Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ka Obi Na-eru Gị Ala n’Agbanyeghị Otú Ihe Nwere Ike Isi Gbanwee ná Ndụ Gị

Ka Obi Na-eru Gị Ala n’Agbanyeghị Otú Ihe Nwere Ike Isi Gbanwee ná Ndụ Gị

“Emewo m ka mkpụrụ obi m jụrụ, meekwa ka ọ nọrọ jụụ.”​—ỌMA 131:2.

ABỤ: 128, 129

1, 2. (a) Olee otú ihe gbanwere ná ndụ Onye Kraịst na mberede nwere ike isi kpaa ya aka? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Olee ihe Abụ Ọma nke 131 kwuru ga-eme ka obi na-eru anyị ala?

MGBE a gwara Nwanna Lloyd na Alexandra nwunye ya ka ha gaa sụwa ụzọ, o wutere ha ná mmalite. A sị kwuwe, ha ejeela ozi na Betel kemgbe ihe karịrị afọ iri abụọ na ise. Nwanna Lloyd sịrị: “Ịnọ na Betel na ọrụ m na-arụ na ya na-atọgbu m atọgbu nke na ọ naghị abata m n’obi ịhapụ ya rụwa ihe ọzọ. Obi tọrọ m ụtọ maka ihe mere e ji mee mgbanwe ahụ. Ma ka izu na ọnwa ole na ole gachara, ọ bịara na-adị m ka à jụrụ m ajụ. Ọ na-abụ obi dịtụ m mma, obere oge ya ajọwa m njọ.”

2 Ihe gbanwee ná ndụ anyị na mberede, o nwere ike ime ka anyị na-echegbu onwe anyị, anyị achịrịkwa obi n’aka. (Ilu 12:25) O nwekwara ike isiri anyị ike ịnabata mgbanwe ndị ahụ. Ụdị ihe a mee, olee otú anyị ga-esi mee ka ‘mkpụrụ obi anyị jụrụ, meekwa ka ọ nọrọ jụụ’? (Gụọ Abụ Ọma 131:1-3.) Ka anyị tụlee otú ụfọdụ ndị ohu Jehova n’oge gara aga na ndị nke oge a si mee ka obi ruo ha ala mgbe ihe gbanwere na mberede ná ndụ ha.

OTÚ “UDO NKE CHINEKE” GA-ESI ENYERE ANYỊ AKA

3. Olee ụdị ọnọdụ Josef chọtara onwe ya?

3 Josef dị ihe dị ka afọ iri na asaa mgbe ụmụnne ya rere ya ka ọ gbawa ohu n’ihi anyaụfụ ha nweere ya. Tupu mgbe ahụ, nna Josef hụrụ ya n’anya karịa ụmụnne ya niile. (Jen. 37:2-4, 23-28) N’ime ihe dị ka afọ iri na atọ, Josef gbara ohu n’Ijipt, mechaakwa gaa mkpọrọ. Nna ya Jekọb ọ hụrụ n’anya anọghị ya nso. Olee ihe mere ka Josef ghara ịtụ ụjọ, meekwa ka obi ghara ịjọ ya njọ?

4. (a) Olee ihe Josef nọ na-eche mgbe ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ? (b) Olee otú Jehova si za ekpere Josef?

4 Mgbe Josef nọ na-ata ahụhụ n’ụlọ mkpọrọ, ọ ga-abụ na ọ na-eche ihe ndị gosiri na Jehova na-agọzi ya. (Jen. 39:21; Ọma 105:17-19) Ọ ga-abụkwa na nrọ ndị ọ rọrọ mgbe ọ na-eto eto mekwara ka obi sie ya ike na Jehova kwụ ya n’azụ. (Jen. 37:5-11) O nwere ike ịbụ na ọ kọọrọ Jehova otú obi dị ya ugboro ugboro. (Ọma 145:18) Jehova zara ekpere ya, mee ka obi sie ya ike na ọ “nọnyeere ya” n’agbanyeghị nsogbu ọ bụla bịaara ya.—Ọrụ 7:9, 10. *

