Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ 24

Na-akụghasị Echiche Na-ezighị Ezi nke Na-emegide Ihe Ọmụma Chineke

Na-akụghasị Echiche Na-ezighị Ezi nke Na-emegide Ihe Ọmụma Chineke

“Anyị na-akụghasị echiche na-ezighị ezi na ihe ọ bụla dị elu nke na-emegide ihe ọmụma Chineke.”—2 KỌR. 10:5.

ABỤ NKE 124 Hụ Jehova na Ụmụnna Anyị n’Anya

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Olee ihe Pọl onyeozi gwara Ndị Kraịst e tere mmanụ?

E NWERE ihe Pọl onyeozi gwara Ndị Kraịst ibe ya ka ha ‘kwụsị.’ Olee ihe ọ bụ? Ọ sịrị: “Kwụsịkwanụ ịbụ ndị na-eme omume dị ka usoro ihe nke a si dị.” (Rom 12:2) Ọ bụ ndị Kraịst n’oge ndịozi ka Pọl gwara ihe ahụ. Gịnị mere o ji gwa Ndị Kraịst ndị ahụ nyeferela Chineke onwe ha, e jirikwa mmụọ nsọ tee ha mmanụ, okwu ahụ?—Rom 1:7.

2-3. Olee otú Setan si agbalị ime ka anyị kwụsị ife Jehova, oleekwa otú anyị nwere ike isi wepụ ihe ndị “gbanyesịrị mgbọrọgwụ ike” n’uche anyị?

2 Ihe na-echu Pọl ụra bụ na echiche ndị na-adịghị mma nke ụwa Setan akpawala ụfọdụ Ndị Kraịst aka ọjọọ. (Efe. 4:17-19) Ụdị ihe a nwekwara ike ime onye ọ bụla n’ime anyị. Setan, bụ́ chi nke usoro ihe a fooro ntụtụ taa na ya ga-eme ka anyị kwụsị ife Jehova. Ọ bụ ya mere o ji eji ụzọ dị iche iche achọ ka ọ rata anyị. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị chọrọ ịbụ ndị a ma ama ma ọ bụ ndị a na-akwanyere ùgwù, o nwere ike ịchọ iji ya mee ka anyị kwụsị ịna-efe Jehova. O nwekwara ike iji ihe ndị anyị mụtara n’ụlọ anyị, n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ n’aka ndị anyị na ha na-emekọrịta ihe, mee ka anyị na-eche echiche otú ọ chọrọ.

3 Ànyị nwere ike iwepụ “ihe ndị gbanyesiri mgbọrọgwụ ike” n’obi anyị? (2 Kọr. 10:4) Pọl kwuru banyere ya, sị: “Anyị na-akụghasị echiche na-ezighị ezi na ihe ọ bụla dị elu nke na-emegide ihe ọmụma Chineke; anyị na-emerikwa echiche ọ bụla iji mee ka ọ na-erubere Kraịst isi.” (2 Kọr. 10:5) Jehova ga-enyeliri anyị aka ịgbanwe echiche na-adịghị mma anyị nwere. Otú ahụ ọgwụ nwere ike igbu ọrịa ndị dị anyị n’ahụ́, ka Okwu Chineke nwere ike ime ka anyị gbanwee echiche na-adịghị mma ụwa Setan na-eme ka anyị nwee.

‘IME KA UCHE GỊ DỊ ỌHỤRỤ’

4. Olee mgbanwe ọtụtụ n’ime anyị mere mgbe anyị mụtara ihe Baịbụl na-akụzi?

4 Chegodị banyere mgbanwe ndị i kwesịrị ime mgbe ahụ ị mụtara ihe Baịbụl na-akụzi ma kpebie ife Jehova. Ka anyị nwee ike ife Jehova, ọtụtụ n’ime anyị kwụsịrị àgwà ọjọọ anyị na-akpa. (1 Kọr. 6:9-11) Obi dị anyị ụtọ na Jehova nyeere anyị aka ịkwụsị ihe ndị ahụ na-adịghị mma anyị na-eme.

