Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Olee otú mmadụ si eji ụgbọ mmiri eme njem n’oge ochie?

N’OGE Pọl, e nweghị ụgbọ mmiri na-ebu naanị ndị njem. Mmadụ chọọ iji ụgbọ mmiri mee njem, ọ ga-ebu ụzọ jụọ ajụjụ iji mara ma è nwere ụgbọ mmiri ndị ahịa ga-aga ebe ahụ ọ chọrọ ịga ga-ekwe ebu ya aga ebe ahụ. (Ọrụ 21:​2, 3) Ọ bụrụgodị na e nweghị ụgbọ mmiri na-aga ebe onye ahụ chọrọ ịga, ụgbọ mmiri ahụ ọ bara rute ebe ọ ga-akwụsị, o nwere ike ịchọ ụgbọ mmiri ọzọ ga-ebuga ya ebe dị nso n’ebe ọ chọrọ ịga.​—Ọrụ 27:​1-6.

Ụgbọ mmiri na-enwekarị oge ọ na-eji aga n’afọ, a naghịkwa enwe ụbọchị a kpọrọ aha ụgbọ mmiri ji apụ na mgbe o ji abata. Ndị na-akwọ ụgbọ mmiri nwere ike ịkagbu ụbọchị ha chọrọ ime njem ma ọ bụrụ na oké ifufe na-efe ma ọ bụkwanụ n’ihi nkwenkwe ụgha. Dị ka ihe atụ, ha agaghị akwọrọ ụgbọ mmiri ha pụọ ma e nwee ihe ha chere ga-egosi na ihe ọjọọ ga-eme, dị ka ma ha nụ ka ugoloọma nọ n’elu ụgbọ mmiri bee ubé ma ọ bụ hụ ụgbọ mmiri kpọkara akpọka n’ụsọ osimiri. Ndị na-akwọ ụgbọ mmiri na-eji oge oké ifufe na-anaghị efe eme njem, ọ bụkwa mgbe ahụ ka ha na-esi n’ọdụ ụgbọ mmiri kwọrọ ụgbọ mmiri ha pụọ. Ọ bụrụ na onye njem achọpụta ụgbọ mmiri ga-ebu ya eme njem, ọ na-eburu ihe ya gaa n’ebe dị nso n’ọdụ ụgbọrọ mmiri ahụ ma na-eche mgbe a ga-ama ọkwa na ụgbọ mmiri ahụ ga-apụ n’oge na-adịghị anya.

Otu onye na-akọ akụkọ ihe mere eme aha ya bụ Lionel Casson kwuru, sị: “Obodo Rom na-adịrị ndị mmadụ mfe inweta ụgbọ mmiri ga-ebu ha eme njem, n’ihi ya, ha anaghị aga n’ọdụ ụgbọ mmiri gaa chọwa ụgbọ mmiri ga-ebu ha. Ọdụ ụgbọ mmiri dị na Rom dị n’ebe e si abanye Osimiri Taịba. E nwere nnukwu mbara ámá na ọfịs dị iche iche n’obodo Ostia nke dị nso n’ebe ahụ. Ọ bụ ụlọ ọrụ ndị na-eji ụgbọ mmiri eburu ndị mmadụ ibu nwe ọtụtụ n’ime ọfịs ndị a. Otu bụ nke ndị Nabọn [ebe a na-akpọ Frans ugbu a], otu bụkwa nke ndị Katej [ebe a na-akpọ Tunisia ugbu a], . . . nakwa ndị ọzọ. Naanị ihe onye ọ bụla chọrọ iji ụgbọ mmiri mee njem ga-eme bụ ịkpọtụrụ ọfịs nke na-anọchite anya obodo ndị ahụ nọ n’ụzọ ebe ụgbọ mmiri ahụ ga-esi aga.”

Ịba ụgbọ mmiri n’oge ochie na-ebelata oge ndị mmadụ ji eme njem, ma o nwekwara ọghọm nke ya. Mgbe Pọl na-eje ozi ala ọzọ ya, e nwere ọtụtụ ugboro ụgbọ ọ nọ n’ime ya kpuru.​—2 Kọr. 11:25.