Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ 9

Otú Iwu Mozis Si Gosi na Jehova Nwere Ịhụnanya ma Na-ekpe Ikpe Ziri Ezi

Otú Iwu Mozis Si Gosi na Jehova Nwere Ịhụnanya ma Na-ekpe Ikpe Ziri Ezi

“Ọ hụrụ ezi omume na ikpe ziri ezi n’anya. Ụwa jupụtara n’obiọma Jehova.”​—ỌMA 33:5.

ABỤ 3 Ị Bụ Ike Anyị, Olileanya Anyị, na Obi Ike Anyị

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1-2. (a) Olee ihe anyị niile chọrọ? (b) Olee ihe obi kwesịrị isi anyị ike na ya?

ANYỊ niile chọrọ ka a hụ anyị n’anya, chọọkwa ka a na-emeso anyị ihe otú kwesịrị ekwesị. Ọ bụrụ na a na-emegbukarị anyị ma ọ bụ ghara ịhụ anyị n’anya, o nwere ike ịdị anyị ka anyị abaghị uru.

2 Jehova ma na anyị chọrọ ka a na-ahụ anyị n’anya ma ghara ịna-emegbu anyị. (Ọma 33:5) Obi kwesịrị isi anyị ike na Chineke anyị hụrụ anyị n’anya nke ukwuu ma chọọ ka a ghara ịna-emegbu anyị. Anyị tụlee Iwu Jehova si n’aka Mozis nye ụmụ Izrel, anyị ga-achọpụta na nke a bụ eziokwu. Ọ bụrụ na obi na-agbawa gị n’ihi na ndị ọzọ ahụghị gị n’anya ma ọ bụ na ha na-emegbu gị, biko tụlee otú Iwu Mozis * si gosi na Jehova hụrụ ndị ya n’anya.

3. (a) Gịnị ka Ndị Rom 13:​8-10 kwuru anyị ga-amụta ma anyị na-amụ Iwu Mozis? (b) Olee ajụjụ ndị a ga-atụle n’isiokwu a?

3 Ọ bụrụ na anyị amụọ gbasara Iwu Mozis, anyị ga-achọpụta otú obi na-adị Nna anyị hụrụ anyị n’anya, bụ́ Jehova. (Gụọ Ndị Rom 13:​8-10.) N’isiokwu a, anyị ga-atụle ụfọdụ iwu ndị ahụ Jehova nyere ndị Izrel ma zaa ajụjụ ndị a: Gịnị mere anyị nwere ike iji ekwu na ihe mere e ji nye Iwu ahụ bụ ịhụnanya? Gịnị mere anyị nwere ike iji kwuo na Iwu ahụ gbara ndị mmadụ ume ka ha ghara imegbu ibe ha? Olee otú ndị isi kwesịrị isi eji Iwu ahụ emeso ndị ọzọ ihe? Ole ndị ka Iwu ahụ na-echebe karịchaa? Azịza ajụjụ ndị a ga-akasi anyị obi, mee ka anyị nwee olileanya, meekwa ka anyị bịarukwuo Nna anyị hụrụ anyị n’anya nso.​—Ọrụ 17:27; Rom 15:4.

IWU AHỤ DABEERE N’ỊHỤNANYA

4. (a) Gịnị mere anyị nwere ike iji kwuo na ihe mere Jehova ji nye ndị Izrel iwu ndị ahụ bụ na ọ hụrụ ha n’anya? (b) Olee iwu abụọ Jizọs kwuru na Matiu 22:​36-40 na ọ bụ ha kacha mkpa?

4 Anyị nwere ike ikwu na ihe mere Jehova ji nye ndị Izrel iwu ndị ahụ bụ na ọ hụrụ ha n’anya, n’ihi na ọ bụ ịhụnanya mere o ji eme ihe niile ọ na-eme. (1 Jọn 4:8) E nwere iwu abụọ dị mkpa Iwu ahụ niile dabeere na ha. Ha bụ ịhụ Chineke n’anya na ịhụ onye agbata obi anyị n’anya. (Lev. 19:18; Diut. 6:5; gụọ Matiu 22:​36-40.) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịtụ anya na nke ọ bụla n’ime narị iwu isii ahụ ma ọ bụ karịa e nyere ndị Izrel nwere ihe ọ na-akụziri anyị banyere otú Jehova si hụ anyị n’anya. Ka anyị tụlee ụfọdụ ihe atụ.

