Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Gịnị mere ụjọ atụghị Stivin onye na-eso ụzọ Kraịst mgbe a na-emegide ya?

STIVIN nọ n’ihu ndị ikom iri asaa na otu obi tara mmiri. Ndị ikom ndị a na-ekpe ikpe n’ụlọikpe Sanhedrin, bụ́ ụlọikpe kachanụ n’Izrel. N’ihi ya, ha so ná ndị ọnụ na-eru n’okwu n’obodo ahụ. Ọ bụ Nnukwu Onye Nchụàjà aha ya bụ Keyafas kpọkọtara ha. Ọ bụkwa ya bụ onyeisi oche n’ụlọikpe ahụ ọnwa ole na ole gara aga a mara Jizọs ikpe ọnwụ. (Mat. 26:57, 59; Ọrụ 6:8-12) Ka ndị ha kpọtara na-ebo Stivin ebubo ụgha, onye nke a kwuchaa onye ọzọ abịa, ha hụrụ ihe juru ha anya. Ha hụrụ ka ihu ya “dị ka ihu mmụọ ozi.”—Ọrụ 6:13-15.

Gịnị mere ụjọ atụghị Stivin mgbe ọ nọ n’ihu ndị ikom ndị a obi tara mmiri? Tupu a kpọpụta ya n’ihu Sanhedrin, mmụọ nsọ nyeere ya aka iji ozi ya kpọrọ ihe. (Ọrụ 6:3-7) Mgbe a na ekpe ya ikpe, mmụọ nsọ nọkwa na-enyere ya aka ma na-eme ka o cheta ihe ndị ọ mabu. (Jọn 14:16) Ka Stivin na-azara ọnụ ya, bụ́ nke e dere n’Ọrụ Ndịozi isi asaa, mmụọ nsọ mere ka o cheta ihe dị ka amaokwu iri abụọ ma ọ bụ karịa ọ gụrụ n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. (Jọn 14:26) Obi bịara sie Stivin ezigbo ike mgbe ọ hụrụ ọhụụ ebe Jizọs guzo n’aka nri Chineke.—Ọrụ 7:54-56, 59, 60.

Otu ụbọchị, e nwere ike ịkpagbu anyị ma ọ bụ yie anyị egwu. (Jọn 15:20) Ọ bụrụ na anyị ana-amụchi Okwu Chineke anya ma na-ejechi ozi anya, anyị na-ekwe ka mmụọ Jehova na-arụ ọrụ n’ahụ́ anyị. Ọ ga-eme ka anyị nwee ike anyị ga-eji die mmegide ọ bụla bịaara anyị, meekwa ka obi na-eru anyị ala.—1 Pita 4:12-14.