Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ 25

Tụkwasị Jehova Obi Mgbe Ị Na-echegbu Onwe Gị

Tụkwasị Jehova Obi Mgbe Ị Na-echegbu Onwe Gị

“Ihe na-enye m nsogbu n’obi adịwo ọtụtụ.”—ỌMA 25:17.

ABỤ NKE 30 Nna M, Chineke M na Enyi M

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Gịnị mere anyị ji kwesị ime ihe Jizọs kwuru?

MGBE Jizọs buru amụma banyere mgbe ikpeazụ, ọ sịrị: “Lezienụ onwe unu anya ka a ghara inwe mgbe . . . nchegbu nke ndụ ga-anyịgbu obi unu.” (Luk 21:34) Anyị kwesịrị ime ihe a o kwuru. N’ihi gịnị? N’ihi na nsogbu ndị na-echi ndị mmadụ ọnụ n’ala taa na-abịakwara anyị.

2. Olee nsogbu ndị na-eme ka mmadụ na-echegbu onwe ya na-abịara ụmụnna anyị?

2 Mgbe ụfọdụ, ọtụtụ nsogbu ndị na-eme ka anyị na-echegbu onwe anyị na-abịara anyị n’otu oge. Ka anyị tụlee ihe atụ ụfọdụ. Otu nwanna aha ya bụ John * na-arịa ọrịa akwara. Obi gbawara ya mgbe nwunye ya hapụrụ ya mgbe ha lụrụla afọ iri na itoolu. Ụmụ ya ndị nwaanyị abụọ kwụsịkwara ife Jehova. Nsogbu otu di na nwunye aha ha bụ Bob na Linda nwere dị iche na nke John. A chụrụ ha abụọ n’ọrụ, ha akwapụkwa n’ebe ha bi n’ihi na ha enweghị ike ịkwụ ụgwọ ya. A chọpụtakwara na Linda na-arịa ọrịa ọrịa obi nke nwere ike igbu ya, ọrịa ogbu na nkwonkwo bidokwara ịrịa ya.

3. Dị ka e kwuru ná Ndị Filipaị 4:6, 7, gịnị ka obi kwesịrị isi anyị ike na ya?

3 Obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova, bụ́ Onye Okike anyị na Nna nke hụrụ anyị n’anya, na-aghọta otú obi na-adị anyị mgbe anyị na-echegbu onwe anyị. Ọ chọkwara inyere anyị aka idi nsogbu ndị na-abịara anyị. (Gụọ Ndị Filipaị 4:6, 7.) E nwere ọtụtụ akụkọ ndị a kọrọ na Baịbụl ndị gosiri nsogbu ndị bịaara ndị ohu Jehova. Baịbụl kwukwara otú Jehova si nyere ha aka idi nsogbu ndị mere ka ha na-echegbu onwe ha. Ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime ha.

ỊLAỊJA BỤ “NWOKE NWERE ỤDỊ MMETỤTA ANYỊ NA-ENWE”

4. Olee nsogbu ndị bịaara Ịlaịja, oleekwa otú obi dị ya gbasara Jehova?

4 Ịlaịja fere Jehova mgbe ihe siri ezigbo ike, ọtụtụ nsogbu ndị tara akpụ bịakwaara ya. Eze Ehab, bụ́ otu n’ime ndị eze Izrel na-erubereghị Jehova isi, lụrụ Jezibel, bụ́ ajọ nwaanyị na-efe Bel. Ha abụọ mere ka ọtụtụ ndị Izrel na-efe Bel, gbuokwa ọtụtụ ndị amụma Jehova. Ma, Ịlaịja riri mbọ mbọ. E nweghịkwa ihe mere ya mgbe oké ụnwụ dara n’ihi na ọ tụkwasịrị Jehova obi. (1 Eze 17:2-4, 14-16) Ịlaịja tụkwasịkwara Jehova obi mgbe ọ mara ndị na-efe Bel na ndị amụma ya aka. Ọ gbara ndị Izrel ume ka ha fewe Jehova. (1 Eze 18:21-24, 36-38) Ịlaịja hụrụ ọtụtụ ihe mere ka o kweta na Jehova nọnyeere ya n’oge ndị ahụ ihe tara akpụ.

Jehova zigara otu mmụọ ozi ka ọ gaa mee ka Ịlaịja nwetaghachi ume (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5 na nke 6) *

5-6. Dị ka 1 Ndị Eze 19:1-4 kwuru, olee otú obi dị Ịlaịja, oleekwa otú Jehova si gosi ya na ọ hụrụ ya n’anya?