5-6. Olee ihe Jehova chọrọ ka di na nwunye na-eme, oleekwa ihe ọ ma? Nye ihe atụ.

5 Ahapụla di gị ma ọ bụ nwunye gị, na-elekọtakwa ụmụ gị nke ọma. Jehova chọrọ ka di na nwunye na-ahụ ibe ha n’anya nke ukwuu nke na ha ga na-eme otú ahụ ruo ọnwụ. (Jen. 2:24; Mat. 19:​3-6) Di ma ọ bụ nwunye ịkwa iko bụ otu n’ime ihe kacha njọ mmadụ ga-eme nke gosiri na ọ hụghị di ma ọ bụ nwunye ya n’anya. Ọ bụ ya mere iwu nke asaa n’ime Iwu Iri ahụ ji kwuo ka a ghara ịkwa iko. (Diut. 5:18) Ọ bụ mmadụ ‘imehie Chineke’ na ime di ya ma ọ bụ nwunye ya ihe na-agbawa obi. (Jen. 39:​7-9) Onye di ya ma ọ bụ nwunye ya kwara iko anaghị echefu ya echefu ruo ọtụtụ afọ.

6 Jehova ma otú di ma ọ bụ nwunye si na-emeso ibe ha ihe. Ọ chọrọ ka a na-emeso ndị nwunye ihe nke ọma. Di nke na-eme ihe iwu ahụ kwuru ga-ahụ nwunye ya n’anya, ọ gaghịkwa agba ya alụkwaghịm n’ihi ihe ndị na-enweghị isi na ọdụ. (Diut. 24:​1-4; Mat. 19:​3, 8) Ma ọ bụrụ na ha enwee ezigbo nsogbu, ya agbaa ya alụkwaghịm, ọ ga-enye ya akwụkwọ ịgba alụkwaghịm. Akwụkwọ ịgba alụkwaghịm a ga-eme ka a ghara ịna-ebo nwaanyị ahụ ebubo na ọ kwara iko. Ihe ọzọ bụ na tupu di enye nwunye ya akwụkwọ ịgba alụkwaghịm, ọ ga-abụ na ọ ga-agakwuru ndị okenye obodo ya. Nke a ga-eme ka ndị okenye ahụ nyere di na nwunye ahụ aka ka ha ghara ịgba alụkwaghịm. Ọ bụrụ na onye Izrel agbaa nwunye ya alụkwaghịm n’ihi ihe na-enweghị isi na ọdụ, ya abụrụ na e nweghị ihe ndị okenye mere banyere ya, ọ pụtara na ha emeghị ihe Jehova gwara ha mee n’ihi na ha na-anọchi anya ya. Ma ọ na-ahụ ákwá nwaanyị ahụ na-ebe na ahụhụ ọ na-ata, ọ na-emetụkwa ya n’obi.​—Mal. 2:​13-16.

Nwaanyị Izrel na ụmụ ya ndị nwaanyị na-akpa nkata mgbe ha na-esi nri, nna ha ana-akụziri nwa ya nwoke otú e si azụ atụrụ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7 na nke 8) *

7-8. (a) Gịnị ka Jehova gwara ndị nne na nna ka ha na-eme? (Lee ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.) (b) Olee ihe ndị anyị na-amụta na ya?

7 Iwu ahụ gosikwara na Jehova chọrọ ka ụmụaka na-enwe obi ụtọ, chọọkwa ka e chebe ha. Jehova gwara ndị nne na nna ka ha na-egboro ụmụ ha mkpa ha, nakwa ka ha nyere ha aka ka ha na Chineke dịrị ná mma. Ọ chọrọ ka ndị nne na nna nyere ụmụ ha aka ka ha ghọta Iwu Jehova ma jiri ya kpọrọ ihe, chọọkwa ka ha nyere ha aka ịhụ ya n’anya. (Diut. 6:​6-9; 7:13) Otu n’ime ihe mere Jehova ji taa ụmụ Izrel ahụhụ bụ na ha menyụrụ ụfọdụ ụmụ ha anya otú na-awụ akpata oyi n’ahụ́. (Jere. 7:​31, 33) Ndị nne na nna ekwesịghị iwere ụmụ ha ka ndị ha ga na-emeso ihe otú masịrị ha. Kama, ha kwesịrị iwere ha ka onyinye si n’aka Jehova ha kwesịrị iji kpọrọ ihe.​—Ọma 127:3.

