Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ 13

Na-egosi na Ihe Banyere Ndị Mmadụ Na-emetụ Gị n’Obi Mgbe Ị Nọ n’Ozi Ọma

Na-egosi na Ihe Banyere Ndị Mmadụ Na-emetụ Gị n’Obi Mgbe Ị Nọ n’Ozi Ọma

“O nwere ọmịiko n’ebe ha nọ . . . O wee malite izi ha ọtụtụ ihe.”​—MAK 6:34.

ABỤ 70 Chọpụta Ndị Ga-anabata Ozi Ọma Unu

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Gịnị bụ otu n’ime ihe kacha emetụ anyị n’obi gbasara Jizọs? Kọwaa.

OTU n’ime ihe kacha emetụ anyị n’obi gbasara Jizọs bụ na ọ ma ihe ya na ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-alụ. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o sooro “ndị na-aṅụrị ọṅụ ṅụrịa ọṅụ,” sorokwa “ndị na-akwa ákwá kwaa ákwá.” (Rom 12:15) Dị ka ihe atụ, mgbe ndị na-eso ụzọ ya dị mmadụ iri asaa ji ọṅụ lọta ozi ọma, “o nwere oké ọṅụ n’ime mmụọ nsọ.” (Luk 10:17-21) Mgbe ọ hụkwara ka ndị ikwu na ibe Lazarọs na-eru uju n’ihi ọnwụ Lazarọs, “ọ sụrụ ude n’ime mmụọ ya, o nyekwara ya nsogbu.”—Jọn 11:33.

2. Olee ihe mere ka Jizọs gosi na ihe banyere ndị ọzọ na-emetụ ya n’obi?

2 Gịnị mere Jizọs ji nwee ọmịiko ma na-emetere ụmụ mmadụ na-ezughị okè ebere n’agbanyeghị na o zuru okè? Nke mbụ bụ na Jizọs hụrụ ndị mmadụ n’anya. Dị ka anyị kwuru n’isiokwu bu nke a ụzọ, “ihe na-enye [ya] obi ụtọ bụkwa ihe metụtara ụmụ mmadụ.” (Ilu 8:31) Otú o si hụ ndị mmadụ n’anya mere ka ọ mata nnọọ otú ụmụ mmadụ si eche echiche. Jọn onyeozi kwuru, sị: “Ya onwe ya maara ihe dị n’ime mmadụ.” (Jọn 2:25) Jizọs nweere ndị mmadụ ọmịiko. Ndị mmadụ chọpụtara na ọ hụrụ ha n’anya, ya emee ka ha gee ntị n’ozi ọma Alaeze. Ọ bụrụ na anyị ana-egosikwu ndị mmadụ na ihe banyere ha na-emetụ anyị n’obi, ọ ga-eme ka anyị na-enyere ha aka ma anyị na-ezi ha ozi ọma.—2 Tim. 4:5.

3-4. (a) Ọ bụrụ na ihe banyere ndị mmadụ ana-emetụ anyị n’obi, olee otú anyị ga-esi ewere ozi ọma anyị na-ekwusa? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?

3 Pọl onyeozi ma na ya kwesịrị ikwusa ozi ọma, otú ahụ ka ọ dịkwa anyịnwa. (1 Kọr. 9:16) Ọ bụrụ na ihe banyere ndị mmadụ ana-emetụ anyị n’obi, anyị agaghị na-aga ozi ọma naanị ka anyị mezuo iwu. Anyị ga-achọ igosi na ihe banyere ndị mmadụ na-emetụ anyị n’obi ma chọọ inyere ha aka. Anyị ma na “a na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.” (Ọrụ 20:35) Ọ bụrụ na anyị eburu ihe a n’uche, ọ ga-eme ka ozi ọma na-atọkwu anyị ụtọ.