5. Olee otú “udo nke Chineke” nwere ike isi mee ka anyị kpebisie ike ife Jehova?

5 N’agbanyeghị otú ihe nwere ike isi siere anyị ike, anyị nwekwara ike ịhụ otú “udo nke Chineke” si eche ike iche echiche anyị nche. (Gụọ Ndị Filipaị 4:6, 7.) N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị arịọ Jehova ka o nyere anyị aka mgbe anyị na-echegbu onwe anyị, udo nke Chineke ga-eme ka anyị kpebisie ike ịnọgide na-efe Chineke, meekwa ka ike ghara ịgwụ anyị. Ka anyị tụlee gbasara ụfọdụ ndị n’oge anyị a ụdị ihe a mere.

RỊỌ JEHOVA KA O NYERE GỊ AKA INWE OBI IRU ALA ỌZỌ

6, 7. Olee otú ịkpọ okwu aha n’ekpere anyị ga-esi enyere anyị aka inwe obi iru ala ọzọ? Nye ihe atụ.

6 Mgbe a gwara Ryan na Juliette nwunye ya na oge e nyere ha maka ịbụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche nke nwa oge agwụla, ike ụwa gwụrụ ha. Ryan kwuru, sị: “Anyị gwara Jehova ozugbo gbasara ya. Anyị ma na ihe a bụ ohere magburu onwe ya anyị ga-eji gosi na anyị tụkwasịrị Jehova obi. Ọtụtụ ndị nọ n’ọgbakọ anyị ka batara ọhụrụ. N’ihi ya, anyị kpere ekpere ka Jehova nyere anyị aka ime ihe ga-eme ka ụmụnna anyị ṅomie okwukwe anyị.”

7 Olee otú Jehova si za ekpere ha? Ryan kwuru, sị: “Ozugbo anyị kpechara ekpere a, obi kwụsịrị ịjọ anyị njọ, anyị akwụsịkwa ichegbu onwe anyị. Udo nke Chineke chebere obi anyị na ike iche echiche anyị. Anyị ghọtara na Jehova nwere ike iji anyị na-arụ ọrụ ma ọ bụrụ na anyị atụkwasị ya obi.”

8-10. (a) Olee otú mmụọ Chineke ga-esi enyere anyị aka mgbe anyị na-echegbu onwe anyị? (b) Olee otú Jehova nwere ike isi nyere anyị aka ma anyị nọgide na-efe ya?

8 Mmụọ nsọ Chineke na-eme ka obi ruo anyị ala, na-emekwa ka anyị cheta amaokwu Baịbụl ndị ga-enyere anyị aka ịghọta ihe ndị ka mkpa ná ndụ. (Gụọ Jọn 14:26, 27.) Chegodị ihe mere Philip na Mary nwunye ya, bụ́ ndị jerela ozi na Betel ihe fọrọ obere ka o ruo afọ iri abụọ na ise. N’ime ọnwa anọ ha hapụrụ Betel, ma mama Philip ma mama nwunye ya nwụrụ, otu onye ikwu Philip anwụọkwa. Ha maliteziri ilekọta papa Mary, onye uche na-akpakọchaghị ọnụ.

9 Philip kwuru, sị: “M chere na m na-edi ihe a otú m kwesịrị isi edi ya, ma m chọpụtara na e nwere ihe m na-anaghị eme. M gụrụ Ndị Kọlọsi 1:11 n’Ụlọ Nche a na-amụ amụ. Ọ bụ eziokwu na m na-edi ya, ma anaghị m edi ya otú m kwesịrị isi edi ya. M kwesịrị iji ‘ọṅụ na ndidi’ na-edi ya. Amaokwu Baịbụl a mere ka m cheta na ihe kwesịrị ime ka m na-enwe ọṅụ abụghị ọnọdụ m nọ na ya, kama ọ bụ ike mmụọ nsọ na-akpa n’ahụ́ m.”

