Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ 20

Ịkasi Ndị E Metọrọ Mgbe Ha Bụ Ụmụaka Obi

Ịkasi Ndị E Metọrọ Mgbe Ha Bụ Ụmụaka Obi

“Chineke nke nkasi obi . . . na-akasi anyị obi ná mkpagbu anyị niile.”—2 KỌR. 1:3, 4.

ABỤ 134 Ụmụ Bụ Onyinye Si n’Aka Chineke

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1-2. (a) Gịnị gosiri na ụmụ mmadụ chọrọ ka a na-akasi ha obi, nakwa na ha nwere ike ịkasi ndị ọzọ obi? (b) Olee ihe a na-eme ụmụaka ụfọdụ na-akpa ha aka ọjọọ?

ỤMỤ MMADỤ na-achọkarị ka a na-akasi ha obi. Ha nwekwara ike ịkasi ndị ọzọ obi. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na nwatakịrị adaa merụọ ahụ́ n’ikpere mgbe ọ na-egwu egwu, o nwere ike ibere ákwá gakwuru mama ya ma ọ bụ papa ya. Ha enweghị ike ime ka ọnyá ya laa, ma ha nwere ike ịkasi ya obi. Ha nwere ike ịjụ ya ihe merenụ, kuru ya, hichaa ya anya mmiri ma gwa ya okwu ga-emeda ya obi. Ha nwekwara ike ite ya ọgwụ ma ọ bụ jiri ákwà kechie ọnyá ahụ. Obere oge, nwa ahụ akwụsị ibe ákwá, o nwedịrị ike laghachi gwuwa egwu. Ka oge na-aga, ọnyá ya alaa.

2 Ma mgbe ụfọdụ, e nwere ihe ndị na-eme ụmụaka na-akpa ha aka ọjọọ karịadị mmerụ ahụ́ nkịtị. E nwere ndị a na-emetọ. E nwere ike imetọ ha otu ugboro ma ọ bụkwanụ ruo ọtụtụ afọ. Nke ọ bụla ọ bụ, ihe ahụ e mere ha nwere ike ịgbawa ha obi nke ukwuu, ọ naghịkwa apụ ha apụ n’obi. Mgbe ụfọdụ, a na-ejide onye mere ihe ahụ ma taa ya ahụhụ. N’oge ndị ọzọ, a naghị ejide ya, ya adịzie ka ọ laferela. Ọ bụrụgodị na a taa onye metọrọ nwatakịrị ahụ ahụhụ ozugbo ihe ahụ mere, obi ka nwere ike ịna-agbawa nwa ahụ ruo mgbe o toro.

3. Dị ka e kwuru ná 2 Ndị Kọrịnt 1:3, 4, gịnị ka Jehova chọrọ ka anyị na-eme, gịnịkwa bụ ajụjụ ndị anyị ga-atụle?

3 Ọ bụrụ na mmetọ e metọrọ nwanna mgbe ọ bụ nwata ka na-agbawa ya obi, olee otú anyị nwere ike isi nyere ya aka? (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 1:3, 4.) O doro anya na Jehova chọrọ ka a hụ ụmụ ya n’anya ma na-akasi ha obi. N’ihi ya, ka anyị tụlee ajụjụ atọ ndị a: (1) Gịnị mere e ji kwesị ịkasi ndị e metọrọ mgbe ha dị obere obi? (2) Ònye nwere ike ịkasi ha obi? (3) Olee otú anyị nwere ike isi kasie ha obi?

GỊNỊ MERE E JI KWESỊ ỊKASI HA OBI?

4-5. (a) Gịnị mere anyị ji kwesị ịghọta na nwatakịrị dị iche na dimkpa? (b) Olee otú mmetọ e metọrọ nwatakịrị nwere ike isi mee ka ọ ghara ịna-atụkwasị ndị ọzọ obi?

4 E nwekwara ụfọdụ ndị e metọrọ mgbe ha dị obere e kwesịrị ịkasi obi, n’agbanyeghị na ọtụtụ afọ agafeela kemgbe ihe ahụ mere. N’ihi gịnị? Ka anyị nwee ike ịmata ihe e ji kwesị ịkasi ha obi, anyị kwesịrị ịghọta na ụmụntakịrị dị iche ná ndị dimkpa. Otú ihe si emetụta nwatakịrị dị iche n’otú o si emetụta dimkpa. Ka anyị tụlee ihe atụ ụfọdụ.

