Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ 27

Jikere Ugbu A Maka Mkpagbu

Jikere Ugbu A Maka Mkpagbu

“A ga-akpagbukwa ndị niile na-achọ ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ ná nsọpụrụ Chineke ná mmekọrịta nke ha na Kraịst Jizọs.”—2 TIM. 3:12.

ABỤ NKE 129 Anyị Ga Na-atachi Obi

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Gịnị mere anyị kwesịrị iji jikere maka mkpagbu?

N’ABALỊ bọtara ụbọchị e gburu Onyenwe anyị Jizọs, o kwuru na ndị mmadụ ga-akpọ onye ọ bụla na-eso ụzọ ya asị. (Jọn 17:14) Kemgbe ahụ, ndị na-anaghị efe Chineke anọgidela na-akpagbu Ndịàmà Jehova. (2 Tim. 3:12) Ka ọgwụgwụ nke usoro ihe a na-erukwu nso, anyị na-atụ anya na ndị iro ga na-akpagbukwu anyị.—Mat. 24:9.

2-3. (a) Gịnị ka anyị kwesịrị ịma gbasara ụjọ? (b) Olee ihe ndị anyị ga-atụle n’isiokwu a?

2 Olee ihe anyị kwesịrị ime ugbu a iji jikere maka mkpagbu? Ọ dịghị mkpa ka anyị nọrọ na-eche gbasara ihe ọjọọ niile nwere ike ime anyị mgbe ahụ. Anyị mee otú ahụ, o nwere ike ime ka ezigbo ụjọ jide anyị, anyị echegbuwekwa onwe anyị. O nwedịrị ike ime ka anyị kwụsị ife Jehova tupu a kpagbuwe anyị. (Ilu 12:25; 17:22) Ụjọ bụ ngwá agha jọgburu onwe ya “onye mmegide” anyị “bụ́ Ekwensu” ji alụso anyị ọgụ. (1 Pita 5:8, 9) Olee ihe anyị ga-eme ka anyị nwee ike idi mkpagbu ndị ga-abịara anyị?

3 N’isiokwu a, anyị ga-amụta ihe ndị ga-enyere anyị aka ka anyị na Jehova dịrịkwuo ná mma nakwa ihe mere o ji dị anyị mkpa ime ya ugbu a. Anyị ga-atụlekwa ihe anyị ga-eme iji nwekwuo obi ike. N’ikpeazụ, anyị ga-atụle ihe anyị ga-eme ma ndị mmadụ kpagbuwe anyị.

IHE Ị GA-EME KA GỊ NA JEHOVA DỊRỊKWUO NÁ MMA

4. Gịnị ka Ndị Hibru 13:5, 6 gwara anyị, gịnịkwa mere obi kwesịrị iji sie anyị ike na ọ bụ eziokwu?

4 Obi sie gị ike na Jehova hụrụ gị n’anya, nakwa na ọ gaghị agbahapụ gị. (Gụọ Ndị Hibru 13:5, 6) Ọtụtụ afọ gara aga, otu Ụlọ Nche kwuru, sị: “Ọ bụ ndị ma Chineke nke ọma na-atụkwasị ya obi kpamkpam n’oge mkpagbu.” Ihe a bụ eziokwu. Iji nwee ike idi mkpagbu, anyị kwesịrị ịhụ Jehova n’anya ma tụkwasị ya obi kpamkpam. Anyị ekwesịghịkwa inwe obi abụọ na ọ hụrụ anyị n’anya.—Mat. 22:36-38; Jems 5:11.

