Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Tụkwasị Jehova Obi Ka I Wee Dị Ndụ

Tụkwasị Jehova Obi Ka I Wee Dị Ndụ

“Jiri obi gị dum tụkwasị Jehova obi, adaberekwala ná nghọta gị.”—ILU 3:5.

ABỤ: 3, 8

1. Gịnị mere nkasi obi ji dị anyị niile mkpa?

NKASỊ OBI dị anyị niile mkpa. O nwere ike ịbụ na anyị na-echegbu onwe anyị n’ihi na nsogbu zuru anyị ahụ́, ma ọ bụkwanụ na obi na-ajọ anyị njọ n’ihi na ihe agaghị otú anyị tụrụ anya ya. O nwekwara ike ịbụ na nká, ọrịa ma ọ bụ ọnwụ onye anyị hụrụ n’anya so na-eme ka anyị na-echegbu onwe anyị. O nwekwara ike ịbụ na a na-emekpọ ụfọdụ n’ime anyị ọnụ. Mpụ na ime ihe ike jukwara ebe niile. N’eziokwu, o doro anyị anya na ‘oge a dị oké egwu, nke tara akpụ’ na-egosi na anyị bi “n’oge ikpeazụ,” nakwa na ka chi na-eji, na-abọ, ka Alaeze Chineke na-erukwu nso. (2 Tim. 3:1) Ma, o nwere ike ịbụ na o teela anyị tụwara anya ka nkwa ndị Chineke kwere anyị mezuo. O nwekwara ike ịbụ na nsogbu anyị na-akakwu njọ. Ugbu a, olee ebe anyị ga-esi nweta nkasi obi?

2, 3. (a) Gịnị ka anyị ma banyere Habakọk? (b) Gịnị mere anyị ga-eji leba anya n’akwụkwọ Habakọk?

2 Ka anyị leba anya n’akwụkwọ Habakọk. Ọ ga-enyere anyị aka ịmata azịza ya. Ọ bụ eziokwu na Akwụkwọ Nsọ ekwughị ihe niile banyere ndụ Habakọk, ma ihe e dere n’akwụkwọ Habakọk ga-agba anyị ume. Ọ ga-abụ na Habakọk pụtara “Mmakụ.” O nwere ike ịbụ na aha ya a na-ekwu banyere otú Jehova si akasi ndị ya obi dị ka à ga-asị na ọ makụrụ ha, ma ọ bụkwanụ otú ndị ohu Jehova si na-atụkwasị ya obi. Habakọk jụrụ Chineke ajụjụ ndị na-enye ya nsogbu n’obi. E nwere ike ikwu na ọ jụchitaara anyị ajụjụ ndị ahụ ebe ọ bụ na Jehova mere ka Habakọk dee mkparịta ụka ya na ya na Baịbụl.—Hab. 2:2.

3 Ọ bụ naanị mkparịta ụka a Habakọk na Chineke nwere ka Akwụkwọ Nsọ kọrọ banyere onye amụma a ihe na-enye nsogbu n’obi. Akwụkwọ Habakọk so ‘n’ihe niile e dere n’oge gara aga’ n’Okwu Chineke, nke ga-eme “ka anyị wee site ná ntachi obi anyị na nkasi obi sitere n’Akwụkwọ Nsọ nwee olileanya.” (Rom 15:4) Olee otú Akwụkwọ Habakọk ga-esi baara onye nke ọ bụla n’ime anyị uru? O nwere ike inyere anyị aka ịma ihe ịtụkwasị Jehova obi pụtara. Ihe ọzọ bụ na amụma Habakọk na-eme ka obi sie anyị ike na obi ga-eruli anyị ala n’agbanyeghị nsogbu anyị nọ n’ime ya. Ugbu a, ka anyị lebakwuo anya n’ihe dị n’akwụkwọ Habakọk.

KPỌKUO JEHOVA

4. Gịnị mere obi ji na-ajọ Habakọk njọ?

4 Gụọ Habakọk 1:2, 3. Habakọk biri ndụ n’oge ihe siri ezigbote ike. Obi adịtụdịghị ya mma maka ndị ọjọọ na ndị na-eme ihe ike gbara ya gburugburu. Olee mgbe ihe ọjọọ ndị a ga-ebi? Gịnị mere Jehova ji na-egbu oge ịkwụsị nsogbu ndị a? Ebe Habakọk lekwasịrị anya bụ naanị ná mmegbu na arụrụala ndị obodo ya ji mere aka ọrụ. Ọ dị ya ka nke ya ọ̀ gwụla. N’oge a ihe siri ike, Habakọk kpọkuru Jehova ka ọ bịa dozie nsogbu a. O nwere ike ịbụ na ọ dịwala Habakọk ka Jehova achọghị ịma banyere ihe na-emenụ. Ọ dị ya ka Chineke agaghị eme ihe ngwa ngwa. Ò nwetụla mgbe ọ dị gị otú a ọ dị nwoke a fere Chineke n’oge ochie?