5 Ụmụaka na ndị na-elekọta ha kwesịrị ịdị n’ezigbo mma, ha atụkwasịkwa ha obi. Ụdị adịm ná mma a na-eme ka obi na-eru ụmụaka ala, na-emekwa ka ha na-atụkwasị ndị hụrụ ha n’anya obi. (Ọma 22:9) Ma ọ dị mwute na ọ na-abụkarị n’ebe nwatakịrị bi ka a na-anọ emetọ ya. Ọ bụkwa ndị ezinụlọ ha na ndị ha na ndị ezinụlọ ha dị ná mma na-akpakarị arụ a. Ọ bụrụ na onye nwatakịrị tụkwasịrị obi emee ya ụdị ihe a, o nwere ike ime ka o siere ya ike ịtụkwasị ndị ọzọ obi, ma mgbe o toro.

6. Gịnị mere imetọ ụmụaka ji bụrụ arụrụala?

6 Ụmụaka enweghị ike ichebe onwe ha, imetọ ha bụkwa arụrụala. Ịmanye ụmụaka ime ihe ndị gbasara mmekọahụ ọtụtụ afọ tupu ha eruo ịlụ di ma ọ bụ nwunye, bụ́ mgbe ha kwesịrị inwe mmekọahụ, ga-akpa ha aka ọjọọ. E metọọ nwatakịrị, o nwere ike ime ka ọ ghara ịna-ele mmekọahụ anya otú kwesịrị ekwesị. O nwekwara ike ime ka ọ na-eche na ya abaghị uru, meekwa ka ọ ghara ịtụkwasị ndị ọzọ obi.

7. (a) Gịnị mere o ji adịrị ndị mmadụ mfe ịrata ụmụaka ma metọọ ha, oleekwa otú ndị ahụ nwere ike isi eme ya? (b) Olee nsogbu ụdị ụgha ndị ahụ nwere ike ịkpatara ụmụaka?

7 Ụmụaka amachaghị otú e si echebara ihe echiche, ha amachaghịkwa otú ha ga-esi achọpụta ihe nwere ike ịkpatara ha nsogbu ma zere ya. (1 Kọr. 13:11) N’ihi ya, ọ na-adịrị ndị na-emetọ ụmụaka mfe ịrata ha. Ndị na-emetọ ụmụaka na-aghara ha okpotokpo ụgha. Dị ka ihe atụ, ha na-agwa ha na ihe ahụ merenụ si ụmụaka ahụ n’aka, na ha ekwesịghị ịgwa onye ọ bụla ihe e mere ha. Ha na-agwakwa ha na onye toro eto na nwatakịrị ime ụdị omume rụrụ arụ a bụ ụzọ ha si egosi na ha hụrụ ibe ha n’anya. O nwere ike iwe ọtụtụ afọ tupu nwatakịrị amata na ihe ndị ahụ a gwara ya bụ ụgha. Nwatakịrị ahụ nwere ike itolite na-eche na ya abaghị uru, nakwa na o nweghị onye ga-ahụli ya n’anya ma ọ bụ kasie ya obi.

8. Gịnị mere obi kwesịrị iji sie anyị ike na Jehova ga-akasili ndị e mere ihe ọjọọ obi?

8 O doro anya na mmetọ e metọrọ ụmụaka nwere ike ịkpa ha aka ọjọọ ruo ọtụtụ afọ. Ọ bụ ya mere o ji jọgbuo onwe ya. Otú a e si na-emetọ ụmụaka ebe niile na-egosi na anyị bi n’oge ikpeazụ, mgbe ọtụtụ ndị ga-abụ “ndị na-enweghị obi mmadụ” nakwa mgbe “ndị ajọ mmadụ na ndị nduhie ga na-ajọwanye njọ.” (2 Tim. 3:1-5, 13) Atụmatụ Setan jọgburu onwe ya. Ọ dịkwa mwute na ọtụtụ ndị na-eme ihe na-amasị ya. Ma, Jehova ka Ekwensu na ndị na-eme ihe ọ na-achọ ike. Ọ ma atụmatụ Setan. Obi siri anyị ike na Jehova ma ihe niile anyị na ha na-alụ, o nwekwara ike ịkasi anyị obi. Obi dị anyị ụtọ na anyị na-efe “Chineke nke nkasi obi niile . . . , onye na-akasi anyị obi ná mkpagbu anyị niile, ka anyị wee nwee ike ịkasi ndị nọ n’ụdị mkpagbu ọ bụla obi site ná nkasi obi nke Chineke na-akasi anyị onwe anyị.” (2 Kọr. 1:3, 4) Oleezi ndị Jehova na-eji akasi anyị obi?