8 Ihe ndị anyị na-amụta: Jehova na-ahụ otú di na nwunye si emeso ibe ha ihe. Ọ chọrọ ka ndị nne na nna hụ ụmụ ha n’anya. Ha ga-azakwa Jehova ajụjụ maka otú ha si na-emeso ha ihe.

9-11. Gịnị mere Jehova ji nye iwu ka ndị Izrel ghara inwe anyaukwu?

9 Enwela anyaukwu. Iwu ikpeazụ n’ime Iwu Iri ahụ kwuru ka mmadụ ghara ịna-enwe anyaukwu ma ọ bụ ihe onye ọzọ nwere ịna-agụ ya agụụ. (Diut. 5:21; Rom 7:7) Jehova nyere iwu a iji kụzie ihe dị ezigbo mkpa, ya bụ na ndị ya kwesịrị ichebe obi ha. Ọ ma na tupu mmadụ emee ihe ọjọọ, ọ na-ebu ụzọ eche ya n’obi ya. (Ilu 4:23) Ọ bụrụ na onye Izrel ekwe ka ihe ọjọọ dịgide n’obi ya, o nwere ike ime ndị ọzọ ihe ọjọọ. Ụdị ihe a mere Eze Devid. Ọ bụ ezigbo mmadụ. Ma otu ụbọchị, nwunye onye ọzọ gụrụ ya agụụ. Ihe a mere ka o mee mmehie. (Jems 1:​14, 15) Devid kwara iko, gbalịa imegharị di nwaanyị ahụ anya ma mechaa gbuo ya.​—2 Sam. 11:​2-4; 12:​7-11.

10 Jehova na-ama mgbe onye Izrel nwewere anyaukwu. Ọ na-enyocha obi. (1 Ihe 28:9) O ji iwu ahụ o nyere ndị Izrel ka ha ghara inwe anyaukwu kụziere ha ka ha zere echiche ọjọọ nwere ike ime ka ha mee ihe ọjọọ. Nke a gosiri na Nna anyị bụ́ Jehova hụrụ anyị n’anya ma mara ihe.

11 Ihe ndị anyị na-amụta: Ihe Jehova na-ahụ abụghị naanị otú mmadụ dị n’elu ahụ́. Ọ na-ahụ ihe dị anyị n’obi. (1 Sam. 16:7) E nweghị ihe anyị na-eche n’echiche, otú obi dị anyị ma ọ bụ ihe anyị na-eme ọ na-amaghị. Ọ na-ahụ ihe ọma ndị dị n’obi anyị, chọọkwa ka anyị na-eme ha. Ma, ọ chọrọ ka anyị chọpụta mgbe ihe ọjọọ batara anyị n’obi ma wepụ ya tupu ya emee ka anyị mee ihe ọjọọ.​—2 Ihe 16:9; Mat. 5:​27-30.

IWU AHỤ MERE KA A NA-EKPE IKPE ZIRI EZI

12. Olee ihe Iwu Mozis na-akụziri anyị?

12 Iwu Mozis na-akụziri anyị na Jehova hụrụ ikpe ziri ezi n’anya. (Ọma 37:28; Aịza. 61:8) Jehova bụ onye kachanụ anyị kwesịrị iṅomi ma a bịa n’imeso mmadụ ihe otú kwesịrị ekwesị. Mgbe ndị Izrel rubere isi n’iwu ya, ọ gọziri ha. Mgbe ha dara iwu ya, ha tara ahụhụ. Ka anyị tụlee iwu abụọ ọzọ n’ime Iwu Iri ahụ Jehova nyere ndị Izrel.

13-14. Gịnị ka iwu abụọ mbụ n’ime Iwu Iri ahụ kwuru? Olee otú irube isi n’iwu ahụ si baara ndị Izrel uru?

13 Na-efe naanị Jehova. Iwu abụọ mbụ n’ime Iwu Iri ahụ kwuru ka ndị Izrel na-efe naanị Jehova, kwuokwa ka ha ghara ikpere arụsị. (Ọpụ. 20:​3-6) Ọ bụghị Jehova ka iwu ndị ahụ baara uru. Kama, ọ bụ ndị ya ka ha baara uru. Mgbe ndị ya rubeere ya isi, ihe gaziiri ha. Ma mgbe ha fere chi ndị mba ọzọ, ha tara ahụhụ.