10 Jehova gọziri Philip na nwunye ya Mary n’ọtụtụ ụzọ n’ihi na ha nọgidere na-ejere ya ozi n’agbanyeghị ọnọdụ ha. Obere oge ha hapụrụ Betel, ha nwetara ndị ha na-amụrụ Baịbụl na-eme nke ọma ma chọọ ka a mụwara ha Baịbụl ihe karịrị otu ugboro n’izu. Mary kwuru, sị: “Ha mere ka obi na-atọ anyị ụtọ. Ọ bụkwa ụzọ Jehova si na-agwa anyị na ihe dị ọkụ ga-emecha jụọ oyi.”

NA-EME IHE JEHOVA GA-EJI AGỌZI GỊ

Olee otú anyị nwere ike isi ṅomie Josef n’agbanyeghị ọnọdụ anyị? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11 ruo na nke 13)

11, 12. (a) Olee ihe Josef mere nke mere Jehova ji gọzie ya? (b) Olee otú Jehova si gọzie Josef maka otú o si die nsogbu bịaara ya?

11 Ọ bụrụ na ọnọdụ anyị agbanwee na mberede, anyị nwere ike ịna-echegbu onwe anyị maka ọdịnihu. Ụdị ihe a gaara eme Josef. Kama ikwe ka o mee ya, o doro anya na o ji ohere ahụ mee ihe bara uru ma si otú ahụ mee ihe mere ka Jehova gọzie ya. N’agbanyeghị na Josef nọ n’ụlọ mkpọrọ, ọ gbara mbọ rụọ ọrụ ọ bụla onyeisi na-elekọta ụlọ mkpọrọ nyere ya otú ahụ o mere mgbe ọ na-arụrụ Pọtịfa ọrụ.—Jen. 39:21-23.

12 Otu ụbọchị, a gwara Josef ka ọ na-elekọta ụmụ nwoke abụọ nọbu n’ọkwá ukwu n’obí Fero. Josef na-akpaso ha àgwà ọma, ọ bụ ya mere obi ji ruo ha ala ịgwa ya ihe ndị na-echegbu ha nakwa nrọ ha rọrọ n’abalị, bụ́ nke na-echu ha ụra. (Jen. 40:5-8) Josef amaghị na mkparịta ụka ahụ ga-emecha mee ka ihe dịrị ya ná mma. Ọ bụ eziokwu na ọ ga-anọkwu afọ abụọ n’ụlọ mkpọrọ, e mechara kpọpụta ya, meekwa ya onye na-esote Fero n’ụbọchị ahụ.—Jen. 41:1, 14-16, 39-41.

13. Olee ihe anyị ga-eme ka Jehova gọzie anyị n’agbanyeghị ọnọdụ anyị?

13 Ọnọdụ anyị na-enweghị ike ime ihe ọ bụla maka ya nwere ike ịbịara anyị otú ahụ ọ bịaara Josef. Ma, ọ bụrụ na anyị agbaa mbọ jiri oge ahụ na-eme ihe bara uru, Jehova ga-agọzi anyị. (Ọma 37:5) N’eziokwu, anyị nwere ike nọrọ ná “mgbagwoju anya” mgbe ụfọdụ, ma dị ka Pọl onyeozi si kwuo, anyị agaghị anọ “n’enwetụghị ụzọ mgbapụ.” (2 Kọr. 4:8) Ọ bụrụ na anyị ejiri ozi anyị kpọrọ ihe, Jehova ga-emere anyị ihe a Pọl kwuru.

JIRI OZI GỊ KPỌRỌ IHE

14-16. Olee otú Filip onye na-ezisa ozi ọma si jiri ozi ya kpọrọ ihe n’agbanyeghị na ọnọdụ ya gbanwere?