ÒNYE NWERE IKE ỊKASI HA OBI?

9. Dị ka Eze Devid kwuru n’Abụ Ọma 27:10, gịnị ka Jehova ga-emere ndị nne na nna ha na-elekọghị otú kwesịrị ekwesị?

Ndị e kwesịrị ịkasi obi karịchaa bụ ndị nne na nna ha leghaara anya e metọọ ha nakwa ndị ndị ha tụkwasịrị obi metọrọ. Ọbụ abụ bụ́ Devid ma na anyị kwesịrị ịtụkwasị Jehova obi na ọ ga na-akasi anyị obi. (Gụọ Abụ Ọma 27:10.) Obi siri Devid ike na Jehova ga-aghọrọ onye ọ bụla ndị ezinụlọ ha na-emegbu Nna. Olee otú Jehova si eme ya? Ọ na-eji ndị na-efe ya eme ya. Ndị anyị na ha na-efe Jehova yiri ndị ezinụlọ anyị. Dị ka ihe atụ, Jizọs kwuru na ndị sooro ya fewe Jehova bụ ụmụnne ya ndị nwoke na ụmụnne ya ndị nwaanyị na nne ya.—Mat. 12:48-50.

10. Olee otú Pọl si kọwaa ọrụ ya dị ka okenye?

10 Ka anyị tụlee otu ihe atụ gosiri otú ndị nọ n’ọgbakọ si yie otu ezinụlọ. Pọl onyeozi bụ ezigbo okenye nke ji ozi ya kpọrọ ihe. O mere ihe anyị kwesịkwara ịna-eme. Chineke nyekwara ya mmụọ nsọ, ya agwa ndị ọzọ ka ha na-eṅomi ya otú yanwa si na-eṅomi Kraịst. (1 Kọr. 11:1) Legodị otú Pọl si kọwaa ozi ya ka okenye. O kwuru, sị: “Anyị ghọrọ ndị dị nwayọọ n’etiti unu, dị ka mgbe nne nke na-enye nwa ara na-elekọta ụmụ ya.” (1 Tesa. 2:7) Mgbe ndị okenye ji Akwụkwọ Nsọ na-akasi ụmụnna ha obi, ha kwesịrị iji okwu ọma mee ka obi ruo ha ala.

Mgbe ụfọdụ, ụmụnna nwaanyị ma nke a na-akọ na-eme nke ọma n’ịkasi ndị ọzọ obi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11) *

11. Gịnị gosiri na ọ bụghị naanị ndị okenye nwere ike ịkasi ụmụnna ha obi?

11 Ọ̀ bụ naanị ndị okenye kwesịrị ịkasi ụmụnna ndị e metọrọ mgbe ha bụ nwata obi? Mba. Anyị niile kwesịrị ‘ịna-akasirịta ibe anyị obi.’ (1 Tesa. 4:18) Ụmụnna nwaanyị ma nke a na-akọ nwere ike ịkacha enyere ụmụnna nwaanyị e kwesịrị ịkasị obi aka. Ọ dabara adaba na Jehova ji onwe ya tụnyere nne na-akasi nwa ya obi. (Aịza. 66:13) Baịbụl kwukwara gbasara ụmụ nwaanyị ndị kasiri ndị ọdachi dakwasịrị obi. (Job 42:11) Obi na-atọgbu Jehova atọgbu ma ọ hụ ka ụmụnna nwaanyị na-akasi ụmụnna nwaanyị ibe ha ihe na-enye nsogbu n’obi obi. Mgbe ụfọdụ, ndị okenye nwere ike ịgwa nwanna nwaanyị ma nke a na-akọ ka o nyere nwanna nwaanyị ụdị ihe a mere aka. *

OLEE OTÚ ANYỊ NWERE IKE ISI AKASI HA OBI?

