Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ 6

Nọgide Na-ekwesị Ntụkwasị Obi

Nọgide Na-ekwesị Ntụkwasị Obi

“Ruo mgbe m kubiri ume, m gaghị akwụsị iguzosi ike n’ezi ihe.”​—JOB 27:5.

ABỤ 34 Ekpebiela M Ime Ezi Omume

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Olee otú Ndịàmà Jehova atọ e kwuru okwu ha na paragraf a si kwesị ntụkwasị obi?

CHEGODỊ banyere ihe atụ atọ a gbasara Ndịàmà Jehova atọ. (1) Otu ụbọchị, otu nwata nwaanyị nọ na klas, onye nkụzi ha agwa ndị niile nọ na klas ahụ ka ha soro mee otu ememme. Nwata nwaanyị a ma na ememme ahụ adịghị Chineke mma. N’ihi ya, o medara obi gwa onye nkụzi ha na ya agaghị eso eme ya. (2) Otu nwa okorobịa ihere na-eme nọ na-ekwusa ozi ọma ụlọ n’ụlọ ma chọpụta na nwa klas ha bi n’ụlọ ọzọ ọ na-aga izi ozi ọma. Nwa klas ya a akwabuola Ndịàmà Jehova emo. Ma, nwa okorobịa a katara obi gaa kụọ aka n’ụlọ ahụ. (3) Otu nwoke na-arụsi ọrụ ike ka o gbooro ndị ezinụlọ ya mkpa ha. Otu ụbọchị, onye ọ na-arụrụ ọrụ gwara ya na ya chọrọ ka ọ rụrụọ aka ma ọ bụ mee ihe iwu na-akwadoghị. Ọ bụ eziokwu na o nwere ike ịchụ ya n’ọrụ ma ọ jụ ime ya, ma nwoke ahụ gwara ya na ya ga-akwụwa aka ya ọtọ ma mee ihe iwu kwuru, n’ihi na Chineke chọrọ ka ndị na-efe ya na-eme otú ahụ.​—Rom 13:​1-4; Hib. 13:18.

2. Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle, n’ihi gịnịkwa?

2 Olee àgwà mmadụ atọ ahụ nwere? Ọ ga-abụ na ị chọpụtara na ha nwere àgwà ndị dị ka obi ike, ime ihe n’eziokwu nakwa ọtụtụ àgwà ndị ọzọ. Ma e nwere ihe dị ezigbo mkpa ha mere. Ha kwesịrị ntụkwasị obi. Onye ọ bụla n’ime ha rubeere Jehova isi. Ha jụrụ imebi iwu Jehova. Ihe mere ha ji jụ ime ihe ndị ahụ bụ na ha na-ekwesị ntụkwasị obi. Obi ga-atọ Jehova ụtọ n’ihi otú onye nke ọ bụla n’ime ha si kwesị ntụkwasị obi. Anyị chọkwara ime ka obi na-atọ Nna anyị nke eluigwe ụtọ. N’ihi ya, ka anyị tụlee ajụjụ ndị a: Gịnị bụ ikwesị ntụkwasị obi? Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-ekwesị ntụkwasị obi? Oleekwa otú anyị ga-esi eme ka mkpebi anyị mere ịna-ekwesị ntụkwasị obi n’oge ndị a tara akpụ sikwuo ike?

GỊNỊ BỤ IKWESỊ NTỤKWASỊ OBI?

3. (a) Olee otú ndị na-efe Chineke si egosi na ha na-ekwesị ntụkwasị obi? (b) Olee ihe atụ ndị nwere ike inyere anyị aka ịghọta ihe ikwesị ntụkwasị obi pụtara?