14 Chegodị banyere ndị Kenan. Ha fere arụsị na-adịghị ndụ kama ife ezi Chineke dị ndụ. Nke a bụ ime onwe ha iberiibe. (Ọma 115:​4-8) Inwe mmekọahụ rụrụ arụ na ịchụ ụmụ ha n’àjà so n’otú ha si efe chi ha. N’ihi ya, mgbe ndị Izrel hapụrụ Jehova ma fee arụsị, ha mekwara onwe ha ndị iberiibe ma mee ka obi gbawaa ndị ezinụlọ ha. (2 Ihe 28:​1-4) Ndị ọnụ na-eru n’okwu anaghị ekpe ikpe ziri ezi otú ahụ iwu Jehova kwuru. Ha na-eji ikike ha na-emegbu ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha. (Ezik. 34:​1-4) Jehova gwara ndị Izrel na ọ ga-ekpe ndị na-emegbu ụmụ nwaanyị na ụmụaka na-enweghị ka ọ hà ha ikpe. (Diut. 10:​17, 18; 27:19) Ma, Jehova gọziri ndị ya mgbe ha rubeere ya isi ma na-emeso ibe ha ihe otú dị mma.​—1 Eze 10:​4-9.

Jehova hụrụ anyị n’anya, marakwa mgbe a na-emegbu anyị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15)

15. Olee ihe ndị anyị na-amụta banyere Jehova?

15 Ihe ndị anyị na-amụta: E kwesịghị ịta Jehova ụta ma ndị na-ekwu na ha na-efe ya mebie iwu ya ma na-emegbu ndị ya. Ma, Jehova hụrụ anyị n’anya, marakwa mgbe a na-emegbu anyị. Ahụhụ anyị na-ata na-emetụ ya n’ahụ́ karịa otú ahụhụ nwatakịrị na-ata si emetụ nne ya n’ahụ́. (Aịza. 49:15) Ọ bụ eziokwu na Jehova nwere ike ghara ime ihe ozugbo, mgbe oge ya zuru, ọ ga-ekpe ndị mere mmehie na-achọghị ichegharị ikpe n’ihi otú ha si meso ndị ọzọ ihe.

OLEE OTÚ E KWESỊRỊ ISI EJI IWU AHỤ EKPE IKPE?

16-18. Olee ihe ndị a na-eji Iwu Mozis eme, oleekwa ihe ndị anyị na-amụta na ya?

16 Iwu Mozis kwuru gbasara ọtụtụ ihe ndị Izrel na-eme. N’ihi ya, ọ dị mkpa ka ndị okenye Izrel na-ekpe ndị Jehova ikpe ziri ezi. Ha ga-ekpe ikpe ndị gbasara ofufe Jehova, kpeekwa ikpe ndị gbasara esemokwu na ime mpụ. Ka anyị tụlee ihe atụ ndị na-esonụ.

17 Ọ bụrụ na onye Izrel egbuo mmadụ, a gaghị egbu ya ozugbo. Ndị okenye obodo ya ga-achọpụta ihe merenụ tupu ha ekpebie ma à ga-egbu ya. (Diut. 19:​2-7, 11-13) Ndị okenye ga-ekpekwa ikpe ndị gbasara ọtụtụ ihe ndị Izrel na-eme kwa ụbọchị, ya bụ, ma idozi esemokwu ndị a na-enwe n’ihi ihe onwunwe ma nke di na nwunye. (Ọpụ. 21:35; Diut. 22:​13-19) Mgbe ndị okenye kpere ikpe ziri ezi, ndị Izrel emeekwa ihe Iwu kwuru, ọ na-abara mmadụ niile uru, meekwa ka a na-eto Jehova.​—Lev. 20:​7, 8; Aịza. 48:​17, 18.

18 Ihe ndị anyị na-amụta: Ihe niile anyị na-eme ná ndụ dị Jehova mkpa. Ọ chọrọ ka anyị na-emeso ndị ọzọ ihe otú kwesịrị ekwesị iji gosi na anyị hụrụ ha n’anya. Ọ na-ahụ ihe ndị anyị na-eme, na-anụkwa ihe ndị anyị na-ekwu ma mgbe naanị anyị nọ.​—Hib. 4:13.

19-21. (a) Olee otú ndị okenye na ndị ikpe kwesịrị isi emeso ndị Chineke ihe? (b) Olee ihe Jehova mere iji chebe ndị ya, oleekwa ihe ndị anyị na-amụta na ya?