4 N’isiokwu a, anyị ga-atụle otú anyị ga-esi na-egosi na ihe banyere ndị anyị gara izi ozi ọma na-emetụ anyị n’obi. Anyị ga-ebu ụzọ tụlee ihe anyị nwere ike ịmụta n’otú Jizọs si gosi na ihe banyere ndị mmadụ na-emetụ ya n’obi. Anyị ga-atụlekwa ụzọ anọ anyị nwere ike isi eme ka ya.—1 Pita 2:21.

JIZỌS GOSIRI NA IHE BANYERE NDỊ Ọ NA-EZI OZI ỌMA NA-EMETỤ YA N’OBI

Otú ihe banyere ndị mmadụ si metụ Jizọs n’obi mere ka o zie ha ozi ọma ga-akasi ha obi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5 na nke 6)

5-6. (a) Ole ndị ka Jizọs gosiri na ihe banyere ha na-emetụ ya n’obi? (b) Dị ka e kwuru n’Aịzaya 61:1, 2, gịnị mere Jizọs ji nweere ndị o ziri ozi ọma ọmịiko?

5 Ka anyị tụlee otu ụzọ Jizọs si gosi na ihe banyere ndị mmadụ na-emetụ ya n’obi. N’otu oge, ike gwụrụ Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya n’ihi ozi ọma ha kwusara ruo ogologo oge. “Ha enweghịkwa ohere ọ bụla iri nri.” N’ihi ya, Jizọs kpọọrọ ndị na-eso ụzọ ya gaa “n’ebe ndị mmadụ na-adịghị anọkarị” ka ha nọrọ naanị ha nakwa ka ha “zurutụ ike.” Ma, ìgwè mmadụ gbaara gawa ebe Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya na-aga. Mgbe Jizọs rutere ebe ahụ ma hụ ha, gịnị ka o mere? O “nwere ọmịiko * n’ebe ha nọ, n’ihi na ha dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha. O wee malite izi ha ọtụtụ ihe.”—Mak 6:30-34.

6 Gịnị mere Jizọs ji nweere ha ọmịiko? Ọ chọpụtara na “ha dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.” Ọ ga-abụ na Jizọs chọpụtara na ụfọdụ n’ime ha dara ogbenye ma na-arụsi ọrụ ike ka ha nwee ike ịkpa afọ ezinụlọ ha. Ọ ga-abụkwa na ụfọdụ n’ime ha na-eru uju n’ihi ọnwụ onye nke ha. Ọ bụrụ otú ahụ, Jizọs nwere ike ịghọta nsogbu ha. Dị ka anyị kwuru n’isiokwu bu nke a ụzọ, ọ ga-abụ na ụdị ihe ndị ahụ mere Jizọs. Ihe banyere ndị ọzọ metụrụ Jizọs n’obi, ya achọọ ịkasi ha obi.—Gụọ Aịzaya 61:1, 2.

7. Olee otú anyị nwere ike isi ṅomie Jizọs?

7 Gịnị ka anyị na-amụta n’aka Jizọs? Dịkwa ka ọ dị n’oge Jizọs, ndị anyị na-ahụ taa dị ka “atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.” Ha nwere ọtụtụ nsogbu. Ma, anyị nwere ihe dị ha mkpa, ya bụ, ozi ọma Alaeze Chineke. (Mkpu. 14:6) N’ihi ya, anyị na-eṅomi Nna Anyị Ukwu ma na-ekwusa ozi ọma n’ihi na anyị na-emetere “onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya na ogbenye ebere.” (Ọma 72:13) Anyị na-enwere ndị mmadụ ọmịiko, chọọkwa ime ihe iji nyere ha aka.