3 Olee otú ndị na-efe Chineke si egosi na ha na-ekwesị ntụkwasị obi? Ọ bụ iji obi ha niile hụ Jehova n’anya. Nke a mere ka ha na-eme ihe na-adị ya mma mgbe niile. Tụlee ihe ụfọdụ e kwuru na Baịbụl banyere ikwesị ntụkwasị obi. Na Baịbụl, okwu Hibru a sụgharịrị “iguzosi ike n’ezi ihe” ma ọ bụ ikwesị ntụkwasị obi pụtara ihe zuru ezu ma ọ bụ ihe na-enweghị nkwarụ. * Dị ka ihe atụ, ndị Izrel ji anụmanụ chụọrọ Jehova àjà. Iwu Mozis kwuru na anụmanụ ndị ahụ agaghị enwe nkwarụ. * (Lev. 22:​21, 22) Chineke achọghị ka ndị ya jiri anụmanụ dara ngwọrọ, nke ntị chiri, ma ọ bụ nke kpuru ìsì chụọrọ ya àjà. Ọ chọghịkwa ka ha jiri nke na-arịa ọrịa chụọrọ ya àjà. Jehova chọrọ ka e jiri anụmanụ na-enweghị nkwarụ na-achụrụ ya àjà. (Mal. 1:​6-9) Ihe ndị a emeela ka anyị ghọta na Jehova ji ihe zuru ezu ma ọ bụ ihe na-enweghị nkwarụ kpọrọ ihe. Anyị chọọ ịzụ ihe, dị ka mkpụrụ osisi, akwụkwọ ma ọ bụ ngwá ọrụ, anyị anaghị achọ ịzụ mkpụrụ osisi na-adịghị mma, akwụkwọ peeji ya na-ezughị ezu ma ọ bụ ngwá ọrụ akụkụ ya ụfọdụ na-ezughị ezu. Anyị chọrọ ịzụ nke dị mma ma ọ bụ nke zuru ezu. Otú ahụ ka ọ dị Jehova ma a bịa n’ihe gbasara ịhụ ya n’anya na irubere ya isi. Ọ chọrọ ka anyị jiri obi anyị niile na-eme otú ahụ.

4. (a) Gịnị mere onye na-ezughị okè nwere ike iji ekwesị ntụkwasị obi? (b) Dị ka Abụ Ọma 103: 12-14 si kwuo, gịnị ka Jehova chọrọ n’aka anyị?

4 Ànyị kwesịrị ịna-eche na anyị ga-ezurịrị okè tupu anyị enwee ike ikwesị ntụkwasị obi? A sị ka e kwuwe, anyị nwere ike na-eche na anyị na-emejọ ọtụtụ ihe. Tụlee ihe abụọ mere na anyị ekwesịghị ịna-eche na anyị ga-ezurịrị okè tupu anyị enwee ike ikwesị ntụkwasị obi. Nke mbụ bụ na Jehova anaghị elekwasị anya n’ebe anyị na-emejọ ihe. Okwu ya gwara anyị, sị: “A sị na ọ bụ njehie ka ị na-ele, Jaa, Jehova, ònye pụrụ iguzo?” (Ọma 130:3) Ọ ma na anyị ezughị okè, ọ na-ejikwa obi ya niile na-agbaghara anyị. (Ọma 86:5) Nke abụọ bụ na Jehova ma ihe anyị na-agaghị emeli. Ọ naghịkwa atụ anya ka anyị mee ihe anyị na-agaghị emeli. (Gụọ Abụ Ọma 103:​12-14.) Oleezi otú anyị ga-esi zuo okè n’anya ya?

5. Olee otú ịhụnanya si bụrụ isi ihe na-eme ka ndị ohu Jehova na-erubere ya isi?

5 Ịhụnanya bụ isi ihe na-eme ka ndị ohu Jehova na-erubere ya isi. Anyị kwesịrị iji obi anyị niile na-ahụ Nna anyị nke eluigwe n’anya ma na-erubere ya isi. Ọ bụrụ na anyị ana-ahụ ya n’anya ma n’oge ọnwụnwa, anyị na-ekwesị ntụkwasị obi. (1 Ihe 28:9; Mat. 22:37) Ka anyị tụleekwa banyere Ndịàmà Jehova atọ ahụ anyị kwuru banyere ha ná mmalite isiokwu a. Gịnị mere ha ji mee ihe ahụ ha mere? Ọ̀ bụ na nwata nwaanyị ahụ achọghị ịtụrụ ndụ n’ụlọ akwụkwọ? Nwa okorobịa ahụ, ọ̀ chọrọ ka a kwaa ya emo n’ụlọ ahụ ọ chọrọ ịga zie ozi ọma? Ka nwoke ahụ na-arụ ọrụ iji gbooro ndị ezinụlọ ya mkpa ha, ọ̀ chọrọ ka a chụọ ya n’ọrụ? Mbanụ. Kama, ha ma na Jehova nwere ihe ọ chọrọ ha n’aka, ha chọkwara ime ihe dị Nna ha nke eluigwe mma. Ịhụnanya ha nwere n’ebe Jehova nọ na-eme ka ha na-eche banyere ya tupu ha ekpebie ihe ha ga-eme. Ha si otú ahụ gosi na ha na-erubere Chineke isi.