5. Gịnị ga-enyere gị aka ịmata na Jehova hụrụ gị n’anya?

5 Na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị. Ihe i kwesịrị ibu n’obi na-agụ ya bụ ka ị bịarukwuo Jehova nso. (Jems 4:8) Ka ị na-agụ Baịbụl, chebara àgwà ọma ndị Chineke nwere echiche. Gbalịa chọpụta otú ihe ndị o mere na ihe ndị o kwuru si gosi na ọ hụrụ gị n’anya. (Ọpụ. 34:6) O nwere ike isiri ụfọdụ ndị ike ikweta na Chineke hụrụ ha n’anya n’ihi na o nwetụbeghị onye gosiri ha ịhụnanya. Ọ bụrụ na ọ dị gị otú ahụ, dee ihe ọma ndị Chineke meere gị n’ụbọchị ọ bụla na otú o si gosi gị obiọma ya. (Ọma 78:38, 39; Rom 8:32) Ka ị na-echebara ihe ndị Chineke meere gị na ihe ndị ị gụtara na Baịbụl echiche, o nwere ike ime ka ọ dịkwuoro gị mfe idepụta ihe ọma niile o meerela gị. Igosi na obi dị gị ụtọ maka ihe ndị Jehova meere gị ga-eme ka ị bịarukwuo ya nso.—Ọma 116:1, 2.

6. Dị ka Abụ Ọma 94:17-19 kwuru, olee otú ekpere e si n’ala ala obi kpee nwere ike isi nyere gị aka?

6 Na-ekpechi ekpere anya. Chegodị otú obi na-adị nwatakịrị ma papa ya kuru ya. Ahụ́ na-eru ya ala, ya ana-akọrọ papa ya ihe niile mere n’ụbọchị ahụ, ma nke ọma ma nke ọjọọ. Gị na Jehova nwere ike ịdị ná mma otú ahụ ma ọ bụrụ na ị na-esi n’ala ala obi gị na-akọrọ ya mkpa gị kwa ụbọchị. (Gụọ Abụ Ọma 94:17-19.) Mgbe ị na-ekpe ekpere, “wụpụ ihe dị gị n’obi dị ka mmiri” ma gwa Nna gị hụrụ gị n’anya bụ́ Jehova ihe niile bụ́ ụjọ gị na ihe niile na-echegbu gị. (Ákwá 2:19) Olee uru ọ ga-abara gị? Ọ ga-eme ka i nwee ihe Baịbụl kpọrọ “udo nke Chineke nke karịrị echiche niile.” (Fil. 4:6, 7) Ọ bụrụ na i si otú a na-ekpe ekpere, ị ga na-abịarukwu Jehova nso.—Rom 8:38, 39.

Ihe ga-eme ka anyị nwee obi ike bụ obi isi anyị ike na Jehova nọnyeere anyị nakwa na ihe niile o kwere ná nkwa ga-emezu n’Alaeze ya

Nwanna Stanley Jones mere ka okwukwe ya sie ike na Alaeze Chineke dị adị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7)

7. Gịnị mere obi kwesịrị iji sie gị ike na Chineke ga-emezu ihe niile o kwere nkwa ime n’Alaeze ya?

7 Obi sie gị ike na ihe ndị Jehova kwere nkwa imere anyị n’Alaeze ya ga-emezu. (Ọnụ Ọgụ. 23:19) Ọ bụrụ na obi esighị gị ike na nkwa ndị a ga-emezu, ọ ga-adịrị Ekwensu na ndị ọrụ ya mfe imenye gị ụjọ. (Ilu 24:10; Hib. 2:15) Olee ihe ị ga-eme ka obi sie gị ike ugbu a na Alaeze Chineke dị adị? Gbalịa wepụta oge mee nchọnchọ ka ị chọpụta nkwa ndị Chineke kwere ga-emezu n’Alaeze ahụ nakwa ihe mere obi kwesịrị iji sie gị ike na ha ga-emezu. Olee uru ọ ga-abara gị? Chebara ihe mere otu nwanna aha ya bụ Stanley Jones echiche. A tụrụ ya mkpọrọ afọ asaa n’ihi ihe o kweere. * Gịnị nyeere ya aka ịtachi obi? O kwuru, sị: “Okwukwe m siri ike n’ihi na amaara m gbasara Alaeze Chineke na ihe ndị ọ ga-emezu. Obi sikwara m ike na ha ga-eme. Ọ bụ ya mere na o nweghị ihe ọ bụla ga-emeli ka m hapụ Jehova.” Ọ bụrụ na obi esie gị ike na Jehova ga-emezu nkwa ya, ị ga-abịarukwu ya nso, ị gaghịkwa ekwe ka ụjọ mee ka ị kwụsị ife ya.—Ilu 3:25, 26.