12. Olee ihe anyị na-ekwesịghị ime?

12 N’eziokwu, anyị ekwesịghị ịghụ ụmụnna anyị ọnụ ka ha kọọrọ anyị ihe ha na-achọghị ịkọrọ anyị. (1 Tesa. 4:11) Gịnịzi ka anyị nwere ike ime iji nyere ndị chọrọ enyemaka na nkasi obi aka? Ka anyị tụlee ihe ise anyị mụtara na Baịbụl anyị nwere ike ime iji nyere ndị ọzọ aka.

13. Dị ka e kwuru ná 1 Ndị Eze 19:5-8, gịnị ka mmụọ ozi Jehova meere Ịlaịja, oleekwa otú anyị nwere ike isi eṅomi mmụọ ozi ahụ?

13 Mee ihe nwere ike inyere onye na-ata ahụhụ aka. Mgbe Ịlaịja onye amụma na-agba ọsọ ndụ, ọ dara mbà n’obi nke na ọ chọrọ ka ọnwụ bịa gburu ya. Jehova ziteere ya otu mmụọ ozi dị ike ka ọ gbaa ya ume. Mmụọ ozi ahụ meere Ịlaịja ihe dị ya mkpa mgbe ahụ. O nyere ya nri dị ọkụ ma gbaa ya ume ka o rie ya. (Gụọ 1 Ndị Eze 19:5-8.) Akụkọ ahụ kụziiri anyị ihe bara ezigbo uru. Ọ na-akụziri anyị na obere ihe anyị meere mmadụ nwere ike inyere ya ezigbo aka. Ịkpọ onye dara mbà n’obi ka o soro anyị rie nri, inye ya obere onyinye ma ọ bụ ịkpọ ya n’ekwentị nwere ike ime ka obi sie ya ike na anyị hụrụ ya n’anya, nakwa na ihe banyere ya na-emetụ anyị n’obi. Ọ bụrụ na ọ dịghịrị anyị mfe iso mmadụ kwurịta otú obi dị ya, anyị nwere ike imere ya ihe ndị a ga-abara ya uru.

14. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’akụkọ Ịlaịja?

14 Mee ka obi ruo onye dara mbà n’obi ala. E nwekwara ihe ọzọ anyị nwere ike ịmụta n’akụkọ Ịlaịja. Jehova rụrụ ọrụ ebube nye onye amụma a ike o ji mee ogologo njem ruo Ugwu Horeb. Ọ ga-abụ na obi ruru Ịlaịja ala mgbe ọ nọ n’ebe a dị anya Jehova na ndị ya nọ gbaa ndụ n’oge gara aga. O nwere ike ịbụ na o chere na ya nọzi n’ebe dị anya n’ebe ndị ahụ na-achọ igbu ya nọ. Gịnị ka anyị na-amụta n’akụkọ a? Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịkasi onye e metọrọ obi, anyị kwesịrị ibu ụzọ mee ka obi ruo ya ala. Dị ka ihe atụ, ndị okenye kwesịrị icheta na ahụ́ nwere ike ịka eru nwanna nwaanyị dara mbà n’obi ala ma a nọrọ n’ụlọ ya na-akasi ya obi karịa ịnọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. O nwekwara ike ịkara nwanna nwaanyị ọzọ mma ma a nọrọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze kasie ya obi.

Anyị nwere ike ịkasi mmadụ obi ma anyị gee ya ntị nke ọma, si n’obi anyị kpeere ya ekpere ma họrọ okwu ndị ga-akasi ya obi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15 ruo na nke 20) *

15-16. Gịnị ka ige mmadụ ntị nke ọma pụtara?