GỊNỊ MERE O JI DỊ MKPA KA ANYỊ NA-EKWESỊ NTỤKWASỊ OBI?

6. (a) Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị na-ekwesị ntụkwasị obi? (b) Gịnị mere Adam na Iv ji nupụrụ Chineke isi?

6 Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị na-ekwesị ntụkwasị obi? Ọ bụ n’ihi na Setan kwuru na ọ bụghị Jehova kwesịrị ịchị, nakwa na ihe mere i ji na-erubere Chineke isi bụ n’ihi ihe ndị ị na-erite n’aka ya. Mmụọ ozi a nupụrụ isi mere onwe ya Setan ma ọ bụ “Onye Mmegide” n’ogige Iden. Ọ katọrọ Jehova. Ihe Setan na-ekwu bụ na Chineke bụ Onye ọchịchị ọjọọ, nke na-achọ ihe ga-abara naanị onwe ya uru nakwa Onye na-anaghị eme ihe n’eziokwu. Ọ dị mwute na Adam na Iv sooro Setan nupụrụ Chineke isi. (Jen. 3:​1-6) Mgbe ahụ Adam na Iv biri n’ogige Iden, ha nwere ezigbo ohere ime ka ịhụnanya ha nwere n’ebe Jehova nọ sikwuo ike. Ma n’oge ahụ Setan boro Jehova ebubo, ha ejighịzi obi ha niile hụ Chineke n’anya. Ma e nwere ajụjụ ọzọ e kwesịrị ịza. È nwere onye ga na-ekwesị ntụkwasị obi n’ebe Jehova Chineke nọ n’ihi na ọ hụrụ Chineke n’anya? Ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ụmụ mmadụ, hà nwere ike irubere Chineke isi? Setan jụrụ ajụjụ a gbasara Job.

7. Dị ka Job 1:​8-11 si kwuo, olee otú obi dị Jehova banyere otú Job si na-erubere ya isi? Olee otú obi dị Setan banyere ya?

7 Job dịrị ndụ n’oge ndị Izrel nọ n’Ijipt. Mgbe ọ dị ndụ, e nweghị onye na-ekwesị ntụkwasị obi ka ya. Job ezughị okè otú ahụ anyị na-ezughị. O mejọkwara ihe. Ma Jehova hụrụ ya n’anya n’ihi otú o si rubere ya isi. Ọ ga-abụ na Setan ebula ụzọ kwuo na ụmụ mmadụ agaghị ekwesịli ntụkwasị obi. Ihe a o kwuru bụ ịkparị Jehova. Ọ bụ ya mere Jehova ji gwa Setan banyere Job. Otú Job si bie ndụ ya mere Setan onye ụgha. Setan gwara Chineke ka o kwe ya ka ya nwaa Job ọnwụnwa iji gosi ma ọ̀ ga-ekwesịli ntụkwasị obi. Jehova tụkwasịrị enyi ya Job obi, n’ihi ya, o kwere ka Setan nwaa Job.​—Gụọ Job 1:​8-11.

8. Olee otú Setan si nwaa Job?

8 Obi tara Setan mmiri, ọ bụkwa ogbu mmadụ. O mere ka ihe niile Job nwere funahụ ya, gbuo ndị na-ejere ya ozi, mebiekwa aha ya. O gburu ụmụ ya iri. O mekwara ka etuto ọjọọ too Job, malite n’ọbụ ụkwụ ya ruo n’opu isi ya. Ihe a gbawara nwunye Job obi, ya agwa di ya ka ọ kọchaa Chineke nwụọ. Job chọkwara ka ọnwụ bịa gburu ya, ma ọ kwụsịghị ịna-erubere Chineke isi. Setan sizi n’ụzọ ọzọ nwaa Job. O ji ndị enyi ya atọ nwaa ya. Ha bịara ka ha kasie ya obi. Ha nọrọ n’ụlọ ya ruo ụbọchị ụfọdụ, ma ha akasilighị ya obi. Kama ịkasi ya obi, ha ji okwu ọjọọ saa ya ahụ́. Ha kwuru na ọ bụ Chineke kpatara nsogbu ya, nakwa na o nweghị ihe o ji isi Job na-erubere ya kpọrọ. Ha kwudịrị na Job bụ onye ọjọọ, nakwa na ihe ndị ahụ mere ya kwesịịrị ya.​—Job 1:​13-22; 2:​7-11; 15:​4, 5; 22:​3-6; 25:​4-6.