8. Gịnị ka otú anyị si aga ọmụmụ ihe ugbu a ga-eme ka anyị mata? Kọwaa.

8 Na-agachi ọmụmụ ihe anya. Ọmụmụ ihe na-eme ka anyị na-abịarukwu Jehova nso. Otú anyị si na-aga ọmụmụ ihe ugbu a ga-eme ka anyị mata ihe anyị ga-eme ma mkpagbu bịara anyị n’ọdịnihu. (Hib. 10:24, 25) Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Ọ bụrụ na anyị ekwere ka obere ihe na-egbochi anyị ịga ọmụmụ ihe ugbu a, oleezi ihe ga-eme ma ọ bụrụ na ịga ọmụmụ ihe esie ezigbo ike n’ọdịnihu nke na o nwere ike ime ka anyị banye ná nsogbu? Ma, ọ bụrụ na anyị ekpebisie ike na anyị ga na-agachi ọmụmụ ihe anya, anyị agaghị akwụsị a sịgodị na ndị mmegide agbalịa ịkwụsị anyị. Ugbu a bụ oge anyị kwesịrị iji ọmụmụ ihe anyị kpọrọ ihe. Ọ bụrụ na anyị ejiri ya kpọrọ ihe ugbu a, o nweghị ndị mmegide ma ọ bụdị iwu ndị ọchịchị nyere ga-eme ka anyị kwụsị irubere Chineke isi karịa mmadụ.—Ọrụ 5:29.

Ibu amaokwu Baịbụl na abụ Alaeze anyị n’isi ugbu a ga-abara anyị uru n’oge mkpagbu (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9) *

9. Olee ihe mere ibute amaokwu Baịbụl n’isi ji bụrụ ụzọ magburu onwe ya isi jikere maka mkpagbu?

9 Bute amaokwu Baịbụl ndị na-amasị gị n’isi. (Mat. 13:52) Anyị nwere ike ichefu amaokwu Baịbụl n’ihi ezughị okè, ma Jehova ga-eji mmụọ nsọ ya nyere anyị aka icheta ha. (Jọn 14:26) Na Jamanị nke Ebe Ọwụwa Anyanwụ, otu nwanna a tụrụ mkpọrọ, nke naanị ya nọ n’otu ọnụ ụlọ, kwuru, sị: “Obi dị m ụtọ na tupu mgbe ahụ, ebutela m ọtụtụ narị amaokwu Baịbụl n’isi. M nọ na-atụgharị uche n’isiokwu dị iche iche si na Baịbụl n’ụbọchị ndị ahụ niile naanị m nọ.” Amaokwu Baịbụl ndị ahụ nyeere nwanna anyị a aka ịnọ Jehova nso ma nọgide na-atachi obi.

(A ga-akọwa ya na paragraf nke 10) *

10. Olee ihe mere anyị kwesịrị iji gbalịa bute abụ anyị n’isi?

10 Bute abụ ndị e ji eto Jehova n’isi, na-abụkwa ha. Mgbe a tụrụ Pọl na Saịlas mkpọrọ na Filipaị, ha bụrụ abụ ndị e ji eto Jehova ha bu n’isi. (Ọrụ 16:25) Mgbe e si n’ebe bụbu Sọviet Yuniọn chụga ụmụnna anyị Saịberịa, gịnị nyeere ha aka? Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Mariya Fedun kwuru, sị: “Anyị bụrụ abụ niile dị n’akwụkwọ abụ anyị anyị bu n’isi.” O kwuru na abụ ndị ahụ gbara ha niile ume, nyekwara ha aka ịbịaru Jehova nso. Ị̀ na-enweta obi ike mgbe ọ bụla ị bụrụ abụ Alaeze ndị kacha amasị gị? Ya bụrụ otú ahụ, gbalịa ka i bute ha n’isi ugbu a.—Lee igbe bụ “ Nye M Obi Ike.”