5 Gụọ 1 Ndị Eze 19:1-4. Ụjọ jidere Ịlaịja mgbe Eze Nwaanyị Jezibel kwuru na ọ ga-egbu ya. N’ihi ya, ọ gbagara Bia-shiba. Ike ụwa gwụchara ya nke na ọ rịọrọ Jehova ka o mee ka ọ nwụọ. Gịnị mere o ji dị ya otú ahụ? Ịlaịja ezughị okè, ọ bụkwa “nwoke nwere ụdị mmetụta anyị na-enwe.” (Jems 5:17) O nwere ike ịbụ na o chegburu onwe ya nke ukwuu, ezigbo ike agwụkwa ya. Ọ ga-abụkwa na o chere na mbọ ọ na-agba ime ka ndị mmadụ fewe Jehova furu ọhịa, na ndị Izrel agbanwebeghị, nakwa na ọ bụ naanị ya na-efe Jehova. (1 Eze 18:3, 4, 13; 19:10, 14) O nwere ike iju anyị anya na onye amụma a kwesịrị ntụkwasi na-eche ụdị ihe a. Ma Jehova ghọtara otú obi dị ya.

6 Jehova abaraghị Ịlaịja mba maka ikwu otú obi dị ya. Kama, o nyeere ya aka inwetaghachi ume. (1 Eze 19:5-7) Jehova mechara jiri obiọma gosi Ịlaịja ike ya dị ebube, si otú ahụ gbazie echiche ya. Jehova gwaziri ya na ọ ka nwere puku mmadụ asaa n’Izrel na-ekwebeghị ife Bel. (1 Eze 19:11-18) Jehova ji ihe ndị a o mere gosi Ịlaịja na ọ hụrụ ya n’anya.

OTÚ JEHOVA GA-ESI ENYERE ANYỊ AKA

7. Olee obi ike anyị nwere n’ihi otú Jehova si nyere Ịlaịja aka?

7 Ò nwere ihe na-eme ka ị na-echegbu onwe gị ugbu a? Obi dị anyị ụtọ ịmara na Jehova ghọtara otú obi dị Ịlaịja. Ihe a na-emekwa ka obi sie anyị ike na Jehova na-aghọta ihe ndị na-enye anyị nsogbu n’obi. Ọ ma ihe ndị anyị ga-emeli na ihe ndị anyị na-agaghị emeli. Ọ madị ihe anyị na-eche n’echiche na otú obi na-adị anyị. (Ọma 103:14; 139:3, 4) Ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova obi ka Ịlaịja, ọ ga-enyere anyị aka idi nsogbu ndị na-eme ka anyị na-echegbu onwe anyị.—Ọma 55:22.

8. Olee otú Jehova ga-esi enyere gị aka ka ị ghara ịna-echegbu onwe gị?

8 Oké nchekasị nwere ike ime ka i chewe na ọnọdụ gị agaghị agbanwe agbanwe, meekwa ka ị daa mbà n’obi. Ụdị ihe ahụ mee gị, cheta na Jehova ga-enyere gị aka ịkwụsị ichegbu onwe gị. Olee otú ọ ga-esi enyere gị aka? Ọ chọrọ ka ị gwa ya nsogbu gị na otú obi dị gị. Ọ ga-anụkwa ákwá ị na-ebe maka enyemaka. (Ọma 5:3; 1 Pita 5:7) Na-arịọ Jehova n’ekpere mgbe mgbe maka nsogbu gị. Ọ gaghị agwa gị okwu otú ahụ o si gwa Ịlaịja, kama ọ ga-eji Baịbụl na nzukọ ya nyere gị aka. Ihe ndị e dere na Baịbụl nwere ike ịkasị gị obi, meekwa ka i nwee olileanya. Ụmụnna gị ga-agbakwa gị ume.—Rom 15:4; Hib. 10:24, 25.

9. Olee otú ezigbo enyi anyị nwere ike isi nyere anyị aka?

9 Jehova gwara Ịlaịja ka o nye Ịlaịsha ọrụ ụfọdụ ọ na-arụ. O si otú ahụ nye Ịlaịja ezigbo enyi ga-enyere ya aka ma o chegbuwa onwe ya. Taakwa, ọ bụrụ na anyị akọọrọ ezigbo enyi anyị otú obi dị anyị, o nwere ike inyere anyị aka idi ihe na-enye anyị nsogbu n’obi. (2 Eze 2:2; Ilu 17:17) Ọ bụrụ na i chere na i nweghị onye ị ga-akọliri obi gị, rịọ Jehova ka o nyere gị aka inweta onye Kraịst ma nke a na-akọ ga-agba gị ume.