5. Olee ihe dị ezigbo mkpa anyị ga-amụta n’akwụkwọ Habakọk? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

5 Ọ̀ pụtara na Habakọk atụkwasịghịzi Jehova obi? Ọ̀ kwụsịrị inwe obi ike na Jehova ga-emezu nkwa ndị o kwere? Mba. Otu ihe gosiri na ọ ka tụkwasịrị Jehova obi bụ na ọ kọsaara Jehova nsogbu ya kama ịkọsara ya mmadụ ibe ya. Nke bụ́ eziokwu bụ na obi nọ na-ajọ ya njọ n’ihi na ọ maghị ihe mere Chineke ji na-egbu oge ime ihe, nakwa ihe mere o ji hapụ ya ka ọ na-ahụsi anya. Jehova ji ike mmụọ nsọ ya mee ka Habakọk dee ihe ndị a iji kụziere anyị otu ihe dị ezigbo mkpa, ya bụ, na anyị ekwesịghị ịtụ ụjọ ịkọrọ ya ihe ọ bụla na-enye anyị nsogbu n’obi. N’eziokwu, Jehova na-agba anyị ume ka anyị kọsara ya ihe ọ bụla na-enye anyị nsogbu n’obi n’ekpere. (Ọma 50:15; 62:8) Ilu 3:5 na-agbakwa anyị ume ka anyị “jiri obi [anyị] dum tụkwasị Jehova obi,” gharakwa ‘ịdabere ná nghọta anyị.’ Ọ ga-abụ na Habakọk maara ihe a dị n’akwụkwọ Ilu, meekwa ya.

6. Gịnị mere ekpere ji dị mkpa?

6 Habakọk gbakwuuru Jehova, tụkwasịkwa ya obi n’ihi na Jehova bụ Enyi ya na Nna ya. Habakọk anọghị na-echegbu onwe ya maka ọnọdụ ya ma tụkwasị onwe ya obi. Kama nke ahụ, ọ kọọrọ Jehova obi ya na nsogbu ya. Ihe a o mere ka anyịnwa kwesịkwara ịna-eme. A sị ka e kwuwe, Jehova bụ́ Onye na-anụ ekpere chọrọ ka anyị na-akọrọ ya ihe na-enye anyị nsogbu n’obi iji gosi na anyị tụkwasịrị ya obi. (Ọma 65:2) Anyị mee otú ahụ, anyị ga-ahụ otú Jehova ga-esi za anyị ekpere, gosi anyị na ọ hụrụ anyị n’anya ma duzie anyị. (Ọma 73:23, 24) Ọ ga-eme ka anyị mata uche ya n’agbanyeghị ụdị nsogbu anyị nọ na ya. Ekpere anyị ji obi anyị niile na-ekpegara Jehova so n’ihe kacha egosi na anyị tụkwasịrị ya obi.

GEE JEHOVA NTỊ

7. Gịnị ka Jehova mere banyere ihe na-enye Habakọk nsogbu n’obi?

7 Gụọ Habakọk 1:5-7. Mgbe Habakọk kọsachaara Jehova nsogbu ya niile, o nwere ike na-eche banyere ihe Jehova ga-eme. Jehova bụ Nna nwere ọmịiko na nghọta. N’ihi ya, ọ baraghị Habakọk mba maka ịkọ nsogbu ya. Chineke ma na ọ bụ ọnọdụ ọjọọ ọ nọ na ya kpatara ya. Jehova gwara Habakọk ihe ọ ga-eme ndị Juu na-enupụ isi n’oge na-adịghị anya. O nwere ike ịbụ na Habakọk bụ onye mbụ Jehova gwara na ọ na-aga ibibi ọgbọ ọjọọ ahụ na-eme ihe ike n’oge na-adịghị anya.

