Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ 12

Na-egosi na Ihe Gbasara Ndị Ọzọ Na-emetụ Gị n’Obi

Na-egosi na Ihe Gbasara Ndị Ọzọ Na-emetụ Gị n’Obi

“Ka ihe banyere onye ọzọ na-emetụ unu n’obi.”—1 PITA 3:8.

ABỤ 90 Ka Anyị Na-agbarịta Ibe Anyị Ume

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Gịnị ka 1 Pita 3:8 kwuru mere obi ji atọ anyị ụtọ ma anyị na ndị ihe banyere anyị na-emetụ n’obi nọrọ?

OBI na-atọ anyị ụtọ ma anyị na ndị na-eche gbasara anyị na ndị chọrọ ka ihe dịrị anyị ná mma nọrọ. Ha na-agbalị ịmata ihe anyị na-eche na otú obi dị anyị. Ha na-achọpụtakwa ihe bụ́ mkpa anyị ma nyere anyị aka, mgbe ụfọdụ, ha na-eme ya tupu anyị agwa ha ka ha nyere anyị aka. Obi na-adị anyị ụtọ ma ndị mmadụ gosi na ‘ihe banyere anyị na-emetụ ha n’obi.’ *Gụọ 1 Pita 3:8.

2. Gịnị mere anyị kwesịrị iji gbaa mbọ ka anyị gosi ndị ọzọ na ihe banyere ha na-emetụ anyị n’obi?

2 Ebe anyị bụ Ndị Kraịst, anyị kwesịrị igosi ndị mmadụ na ihe banyere ha na-emetụ anyị n’obi. Ma, ọ naghị adị mfe mgbe niile. N’ihi gịnị? Otu ihe kpatara ya bụ na anyị ezughị okè. (Rom 3:23) Anyị na-echekarị gbasara onwe anyị. N’ihi ya, anyị ga-agbasi mbọ ike ka anyị na-eche gbasara ndị ọzọ. O nwere ike isiri ụfọdụ n’ime anyị ike igosi ndị ọzọ na ihe gbasara ha na-emetụ anyị n’obi n’ihi otú e si zụọ anyị ma ọ bụkwanụ n’ihi ihe ndị merela ná ndụ anyị. Ihe ọzọ bụ na anyị nwere ike ịmụta àgwà ndị bi n’ebe anyị bi na-akpa. N’oge ikpeazụ a, ọtụtụ ndị achọdịghị ịma otú obi na-adị ndị ọzọ. Kama, ha bụ “ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya.” (2 Tim. 3:1, 2) Olee ihe ga-enyere anyị aka ka ihe ndị a ghara igbochi anyị igosi ndị ọzọ na ihe gbasara ha na-emetụ anyị n’obi?

3. (a) Olee ihe anyị ga-eme ka anyị na-egosikwu na ihe banyere ndị ọzọ na-emetụ anyị n’obi? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?

3 Ọ bụrụ na anyị ana-eṅomi Jehova na Ọkpara ya Jizọs Kraịst, ọ ga-eme ka anyị na-egosikwu na ihe banyere ndị ọzọ na-emetụ anyị n’obi. Jehova bụ Chineke nke hụrụ anyị n’anya. O mekwara ihe ndị anyị kwesịrị iṅomi ma a bịa n’igosi na ihe banyere ndị ọzọ na-emetụ anyị n’obi. (1 Jọn 4:8) Jizọs kpakwara àgwà ka Nna ya. (Jọn 14:9) Mgbe ọ nọ n’ụwa, o gosiri otú mmadụ nwere ike isi nweere ndị ọzọ ọmịiko. N’isiokwu a, anyị ga-ebu ụzọ tụlee otú Jehova na Jizọs si gosi na ihe gbasara ndị ọzọ na-emetụ ha n’obi. Anyị ga-atụlekwa otú anyị nwere ike isi ṅomie ha.