5. Olee ihe abụọ Ndị Rom 12:2 kwuru ka anyị na-eme?

5 Ma anyị ekwesịghị iche na okwu agwụla. N’agbanyeghị na anyị akwụsịla ime mmehie ndị dị oké njọ anyị na-eme tupu e mee anyị baptizim, anyị ga na-agbasi mbọ ike ka anyị zere ihe ọ bụla nwere ike ime ka anyị mee ihe ndị ahụ ọzọ. Olee otú anyị nwere ike isi eme ya? Pọl kwuru, sị: “Kwụsịkwanụ ịbụ ndị na-eme omume dị ka usoro ihe nke a si dị, kama gbanweenụ site n’ime ka uche unu dị ọhụrụ.” (Rom 12:2) N’ihi ya, e nwere ihe abụọ anyị ga-eme. Nke mbụ bụ na anyị kwesịrị ‘ịkwụsị ịbụ ndị na-eme omume’ otú ụwa a si eme. Nke abụọ abụrụ na anyị kwesịrị ‘ịgbanwe’ site n’ime ka uche anyị dị ọhụrụ.

6. Olee ihe ndị anyị na-amụta n’ihe Jizọs kwuru na Matiu 12:43-45?

6 Mgbanwe ahụ Pọl kwuru banyere ya abụghị naanị ịgbanwe otú anyị dị n’anya. Ọ gbasara ndụ anyị niile. (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Ànyị Agbanweela Kpamkpam Ka Ò Yiri Ka Anyị Agbanweela?”) Ọ pụtara na anyị ga-agbanwe otú anyị si eche echiche, àgwà anyị na ihe ndị na-agụ anyị agụụ. N’ihi ya, anyị niile kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: ‘Mgbanwe ndị m na-eme iji bụrụ Onye Kraịst, ọ̀ bụ naanị n’anya ndị ọzọ, ka m na-aghọ Onye Kraịst n’eziokwu n’obi m na n’uche m?’ Jizọs kwuru ihe anyị kwesịrị ime na Matiu 12:43-45. (Gụọ ya.) Ihe ahụ Jizọs kwuru na-akụziri anyị otu eziokwu gbara ọkpụrụkpụ. Ọ na-akụziri anyị na iwepụ ihe ọjọọ n’obi anyị abụghị ebe okwu biri. Anyị kwesịrị iji ihe ndị dị Chineke mma dochie ya.

‘MEE KA IKE NKE NA-EDUZI UCHE GỊ DỊ ỌHỤRỤ’

7. Olee otú anyị nwere ike isi agbanwe obi anyị na uche anyị?

7 Ànyị ga-agbanweli obi anyị na uche anyị? Okwu Chineke kwuru, sị: “Unu kwesịrị ime ka ike nke na-eduzi uche unu dị ọhụrụ, unu kwesịkwara iyiri mmadụ ọhụrụ ahụ nke e kere dị ka uche Chineke si dị, n’ezi omume na iguzosi ike n’ihe.” (Efe. 4:23, 24) Ihe a Baịbụl kwuru gosiri na anyị ga-agbanweli obi anyị na uche anyị, ma ime otú ahụ adịchaghị mfe. Ihe anyị ga-eme abụghị naanị ịgba mbọ ka anyị wepụ ihe ọjọọ na-agụ anyị n’obi anyị nakwa ịkwụsị ime ihe ndị na-adịghị mma. Anyị kwesịkwara ịgbanwe “ike nke na-eduzi uche” anyị. Ọ pụtara na anyị ga-agbanwe ihe ndị na-agụ anyị agụụ, àgwà anyị, nakwa ihe ndị mere anyị ji eme ihe ndị anyị na-eme. Anyị ga na-agbasi mbọ ike ka anyị nwee ike ime ya.

8-9. Olee otú ihe mere otu nwanna si gosi ihe mere anyị ji kwesị ịgbanwe ụdị mmadụ anyị bụ n’ime?