14 Filip onye na-ezisa ozi ọma mere ihe anyị kwesịrị ime. O ji ozi ya kpọrọ ihe mgbe ọnọdụ ya gbanwere. A malitere imekpọ ndịozi Jizọs ọnụ na Jeruselem mgbe e gbuchara Stivin. * N’oge ahụ, Filip nọ na-arụ ọrụ ọhụrụ e nyere ya. (Ọrụ 6:1-6) Ma mgbe a chụsasịrị ndị na-eso ụzọ Jizọs, Filip anọghị na-ele ihe na-emenụ n’anya n’anya. Ọ gara ikwusa ozi ọma na Sameria, bụ́ ebe nwere ọtụtụ ebe a na-ekwusabeghị ozi ọma na ya n’oge ahụ.—Mat. 10:5; Ọrụ 8:1, 5.

15 Filip dị njikere ịga ebe ọ bụla mmụọ Chineke ga-agwa ya gaa. N’ihi ya, Jehova mere ka ọ gaa kwusaa ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-anụbeghị ozi ọma. Ọ ga-abụ na obi ruru ndị Sameria ala n’ihi otú o si meso ha ihe n’eleghị mmadụ anya n’ihu, ebe ọ bụkwanụ na ndị Juu na-eleda ndị Sameria anya. Ka a sịkwa ihe mere ìgwè mmadụ ji were “otu obi” na-ege ya ntị.—Ọrụ 8:6-8.

16 Mmụọ nsọ Chineke duuru Filip gaa Ashdọd na Sesaria, bụ́ obodo abụọ ọtụtụ ndị Jentaịl bi. (Ọrụ 8:39, 40) Mgbe ihe dị ka afọ iri abụọ gachara Filip kwusara ozi ọma na nke mbụ ya na Sameria, o doro anya na ọnọdụ ya gbanwere ọzọ. Ọ lụrụ nwaanyị, mụta ụmụ ma birizie n’ebe ọ nọ na-ekwusa ozi ọma. N’agbanyeghị na ọnọdụ Filip agbanweela, ọ ka ji ozi ya kpọrọ ihe, n’ihi ya, Jehova gọziri ya na ezinụlọ ya nke ukwuu.—Ọrụ 21:8, 9.

17, 18. Olee otú iji ozi anyị kpọrọ ihe ga-esi enyere anyị aka ịna-enwe obi ụtọ n’agbanyeghị ọnọdụ anyị?

17 Ọtụtụ ndị ozi oge niile kwuru na iji ozi ha kpọrọ ihe enyerela ha aka ịna-enwe obi ụtọ n’agbanyeghị ọnọdụ ha. Mgbe Nwanna Osborne na Polite nwunye ya, bụ́ ndị Saụt Afrịka hapụrụ Betel, ha chere na ozugbo ha pụtara na ha ga-enweta ọrụ ha ga na-arụ ụbọchị ole na ole n’izu nakwa ebe ha ga-ebi. Nwanna Osborne kwuru, sị: “Ọ dị mwute na anyị enwetaghị ọrụ ozugbo otú anyị tụrụ anya ya.” Nwunye ya Polite kwuru, sị: “Ruo ọnwa atọ, anyị ahụghị ọrụ anyị ga-arụ, e nweghịkwanụ ego dị anyị n’akpa. Ihe a siiri anyị ike.”

18 Gịnị nyeere ha aka idi ọnọdụ a? Nwanna Osborne kwukwara, sị: “Iso ọgbakọ aga ozi ọma nyeere anyị ezigbo aka ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị. Anyị kpebiri ịgachi ozi ọma anya kama ịnọ otu ebe na-echegbu onwe anyị. O mekwara ka anyị na-enwe ezigbo ọṅụ. Anyị gara ebe niile chọọ ọrụ, mechaakwa chọta.”

JIRI NDIDI CHERE JEHOVA

19-21. (a) Gịnị ga-enyere anyị aka ime ka obi na-eru anyị ala? (b) Olee uru ndị anyị nwere ike irite ma anyị jiri oge anyị na-eme ihe bara uru ma ọnọdụ anyị gbanwee?