15 Na-ege ntị nke ọma. Baịbụl nyere anyị ndụmọdụ a doro anya: “Onye ọ bụla aghaghị ịbụ onye na-anụ ihe ngwa ngwa, onye na-adịghị ekwu okwu ngwa ngwa.” (Jems 1:19) Ànyị na-ege ntị nke ọma? Anyị nwere ike iche na ige ntị nke ọma bụ ịgbachi nkịtị, na-ele onye ahụ sọ anya mgbe ọ na-ekwu okwu. Ma, o nwere ihe ọzọ anyị ga-eme iji gosi na anyị na-ege ntị nke ọma. Dị ka ihe atụ, Ịlaịja gwara Jehova ihe niile dị ya n’obi, Jehova gekwara ya ntị nke ọma. Jehova chọpụtara na ụjọ ji Ịlaịja nakwa na o chere na ọ bụ naanị ya bụ onye na-efe Chineke fọrọnụ. Ọ chọpụtakwara na Ịlaịja chere na ihe niile ya mere bụ ịkwọ aka tiere ọkụkọ akị. Jehova nyeere ya aka ịkwụsị iche otú ahụ. Ihe o mere gosiri na o gere Ịlaịja ntị nke ọma.—1 Eze 19:9-11, 15-18.

16 Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị nweere onye na-agwa anyị okwu ọmịiko mgbe anyị na-ege ya ntị? Mgbe ụfọdụ, okwu ọma ole na ole anyị họrọ ahọ gwa ya nwere ike igosi otú ihe ọ na-agwa anyị dị anyị n’obi. I nwere ike ịgwa ya, sị: “O wutere m na ụdị ihe a mere gị. Ihe a e mere gị jọgburu onwe ya.” I nwekwara ike ịjụ ya ajụjụ ụfọdụ ka i jide n’aka na ị ghọtara ihe ọ na-agwa gị. I nwere ike ịgwa ya, sị: “Biko, kwughachigodị ihe ahụ i kwuru,” ma ọ bụ gị ajụọ ya, sị: “Mgbe i kwuru ihe ahụ, ihe m ghọtara bụ na . . . Ọ̀ kwa ya?” Okwu ndị dị otú a ga-eme ka onye ahụ mata na ị na-ege ya ntị nke ọma, nakwa na ị na-agba mbọ ịghọta ihe ọ na-ekwu.—1 Kọr. 13:4, 7.

17. Gịnị mere anyị ji kwesị inwe ndidi ma ghara ịna-ekwu “okwu ngwa ngwa”?

17 Ma, kpachara anya ka ị ghara ikwu “okwu ngwa ngwa.” I kwesịghị ịnara onye ahụ okwu n’ọnụ ebe ị na-achọ ka i nye ya ndụmọdụ ma ọ bụ ka ị gbazie echiche ya. Nweere ya ndidi. Mgbe Ịlaịja mechara gwa Jehova otú ọ dị ya n’obi, o kwuru okwu otú gosiri na obi adịghị ya mma. Mgbe Jehova mechara ihe ndị kwesịrị ime ka obi sikwuo Ịlaịja ike, Ịlaịja kwughachikwara ihe ndị ahụ o kwuru na mbụ. (1 Eze 19:9, 10, 13, 14) Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’akụkọ a? Mgbe ụfọdụ, ndị ihe na-enye nsogbu n’obi nwere ike ikwu ihe na-enye ha nsogbu ihe karịrị otu ugboro. Anyị kwesịrị ige ha ntị nke ọma, otú ahụ Jehova gere Ịlaịja. Kama ịgwawa ha ihe ha ga-eme, anyị kwesịrị inwere ha ọmịiko.—1 Pita 3:8.

18. Olee otú ekpere anyị nwere ike isi gbaa onye dara mbà n’obi ume?

18 Si n’obi gị kpeere onye ahụ ekpere. O nwere ike isiri onye dara mbà n’obi ike ikpe ekpere. O nwekwara ike ịna-eche na Jehova agaghị anụ ekpere ya. Anyị gaa ịkasi onye ahụ obi, anyị nwere ike ikpere ya ekpere. Anyị na ya kpewe ekpere, anyị kwesịrị ịkpọ aha ya n’ekpere ahụ. Anyị nwere ike ịgwa Jehova na anyị na ụmụnna anyị hụrụ nwanna a n’anya. Anyị nwekwara ike ịrịọ Jehova ka ọ kasie nwa ya a ọ hụrụ n’anya obi ma mee ka obi ruo ya ala. Ụdị ekpere a na-akasi onye ike ụwa gwụrụ obi.—Jems 5:16.

