Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Ihe Ndị Chineke Ga-eme?

Olee Ihe Ndị Chineke Ga-eme?

Ọ bụrụ na ị nọ ná nsogbu, ọ̀ bụ na ị gaghị achọ ka enyi gị bịa nyere gị aka? Ọ bụ ya mere ụfọdụ ndị ji asị na Chineke abụghị enyi ha n’ihi na ha chere na o nweghị ihe ọ na-eme iji nyere ha aka. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na e nweela ọtụtụ ihe Chineke mere iji nyere anyị aka, e nwekwara ihe ndị ọ ga-eme gbasara nsogbu ndị anyị na-enwe taa. Olee ihe ndị Chineke ga-eme?

Ọ GA-EME KA IHE ỌJỌỌ NIILE KWỤSỊ

Ihe Chineke ga-eme ka ihe ọjọọ niile kwụsị bụ ibibi onye ihe ọjọọ niile si n’aka. Baịbụl gwara anyị onye o si n’aka. Ọ sịrị: “Ụwa dum dị n’aka ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) O nweghị onye ọzọ bụ́ “ajọ onye ahụ” ma ọ́ bụghị onye ahụ Jizọs kpọrọ “onye na-achị ụwa a,” ya bụ, Setan. (Jọn 12:31) Ọ bụ ya na-eme ka ụmụ mmadụ na-eme ihe ọjọọ ndị juru n’ụwa taa. Gịnị ka Chineke ga-eme gbasara ya?

Jehova Chineke ga-eji Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst “mee ka ọ ghara ịdị bụ́ onye ahụ nke nwere ikike ịkpata ọnwụ, ya bụ, Ekwensu.” (Ndị Hibru 2:14; 1 Jọn 3:8) Ihe Baịbụl kwuru gosiri na Ekwensu n’onwe ya ma na “o nwere oge dị mkpirikpi.” (Mkpughe 12:12) Chineke ga-ebibikwa ndị niile na-eme ihe ọjọọ.—Abụ Ọma 37:9; Ilu 2:22.

Ọ GA-EME KA ỤWA GHỌỌ PARADAỊS

Chineke mechaa ka ihe ọjọọ niile kwụsị n’ụwa, ọ ga-emezuzi nzube ya, ya bụ, ime ka ụmụ mmadụ zuru okè biri na paradaịs ruo mgbe ebighị ebi. Olee ihe ndị anyị na-atụ anya na Chineke ga-emere anyị n’oge ahụ?

A ga-enwe udo na obi iru ala. “Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa, ha ga-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile.”—Abụ Ọma 37:11.

A ga-enwe nri na-edozi ahụ́ n’ụwa niile. “Ọka ga-ejupụta n’elu ụwa; Ọ ga-ejubiga ókè n’elu ugwu dị iche iche.”—Abụ Ọma 72:16.

A ga-enwe ụlọ ndị mara mma na ọrụ ndị na-eme obi ụtọ. “Ha ga-ewu ụlọ, biri n’ime ha; ha ga-akọkwa ubi vaịn, rie mkpụrụ ha. . . . Ndị m họọrọ ga-eji ihe aka ha rụpụtara mee ihe n’uju.”—Aịzaya 65:21, 22.

Ọ̀ na-agụ gị agụụ ịhụ mgbe ihe ndị a ga-emezu? N’oge na-adịghị anya, ha ga-emezu.

Ọ GA-EME KA ỌRỊA NA ỌNWỤ GHARAZIE ỊDỊ

Anyị niile na-arịa ọrịa ma na-anwụ anwụ taa. Ma n’oge na-adịghị anya, ihe ndị a agaghịzi adị. N’ihi àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ, Chineke ga-eme “ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na [Jizọs], kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Olee ihe ga-eme mgbe ahụ?

Ọrịa agaghịzi adị. “Ọ dịghị onye bi na ya nke ga-asị: ‘Ana m arịa ọrịa.’ Ndị bi n’ala a ga-abụ ndị a gbaghaara njehie ha.”—Aịzaya 33:24.

Ọnwụ agaghịzi adị. “Ọ ga-eloda ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ga-ehichapụkwa anya mmiri n’ihu niile.”—Aịzaya 25:8.

Ụmụ mmadụ ga-adị ndụ ebighị ebị. “Onyinye nke Chineke na-enye bụ ndụ ebighị ebi site n’aka Kraịst Jizọs Onyenwe anyị.”—Ndị Rom 6:23.

A ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ. “A gaje inwe mbilite n’ọnwụ nke ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume.” (Ọrụ Ndịozi 24:15) Ndị nwụrụ anwụ ga-eso rite uru n’ihe mgbapụta ahụ Chineke nyere anyị.

Olee otú Chineke ga-esi mezuo ihe ndị a niile?

Ọ GA-EME KA E NWEE ỌCHỊCHỊ ZURU OKÈ

Chineke ga-eji Alaeze eluigwe ya, nke Jizọs Kraịst bụ eze ya, mee ka ihe o bu n’obi gbasara ụmụ mmadụ na ụwa mezuo. (Abụ Ọma 110:1, 2) Ọ bụ ọchịchị, ma ọ bụ alaeze ahụ ka Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha kpee ekpere gbasara ya, sị: “Nna anyị nke bi n’eluigwe, . . . ka alaeze gị bịa.”—Matiu 6:9, 10.

Alaeze Chineke ga-achị ụwa niile ma mee ka ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata gharazie ịdị. Alaeze a bụ ọchịchị kacha mma ụmụ mmadụ nwere ike inwe. Ọ bụ ya mere Jizọs ji jiri ike ya niile kwusaa “ozi ọma alaeze ahụ” mgbe ọ nọ n’ụwa ma gwa ndị na-eso ụzọ ya ka ha mee otú ahụ.—Matiu 4:23; 24:14.

Ọ bụ n’ihi na Jehova Chineke hụrụ anyị n’anya mere o ji kwe nkwa na ọ ga-emere anyị ihe ndị a niile. Ọ̀ bụ na ihe a agaghị eme ka ị chọọ ịbịaru ya nso? Olee uru ịbiaru ya nso ga-abara gị? Ị ga-amata ya n’isiokwu na-esonu.

OLEE IHE NDỊ CHINEKE GA-EME? Chineke ga-eme ka ọrịa na ọnwụ gharazie ịdị. Ọ ga-emekwa ka Alaeze ya chịwa ụwa niile, ka ụmụ mmadụ dịrị n’otu, meekwa ka ụwa ghọọ paradaịs