8. Gịnị mere ihe Jehova zara Habakọk ji gbaa ya gharịị?

8 Jehova mere ka Habakọk mata na ọ ga-eme ihe n’oge na-adịghị anya. Ntaramahụhụ ọ ga-enye ọgbọ ọjọọ ahụ na-eme ihe ike ji ọsọ na-abịa. Jehova gwara Habakọk na ihe ahụ ga-eme “n’ụbọchị unu,” ya bụ, na ọ ga-ekpe ọgbọ ọjọọ ahụ ikpe n’oge Habakọk ka nọ ndụ ma ọ bụkwanụ n’oge ndị ọgbọ ya ka nọ ndụ. Ihe a Jehova zara Habakọk abụtụdịghị ihe ọ tụrụ anya ya. Ọ̀ bụ ihe a ka Jehova ga-eme maka ákwá ọ na-ebere ya ka o mee ihe ozugbo? Ihe Jehova gwara ya gosiri na ahụhụ ga-aka njọ na Juda niile. * Ndị Kaldia (ya bụ, ndị Babịlọn) bụ ndị obi fere azụ. Ha na-emedị ihe ike karịa ndị obodo Habakọk, bụ́ ndị maara iwu Chineke. Gịnị mere Jehova ga-eji jiri mba ọjọọ a na-ekpere arụsị nye ndị ya ntaramahụhụ? Gịnị ka ị ga-eme ma a sị na ọ bụ gị ka Jehova gwara ihe a?

9. Olee ajụjụ ndị o nwere ike ịbụ na Habakọk jụrụ onwe ya?

9 Gụọ Habakọk 1:12-14, 17. Habakọk ghọtara na Jehova ga-eji ndị Babịlọn nye ndị ọjọọ ahụ ntaramahụhụ. Ma, o nwere ihe na-edochabeghị ya anya. N’agbanyeghị nke ahụ, o medara obi gwa Jehova na ọ ka bụkwa “Oké Nkume” ya. (Diut. 32:4; Aịza. 26:4) Habakọk nwere ndidi ma tụkwasị Jehova obi na ọ ga-emere ya amara. N’ihi nke a, ụjọ atụghị ya ịjụ Jehova ajụjụ ọzọ. Gịnị mere Chineke ga-eji kwe ka nsogbu dị na Juda ka njọ? Gịnị mere ọ chọghị ime ihe ozugbo? Gịnị mere Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ga-eji kwe ka ndị ya takwuo ahụhụ? Gịnị mere ọ ga-eji “na-agbachikwa nkịtị” mgbe ihe ọjọọ na-arị ibe ya elu? A sịdị kwuwe, Jehova bụ “Onye Nsọ”; “anya [ya] dị nsọ nke ukwuu nke na ọ dịghị ele ihe ọjọọ.”

10. Mgbe ụfọdụ, olee otú o nwere ike isi dị anyị otú ahụ ọ dị Habakọk?

10 Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịdị anyị otú ahụ ọ dị Habakọk. Anyị na-ege Jehova ntị. Anyị tụkwasịrị ya obi, na-agụ Okwu ya, na-amụkwa ya. Ọ na-emekwa ka anyị nwee olileanya. Anyị sikwa n’ọnụ nzukọ Jehova na-anụ banyere ọtụtụ nkwa ndị o kwere anyị. Mana, anyị ka nwere ike ịna-eche, sị: ‘Olee mgbe nsogbu anyị ga-ebi?’ Olee ihe anyị ga-amụta n’ihe ọzọ Habakọk mere?

CHERE JEHOVA

11. Gịnị ka Habakọk kpebiri ime mgbe o gechara Jehova ntị?

11 Gụọ Habakọk 2:1. Mkparịta ụka Jehova na Habakọk nwere mere ka obi ruo Habakọk ala. N’ihi ya, Habakọk kpebiri na ọ ga-echere Jehova. Ihe a abụghị mkpebi na-esighị ya n’obi n’ihi na o kwughachiri ya ọzọ mgbe ọ sịrị: “M ga-anọrọ nwayọọ wee chere ụbọchị ahụhụ.” (Hab. 3:16) Ndị ọzọ fere Jehova n’oge ochie mekwara otu ihe ahụ. Ha ji ndidi chere Jehova. Ihe a ha mere na-akụziri anyị na anyị kwesịrị ịtachi obi nọgide na-echere Jehova.—Maị. 7:7; Jems 5:7, 8.