OTÚ ANYỊ NWERE IKE ISI GOSI NA IHE BANYERE NDỊ MMADỤ NA-EMETỤ ANYỊ N’OBI

Chebara mkpa nke onye ọ bụla echiche (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8 na nke 9)

8. Olee otu ụzọ anyị nwere ike isi gosi na ihe banyere ndị mmadụ na-emetụ anyị n’obi ma anyị gaa ozi ọma? Nye ihe atụ.

8 Gịnị ga-enyere anyị aka igosi ndị anyị na-ezi ozi ọma na ihe banyere ha na-emetụ anyị n’obi? Anyị kwesịrị ịgbalị ka anyị ghọta otú obi dị ndị anyị hụrụ n’ozi ọma na ihe ha na-eche ma mesoo ha ihe otú anyị chọrọ ka e si mesoo anyị. * (Mat. 7:12) Ka anyị tụlee ụzọ anọ anyị nwere ike isi eme ya. Nke mbụ, chebara ihe dị onye nke ọ bụla n’ime ha mkpa echiche. Ihe anyị na-eme ma anyị kwusawa ozi ọma yiri ihe dọkịta na-eme. Dọkịta ma nke a na-akọ na-echebara nsogbu onye ọrịa nke ọ bụla echiche. Ọ na-ajụ ajụjụ ma gee ntị nke ọma mgbe onye na-arịa ọrịa na-ekwu otú o si eme ya. Kama inye onye ọrịa ahụ ọgwụ gbatara ya n’uche ozugbo, dọkịta ahụ nwere ike ile ya ahụ́ ka ọ mata ihe na-eme ya, mgbe ahụzi, ya enye ya ọgwụ. Dịkwa ka dọkịta ahụ, anyị ekwesịghị iji otu ihe ezi onye ọ bụla anyị hụrụ ozi ọma. Kama, anyị ga-agbalị ịmata ọnọdụ onye nke ọ bụla na ihe bụ́ echiche ya.

9. Olee ihe anyị na-ekwesịghị iche? Kọwaa.

9 Ị hụ mmadụ n’ozi ọma, echela na ị ma ihe ya na ya na-alụ ma ọ bụ ihe ndị o kweere na ihe mere o ji kwere ha. (Ilu 18:13) Kama, jiri akọ jụọ ya ajụjụ ka i nwee ike ịmata gbasara ya na ihe ndị o kweere. (Ilu 20:5) Jụọ ya gbasara ọrụ ya, ezinụlọ ya, ihe ndị merela ná ndụ ya, na ihe ndị o chere, ma ọ bụrụ na a na-eme otú ahụ n’ebe unu na-ezi ozi ọma. Anyị jụọ ndị mmadụ ajụjụ, ọ ga-eme ka ha gwa anyị ihe mere ozi ọma ji dị ha mkpa. Anyị mata ihe bụ́ mkpa ha, ọ ga-eme ka ọ dịrị anyị mfe igosi na ihe banyere ha na-emetụ anyị n’obi ma nyere ha aka, otú ahụ Jizọs mere.—Tụlee 1 Ndị Kọrịnt 9:19-23.

Chee gbasara otú ihe nwere ike isi dịrị onye ị na-ezi ozi ọma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10 na nke 11)

10-11. Dị ka e kwuru ná 2 Ndị Kọrịnt 4:7, 8, olee ụzọ nke abụọ anyị nwere ike isi gosi na ihe banyere ndị ọzọ na-emetụ anyị n’obi? Nye ihe atụ.

10 Nke abụọ, gbalịa ka ị ghọta otú ihe si dịrị ha. Anyị nwere ike ịghọtatụ otú ihe si dịrị ha. A sị ka e kwuwe, anyị ezughị okè, anyị nwekwara nsogbu. (1 Kọr. 10:13) Anyị ma na ibi n’ụwa ochie a adịghị mfe. Anyị na-edi nsogbu anyị n’ihi na Jehova na-enyere anyị aka. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 4:7, 8.) Ma, chegodị banyere ndị ha na Chineke na-abụghị enyi. Ọ ga-esiri ha ezigbo ike ibi n’ụwa a ma ọ bụrụ na o nyereghị ha aka. Anyị na-enwere ha ọmịiko ka Jizọs ma na-ezi ha “ozi ọma nke ihe ka mma.”—Aịza. 52:7.