OTÚ JEHOVA SI GOSI NA IHE BANYERE NDỊ ỌZỌ NA-EMETỤ YA N’OBI

4. Olee otú Aịzaya 63:7-9 si gosi na ihe banyere anyị na-emetụ Jehova n’obi?

4 Baịbụl na-akụziri anyị na ihe gbasara ndị ohu Jehova na-emetụ Jehova n’obi. Dị ka ihe atụ, chegodị otú obi dị Jehova mgbe ụmụ Izrel na-ata ahụhụ. Baịbụl kwuru, sị: “N’oge niile ha nọ na-ata ahụhụ, ọ nọ na-ewute ya.” (Gụọ Aịzaya 63:7-9.) Jehova mechara si n’ọnụ Zekaraya onye amụma kwuo na mgbe a na-emegbu ndị ya, ọ na-adị ya ka ọ bụ ya ka a na-emegbu. Jehova gwara ndị ohu ya, sị: “Onye na-emetụ unu aka na-emetụ mkpụrụ anya m aka.” (Zek. 2:8) Ihe a bụ ihe atụ magburu onwe ya iji gosi otú ihe banyere anyị si emetụ Jehova n’obi.

Jehova napụtara ụmụ Izrel n’ohu ha na-agba n’Ijipt n’ihi na o nweere ha ọmịiko (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5)

5. Nye ihe atụ otú Jehova si mee ihe iji nyere ndị ya na-ata ahụhụ aka.

5 Ihe Jehova na-eme abụghị naanị inwere ndị ohu ya na-ata ahụhụ ọmịiko. Ọ na-eme ihe iji nyere ha aka. Dị ka ihe atụ, mgbe ụmụ Izrel na-ata ahụhụ n’ihi ohu ha na-agba n’Ijipt, Jehova ghọtara ihe ha na ya na-alụ ma mee ihe iji nyere ha aka. Jehova gwara Mozis, sị: “N’ezie, ahụwo m ahụ́ a na-emekpa ndị m . . . , anụwokwa m mkpu ákwá ha na-eti . . . n’ihi na m maara nnọọ ihe mgbu ha na-enwe. M na-agbada ịga napụta ha n’aka ndị Ijipt.” (Ọpụ. 3:7, 8) Ebe ọ bụ na Jehova nweere ndị ohu ya ọmịiko, ọ napụtara ha n’ohu ha na-agba. Mgbe ọtụtụ narị afọ gachara, mgbe ụmụ Izrel banyere n’Ala Nkwa ahụ, ndị iro ha lụsowere ha agha. Gịnị ka Jehova mere maka ya? O wutere ya “na ha na-asụ ude n’ihi ndị na-emegbu ha na ndị na-akwagharị ha.” Obi ebere Jehova nwere maka ndị ya mere ka o nyere ha aka. O zitere ndị ikpe ka ha napụta ndị Izrel n’aka ndị iro ha.—Ikpe 2:16, 18.

6. Nye ihe atụ gosiri otú Jehova si gosi na ihe banyere onye na-echeghị echiche otú kwesịrị ekwesị metụrụ ya n’obi.

6 Jehova na-echebara ndị ohu ya echiche, ma mgbe ihe ha na-eche na-ekwesịchaghị ekwesị. Chegodị gbasara Jona. Chineke ziri onye amụma a ka ọ gaa gwa ndị Ninive na ya ga-ebibi ha. Mgbe ha chegharịrị, Chineke kpebiri na ya agaghịzi ebibi ha. Ma, obi adịghị Jona mma maka ihe a Jehova kpebiri ime. O wewere ‘iwe dị ọkụ’ n’ihi na amụma o buru na a ga-ebibi Ninive emezughị. Jehova nweere Jona ndidi ma nyere ya aka iche echiche otú kwesịrị ekwesị. (Jona 3:10–4:11) Ka oge na-aga, Jona ghọtara ihe Chineke na-akụziri ya. Jehova jikwa ya dee akụkọ a ka anyị mụta ihe na ya.—Rom 15:4. *