9. Olee ihe Job na-akwụsịghị ime n’agbanyeghị ọnwụnwa ndị bịaara ya?

9 Gịnị ka Job mere ná nsogbu niile ahụ bịaara ya? Job ezughị okè. O ji iwe gwa ndị enyi ụgha ya ahụ bịara ịkasi ya obi okwu, o kwukwara okwu o mechara kweta na ya echeghị echiche kwuo. Ọ kpọrọ onwe ya onye ezi omume kama ịkpọ Chineke onye ezi omume. (Job 6:3; 13:​4, 5; 32:2; 34:5) Job nọgidere na-erubere Jehova Chineke isi ma mgbe ọ nọ n’ọnọdụ dị oké njọ. O kwetaghị ụgha ndị ahụ ndị enyi ọjọọ ya ghara. O kwuru, sị: “Tụfịakwa! Agaghị m akpọ unu ndị ezi omume! Ruo mgbe m kubiri ume, m gaghị akwụsị iguzosi ike n’ezi ihe!” (Job 27:5) Ihe a Job kwuru gosiri na o kpebisiri ike ịnọgide na-erubere Chineke isi n’agbanyeghị ọnwụnwa ọ bụla ga-abịara ya. Ọ kwụsịghị ife Chineke, anyị nwekwara ike ime ka ya.

10. Olee otú ebubo ahụ Setan boro Job si gbasa gị?

10 Olee otú ebubo ahụ Setan boro Job si gbasa gị? Ihe Setan na-ekwu bụ na i jighị obi gị niile hụ Jehova Chineke n’anya, nakwa na ị ga-akwụsị ịna-efe ya ka i ghara ịnwụ. Ihe ọzọ bụ na ị gaghị anọgide na-ekwesị ntụkwasị obi. (Job 2:​4, 5; Mkpu. 12:10) Olee otú obi dị gị maka ihe a Setan kwuru? Ọ̀ kwa o wutere gị? Ma, chegodị ihe a: Jehova tụkwasịrị gị obi ma nye gị ohere magburu onwe ya iji rubere ya isi. Jehova na-enye Setan ohere ka ọ nwaa gị iji gosi ma ị̀ ga na-ekwesị ntụkwasị obi. Obi siri Jehova ike na ị ga-ekwesịli ntụkwasị obi ma gosi na Setan bụ onye ụgha. Jehova kwekwara nkwa na ya ga-enyere gị aka. (Hib. 13:6) Obi kwesịrị ịtọ gị ụtọ na Ọkaakaa eluigwe na ụwa tụkwasịrị gị obi. Ị̀ hụlanụ ihe mere i ji kwesị ịna-ekwesị ntụkwasị obi? Ọ na-eme ka anyị gosi na Setan bụ ezigbo onye ụgha, na-emekwa ka anyị wepụ aha Nna anyị n’ụta ma kwado ọchịchị ya. Olee ihe anyị ga-eme ka anyị nọgide na-ekwesị ntụkwasị obi?

OTÚ ANYỊ GA-ESI NA-EKWESỊ NTỤKWASỊ OBI UGBU A

11. Olee ihe anyị ga-amụta n’aka Job?

11 Setan na-alụso ndị na-efe Chineke ọgụ kpụ ọkụ n’ọnụ ‘n’oge ikpeazụ a.’ (2 Tim. 3:1) Olee ihe anyị ga-eme ka anyị nọgide na-ekwesị ntụkwasị obi ma Setan lụso anyị ọgụ? Anyị nwekwara ike ịmụta ọtụtụ ihe n’aka Job. Ogologo oge tupu Setan anwaa ya, o ruberela Chineke isi ọtụtụ ugboro. Ka anyị tụlee ihe atọ anyị nwere ike ịmụta n’aka Job banyere ihe anyị ga-eme ka anyị nọgide na-ekwesị ntụkwasị obi.

Olee ihe ụfọdụ anyị ga-eme ka anyị nọgide na-ekwesị ntụkwasị obi? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12) *

12. (a) Dị ka Job 26:​7, 8, 14 kwuru, olee ihe Job mere nke nyeere ya aka ịna-asọpụru Jehova? (b) Olee otú anyị nwere ike isi na-eme ka Job?