11 Ka anyị tụlee gbasara otu nwanna aha ya bụ Sergey. Tupu ya abata n’ọgbakọ, ọ bụ onye ihere. Ọ na-esiri ya ike ịgwa mmadụ okwu. Ma, ka oge na-aga, o kwere ka a mụwara ya Baịbụl. O kwuru, sị: “Ka m na-amụ Baịbụl, m mụtara na Ndị Kraịst kwesịrị ịkọrọ ndị ọzọ ihe ha kweere. M chekwara na mụ agaghị emeli ya.” Ma, o chere gbasara ndị na-anụbeghị ozi ọma ma ghọta na ihe ga-esiri ha ezigbo ike n’ihi na ha amaghị Jehova. O kwukwara, sị: “Ihe ọhụrụ ndị m na-amụ mere ka m na-enwe ezigbo obi ụtọ, meekwa ka obi na-eru m ala. M ma na ndị ọzọ kwesịkwara ịmụta ihe ndị ahụ m mụtara.” Ka ihe banyere ndị ọzọ na-emetụkwu Sergey n’obi, ka ọ na-akatakwu obi ezi ozi ọma. Sergey kwuru, sị: “O juru m anya na ịgwa ndị ọzọ gbasara Baịbụl mere ka m na-akatakwu obi. O mekwara ka ihe ndị ahụ m mụtara gbasie mgbọrọgwụ ike n’obi m.” *

O nwere ike iwe oge tupu ụfọdụ emewe nke ọma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12 na nke 13)

12-13. Gịnị mere anyị ji kwesị inwere ndị anyị na-amụrụ ihe ndidi? Nye ihe atụ.

12 Nke atọ, na-enwere ndị ị na-ezi ozi ọma ndidi. Cheta na o nwere ike ịbụ na ha echetụbeghị banyere ụfọdụ eziokwu Baịbụl anyị ma nke ọma. Ọtụtụ ejighị ihe ndị ha kweere egwu egwu. Ha nwere ike ịna-ewere ya na ihe ndị ha kweere n’okpukpe ha na-eme ka ha na ndị ezinụlọ ha na ndị bi n’ebe ha bi dịrị n’otu. Olee otú anyị nwere ike isi nyere ha aka?

13 Ka anyị chegodị gbasara ihe atụ a: Gịnị ka a ga-eme ma ọ bụrụ na àkwà mmiri ochie adịchakwaghị mma? Ihe a na-emekarị bụ na a na-amalite ịrụ nke ọhụrụ, hapụkwa ndị mmadụ ka ha na-aga na nke ochie. Ozugbo a rụchara nke ọhụrụ, e nwere ike ịkwatu nke ochie. Otú ahụ ka ọ dịkwa ndị mmadụ. Tupu anyị agwa ha ka ha hapụ ihe ochie ndị ha kweere ha na-anaghị eji egwu egwu, anyị nwere ike ibu ụzọ nyere ha aka ịmata eziokwu Baịbụl ha na-amaghị ma jiri ha kpọrọ ihe. Ọ bụzi mgbe ahụ ka ha ga-ahapụ ihe ochie ndị ahụ ha kweere. O nwere ike iwe oge tupu anyị enyere ndị mmadụ aka ime ụdị mgbanwe ndị ahụ.—Rom 12:2.

14-15. Olee otú anyị ga-esi nyere ma ndị na-amachaghị ma ndị na-amatụdịghị banyere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi na paradaịs n’ụwa aka? Nye ihe atụ.

14 Ọ bụrụ na anyị ana-enwere ndị mmadụ ndidi n’ozi ọma, anyị agaghị atụ anya ka ha ghọta ma ọ bụ nabata eziokwu Baịbụl na nke mbụ ha nụrụ ya. Kama, ọ bụrụ na ihe banyere ha na-emetụ anyị n’obi, anyị ga-enyere ha aka ichebara ihe Baịbụl kwuru echiche ka oge na-aga. Dị ka ihe atụ, ka anyị legodị ụzọ anyị nwere ike isi nyere mmadụ aka ịghọta banyere olileanya anyị nwere ịdị ndụ ebighị ebi na paradaịs n’ụwa. Ọtụtụ ndị amachaghị gbasara ya, ụfọdụ amatụdịghị gbasara ya. Ha nwere ike ikwere na ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, nke ya agwụla, ma ọ bụkwanụ na-eche na ndị ezi omume niile ga-aga eluigwe. Olee otú anyị nwere ike isi nyere ha aka?

