Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova Ji “Amen” Ị Na-ekwe Kpọrọ Ihe

Jehova Ji “Amen” Ị Na-ekwe Kpọrọ Ihe

JEHOVA ji ofufe anyị na-efe ya kpọrọ ihe. Ọ “na-ege ntị ma na-anụ” ihe ndị ohu ya na-ekwu. O jikwa ihe niile anyị na-eme iji too ya kpọrọ ihe n’agbanyeghị otú ọ dịruru ná ntakịrị. (Mal. 3:16) Dị ka ihe atụ, chegodị gbasara otu okwu ọ ga-abụ na anyị ekwuola ọtụtụ ugboro. Ọ bụ “amen.” Jehova ò ji okwu a kpọrọ ihe? À na-ajụkwa ajụ? Iji mata ihe mere anyị ji kwuo otú ahụ, ka anyị tụlee ihe okwu ahụ pụtara, nakwa otú e si kwuo ya na Baịbụl.

“MMADỤ NIILE GA-ASỊ, ‘AMEN!’”

Okwu ahụ bụ́ “amen” pụtara “ka ọ dị otú ahụ.” O si n’okwu Hibru pụtara “ikwesị ntụkwasị obi” ma ọ bụ onye “e nwere ike ịtụkwasị obi.” Mgbe ụfọdụ, a na-ekwu ya n’ihe gbasara okwu ikpe. Ọ bụrụ na mmadụ aṅụchaa iyi, ọ ga-asị “amen” iji gosi na ihe o kwuru bụ eziokwu nakwa na ya kwetara iji isi ya buru ihe ọ bụla si na ya pụta. (Ọnụ Ọgụ. 5:22) Ọ bụrụ na o kwe “amen” n’ihu ọha, o gosiri na o kwetasiri ike na ọ ga-emezu ihe ahụ o kwere ná nkwa.—Nehe. 5:13.

E kwuru otu ihe atụ magburu onwe ya banyere otú e si kwe “amen” na Diuterọnọmi isi iri abụọ na asaa. Mgbe ụmụ Izrel banyechara n’Ala Nkwa ahụ, ha zukọrọ n’agbata Ugwu Ibal na Ugwu Gerizim ka ha nụrụ Iwu Jehova a ga-agụpụtara ha. Ihe mere ha ji gaa ebe ahụ abụghị naanị ka ha nụrụ Iwu Jehova, kama ka ha kwupụta na ha kweere n’ihe ha nụrụ. Ha gosiri na ha kweere mgbe ha zaghachiri “amen” mgbe a gụpụtachaara ha ihe ga-eme ha ma ha nupụ isi n’Iwu ahụ. (Diut. 27:15-26) Chegodị otú umụ nwoke, ụmụ nwaanyị, na ụmụaka ndị nọ ebe ahụ si jiri olu dara ụda zaghachi mgbe ahụ. (Jọsh. 8:30-35) O doro anya na ha echefughị ihe ha kwuru ụbọchị ahụ. Ha mezukwara ihe ha kwuru n’ihi na Baịbụl kwuru, sị: “Izrel wee na-efe Jehova ụbọchị niile nke Jọshụa nakwa ụbọchị niile nke ndị okenye dịrị ndụ mgbe Jọshụa nwụsịrị, ya bụ, ndị maara ọrụ niile Jehova rụụrụ Izrel.”—Jọsh. 24:31.

Jizọs sịrị “amen” iji gosi na ihe o kwuru bụ eziokwu, ma o mere ya n’ụzọ pụrụ iche. Kama ịsị “amen” mgbe mmadụ kwuchara okwu, ọ na-ekwu ya mgbe ọ chọrọ ibido ikwu okwu iji mee ka o doo anya na ihe ọ chọrọ ikwu bụ eziokwu. Mgbe ụfọdụ, ọ na-ekwu ya ugboro abụọ, sị, “amen amen.” (Mat. 5:18; Jọn 1:51) Ọ na-esi otú a eme ka obi sie ndị na-ege ya ntị ike na ihe ọ na-ekwu bụ eziokwu. Ihe mere Jizọs ji ekwu okwu otú a bụ n’ihi na Chineke nyere ya ikike ime ka nkwa ya niile mezuo.—2 Kọr. 1:20; Mkpu. 3:14.