19. Olee otú anyị ga-esi akwadebe ma anyị chọọ ịga kasie mmadụ obi?

19 Họrọ okwu ndị ga-akasi ya obi. Chee echiche nke ọma tupu gị agwa ya okwu. Okwu e kwuru n’echeghị echiche nwere ike ịgbawa mmadụ obi. Ma, okwu ọma na-agwọ ọrịa. (Ilu 12:18) N’ihi ya, rịọ Jehova ka o nyere gị aka ịhọrọ okwu ndị ga-akasi ya obi ma mee ka ahụ́ ruo ya ala. Cheta na o nweghị okwu ọ bụla ga-akpa ike karịa okwu Jehova e dere na Baịbụl.—Hib. 4:12.

20. Gịnị ka ụfọdụ ụmụnna e metọrọ mgbe ha dị obere nwere ike ịna-eche, gịnịkwa ka anyị kwesịrị ichetara ha?

20 Ndị e metọrọ n’oge gara aga nwere ike ịna-eche na ha adịkwaghị ọcha, na o nweghị uru ha bara ma ọ bụ na o nweghị onye ga-ahụli ha n’anya. Ihe ndị a niile bụ ụgha chara acha. N’ihi ya, jiri Okwu Chineke chetara ha na Jehova hụrụ ha n’anya. (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Nkasi Obi Sitere n’Akwụkwọ Nsọ.”) Cheta otú mmụọ ozi Jehova si gbaa Daniel ume mgbe ike gwụrụ ya. Jehova chọrọ ka nwoke a bụ enyi ya mara na ọ hụrụ ya n’anya nke ukwuu. (Dan. 10:2, 11, 19) Otú ahụkwa ka Jehova hụrụ ụmụnna anyị ihe na-enye nsogbu n’obi n’anya.

21. Gịnị ga-eme ndị niile na-eme ihe ọjọọ na-ekweghị echegharị, gịnịkwa ka anyị kwesịrị ikpebisi ike imere ndị e mere ihe ọjọọ?

21 Mgbe anyị na-akasi ndị mmadụ obi, anyị na-echetara ha na Jehova hụrụ ha n’anya. Anyị kwesịkwara icheta na Jehova bụ Chineke na-ekpe ikpe ziri ezi. Ọ ma banyere onye ọ bụla e metọrọ, ọ bụrụgodị na e nweghị onye ọzọ manụ. Jehova na-ahụ ihe niile. Ọ ga-enyerịrị ndị niile na-eme ihe ọjọọ na-ekweghị echegharị ntaramahụhụ. (Ọnụ Ọgụ. 14:18) Tupu mgbe ahụ, ka anyị mee ihe niile anyị nwere ike ime iji nyere ndị e metọrọ n’oge ha bụ nwata aka. Obi dị anyị ụtọ na anyị ma na Jehova ga-eme ka ndị niile Setan na ụwa ya metọrọ nweta onwe ha ọzọ. N’oge na-adịghị anya, ihe mgbu niile ha nwere agaghịzi abata ha n’obi.—Aịza. 65:17.

ABỤ 109 Jirinụ Obi Unu Niile Hụ Ibe Unu n’Anya

^ par. 5 Ndị e metọrọ n’oge ha bụ ụmụaka ka nwere ike ịna-enwe ọtụtụ ihe ga na-enye ha nsogbu n’obi, a sịgodị na o meela ọtụtụ afọ ihe ahụ mere. Isiokwu a ga-enyere anyị aka ịmata ihe kpatara ya. Anyị ga-amatakwa ndị nwere ike ịkasi ha obi. N’ikpeazụ, anyị ga-atụle ụzọ ụfọdụ anyị nwere ike isi akasi ha obi.

^ par. 11 Ọ bụ onye ahụ e metọrọ ga-ekpebi ma ọ̀ ga-aga hụ dọkịta ka o nyere ya aka ma ọ bụ na ọ gaghị aga.

^ par. 76 NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna nwaanyị katarala ahụ́ na-akasi nwanna nwaanyị ọzọ obi.

^ par. 78 NKỌWA FOTO: Ebe ndị okenye gara ileta nwanna nwaanyị ahụ. Ọ kpọrọ nwanna nwaanyị ahụ katarala ahụ́ ka ọ nọrọ ya.