12. Olee ihe ụfọdụ anyị na-amụta n’aka Habakọk?

12 Olee ihe mkpebi Habakọk mere na-akụziri anyị? Ihe nke mbụ ọ na-akụziri anyị bụ na anyị ekwesịghị ịkwụsị ịkọrọ Jehova nsogbu anyị n’agbanyeghị ụdị nsogbu ọ bụ. Ihe nke abụọ bụ na anyị kwesịrị ịna-ege ntị n’ihe Jehova ji Okwu ya na nzukọ ya na-agwa anyị. Ihe nke atọ abụrụ na anyị kwesịrị iji ndidi na-echere Jehova, kwetasiekwa ike na ọ ga-akwụsị nsogbu anyị niile n’oge nke ya. Ọ bụrụ na anyị ana-akọrọ Jehova obi anyị, na-ege ya ntị ma jiri ndidi chere oge nke ya dị ka Habakọk mere, obi ga-eru anyị ala. Ọ ga-enyekwara anyị aka ịtachi obi. Olileanya anyị ga-enyere anyị aka ịna-enwe ndidi. Ọ ga-enyekwara anyị aka ịna-aṅụrị ọṅụ n’agbanyeghị nsogbu anyị nọ n’ime ya, meekwa ka obi sie anyị ike na Nna anyị nke eluigwe ga-eme ihe mgbe oge ya ruru.—Rom 12:12.

13. Olee okwu na-emesi obi ike Jehova kwuru na Habakọk 2:3?

13 Gụọ Habakọk 2:3. O doro anya na obi tọrọ Jehova ụtọ na Habakọk kpebiri ichere ya. Ọnọdụ ọjọọ Habakọk nọ na ya doro Jehova anya. N’ihi ya, Jehova kasiri ya obi, jirikwa nwayọọ mee ka ọ mata na ya ga-eme ihe n’oge na-adịghị anya. E nwere ike ikwu na Chineke nọ na-agwa Habakọk, sị: “Nwee ndidi, tụkwasị m obi. M ga-eme ihe, ọ sọgodị ya ya bụrụ na o yie ka ò gbutụrụ oge.” Jehova chetaara Habakọk na o nwere oge a kapịrị ọnụ ọ ga-eji emezu nkwa ya. Ọ gbara Habakọk ume ka o chere ka oge ahụ ruo. Otu ihe doro anya bụ na n’ikpeazụ, Jehova agaghị agharịpụ ya.

Gịnị mere anyị ji kpebie iji ike anyị niile jeere Jehova ozi? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14)

14. Gịnị ka anyị kwesịrị ikpebi ime ma anyị nọrọ ná nsogbu?

14 Iji ndidi na-echere Jehova, na-egekwa ya ntị ga-eme ka obi sie anyị ike, meekwa ka obi ruo anyị ala n’agbanyeghị nsogbu anyị nọ na ya. Jizọs gbara anyị ume ka anyị ghara itinye uche anyị ‘n’oge ma ọ bụ mgbe a kara aka’ nke Chineke na-ekpughebeghị. Kama, ka anyị tụkwasị Jehova obi n’ihi na ọ bụ ya bụ Onye Ukwu Na-edebe Oge. (Ọrụ 1:7) N’ihi ya, ka anyị ghara ịda mbà. Kama, ka anyị dịrị umeala n’obi, jiri okwukwe na ndidi na-echere Jehova, jirikwa oge anyị na-eme ike anyị nille n’ozi ya.—Mak 13:35-37; Gal. 6:9.

ỊTỤKWASỊ JEHOVA OBI GA-EME KA ANYỊ NWETA NDỤ NA ỌTỤTỤ IHE ỌMA N’ỌDỊNIHU

15, 16. (a) Olee ọmarịcha nkwa ndị dị n’akwụkwọ Habakọk? (b) Oleekwa ihe nkwa ndị a na-akụziri anyị?

15 Jehova kwere ndị tụkwasịrị ya obi nkwa, sị: “Onye ezi omume ga-esi n’ikwesị ntụkwasị obi ya dị ndụ,” n’ihi na “ụwa ga-ejupụtakwa n’ịmara ebube Jehova.” (Hab. 2:4, 14) N’eziokwu, Chineke ga-eji ndụ kwụọ ndị niile nwere ndidi ma tụkwasị ya obi ụgwọ ọrụ.

16 Onye lee nkwa ahụ dị na Habakọk 2:4 anya elu elu, o nwere ike iche na o nweghị oké ihe ọ bụ. Ma, Pọl onyeozi ma na nkwa ahụ dị ezigbo mkpa. Ọ bụ ya mere o ji kwuo gbasara ya ugboro atọ. (Rom 1:17; Gal. 3:11; Hib. 10:38) N’agbanyeghị nsogbu ọ bụla onye ezi omume nọ na ya, okwukwe ya na ntụkwasị obi o nwere n’ebe Chineke nọ ga-eme ka ọ dị ndụ hụ mmezu nke nkwa ndị Chineke kwere. Jehova na-agwa anyị ka anyị hapụ nsogbu anyị ma tinye uche anyị n’ihe ọma ndị dị n’ihu.