12 Ihe Jehova kere juru Job anya, ya emee ka ọ hụkwuo ya n’anya. Job wepụtara oge chebara ihe ndị dị ebube Chineke kere echiche. (Gụọ Job 26:​7, 8, 14.) O riri ya ọnụ mgbe o chebaara ihe ndị dị ka ụwa, ígwé, ígwé ojii, na égbè eluigwe echiche. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ ghọtara na ọ bụ naanị ihe ole na ole ka ọ ma n’ihe niile Chineke kere. O jikwa ihe Chineke kwuru kpọrọ ihe. O kwuru banyere ihe ndị ahụ, sị: “Echekwawo m okwu si ya n’ọnụ karịa ihe a chọrọ m n’aka.” (Job 23:12) Ihe banyere Jehova juru Job anya, ya emee ka ọ kwanyere ya ùgwù nke ukwuu. Ọ hụrụ Nna ya n’anya ma chọọ ime ihe dị ya mma. Ọ bụ ya mere Job ji kpebisikwuo ike ịna-ekwesị ntụkwasị obi. Anyị kwesịrị ime ka Job. Anyị ma ọtụtụ ihe ndị dị ebube Chineke kere karịa ndị oge Job. Anyị nwere Baịbụl nke ga-enyere anyị aka ịmata onye Jehova bụ. Ihe niile anyị mụtara ga-enyere anyị aka ịna-asọpụrụ Jehova. Otú anyị si na-asọpụrụ ya ga-eme ka anyị hụ ya n’anya ma na-erubere ya isi. Ọ ga-emekwa ka anyị chọkwuo ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi.​—Job 28:28.

Otú anyị ga-esi na-ekwesị ntụkwasị obi bụ ịgbara ile ndị gba ọtọ ọsọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13) *

13-14. (a) Dị ka Job 31:1 si kwuo, olee otú Job si gosi na ya na-erubere Chineke isi? (b) Olee otú anyị ga-esi eme ka Job?

13 Otú Job si rubere Chineke isi n’ihe niile nyeere ya aka ịna-ekwesị ntụkwasị obi. Job ma na ihe ga-eme ka ya na-ekwesị ntụkwasị obi bụ ịna-erubere Jehova isi. Nke bụ́ eziokwu bụ na mgbe ọ bụla anyị rubeere Jehova isi, anyị na-eme ka mkpebi anyị mere ịna-ekwesị ntụkwasị obi sikwuo ike. Job gbara mbọ rubere Chineke isi n’ihe niile ọ na-eme ná ndụ. Dị ka ihe atụ, ọ kpachapụrụ anya n’otú o si kpaso ụmụ nwaanyị àgwà. (Gụọ Job 31:1.) Ebe o nwere nwunye, ọ ma na inwe mmasị n’ebe nwaanyị ọzọ nọ adịghị mma. Taa, ụwa anyị bi na ya na-eji ihe dị iche iche anwa anyị ka anyị chọwa inwe mmekọahụ. Dị ka Job, ànyị ga-ajụ inwewe mmasị n’ebe nwunye onye ọzọ nọ? Ànyị ga-ajụkwa ile foto ndị gba ọtọ ebe ọ bụla anyị hụrụ ha? (Mat. 5:28) Ọ bụrụ na anyị agbaa mbọ na-ejide onwe anyị kwa ụbọchị, ọ ga-emekwu ka anyị na-ekwesị ntụkwasị obi.

Otú anyị ga-esi na-ekwesị ntụkwasị obi bụ ile ihe onwunwe anya otú kwesịrị ekwesị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14) *

14 Otú Job si lee ihe onwunwe anya mekwara ka o rubere Chineke isi. Ọ ghọtara na ọ bụrụ na ya atụkwasị ihe onwunwe obi, na ya ga-eme ihe jọgburu onwe ya e kwesịrị iji maka ya taa ya ahụhụ. (Job 31:​24, 25, 28) Taa, anyị bi n’ụwa ebe ihe onwunwe na-agba ndị mmadụ ara. Ọ bụrụ na anyị emee ihe Baịbụl kwuru gbasara ego na ihe onwunwe, ọ ga-eme ka anyị kpebisikwuo ike ịna-ekwesị ntụkwasị obi.​—Ilu 30:​8, 9; Mat. 6:​19-21.

Otú anyị ga-esi na-ekwesị ntụkwasị obi bụ ịna-echebara olileanya anyị nwere echiche (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15) *

15. (a) Olee olileanya Job nwere n’ebe Jehova nọ nke nyeere ya aka ikwesị ntụkwasị obi? (b) Olee otú iburu ụdị olileanya ahụ n’obi ga-esi enyekwara anyị aka?