10. Olee uru aka Jehova nyeere Ịlaịja ga-abara anyị, oleekwa otú ihe e dere n’Aịzaya 40:28, 29 ga-esi enyere anyị aka?

10 Jehova nyeere Ịlaịja aka ịkwụsị ichegbu onwe ya na ife ya ruo ọtụtụ afọ. Ihe a Jehova meere ya na-eme ka obi sie anyị ike na ọ ga-enyekwara anyị aka. Anyị nwere ike ịna-echegbu onwe anyị ruo ogologe oge, ya emee ka ike na-agwụ anyị, meekwa ka isi na-agba anyị ghara ghara. Ma ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova obi, ọ ga-enye anyị ike ka anyị nọgide na-efe ya.—Gụọ Aịzaya 40:28, 29.

HANA, DEVID NA OTU ỌBỤ ABỤ TỤKWASỊRỊ JEHOVA OBI

11-13. Olee nsogbu nchegbu kpataara ndị ohu Chineke atọ n’oge ochie?

11 E nwekwara ndị ọzọ a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl chegburu onwe ha. Dị ka ihe atụ, Hana chegburu onwe ya n’ihi na ihere na-eme ya na ọ mụtaghị nwa. Ma nwunye di ya mụtara ụmụ, ọ na-achịkwa ya ọchị. (1 Sam. 1:2, 6) Oké nchegbu mere ka obi na-ajọ Hana njọ, nke mere ka ọ na-ebe ákwá ma jụ nri.—1 Sam. 1:7, 10.

12 Eze Devid chegbukwara onwe ya nke ukwuu mgbe ụfọdụ. Chegodị ụfọdụ nsogbu ndị bịaara ya. Obi ya nọ na-ama ya ikpe n’ihi ihe ndị o mejọrọ n’oge ndị gara aga. (Ọma 40:12) Absalọm nwa ya ọ hụrụ n’anya nupụụrụ ya isi, nke kpataara Absalọm ọnwụ. (2 Sam. 15:13, 14; 18:33) Otu ezigbo enyi Devid gbara ya mgba okpuru. (2 Sam. 16:23–17:2; Ọma 55:12-14) Ọtụtụ n’ime abụ ndị Devid dere gosiri na ọ dara mbà n’obi, gosikwa na ọ tụkwasịrị Jehova obi ya niile.—Ọma 38:5-10; 94:17-19.

Gịnị nyeere otu ọbụ abụ aka ịmaliteghachi iji ọṅụ ejere Jehova ozi? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13 ruo na nke 15) *

13 Otu ọbụ abụ mechara nwewere ndị ajọ omume anyaụfụ n’ihi otú ihe si agara ha. O nwere ike ịbụ na o si n’ezinụlọ Esaf onye Livaị. O jekwara ozi “ná nnukwu ebe nsọ Chineke.” Ọbụ abụ a nwere ihe na-echegbu ya nke mere ka ọ ghara ịna-enwe obi ụtọ, ihe o nwere anaghịzi eju ya afọ. O mechadịrị chewe na o nweghị ezigbo uru ife Chineke bara.—Ọma 73:2-5, 7, 12-14, 16, 17, 21.

14-15. Gịnị ka anyị na-amụta n’aka mmadụ atọ ahụ a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl gbasara ịchọ enyemaka Jehova?

14 Ndị ohu Chineke atọ anyị tụlere banyere ha tụkwasịrị Jehova obi na ọ ga-enyere ha aka. Ha kọọrọ Jehova ihe na-enye ha nsogbu n’obi n’ekpere. Ha kọọrọ ya n’ezoghị ọnụ ihe mere ha ji na-echegbu onwe ha. Ha nọgidekwara na-aga n’ebe a na-anọ efe Jehova.—1 Sam. 1:9, 10; Ọma 55:22; 73:17; 122:1.

15 Jehova zara onye nke ọ bụla n’ime ha ekpere ya n’ihi na o nweere ha ọmịiko. Obi bịara ruo Hana ala. (1 Sam. 1:18) Devid dere, sị: “Ọdachi ndị na-adakwasị onye ezi omume dị ọtụtụ, ma Jehova na-anapụta ya na ha niile.” (Ọma 34:19) Ọbụ abụ ahụ mechara kwuo na ọ dị ya ka Jehova ò ‘jidere ya n’aka nri ya,’ jiri ịhụnanya na-edu ya. Ọ bụrụ abụ, sị: “Ma mụ onwe m, ịbịaru Chineke nso dị m mma. Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ka m ji mere ebe mgbaba.” (Ọma 73:23, 24, 28) Olee ihe anyị mụtara n’akụkọ ndị a? Mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike inwe nsogbu ndị tara akpụ na-eme ka anyị chegbuwe onwe anyị. Ma anyị ga-edili ha ma ọ bụrụ na anyị ana-atụgharị uche n’otú Jehova sirila nyere ndị ọzọ aka, na-ekpesi ekpere ike, ma na-eme ihe ọ chọrọ.—Ọma 143:1, 4-8.