15 Otu nwanna kwuru otú ya na-esi enyere ndị mmadụ aka ịghọta olileanya anyị nwere ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa. Ọ na-ebu ụzọ agụrụ onye nwe ụlọ Jenesis 1:28. Ọ gụchaa ya, ya ajụọ ya ebe o chere na Chineke chọrọ ka ụmụ mmadụ biri nakwa otú ọ chọrọ ka ihe dịrị ha. Ọtụtụ ndị na-aza ya, sị: “Ọ bụ n’ụwa. Ọ chọkwara ka ha na-enwe obi ụtọ.” Nwanna ahụ na-agụkwara ha Aịzaya 55:11 ma jụọ ha ma nzube Chineke ọ̀ gbanweela. Ọtụtụ mgbe, ha na-asị mba, na ọ gbanwebeghị. N’ikpeazụ, ọ na-agụrụ ha Abụ Ọma 37:10, 11 ma jụọ ha otú ihe ga-adịrị ụmụ mmadụ n’ọdịnihu. Nwanna a esila otú a nyere ọtụtụ ndị aka ịghọta na Chineke chọrọ ka ndị ezi omume dịrị ndụ ebighị ebi na Paradaịs n’ụwa.

Obere ihe anyị mere iji gosi ndị mmadụ na anyị hụrụ ha n’anya, dị ka izigara ha akwụkwọ ozi na-agba ume, nwere ike ịbara ha uru (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16 na nke 17)

16-17. N’iburu ihe e kwuru n’Ilu 3:27 n’obi, olee ụzọ ụfọdụ anyị nwere ike isi gosi ndị mmadụ na ihe banyere ha na-emetụ anyị n’obi? Nye ihe atụ.

16 Nke anọ, chee ihe i nwere ike imere ndị mmadụ iji gosi na ihe banyere ha na-emetụ gị n’obi. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ na anyị gara na nke mmadụ n’oge na-adịcharaghị ya mma. Anyị nwere ike ịsị ya ewela iwe ma gwa ya na anyị ga-abịa n’oge ọzọ ga-adaba adaba. Ọ bụrụkwanụ na onye nwe ụlọ chọrọ ka e nyere ya aka mee ihe ụfọdụ, ma ọ bụ na onye na-anaghị enweli ike ịpụ apụ n’ihi ọrịa ma ọ bụ nká chọrọ onye ga-enyere ya aka mee ihe ụfọdụ? Anyị nwere ike inyere ndị nọ n’ụdị ọnọdụ ndị a aka.—Gụọ Ilu 3:27.

17 Otu nwanna nwaanyị chọpụtara na obere ihe e chere na o nweghị ihe ọ bụ o meere ndị mmadụ baara ha ezigbo uru. Ihe banyere otu ezinụlọ nwa ha nwụrụ metụrụ ya n’obi, ya edegara ha akwụkwọ ozi. N’akwụkwọ ozi ahụ, o dere ihe ụfọdụ na-akasi obi si n’Akwụkwọ Nsọ. Gịnị ka ezinụlọ ahụ mechara mee? Nne nwatakịrị ahụ nwụrụ anwụ dere akwụkwọ ozi o ji zaghachi ya. Ọ sịrị: “Obi nọ na-ajọ m njọ ụnyaahụ. Akwụkwọ ozi ahụ baara anyị ezigbo uru. M na-ekele gị maka akwụkwọ ozi ahụ n’ihi na ọ gbara anyị ezigbo ume. M gụrụ akwụkwọ ozi ahụ ihe karịrị ugboro iri abụọ ụnyaahụ. Akwụkwọ ozi ahụ kasiri m obi otú m na-atụghị anya ya. Anyị si n’ala ala obi anyị na-ekele gị.” O doro anya na ọ bụrụ na anyị aghọta otú ihe si dịrị ndị na-ata ahụhụ ma mee ihe iji nyere ha aka, o nwere ike ime ka ndị mmadụ nwee mmasị n’ozi anyị.