8 Ka anyị tụlee ihe banyere otu nwanna na-alụkarị ọgụ n’oge gara aga. Mgbe ọ kwụsịrị ịṅụ oké mmanya na ịlụ ọgụ, e mere ya baptizim. Ihe a mere ka ndị mmadụ na-eto Jehova n’ebe ahụ o bi. Ma, obere oge e mechara ya baptizim, ọnwụnwa ọ na-atụghị anya ya bịaara ya. N’otu mgbede, otu nwoke ṅụrụ oké mmanya bịara n’ụlọ ya ma chọọ ka ha lụọ ọgụ. Ná mmalite, nwanna a jidere onwe ya. Ma mgbe nwoke ahụ mechara katọọ aha Jehova, iwe were nwanna ahụ nke na o jidelighị onwe ya. Ọ pụrụ n’èzí ma kụọ nwoke ahụ isi aba okpu. Gịnị mere nwanna a ji mee ihe a o mere? Ọ bụ eziokwu na Baịbụl ọ na-amụ nyeere ya aka ịkwụsịtụ ịlụ ọgụ, o nwebeghị ike ịgbanwe ike nke na-eduzi uche ya, ya bụ, ụdị mmadụ ọ bụ.

9 Ma nwanna ahụ nọgidere na-agba mbọ ka ọ gbanwee ụdị mmadụ ọ bụ. (Ilu 24:16) Ndị okenye nyeere ya aka ịgbanwe. O mechakwara bụrụ okenye. Ma n’otu mgbede, ụdị ihe ahụ mere ya n’oge gara aga mekwara ọzọ. Otu nwoke ṅụrụ oké mmanya bịara ka ọ kụọ otu okenye ihe n’ihu Ụlọ Nzukọ Alaeze. Olee ihe nwanna anyị a mere? O medara obi gwa nwoke ahụ okwu, mee ka obi ya jụrụ, nyekwara ya aka iru n’ụlọ ya. Gịnị mere nwanna ahụ ji mee ihe dị iche ná nke ugbu a? Ọ bụ n’ihi na ọ gbanweela ụdị mmadụ ọ bụ n’ime. N’eziokwu, ọ ghọọla onye na-eme udo na onye dị umeala n’obi. Nke a mekwara ka e too Jehova.

10. Olee ihe ndị anyị kwesịrị ime ka anyị nwee ike ịgbanwe ụdị mmadụ anyị bụ n’ime?

10 Ọ na-ewe oge tupu mmadụ emee mgbanwe ndị ahụ, ọ chọkwara mmadụ ịgbasi mbọ ike. Anyị nwere ike ‘itinye oké mgbalị’ ruo ọtụtụ afọ. (2 Pita 1:5) Mmadụ ife Jehova ọtụtụ afọ abụghị ya ga-eme ka o mee mgbanwe ndị ahụ. Anyị ga-agbasi mbọ ike ka anyị gbanwee ụdị mmadụ anyị bụ. E nwere ihe ndị dị mkpa anyị ga-eme iji nwee ike ịgbanwe. Ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime ha.

OTÚ ANYỊ GA-ESI MEE KA IKE NKE NA-EDUZI UCHE ANYỊ DỊ ỌHỤRỤ

11. Olee otú ekpere si enyere anyị aka ịgbanwe ike nke na-eduzi uche anyị?

11 Ihe mbụ dị mkpa anyị ga-eme bụ ịna-ekpe ekpere. Anyị kwesịkwara ikpe ụdị ekpere a otu ọbụ abụ kpere. Ọ rịọrọ Jehova, sị: “Chineke, biko, mee ka m nwee obi dị ọcha. Tinyekwa mmụọ ọhụrụ, nke iguzosi ike, n’ime m.” (Ọma 51:10) Anyị kwesịrị ikweta na anyị kwesịrị ịgbanwe ike nke na-eduzi uche anyị ma na-arịọ Jehova ka o nyere anyị aka. Gịnị ga-eme ka obi sie anyị ike na Jehova ga-enyere anyị aka ime mgbanwe? Ihe Jehova kwuru na ya ga-emere ndị Izrel obi kpọrọ nkụ n’oge Ezikiel, ga-agba anyị ume. Jehova kwuru, sị: “M ga-enyekwa ha otu obi, m ga-etinyekwa mmụọ ọhụrụ n’ime ha . . . ma nye ha obi nke dị nro dị ka anụ ahụ́, [ya bụ, obi nke na-anabata nduzi Chineke].” (Ezik. 11:19) Jehova dị njikere inyere ndị Izrel ahụ aka ịgbanwe, ọ dịkwa njikere inyere anyị aka.