“MMADỤ NIILE WEE SỊ, ‘AMEN!’ TOOKWA JEHOVA”

Ụmụ Izrel na-ekwekwa “amen” mgbe ha na-ekpe ekpere na mgbe ha na-eto Jehova. (Nehe. 8:6; Ọma 41:13) Ọ bụrụ na ha ekwe “amen” mgbe e kpechara ekpere, o gosiri na ha kwetara n’ihe e kpere n’ekpere. Ndị niile nọ ebe ahụ na-esi otú ahụ egosi na ha so too Chineke, ya emee ka ofufe ha bịara ife Chineke tọọ ha ụtọ. Ọ bụ ihe a mere mgbe Eze Devid bubatara Igbe Jehova na Jeruselem. Mgbe ha nọ na-eme ememme n’ihi igbe ahụ, Devid si n’ala ala obi ya kpee ekpere yiri abụ e dere na 1 Ihe E Mere 16:8-36. Ihe e kwuru n’ekpere ahụ metụrụ ndị nọ ebe ahụ n’obi nke mere ka ‘mmadụ niile sị, “amen!” tookwa Jehova.’ N’eziokwu, ha niile ji obi ụtọ fee Jehova.

Ndị Kraịst n’oge ndịozi Jizọs kwekwara “amen” mgbe ha na-eto Jehova. Ndị nke so dee Baịbụl dekwara “amen” ọtụtụ ugboro n’akwụkwọ ozi ndị ha dere. (Rom 1:25; 16:27; 1 Pita 4:11) Akwụkwọ Mkpughe kwukwara na ndị mmụọ ozi nọ n’eluigwe na-eto Jehova, na-asị: “Amen! Toonụ Jaa!” (Mkpu. 19:1, 4) Ndị Kraịst oge mbụ na-ekwekarị “amen” mgbe ha kpechara ekpere ná nzukọ ha. (1 Kọr. 14:16) Ma ha anaghị eme ya n’echeghị echiche.

IHE MERE I KWESỊRỊ IJI KWE “AMEN”

Ebe ọ bụ na anyị amatala otú ndị fere Jehova n’oge ochie si kwe “amen,” o doro anya na anyị ahụla uru ọ bara ikwe “amen” ma anyị kpechaa ekpere. Ọ bụrụ na anyị ekwe “amen” mgbe anyị kpechara ekpere nke onwe anyị, o gosiri na ihe anyị kwuru si anyị n’obi. Ọ bụrụkwanụ na anyị ekwe “amen” n’ime obi anyị ma ọ bụkwanụ kwupụta ya ekwupụta mgbe onye ọzọ kpechara ekpere n’ihu ọha, o gosiri na anyị kwadoro ihe onye ahụ kpere n’ekpere. Ka anyị tụlee ihe ndị ọzọ mere o ji dị mkpa ikwe “amen.”

Ọ na-egosi na anyị na-ege ntị n’ekpere n’ihi na o so n’ofufe anyị na-efe Chineke. Ihe na-egosi na anyị na-efe Chineke mgbe a na-ekpe ekpere abụghị naanị ikwe “amen” ma e kpechaa ekpere, kama otú anyị si akpa àgwà mgbe a na-ekpe ekpere. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka “amen” anyị ga-ekwe si anyị n’obi, anyị kwesịrị ịkpa àgwà ọma ma gee ntị nke ọma mgbe a na-ekpe ekpere.

Ọ na-eme ka anyị dịrị n’otu. Ekpere a na-ekpe mgbe anyị bịara ọmụmụ ihe na-eme ka uche anyị na ụmụnna anyị dịrị n’ihe a na-ekpe n’ekpere. (Ọrụ 1:14; 12:5) Ọ bụrụ na anyị niile ejiri otu obi kwee “amen,” ọ ga-eme ka anyị na ụmụnna anyị dịrịkwuo n’otu. Ma ànyị kwuru ya n’obi anyị ma ọ bụkwanụ kwupụta ya ekwupụta, o nwere ike ime ka Jehova mee ihe anyị rịọrọ ya.

“Amen” anyị na-ekwe na-eme ka a na-eto Jehova

Ọ na-eme ka anyị na-eto Jehova. Jehova na-ahụ ihe niile anyị na-eme n’ofufe ya. (Luk 21:2, 3) Ọ na-ahụ ihe anyị bu n’obi na-efe ya nakwa ihe dị anyị n’obi. Ọ bụrụgodị na ọ bụ ekwentị ka anyị ji egere ihe ndị a na-eme n’ọmụmụ ihe, ka obi sie anyị ike na Jehova ga-anụ “amen” anyị ji obi anyị kwee. Ọ bụrụ na anyị ekwe “amen,” anyị na-eso ụmụnna anyị ndị nọ n’ọmụmụ ihe na-eto Jehova.

Anyị nwere ike ịna-eche na “amen” anyị kwere enweghị uru ọ bara, ma Jehova ji ya kpọrọ ezigbo ihe. Otu akwụkwọ na-akọwa Baịbụl kwuru, sị: “Okwu a ka ndị na-efe Chineke ji egosi na ihe ha kwuru si ha n’obi, nakwa na ha nwere obi ike ma nwee olileanya na Chineke ga-aza ekpere ha.” Ka “amen” ọ bụla anyị kwere bụrụ ihe na-atọ Jehova ụtọ.—Ọma 19:14.