7. Olee ihe otú Jehova si emeso ndị ohu ya ihe na-emesi anyị obi ike maka ya?

7 Otú Jehova si emeso ndị ohu ya ihe na-eme ka obi sie anyị ike na ọ na-enwere ndị ohu ya ọmịiko. Ọ ma ihe ya na onye ọ bụla n’ime anyị na ya na-alụ. Jehova “maara obi ụmụ mmadụ nke ọma.” (2 Ihe 6:30) Ọ ma ihe niile anyị na-eche, otú obi na-adị anyị, na ihe ndị anyị ga-emeli. “Ọ gaghịkwa ekwe ka a nwaa [anyị] gabiga ihe [anyị] pụrụ idi.” (1 Kọr. 10:13) Okwu a na-akasi anyị obi.

OTÚ JIZỌS SI GOSI NA IHE BANYERE NDỊ MMADỤ NA-EMETỤ YA N’OBI

8-10. Olee ihe ndị ọ ga-abụ ya mere ka ihe banyere ndị mmadụ na-emetụ Jizọs n’obi?

8 Mgbe Jizọs nọ n’ụwa dị ka mmadụ, ihe banyere ndị ọzọ na-emetụ ya n’obi. E nwere ọ̀ dịkarịa ala, ihe atọ mere ihe banyere ndị ọzọ ji emetụ ya n’obi. Nke mbụ, dị ka anyị kwuburu ná mmalite, Jizọs ṅomiri Nna ya nke eluigwe. Ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya otú ahụ Nna ya mere. Ọ bụ eziokwu na obi dị Jizọs ụtọ maka ihe niile o nyeere Jehova aka kee, ‘ihe na-enye ya obi ụtọ bụkwa ihe metụtara ụmụ mmadụ.’ (Ilu 8:31) Otú Jizọs si hụ ndị ọzọ n’anya mere ka o chebara otú obi dị ha echiche.

9 Nke abụọ, Jizọs nwere ike ịmata ihe dị mmadụ n’obi ka Jehova. O nwekwara ike ịma ihe mmadụ na-eche na otú obi dị ya. (Mat. 9:4; Jọn 13:10, 11) N’ihi ya, mgbe Jizọs chọpụtara na e nwere ihe na-ewute ndị mmadụ n’obi, ọ na-akasi ha obi n’ihi na ihe banyere ha na-emetụ ya n’obi.—Aịza. 61:1, 2; Luk 4:17-21.

10 Nke atọ, e nwere mgbe Jizọs nwere ụfọdụ nsogbu ha na ụmụ mmadụ na-alụ. Dị ka ihe atụ, a zụlitere Jizọs n’ezinụlọ dara ogbenye. Ọ mụtakwara otú e si arụ ọrụ ndị siri ike n’aka Josef, bụ́ nna ya n’ụwa. (Mat. 13:55; Mak 6:3) O nwere ike ịbụ na Josef nwụrụ tupu Jizọs amalite ozi ya n’ụwa. N’ihi ya, ọ ga-abụkwa na ọnwụ ya wutere Jizọs otú ahụ o si ewute ndị mmadụ nwụnahụrụ. Jizọs ma ihe ọ na-adị ka ya mmadụ ịnọ n’ezinụlọ nke ndị nọ ya na-anaghị ekpe otu okpukpe. (Jọn 7:5) Ọ ga-abụ na ihe ndị a niile na ihe ndị ọzọ mere ka Jizọs ghọta ihe ha na ndị mmadụ na-alụ na otú obi na-adị ha.