12-13. (a) Dị ka Abụ Ọma 119:59 kwuru, olee ihe anyị kwesịrị ịna-atụgharị uche na ha? (b) Olee ajụjụ ndị i kwesịrị ịjụ onwe gị?

12 Ihe nke abụọ dị mkpa anyị ga-eme bụ ichebara ihe ndị anyị gụrụ echiche. Ka anyị na-agụ Okwu Chineke kwa ụbọchị, anyị kwesịrị iwepụta oge na-atụgharị uche n’ihe ndị anyị gụrụ ka anyị nwee ike ịmata ihe ndị anyị na-eche n’echiche anyị kwesịrị ịgbanwe. (Gụọ Abụ Ọma 119:59; Hib. 4:12; Jems 1:25) Anyị kwesịrị ịchọpụta àgwà ọ bụla nwere ike ime ka anyị na-eche echiche otú ụwa si eche. Anyị kwesịkwara ikweta n’eziokwu na e nwere ebe ndị anyị na-anaghị eme nke ọma, ma na-agba mbọ ka anyị mewe nke ọma n’ebe ndị ahụ.

13 Dị ka ihe atụ, jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ nwetụrụ anyaụfụ ma ọ bụ ekworo n’obi m?’ (1 Pita 2:1) ‘M̀ na-eche na m ka ndị ọzọ mma n’ihi ebe m si, otú m gụruru akwụkwọ ma ọ bụ n’ihi ego m nwere?’ (Ilu 16:5) ‘M̀ na-eleda ndị ọzọ anya n’ihi na ha enweghị ihe ndị m nwere ma ọ bụ na mụ na ha esighị n’otu agbụrụ?’ (Jems 2:2-4) ‘Ihe ndị dị n’ụwa Setan, hà na-amasị m?’ (1 Jọn 2:15-17) ‘Ihe ndị e ji atụrụ ndụ a na-egosi ndị na-eme ihe ike ma ọ bụ ndị na-eme omume rụrụ arụ na ha, hà na-atọ m ụtọ?’ (Ọma 97:10; 101:3; Emọs 5:15) Ọ bụrụ na ị jụọ onwe gị ajụjụ ndị a, ị ga-achọpụta ebe ndị i kwesịrị imezi ihe. Anyị gbanwee “ihe ndị gbanyesiri mgbọrọgwụ ike” n’obi anyị, anyị ga-eme ka obi na-atọ Nna anyị nke eluigwe ụtọ.—Ọma 19:14.

14. Gịnị mere ịhọrọ ezigbo ndị enyi ji dị ezigbo mkpa?

14 Ịhọrọ ezigbo ndị enyi bụ ihe nke atọ ga-enyere anyị aka ịgbanwe ụdị mmadụ anyị bụ. Ma ànyị ma, ma ọ bụ na anyị amaghị, ndị enyi anyị na-akpa anyị ezigbo aka. (Ilu 13:20) Ndị anyị na ha na-arụkọ ọrụ ma ọ bụ ụmụ akwụkwọ ibe anyị nwere ike ịbụ ndị na-enweghị ike inyere anyị aka iche echiche otú Chineke chọrọ. Ma, anyị nwere ike inweta ezigbo ndị enyi ma anyị gaa ọmụmụ ihe anyị. Ọmụmụ ihe anyị na-akpali anyị inwe “ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ.”—Ndị Hibru 10:24, 25.

“GBASIE IKE N’OKWUKWE”

15-16. Olee ụzọ Setan si achọ ịgbanwe otú anyị si eche echiche?

15 Ma cheta na Setan na-agbasi mbọ ike ka ọ gbanwee otú anyị si eche echiche. Ọ na-eji ụdị echiche niile emebi ike Okwu Chineke na-akpa n’otú anyị si eche echiche.