IHE I NWERE IKE IME IJI NWETAKWUO OBI IKE

11-12. (a) Gịnị ka 1 Samuel 17:37, 45-47 kwuru nyeere Devid aka inwe obi ike? (b) Olee ihe dị mkpa anyị ga-amụta n’ihe Devid mere?

11 Iji nwee ike idi mkpagbu, obi ike dị anyị mkpa. Gịnị ka i nwere ike ime ma ọ bụrụ na ị chọpụta na i nwechaghị obi ike? Cheta na obi ike anaghị esi n’otú mmadụ hà, n’ike ya ma ọ bụ n’ihe ndị ọ ga-emeli. Chetụgodị ihe merenụ mgbe Devid lụsoro Golayat ọgụ. E jiri ya tụnyere Golayat, ọ dị ezigbo obere, ọ dịghị ike, o nweghịkwa ezigbo ihe e ji alụ agha o ji. O jighịdị mma agha. Ma, o nwere ezigbo obi ike. Ọ katara obi jiri ọsọ gaa lụso nwoke ahụ gbara ajọ dimkpa, dịrịkwa mpako, ọgụ.

12 Gịnị mere Devid ji kaa ụdị obi a? Ọ bụ n’ihi na o kwetasiri ike na Jehova nọnyeere ya. (Gụọ 1 Samuel 17:37, 45-47) Devid anọghị na-eche otú o si dị ntakịrị n’ebe Golayat nọ. Kama, ọ nọ na-eche otú Golayat si dị ntakịrị n’ebe Jehova nọ. Olee ihe anyị na-amụta n’akụkọ a? Anyị ga-akata obi ma ọ bụrụ na obi esie anyị ike na Jehova nọnyeere anyị, nakwa na ndị na-emegide anyị dị ezigbo ntakịrị ma e jiri ha tụnyere Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile. (2 Ihe 20:15; Ọma 16:8) Olee ihe anyị ga-eme iji nwee obi ike ugbu a mkpagbu na-abịabeghị?

13. Olee ihe anyị ga-eme iji nwetakwuo obi ike? Kọwaa.

13 Anyị ga-enwekwu obi ike ugbu a ma ọ bụrụ na anyị ana-ekwusa ozi ọma gbasara Alaeze Chineke. N’ihi gịnị? N’ihi na ikwusa ozi ọma na-eme ka anyị tụkwasị Jehova obi, na-emekwa ka anyị kwụsị ịtụ ụjọ mmadụ. (Ilu 29:25) Ikwusa ozi ọma n’ụlọ n’ụlọ, n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị, n’ebe a na-azụ ahịa, nakwa mgbe anyị na-anọghị n’ozi na-eme ka anyị na-enwekwu obi ike, otú ahụ mmega ahụ́ si eme ka ahụ́ gbasikwuo anyị ike. Ọ bụrụ na anyị amụta iji obi ike na-ekwusa ozi ọma ugbu a, ọ ga-eme ka anyị dị njikere ịnọgide na-ekwusa ozi ọma ọ bụrụgodị na a machiri ọrụ anyị.—1 Tesa. 2:1, 2.

Nwanna Nwaanyị Nancy Yuen ekweghị akwụsị ikwusa ozi ọma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14)

14-15. Olee ihe ndị anyị nwere ike ịmụta n’aka Nwanna Nwaanyị Nancy Yuen na Nwanna Nwaanyị Valentina Garnovskaya?

14 E nwere ọtụtụ ihe anyị ga-amụta n’ihe ụmụnna nwaanyị abụọ nwere ezigbo obi ike mere. Otu n’ime ha bụ Nwanna Nwaanyị Nancy Yuen. N’agbanyeghị na o tochaghị ogologo, o kweghị ka e menye ya ụjọ. * O kweghị akwụsị ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Nke a mere ka a tụọ ya mkpọrọ ihe karịrị afọ iri abụọ n’oge ndị ọchịchị Kọmunist na-achị Chaịna. Ndị uwe ojii gbara ya ajụjụ ọnụ sịrị na ha ahụtụbeghị onye “na-agba isi akwara ka ya” n’obodo ahụ.