Jizọs gosiri na ya nwere ọmịiko. O si n’ebe ìgwè mmadụ nọ kpọrọ otu nwoke ntị chiri pụọ tupu ya agwọọ ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11)

11. Olee ihe kacha gosi na ihe banyere ndị ọzọ na-emetụ Jizọs n’obi? Kọwaa. (Lee ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)

11 Ọrụ ebube ndị Jizọs rụrụ mere ka o doo anya na ihe banyere ndị mmadụ na-emetụ ya n’obi. Jizọs arụghị ọrụ ebube ndị ahụ ka o mezuo iwu. O nweere ndị na-ata ahụhụ “ọmịiko.” (Mat. 20:29-34; Mak 1:40-42) Dị ka ihe atụ, chegodị otú obi dị Jizọs mgbe o si n’ebe ìgwè mmadụ nọ kpọrọ otu nwoke ntị chiri pụọ ma gwọọ ya, ma ọ bụkwanụ mgbe ọ kpọlitere otu mkpụrụ nwa nwoke nke otu nwaanyị di ya nwụrụ. (Mak 7:32-35; Luk 7:12-15) Jizọs meteere ha ebere ma chọọ inyere ha aka.

12. Olee otú Jọn 11:32-35 si gosi na ihe banyere Mata na Meri metụrụ Jizọs n’obi?

12 Jizọs gosiri na ihe banyere Mata na Meri metụrụ ya n’obi. “Anya mmiri gbara Jizọs” mgbe ọ hụrụ ka ha na-akwa ákwá n’ihi ọnwụ nwanne ha nwoke bụ́ Lazarọs. (Gụọ Jọn 11:32-35.) Ihe mere o ji bee ákwá abụghị naanị n’ihi na ya na enyi ya Lazarọs agaghịzi anọ. A sị ka e kwuwe, Jizọs ma na ya na-aga ịkpọlite ya n’ọnwụ. Kama, o bere ákwá n’ihi na ọ ghọtara otú obi si na-agbawa ezigbo ndị enyi ya n’ihi ọnwụ nwanne ha nwoke.

13. Gịnị mere obi ji atọ anyị ụtọ ịmata na ihe banyere anyị na-emetụ Jizọs n’obi?

13 Ọ ga-abara anyị ezigbo uru ma anyị mụọ gbasara otú ihe gbasara ndị ọzọ si metụ Jizọs n’obi. Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị ezughị okè ka Jizọs. Anyị hụrụ ya n’anya n’ihi na ọ na-enwere ndị mmadụ ọmịiko. (1 Pita 1:8) Obi dị anyị ụtọ ịmata na Jizọs na-achị ugbu a ka Eze nke Alaeze Chineke. N’oge na-adịghị anya, ọ ga-eme ka ahụhụ niile kwụsị. Ebe ọ bụ na Jizọs adịtụla ndụ ka mmadụ, ọ bụ ya ga-akacha eme ka ụmụ mmadụ nwere onwe ha n’ahụhụ ọchịchị Setan kpataara ha. N’eziokwu, obi dị anyị ụtọ na anyị nwere Onye Ọchichị nwere ike “imere anyị ebere n’adịghị ike anyị.”—Hib. 2:17, 18; 4:15, 16.

NA-EME KA JEHOVA NA JIZỌS

14. N’ihi ihe Ndị Efesọs 5:1, 2 kwuru, olee ihe anyị kwesịrị ime?

14 Ọ bụrụ na anyị echebara otú ihe banyere ndị ọzọ si emetụ Jehova na Jizọs n’obi echiche, ọ ga-eme ka anyị na-egosikwu na ihe banyere ndị ọzọ na-emetụ anyị n’obi. (Gụọ Ndị Efesọs 5:1, 2.) Anyị enweghị ike ịmata ihe dị mmadụ n’obi ka ha. N’agbanyeghị nke ahụ, anyị kwesịrị ịgbalị na-aghọta otú obi dị ndị ọzọ na ihe bụ́ mkpa ha. (2 Kọr. 11:29) Anyị ekwesịghị ime ka ndị na-achọ ihe ga-abara naanị onwe ha uru n’ụwa taa. Kama, anyị kwesịrị ịna-agba mbọ “na-elekwasị anya, ọ bụghị naanị n’ọdịmma onwe [anyị], kamakwa n’ọdịmma nke ndị ọzọ.”—Fil. 2:4.