19 Akụkọ ndị a gosiri na ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe ndị bara uru n’agbanyeghị ọnọdụ anyị ma tụkwasị Jehova obi anyị niile, obi ga na-eru anyị ala. (Gụọ Maịka 7:7.) Anyị nwere ike ịchọpụta na otú anyị si jiri oge anyị mee ihe bara uru mgbe ọnọdụ anyị gbanwere mere ka anyị na Jehova dịrịkwuo ná mma. Nwanna nwaanyị Polite anyị kwuru banyere ya n’elu kwuru banyere ihe mere ya, sị: “Otú ahụ e si si na Betel zipụ anyị ka anyị gaa sụwa ụzọ akụzierela m ihe mmadụ ịtụkwasị Jehova obi pụtara, ma mgbe ihe na-esiri m ike. Mụ na Jehova adịkwuola ná mma.”

20 Nwanna nwaanyị Mary anyị kwuru banyere ya ná mmalite ka na-elekọta nna ya na-arịa ọrịa, na-asụkwa ụzọ. O kwuru, sị: “M mụtala na ihe m kwesịrị ime ma m chegbuwe onwe m bụ ịkwụsị, kpee ekpere ma gba nkịtị. Ihe kachanụ m mụtara bụ ịhapụrụ Jehova ihe niile, ọ bụkwa ihe a ka m kwesịrị ime n’ọdịnihu.”

21 Nwanna Lloyd na Alexandra nwunye ya anyị kwuru gbasara ha ná mmalite isiokwu a kwuru na otú ọnọdụ ha si gbanwee mere ka a mata ma hà nwere okwukwe n’ebe Chineke nọ. Ha kwuru, sị: “Mgbanwe ndị na-eme ná ndụ anyị na-egosi ma ànyị nwere okwukwe n’ebe Chineke nọ, na-egosikwa ma okwukwe anyị ò siri ike ime ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị mgbe ihe na-esiri anyị ike. O mekwaala ka àgwà anyị ka mma.”

Ihe ndị gbanwere ná ndụ anyị na mberede nwere ike ime ka a gọzie anyị otú anyị na-atụghị anya ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 19 ruo na nke 21)

22. Ọ bụrụ na anyị agbalịa na-eme ihe bara uru n’ọnọdụ anyị nọ na ya, olee ihe obi ga-esi anyị ike na ya?

22 Ihe nwere ike ịgbanwe na mberede ná ndụ anyị. E nwere ike inye anyị ihe ọzọ anyị ga na-arụ ná nzụkọ Jehova, anyị nwekwara ike rịawa ọrịa, ma ọ bụ lekọtawa onye ezinụlọ anyị. N’agbanyeghị ihe ọ bụla nwere ike ime, ka obi sie gị ike na Jehova ga na-elekọta gị ma na-enyere gị aka n’oge kwesịrị ekwesị. (Hib. 4:16; 1 Pita 5:6, 7) Ka ọ dịgodị, gbalịa na-eme ihe bara uru n’ọnọdụ ị nọ ugbu a. Na-abịaru Nna gị nke eluigwe nso n’ekpere, mụtakwa ịtụkwasị ya obi gị niile. I mee ihe ndị a, obi ga na-eru gị ala n’agbanyeghị otú ihe si gbanwee ná ndụ gị.

^ para. 4 Mgbe Josef pụtachara n’ụlọ mkpọrọ, o kwuru na Jehova mere ka obi ya jụrụ n’ahụhụ ndị ọ tara ma nye ya nwa nwoke. Ọ gụrụ nwa mbụ ya Manase, n’ihi na ọ sịrị: “Chineke emewo ka m chefuo nsogbu m niile.”—Jen. 41:51.

^ para. 14 Gụọ isiokwu bụ́, “Ị̀ Maara?” nke dị n’Ụlọ Nche a.