Nwanna Nwaanyị Valentina Garnovskaya kwetasiri ike na Jehova nọnyeere ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15)

15 A tụkwara Nwanna Nwaanyị Valentina Garnovskaya mkpọrọ ugboro atọ n’ebe bụbu Sọviet Yuniọn. Ọ nọrọ ihe dị ka afọ iri abụọ na otu n’ụlọ mkpọrọ. * N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na o kpebisiri ike na ya ga na-ekwusa ozi ọma. Nke a mere ka ndị uwe ojii kwuzie na ọ bụ “ezigbo onye omekome.” Gịnị mere ụmụnna nwaanyị abụọ ndị a ji nwee ụdị obi ike a? Ọ bụ n’ihi na obi siri ha ike na Jehova nọnyeere ha.

16. Gịnị ga-enyere anyị aka inwe ezigbo obi ike?

16 Dị ka anyị mụtara, ihe ga-enyere anyị aka ịna-enwe obi ike abụghị ịtụkwasị obi n’ike anyị ma ọ bụ n’ihe anyị ga-emeli. Kama, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova nọnyeere anyị nakwa na ọ bụ ya na-alụrụ anyị ọgụ. (Diut. 1:29, 30; Zek. 4:6) Ọ bụ ihe ndị a ga-eme ka mmadụ nwee ezigbo obi ike.

IHE Ị GA-EME MA NDỊ MMADỤ KPỌ GỊ ASỊ

17-18. Olee aka ná ntị Jizọs dọrọ anyị na Jọn 15:18-21? Kọwaa.

17 Anyị niile na-enwe obi ụtọ ma ndị ọzọ na-akwanyere anyị ùgwù. Ma, anyị ekwesịghị iche na e nweghị uru anyị bara ma ọ bụrụ na ihe anyị anaghị amasị ndị ọzọ. Jizọs kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị unu mgbe ọ bụla ndị mmadụ kpọrọ unu asị, na mgbe ọ bụla ha chụpụrụ unu, kọchaa unu ma mebie aha unu wee kwuo na unu bụ ndị na-eme ihe ọjọọ, n’ihi Nwa nke mmadụ.” (Luk 6:22) Gịnị ka ihe a Jizọs kwuru pụtara?

18 Ihe Jizọs na-ekwu abụghị na obi na-adị Ndị Kraịst ụtọ ma ndị mmadụ kpọ ha asị. Kama, ọ na-agwa anyị ihe ga-eme anyị. Anyị abụghị nke ụwa. Anyị na-eme ihe Jizọs kụziri, na-ekwusakwa ihe o kwusara. Ọ bụ ya mere ụwa ji kpọ anyị asị. (Gụọ Jọn 15:18-21.) Anyị chọrọ ịna-erubere Jehova isi. Ọ bụrụ na ndị mmadụ akpọ anyị asị n’ihi na anyị hụrụ Jehova n’anya, ọ naghị ewute anyị.

19. Olee otú anyị ga-esi ṅomie ndịozi Jizọs?

19 Ekwela ka ihe ọ bụla mmadụ mere ma ọ bụ kwuo mee ka ihere ịbụ Onyeàmà Jehova mewe gị. (Maị. 4:5) Anyị ga-akwụsị ịtụ egwu mmadụ ma anyị chee gbasara ihe ndịozi Jizọs mere na Jeruselem ozugbo e gbuchara Jizọs. Ha ma na ndị ndú okpukpe ndị Juu kpọrọ ha ezigbo asị. (Ọrụ 5:17, 18, 27, 28) N’agbanyeghị ya, ha nọ na-aga n’ụlọ nsọ kwa ụbọchị na-ezi ozi ọma, si otú ahụ mee ka a mata na ha bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. (Ọrụ 5:42) Ha ekweghị ka ụjọ mee ka ha kwụsị ikwusa ozi ọma. Anyịnwa ga-akwụsịlikwa ịtụ egwu mmadụ ma ọ bụrụ na anyị ana-eme ka ndị mmadụ mata na anyị bụ Ndịàmà Jehova ma n’ebe ọrụ anyị, ma n’ụlọ akwụkwọ, ma n’ebe anyị bi.—Ọrụ 4:29; Rom 1:16.