(A ga-akọwa ya na paragraf nke 15 ruo na nke 19) *

15. Ole ndị kwesịrị ịkacha egosi na ihe banyere ndị ọzọ na-emetụ ha n’obi?

15 Ndị okenye kwesịrị ịkacha egosi na ihe gbasara ndị ọzọ na-emetụ ha n’obi. Ha ma na ha ga-aza Jehova ajụjụ maka atụrụ ya o nyefere ha n’aka. (Hib. 13:17) Ndị okenye kwesịrị inwe ọmịiko ka ha nwee ike inyere ụmụnna ha aka. Olee otú ndị okenye ga-esi gosi na ihe banyere ndị ọzọ na-emetụ ha n’obi?

16. Gịnị ka okenye ihe banyere ndị ọzọ na-emetụ n’obi na-eme, gịnịkwa mere o ji dị mkpa?

16 Okenye nke ihe banyere ndị ọzọ na-emetụ n’obi na-ewepụta oge ka ya na ụmụnna ya nọrịa. Ọ na-ajụ ajụjụ, gee ntị nke ọma ma ghara ịnara onye na-agwa ya okwu okwu n’ọnụ. Ọ dị mkpa ka ndị okenye mee ihe a karịchaa ma ọ bụrụ na nwanna chọrọ ịkọrọ ha ihe bụ mkpa ya, ma ya ana-esiri ya ike. (Ilu 20:5) Ọ bụrụ na okenye ewepụta oge ya ka ya na ụmụnna ya nọrịa, ọ ga-eme ka ha tụkwasịkwuo ya obi, mee ka ya na ha bụrụ ezigbo enyi, meekwa ka ha hụkwuo ibe ha n’anya.—Ọrụ 20:37.

17. Olee àgwà ọtụtụ ụmụnna kwuru kacha amasị ha ndị okenye nwere? Nye ihe atụ.

17 Ọtụtụ ụmụnna kwuru na àgwà ndị okenye kacha amasị ha bụ otú ha si egosi na ihe banyere ndị ọzọ na-emetụ ha n’obi. N’ihi gịnị? Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Adelaide kwuru, sị: “Ọ na-adị mfe ịgwa ha okwu n’ihi na ị ma na ha ga-ege gị ntị.” O kwukwara, sị: “Otú ha si azaghachi ma ị gwa ha okwu ga-eme ka ị mata na ihe banyere gị na-emetụ ha n’obi.” Otu nwanna obi dị ụtọ maka otú otu okenye si meso ya ihe kwuru, sị: “M hụrụ otú anya mmiri si gbaa ya mgbe m na-agwa ya ihe mụ na ya na-alụ. Agaghị m echefu ya echefu.”—Rom 12:15.

18. Gịnị ka anyị ga-eme ka ihe banyere ndị ọzọ na-emetụ anyị n’obi?

18 N’eziokwu, ọ bụghị naanị ndị okenye kwesịrị igosi na ihe banyere ndị ọzọ na-emetụ ha n’obi. Anyị niile kwesịrị inwe àgwà a. Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị nwee ike inwe ya? Gbalịa ka ị ghọta ihe ya na ndị ezinụlọ gị na ụmụnna gị na-alụ. Gosikwa na ihe banyere ndị na-eto eto na ndị na-arịa ọrịa gị na ha nọ n’ọgbakọ na-emetụ gị n’obi. Ndị ọzọ bụ ndị merela agadi nakwa ndị onye ha hụrụ n’anya nwụnahụrụ. Jụọ ha otú ha mere. Gee ha ntị nke ọma mgbe ha na-ekwu otú obi dị ha. Mee ka ha ghọta na ị ghọtara nsogbu ha nọ na ya. Meere ha ihe ọ bụla i nwere ike imere ha. Anyị mee otú a, anyị na-egosi na anyị hụrụ ha n’anya.—1 Jọn 3:18.