17. Olee otú akwụkwọ Habakọk si emesi anyị obi ike?

17 Akwụkwọ Habakọk na-akụziri anyị niile bi n’oge ikpeazụ a ihe dị ezigbo mkpa. Jehova kwere ndị niile nwere okwukwe n’ebe ọ nọ nkwa ndụ ebighị ebi. Ka anyị nọgide na-eme ka okwukwe na ntụkwasị obi anyị nwere n’ebe Chineke nọ sikwuo ike n’agbanyeghị nsogbu ọ bụla nwere ike ịbịara anyị. Jehova ji ihe ọ gwara Habakọk na-emesi anyị obi ike na ya ga-akwado anyị ma napụta anyị ná nsogbu anyị niile. Ọ na-agba anyị ume ka anyị tụkwasị ya obi ma jiri ndidi na-echere oge ya a kara aka. Mgbe ahụ, n’Alaeze ya, ụwa niile ga-ejupụta ná ndị dị nwayọọ n’obi, ndị ji obi ụtọ na-efe ya ofufe.—Mat. 5:5; Hib. 10:36-39.

JIRI ỌṄỤ NA-ATỤKWASỊ JEHOVA OBI

18. Olee ihe okwu Jehova mere ka Habakọk mee?

18 Gụọ Habakọk 3:16-19. Okwu Jehova kpara ike dị egwu n’ahụ́ Habakọk. Ọ tụgharịrị uche n’ọrụ ndị dị ịtụnanya Jehova rụụrụ ndị ya n’oge gara. Ihe ndị a mere ka okwukwe ya sikwuo ike, meekwa ka ọ mata na Jehova ga-eme ihe n’oge na-adịghị anya. Ọ kasikwara ya obi n’agbanyeghị na ọ ma na ahụhụ ya agaghị ebi ozugbo. Habakọk kwụsịrị inwe obi abụọ. Obi bịaziri sie ya ike na Jehova ga-anapụta ya. O kwuru ihe gosiri na obi siri ya ike n’ebe Jehova nọ. Ihe a o kwuru n’amaokwu nke iri na asatọ so n’okwu kacha gbaa ọkpụrụkpụ e kwutụrụla gbasara inwe obi ike. Ụfọdụ ndị ọkà mmụta kwuru na ihe amaokwu a pụtara kpọmkwem bụ: “M ga-eji ọṅụ wụlie elu n’ime Onyenwe anyị; m ga-etegharị egwú gburugburu n’ihi aṅụrị m na-enwe n’ime Chineke.” Okwu ndị a na-eme ka anyị nwee ezigbo obi ike. Ọ bụghị naanị na Jehova ekwela anyị ọtụtụ ọmarịcha nkwa, kama, o meekwala ka obi sie anyị ike na ya ga-emezu nkwa ndị ahụ.

19. Olee otú anyị ga-esi nweta ụdị nkasi obi Habakọk nwetara?

19 O doro anya na isi ihe akwụkwọ Habakọk na-akụziri anyị bụ ka anyị na-atụkwasị Jehova obi. (Hab. 2:4) Ihe ga-enyere anyị aka ịnọgide na-atụkwasị Jehova obi bụ ime ka mmekọrịta anyị na ya sikwuo ike. Iji nwee ike ime ya, anyị ga na-eme ihe atọ a: (1) ịnọgide na-akọrọ Jehova mkpa anyị niile n’ekpere; (2) ime ihe ọ bụla Okwu Chineke kwuru na iso ntụziaka niile nzukọ ya na-enye; nakwa (3) iji okwukwe na ndidi na-echere Jehova. Ọ bụ ihe ndị a ka Habakọk mere. Ọ bụ eziokwu na Habakọk ji okwu mwute dee mmalite akwụkwọ ya, ma o ji okwu ndị na-egosi na o nwere obi ụtọ na obi ike dee mmechi ya. Ka anyị niile gbalịa ṅomie Habakọk ka Jehova nwee ike igosi anyị na ọ hụrụ anyị n’anya dị ka nna si ahụ ụmụ ya n’anya. Ò nwere ebe ọzọ anyị ga-esi nweta ụdị nkasi obi karịrị nke a n’ụwa ọjọọ a?

^ para. 8 Na Habakọk 1:5, e dere okwu bụ́ “unu,” nke na-egosi na ọdachi ahụ ga-adakwasị Juda niile.