19 Jehova chọrọ ichebe ndị ya ka ha ghara ịmụta àgwà ọjọọ n’aka mba ndị gbara ha gburugburu. N’ihi ya, ọ chọrọ ka ndị okenye na ndị ikpe jiri Iwu ahụ na-ekpe ikpe n’eleghị mmadụ anya n’ihu. Ma, ndị ikpe ekwesịghị imegbu ndị ya ma ha kpewe ikpe. Kama, ha kwesịrị ịna-ekpe ikpe ziri ezi.​—Diut. 1:​13-17; 16:​18-20.

20 Jehova na-enwere ndị ya ọmịiko. Ọ bụ ya mere o ji nye ndị ya iwu ga-eme ka a ghara imegbu ndị mmadụ. Dị ka ihe atụ, Iwu ahụ mere ka mmadụ ghara ịna-ebokarị mmadụ ibe ya ebubo ụgha. Onye e boro ebubo nwere ike ikwu ka a gwa ya onye boro ya ebubo. (Diut. 19:​16-19; 25:1) Ma tupu a maa ya ikpe, a ga-enwe, ọ dịkarịa ala, ndị akaebe abụọ. (Diut. 17:6; 19:15) Gịnịkwanụ gbasara onye Izrel mere mpụ, ya abụrụ na ọ bụ naanị otu onye hụrụ ya? O kwesịghị iche na ọ gaghị ata ahụhụ ihe ọjọọ ahụ o mere. Jehova hụrụ ya. N’ezinụlọ, e nyere ndị nna ikike ime ihe ụfọdụ. A bịa n’ụfọdụ nsogbu ndị a na-enwe n’ezinụlọ, e nyere ndị okenye obodo ikike ileba ya anya ma kpebie ihe a ga-eme.​—Diut. 21:​18-21.

21 Ihe ndị anyị na-amụta: Jehova bụ onye kachanụ anyị kwesịrị iṅomi ma a bịa n’ikpe ikpe ziri ezi. Ọ naghị eme ihe na-ezighị ezi. (Ọma 9:7) Ọ na-agọzi ndị na-erubere ya isi ma na-ata ndị na-emegbu ndị ọzọ ahụhụ. (2 Sam. 22:​21-23; Ezik. 9:​9, 10) Ụfọdụ nwere ike mee ihe ọjọọ, ya eyie ka hà alaferela, ma Jehova ga-ekpe ha ikpe n’oge o kpebiri. (Ilu 28:13) Ọ bụrụ na ha echegharịghị, ha ga-amata n’oge na-adịghị anya na “ọ bụ ihe dị egwu ịdaba n’aka Chineke dị ndụ.”​—Hib. 10:​30, 31.

OLE NDỊ KA IWU AHỤ NA-ECHEBE KARỊCHAA?

Mgbe ndị okenye na-edozi esemokwu, ha kwesịrị iṅomi Jehova n’otú o si hụ ndị mmadụ n’anya ma na-ekpe ikpe ziri ezi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 22) *

22-24. (a) Ole ndị ka Iwu ahụ chebere karịchaa, gịnịkwa ka anyị na-amụta banyere Jehova? (b) Olee ihe a dọrọ anyị aka ná ntị banyere ya n’Ọpụpụ 22:​22-24?

22 Ndị Iwu ahụ na-echebe karịchaa bụ ndị na-enweghị ike ichebe onwe ha, dị ka ụmụ na-enweghị nne na nna, ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ, na ndị mbịarambịa. A gwara ndị ikpe Izrel, sị: “Agbagọla ikpe nke onye mbịarambịa ma ọ bụ nke nwa na-enweghị nna, achịrịla uwe nwaanyị di ya nwụrụ dị ka ihe ibé.” (Diut. 24:17) Ihe gbasara ndị na-enweghị ka ọ hà ha n’obodo metụrụ Jehova n’obi. Ọ takwara ndị megburu ha ahụhụ.​—Gụọ Ọpụpụ 22:​22-24.

23 Iwu ahụ gbochiri mmadụ na onye ezinụlọ ya ma ọ bụ onye ikwu ya inwe mmekọahụ. (Lev. 18:​6-30) Ndị Izrel kwesịrị ile àgwà a anya ka ihe rụrụ arụ otú ahụ Jehova si ele ya. Ha ekwesịghị ịdị ka mba ndị gbara ha gburugburu, bụ́ ndị na-ahapụ ndị mmadụ ka ha na-akpa àgwà ọjọọ a ma ọ bụ na-akwado ndị na-akpa ya.