15 Ihe nyeere Job aka ikwesị ntụkwasị obi bụ na o nwere olileanya na Chineke ga-agọzi ya. Ọ ma na Chineke ejighị isi ọ na-erubere ya egwu egwu. (Job 31:6) N’agbanyeghị ọnwụnwa ndị bịaara ya, obi siri ya ike na Jehova ga-emecha gọzie ya. Ihe a nyeere ya aka ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi. Obi tọrọ Jehova ezigbo ụtọ maka ikwesị ntụkwasị obi ya nke na ọ gọziri ya nke ukwuu n’agbanyeghị na o zughị okè. (Job 42:​12-17; Jems 5:11) Chineke ka ga-agọzikwu ya n’ọdịnihu. Obi ò siri gị ike na Jehova ga-agọzi gi maka na ị na-ekwesị ntụkwasị obi? Chineke anyị agbanwebeghị. (Mal. 3:6) Ọ bụrụ na anyị echeta na Chineke ejighị isi anyị na-erubere ya egwu egwu, ọ ga-eme ka obi anyị dịgide n’olileanya magburu onwe ya anyị nwere maka ọdịnihu.​—1 Tesa. 5:​8, 9.

16. Olee ihe anyị kpebisiri ike ime?

16 Kpebisie ike na ị gaghị akwụsị ịna-ekwesị ntụkwasị obi. Mgbe ụfọdụ, i nwere ike na-eche na ọ bụ naanị gị na-ekwesị ntụkwasị obi n’ebe i bi. Ma, e nweghị mgbe ọ ga-abụ naanị gị. Ị ga-esonye n’ọtụtụ nde mmadụ na-ekwesị ntụkwasị obi n’ụwa niile. Ị ga-esonyekwa n’ọtụtụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị fere Chineke n’oge ochie, bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi ma mgbe ha nọ n’ọnụ ọnwụ. (Hib. 11:​36-38; 12:1) Ka anyị niile kpebisie ike ịna-ekwesị ntụkwasị obi otú ahụ Job mere, bụ́ onye sịrị: “M gaghị akwụsị iguzosi ike n’ezi ihe.” Ka otú anyị si ekwesị ntụkwasị obi n’ebe Chineke nọ mee ka a na-eto ya ruo mgbe ebighị ebi.

ABỤ 124 Hụ Jehova na Ụmụnna Anyị n’Anya

^ para. 5 Gịnị bụ iguzosi ike n’ezi ihe? Gịnị mere Jehova ji chọsie ike ka ndị na-efe ya na-ekwesị ntụkwasị obi? Gịnị mere ikwesị ntụkwasị obi ji dị anyị niile mkpa? Isiokwu a ga-enyere anyị aka ịmata ihe Baịbụl zara n’ajụjụ ndị a. Ọ ga-enyekwara anyị aka ịmatakwu otú anyị ga-esi na-ekwesị ntụkwasị obi kwa ụbọchị. Ime otú ahụ ga-eme ka Jehova gọzie anyị nke ukwuu.

^ para. 3 N’isiokwu a, anyị ga-eji ikwesị ntụkwasị obi dochie anya iguzosi ike n’ezi ihe.

^ para. 3 Okwu Hibru a sụgharịrị “enweghị nkwarụ” a na-ekwu ma e kwuwe gbasara anụmanụ, yiri “iguzosi ike n’ezi ihe” ma ọ bụ ikwesị ntụkwasị obi a na-ekwu ma e kwuwe gbasara mmadụ.

^ para. 51 NKỌWA FOTO: Ebe Job na-akụziri ụfọdụ ụmụ ya ihe ndị dị ebube Jehova kere. Job akatabeghị ahụ́ mgbe ahụ.

^ para. 53 NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna jụrụ iso ndị ọrụ ibe ya na-ele ndị gba ọtọ.

^ para. 55 NKỌWA FOTO: Ebe ọ jụrụ ịzụ nnukwu tiivi dị oké ọnụ. Tiivi a adịghị ya mkpa, o jighịkwa ego ịzụ ya.

^ para. 57 NKỌWA FOTO: Ebe o wepụtara oge na-ekpe ekpere ma na-echebara olileanya o nwere maka Paradaịs a ga-enwe n’ọdịnihu echiche.