TỤKWASỊ JEHOVA OBI KA I NWEE IKE IDI NSOGBU GỊ

Na mbụ, otu nwanna nwaanyị nọ na-akpapụ onwe ya iche n’ihi nchegbu, ma ihe mechara ka mma mgbe ọ malitere inyere ndị ọzọ aka (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16 na nke 17)

16-17. (a) Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịna-akpapụ onwe anyị iche? (b) Olee otú anyị nwere ike isi nwetaghachi ume?

16 Akụkọ mmadụ atọ ahụ anyị tụlere banyere ha na-akụziri anyị otu ihe dị mkpa. Ọ na-akụziri anyị na anyị kwesịrị ịnọ Jehova na ndị na-efe ya nso. (Ilu 18:1) Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Nancy chegburu onwe ya nke ukwuu mgbe di ya hapụrụ ya. O kwuru, sị: “E nwere ọtụtụ ụbọchị ndị m na-achọghị ịhụ onye ọ bụla ma ọ bụ kwusara onye ọ bụla okwu. Ma, m chọpụtara na ka m na-akpapụ onwe m iche, ka obi na-ajọkwu m njọ.” Ihe gbanwere mgbe Nancy malitere ịchọ otú ọ ga-esi enyere ndị ọzọ nwere nsogbu aka. O kwuru, sị: “M gere ndị ọzọ ntị mgbe ha na-akọrọ m ihe ha na ya na-alụ. M chọpụtara na ka m na-emetere ndị ọzọ ebere, m kwụsịrị imetere onwe m oké ebere.”

17 Anyị nwere ike inweta ume ma anyị na-aga ọmụmụ ihe. Anyị nọrọ n’ọmụmụ ihe, anyị na-eme ka Jehova nwekwuo ihe mere ọ ga-eji enyere anyị aka ma na-akasi anyị obi. (Ọma 86:17) N’ọmụmụ ihe, Jehova na-eji mmụọ nsọ ya, Okwu ya, na ụmụnna anyị agba anyị ume. Anyị na-enwekwa ohere ‘ịgbarịta ibe anyị ume.’ (Rom 1:11, 12) Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Sophia kwuru, sị: “Jehova na ụmụnna m nyeere m aka. Ọmụmụ ihe nyeere m ezigbo aka. M chọpụtara na ka m na-ewepụtakwu oge na-aga ozi ọma na ọmụmụ ihe, ka m na-enwekwu ike idi nsogbu ndị na-abịara m.”

18. Olee ihe Jehova ga-emere anyị ma anyị daa mbà n’obi?

18 Mgbe ọ bụla anyị dara mbà n’obi, ka anyị cheta na Jehova kwere nkwa na ọ ga-eme ka anyị gharazie ịna-echegbu onwe anyị n’ọdịnihu. O kwukwara na ọ ga-enyere anyị aka ịkwụsị ịna-echegbu onwe anyị ugbu a. Ọ na-eme ka anyị “na-enwe ọchịchọ ma na-eme ihe” ga-eme ka anyị nwee olileanya ma ghara ịda mbà n’obi.—Fil. 2:13.

19. Olee ihe Ndị Rom 8:37-39 kwuru nke na-eme ka obi sie anyị ike?

19 Gụọ Ndị Rom 8:37-39. Pọl onyeozi mere ka obi sie anyị ike na o nweghị ihe ga-ekewapụ anyị n’ịhụnanya Chineke. Olee otú anyị ga-esi enyere ụmụnna anyị ndị na-agbalị ịkwụsị ichegbu onwe ha aka? Isiokwu na-esonu ga-atụle otú anyị ga-esi eṅomi Jehova n’otú o si emetere ndị mmadụ ebere, nakwa otú anyị ga-esi na-enyere ụmụnna anyị ndị na-echegbu onwe ha aka.

ABỤ NKE 44 Ekpere Onye Ọ Na-enweghị Ka Ọ Hà Ya

^ par. 5 Ọ bụrụ na anyị echegbuo onwe anyị ruo ogologo oge, o nwere ike ịkpa anyị aka ọjọọ. Olee otú Jehova nwere ike isi enyere anyị aka? Anyị ga-atụle otú Jehova si nyere Ịlaịja aka mgbe ọ na-echegbu onwe ya. Ihe ụfọdụ ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl mere ga-eme ka anyị mata ihe anyị ga-eme ka Jehova nyere anyị aka mgbe anyị na-echegbu onwe anyị.

^ par. 2 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

^ par. 53 NKỌWA FOTO: Ebe mmụọ ozi Jehova ji nwayọọ kpọtee Ịlaịja n’ụra, ma nye ya achịcha na mmiri.

^ par. 55 NKỌWA FOTO: Ebe otu ọbụ abụ o yiri ka ò si n’ezinụlọ Esaf na-ede abụ, sorokwa ndị Livaị ndị ọzọ na-abụ abụ.