24 Ihe ndị anyị na-amụta: Jehova chọrọ ka ndị o nyere ọrụ ilekọta ndị ya na-ahụ ndị ha na-elekọta n’anya. Ọ kpọrọ idina nwaanyị n’ike, mmadụ na onye ikwu ya inwe mmekọahụ, na idina ụmụaka asị. Ọ chọkwara ka e chebe mmadụ niile, nke ka nke, ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha. Onye kpakwara àgwà ọjọọ ndị a na-aza Jehova ajụjụ.

IWU AHỤ BỤ “ONYINYO NKE IHE ỌMA NDỊ GAJE ỊBỊA”

25-26. (a) Gịnị mere anyị nwere ike iji kwuo na ma ịhụnanya adịghị, ikpe ziri ezi agaghị adị? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu nke abụọ n’ime isiokwu anọ ndị ahụ?

25 Ọ bụrụ na ịhụnanya adịghị, ikpe ziri ezi agaghị adị. Ọ bụrụkwa na ikpe ziri ezi adịghị, ịhụnanya agaghị adị. O doo anyị anya na Jehova na-emeso anyị ihe otú dị mma, anyị ga-ahụkwu ya n’anya. Anyị hụ Chineke n’anya ma jiri iwu ya kpọrọ ihe, ọ ga-eme ka anyị hụ ndị ọzọ n’anya, na-emesokwa ha ihe otú dị mma.

26 Iwu Mozis nyeere ndị Izrel aka ka ha na Jehova dịrịkwuo ná mma. Ma, ndị Chineke anaghịzi edebe Iwu Mozis mgbe Jizọs bịara mezuo ya, e jirikwa ihe ọzọ ka mma dochie ya. (Rom 10:4) Pọl onyeozi kwuru na Iwu ahụ bụ “onyinyo nke ihe ọma ndị gaje ịbịa.” (Hib. 10:1) Isiokwu nke abụọ n’ime isiokwu anọ ndị ahụ ga-akọwa ụfọdụ ihe ọma ndị ahụ nakwa ihe mere ịhụnanya na ikpe ziri ezi ji dị mkpa n’ọgbakọ Ndị Kraịst.

ABỤ 109 Jirinụ Obi Unu Niile Hụ Ibe Unu n’Anya

^ para. 5 Isiokwu a bụ nke mbụ n’ime isiokwu anọ a ga-atụle ihe mere obi ji kwesị isi anyị ike na Jehova hụrụ anyị n’anya. Isiokwu atọ ndị ọzọ ga-agba n’Ụlọ Nche Mee afọ 2019. Ha ga-akọwa otú Jehova si egosi na ọ hụrụ anyị n’anya ma na-ekpe ikpe ziri ezi n’ọgbakọ, otú ndị okenye ga-esi echebe ọgbakọ na otú ndị nne na nna ga-esi echebe ụmụ ha ka a ghara idina ha n’ike, na otú anyị nwere ike isi kasie ndị e dinara n’ike mgbe ha bụ ụmụaka obi.

^ para. 2 NKỌWAKWU: Ihe a na-akpọ narị iwu isii ma ọ bụ karịa Jehova si n’aka Mozis nye ndị Izrel bụ “Iwu ahụ,” “Iwu Mozis,” nakwa “ihe e nyere n’iwu.” Ihe ọzọ bụ na a na-akpọkarị akwụkwọ ise mbụ dị na Baịbụl, ya bụ, Jenesis ruo Diuterọnọmi, Iwu ahụ. Mgbe ụfọdụ, a na-akpọkwa Akwụkwọ Nsọ Hibru niile, Iwu ahụ.

^ para. 60 FOTO DỊ N’IHU ỤLỌ NCHE A: Jehova chọrọ ka ndị nne na nna hụ ụmụ ha n’anya, na-akụziri ha ihe, na-echebe ha ma na-eme ka obi na-eru ha ala

NKỌWA FOTO: Ebe nwaanyị Izrel na ụmụ ya ndị nwaanyị ji obi ụtọ na-akpa nkata mgbe ha na-esi nri, nna ha ana-akụziri nwa ya nwoke otú e si azụ atụrụ.

^ para. 64 NKỌWA FOTO: Ebe ndị okenye nọ n’ọnụ ụzọ ámá na-enyere otu nwaanyị di ya nwụrụ na nwa ya aka, bụ́ ndị onye ahịa megburu.