16 Setan ka na-ajụ ajụjụ ahụ ọ jụru Iv n’ogige Iden. Ọ jụrụ ya, sị: “Ọ̀ bụ eziokwu na Chineke sịrị . . . ?” (Jen. 3:1) N’ụwa a Setan na-achị, anyị na-anụ ka ndị mmadụ na-ajụ ajụjụ ndị dị ka: ‘Ọ̀ bụ eziokwu na Chineke achọghị ka nwoke na-alụ nwoke, nwaanyị ana-alụ nwaanyị? Ọ̀ bụ eziokwu na Chineke achọghị ka unu na-agba Krismas, na-echetakwa ụbọchị ọmụmụ? Ọ̀ bụ eziokwu na Chineke unu achọghị ka a mịnye unu ọbara? Ọ̀ bụ eziokwu na Chineke nke hụrụ ụmụ ya n’anya achọghị ka unu na ndị ikwu unu na ndị enyi unu a chụrụ n’ọgbakọ na-akpakọrịta?’

17. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma e nwee ihe ndị na-edochaghị anyị anya gbasara ihe ndị anyị kweere, gịnịkwa bụ uru Ndị Kọlọsi 2:6, 7 kwuru na ọ ga-abara anyị?

17 Obi kwesịrị isi anyị ike na ihe ndị anyị kweere bụ eziokwu. Ọ bụrụ na e nwere ajụjụ ndị gbasara ihe ndị anyị kweere anyị na-amatabeghị azịza ha, o nwere ike ime ka anyị na-eche ma ihe ndị anyị kweere hà bụkwa eziokwu. Ihe ndị ahụ nwere ike mechaa gbanwee otú anyị si eche echiche ma mee ka okwukwe anyị ghara isi ike. Gịnịzi ka anyị ga-eme? Okwu Chineke gwara anyị ka anyị gbanwee uche anyị ka anyị nwee ike chọpụta n’onwe anyị “ihe bụ́ uche Chineke, nke ziri ezi na nke dị ya mma, nke zukwara okè.” (Rom 12:2) Ọ bụrụ na anyị ana-amụchi ihe anya, anyị ga-achọpụta n’onwe anyị na ihe anyị na-amụta na Baịbụl bụ eziokwu. Obi ga-esikwa anyị ike na ihe Chineke gwara anyị mee bụ ihe kacha mma anyị kwesịrị ime. Mgbe ahụ, anyị ga-agbanyesi mgbọrọgwụ ike, ‘gbasiekwa ike n’okwukwe’ dị ka osisi mgbọrọgwụ ya siri ezigbo ike.—Gụọ Ndị Kọlọsi 2:6, 7.

18. Olee ihe ndị anyị nwere ike ime ka ụwa Setan ghara imebi otú anyị si eche echiche?

18 Ọ bụ gịnwa ka ọ dị n’aka ime ka okwukwe gị sie ike. N’ihi ya, na-eme ka ike nke na-eduzi uche gị dị ọhụrụ. Na-ekpe ekpere mgbe niile, na-arịọkwa Jehova ka o nye gị mmụọ ya. Na-atụgharị uche ma na-elebara ihe ndị ị na-eche n’echiche anya. Gị na ndị ezigbo mmadụ na-akpa. Meta ndị enyi ga-enyere gị aka ịgbanwe otú i si eche echiche. I mee otú ahụ, ị ga-echebe onwe gị ka ụwa Setan ghara imebi otú i si eche echiche. Ọ ga-emekwa ka ị kụghasịa “echiche na-ezighị ezi na ihe ọ bụla dị elu nke na-emegide ihe ọmụma Chineke.”—2 Kọr. 10:5.

ABỤ NKE 50 Ekpere M Ji Nyefee Chineke Onwe M

^ par. 5 Mee elu, mee ala, ihe mere anyị n’oge gara, ebe a zụlitere anyị na otú anyị gụruru akwụkwọ na-emetụta otú anyị si eche echiche. Anyị nwere ike ịchọpụta na anyị akpawala ụfọdụ àgwà na-adịghị mma, ya ana-esikwara anyị ike nkwụsị. Isiokwu a ga-enyere anyị aka ịkwụsị àgwà ọ bụla na-adịghị mma anyị nwere ike ịna-akpa.