20. Gịnị mere ndịozi Jizọs ji nwee obi ụtọ n’agbanyeghị na a kpọrọ ha asị?

20 Gịnị mere ndịozi Jizọs ji nwee obi ụtọ? Ha ma ihe mere e ji kpọ ha asị, ha nwekwara obi ụtọ na e menyere ha ihere n’ihi irubere Jehova isi. (Luk 6:23; Ọrụ 5:41) Pita onyeozi mechara dee, sị: “Ọ bụrụgodị na unu ataa ahụhụ n’ihi ezi omume, unu ga-enwe obi ụtọ.” (1 Pita 2:19-21; 3:14) Ọ bụrụ na anyị aghọta na ihe mere ndị mmadụ ji kpọ anyị asị bụ na anyị na-eme ihe dị mma, anyị agaghị ekwe ka asị ahụ ha kpọrọ anyị mee ka anyị kwụsị ife Jehova.

IJIKERE UGBU A GA-ABARA GỊ URU

21-22. (a) Olee ihe i kpebiri ime ugbu a iji jikere maka mkpagbu? (b) Olee ihe anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

21 Anyị amaghị mgbe ndị mmadụ ga-ebido kpagbuwe anyị ma ọ bụ mgbe a ga-amachi anyị ife Jehova. Ma, anyị ma na anyị nwere ike ijikere maka ya ugbu a. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ime ka anyị na Jehova dịrịkwuo ná mma, ime ka anyị nwekwuo obi ike, nakwa ịghara ikwe ka asị ndị mmadụ kpọrọ anyị na-ewute anyị. Ọ bụrụ na anyị adị njikere ugbu a, ọ ga-enyere anyị aka ịnọgide na-efe Jehova n’ọdịnihu.

22 Ma, ọ bụrụkwanụ na a machie anyị ife Jehova? N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-atụle amaokwu Baịbụl ndị ga-enyere anyị aka ịnọgide na-efe Jehova, ọ bụrụgodị na a machiri ọrụ anyị.

ABỤ NKE 118 “Nyere Anyị Aka Ka Okwukwe Anyị Sie Ike”

^ par. 5 Anyị achọghị ka a kpọ anyị asị. Ma, a ga-akpagbu onye ọ bụla n’ime anyị ugbu a ma ọ bụ n’ọdịnihu. Isiokwu a ga-enyere anyị aka ijikere maka mkpagbu ndị nwere ike ịbịara anyị ma jiri obi ike die ha.

^ par. 7 Gụọ Ụlọ Nche Bekee nke Disemba 15, 1965, peeji nke 756-767.

^ par. 14 Gụọ Ụlọ Nche Bekee nke Julaị 15, 1979 peeji nke 4-7. Leekwa vidio bụ́ A Ga-eme Ka A Mara Aha Jehova dị na Tiivi anyị. Gaa n’ebe e dere AJỤJỤ ỌNỤ.

^ par. 15 Gụọ Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke afọ 2008, nke Bekee, peeji nke 191 ruo 192,.

^ par. 67 NKỌWA FOTO: Ebe nne na nna ji kaadị na-enyere ụmụ ha aka ibute amaokwu Baịbụl n’isi n’oge ha na-enwe ofufe ezinụlọ ha.

^ par. 70 NKỌWA FOTO: Ebe otu ezinụlọ na-abụ abụ Alaeze n’ụgbọala ha mgbe ha na-aga ọmụmụ ihe.