GHỌTA IHE JEHOVA CHỌRỌ ANYỊ N’AKA

18. Dị ka e kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 3:6, 7, gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’uche banyere ozi anyị, n’ihi gịnịkwa?

18 Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị kwesịrị ịghọta ihe Chineke chọrọ anyị n’aka. Anyị nwere ike inyere ndị mmadụ aka ịmụta gbasara Chineke, ma ọ bụghị anyị na-arụ ihe kacha mkpa n’ọrụ a. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 3:6, 7.) Ọ bụ Jehova na-adọta ndị mmadụ n’ebe ọ nọ. (Jọn 6:44) Ihe ga-eme ka mmadụ nabata ozi ọma anyị ma ọ bụ jụ ya bụ otú obi ya dị. (Mat. 13:4-8) Cheta na n’agbanyeghị na Jizọs bụ Onye Ozizi kachanụ dịtụrụla ndụ n’ụwa, ọtụtụ ndị egeghị ya ntị. N’ihi ya, ike ekwesịghị ịgwụ anyị ma ọ bụrụ na ọtụtụ ndị anyị chọrọ izi ozi ọma egeghị anyị ntị.

19. Olee uru ọ ga-aba ma anyị gosi ndị mmadụ na ihe banyere ha na-emetụ anyị n’obi ma anyị gaa ozi ọma?

19 Ndị mmadụ ga-ege anyị ntị ma anyị gosi ha na ihe banyere ha na-emetụ anyị n’obi mgbe anyị nọ n’ozi ọma. Ọ ga-eme ka ozi anyị na-atọkwu anyị ụtọ. Anyị ga-achọpụta na a na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe. Ọ ga-emekwa ka ọ dịrịkwuo ndị “nwere ezi obi maka inweta ndụ ebighị ebi” mfe ịnụ ozi ọma. (Ọrụ 13:48) N’ihi ya, “ọ bụrụhaala na anyị nwere oge dị mma maka ya, ka anyị na-eme ihe ọma n’ebe mmadụ niile nọ.” (Gal. 6:10) Anyị mee otú ahụ, anyị ga-enwe obi ụtọ na anyị mere ka e too Nna anyị nke eluigwe.—Mat. 5:16.

ABỤ 64 Anyị Ji Ọṅụ Soro Na-ewe Ihe Ubi

^ para. 5 Ọ bụrụ na anyị ana-egosi na ihe banyere ndị anyị na-ezi ozi ọma na-emetụ anyị n’obi, o nwere ike ime ka anyị na-enwekwu obi ụtọ, meekwa ka ndị mmadụ chọọ ige anyị ntị. Gịnị mere o ji dị otú ahụ? N’isiokwu a, anyị ga-atụle ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka Jizọs gbasara igosi ndị ọzọ na ihe banyere ha na-emetụ anyị n’obi, nakwa ụzọ anọ anyị nwere ike isi gosi ndị anyị gara izi ozi ọma na ihe banyere ha na-emetụ anyị n’obi.

^ para. 5 NKỌWAKWU: N’amaokwu a, ọmịiko pụtara imetere onye na-ata ahụhụ ma ọ bụ onye a na-emegbu emegbu ebere. Onye na-emetere ndị mmadụ ebere nwere ike ime ihe niile o nwere ike ime ka o nyere ha aka.

^ para. 8 Gụọ isiokwu bụ́ “Na-akpa Àgwà Ọma n’Ozi Ọma.” Ọ gbara n’Ụlọ Nche nke Mee 15, 2014.