19. Gịnị mere na ọ bụghị naanị otu ihe ka anyị kwesịrị ime mgbe anyị chọrọ inyere ndị mmadụ aka?

19 Ọ bụghị naanị otu ihe ka anyị kwesịrị ime ma anyị chọọ inyere ndị mmadụ aka. Maka gịnị? Ọ bụ n’ihi na ihe ndị mmadụ na-eme ma nsogbu bịara ha dị iche iche. Ụfọdụ na-ekwu otú ọ dị ha n’obi, ebe ndị ọzọ anaghị achọ ikwu gbasara nsogbu ha. N’ihi ya, mgbe anyị na-achọ inyere ha aka, anyị kwesịrị izere ịjụ ha ajụjụ ndị nwere ike imenye ha ihere. (1 Tesa. 4:11) Ha kwugodị otú obi dị ha, o nwere ike ọ bụghị mgbe niile ka anyị ga-ekweta ihe ha kwuru. Ma, anyị kwesịrị ịghọta na ọ bụ otú ahụ ka obi dị ha. Anyị kwesịkwara ịdị ngwa ige ntị ma ghara ịdị ngwa ikwu okwu.—Mat. 7:1; Jems 1:19.

20. Olee ihe anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

20 Ọ bụghị naanị n’ọgbakọ ka anyị kwesịrị igosi na ihe banyere ndị ọzọ na-emetụ anyị n’obi. Anyị kwesịkwara igosi ya mgbe anyị nọ n’ozi ọma. Olee otú anyị ga-esi egosi na ihe banyere ndị ọzọ na-emetụ anyị n’obi mgbe anyị nọ n’ozi ọma? Anyị ga-atụle ya n’isiokwu na-esonụ.

ABỤ 130 Na-agbaghara Ndị Ọzọ

^ para. 5 Ihe banyere ndị ọzọ na-emetụ Jehova na Jizọs n’obi. N’isiokwu a, anyị ga-atụle ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka ha. Anyị ga-atụlekwa ihe mere ihe gbasara ndị ọzọ kwesịrị iji na-emetụ anyị n’obi nakwa ụzọ ndị anyị nwere ike isi eme ya.

^ para. 1 NKỌWAKWU: Igosi na ‘ihe banyere ndị ọzọ na-emetụ anyị n’obi’ pụtara na anyị ga-agbalị ka anyị ghọta otú obi dị ha ma mee ka obi dịrị anyị otú ọ dị ha.—Rom 12:15.

^ para. 6 E nwekwara ndị fere Jehova dara mbà n’obi ma ọ bụ na-atụ ụjọ Jehova nweere ọmịiko. Chegodị ihe Baịbụl kọrọ banyere Hana (1 Sam. 1:10-20), Ịlaịja (1 Eze 19:1-18), na Ibed-melek (Jere. 38:7-13; 39:15-18).

^ para. 65 NKỌWA FOTO: Anyị nwere ike isi n’ụzọ dị iche iche gosi ụmụnna anyị na ihe banyere ha na-emetụ anyị n’obi mgbe anyị gara ọmụmụ ihe. Anyị na-ahụ (1) ebe otu okenye medara obi na-agwa otu onye na-eto eto na mama ya okwu, (2) ebe nna na nwa ya nwaanyị na-enyere otu nwanna nwaanyị merela agadi aka ka ọ banye n’ụgbọala, nakwa (3) ebe ndị okenye abụọ na-ege otu nwanna nwaanyị ntị nke ọma mgbe ọ na-agwa ha okwu ka ha gwa ya ihe ọ ga-eme.