Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ 28

Nọgide Na-efe Jehova Mgbe A Machiri Ọrụ Anyị

Nọgide Na-efe Jehova Mgbe A Machiri Ọrụ Anyị

“Anyị apụghị ịkwụsị ikwu banyere ihe ndị anyị hụrụ na ihe ndị anyị nụrụ.”—ỌRỤ NDỊOZI 4:19, 20.

ABỤ NKE 122 Ka Anyị Guzosie Ike, Kwụrụ Chịm

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1-2. (a) Gịnị mere na o kwesịghị iju anyị anya ma ọ bụrụ na ndị ọchịchị amachie ọrụ anyị? (b) Olee ihe ndị anyị ga-atụle n’isiokwu a?

N’AFỌ 2018, ihe karịrị narị puku ndị nkwusa abụọ na puku iri abụọ na atọ bi n’obodo ndị a machiri ọrụ anyị ma ọ bụ machie anyị ime ihe ụfọdụ. O jughị anyị anya. Dị ka anyị mụtara n’isiokwu bu nke a ụzọ, Ndị Kraịst na-atụ anya na a ga-akpagbu ha. (2 Tim. 3:12) N’agbanyeghị ebe anyị bi, ndị ọchịchị nwere ike ịnọkata machie anyị ife Chineke anyị hụrụ anyị n’anya bụ́ Jehova.

2 Ọ bụrụ na ndị ọchịchị obodo unu ekpebie ịmachi unu ife Jehova, i nwere ike ịjụ onwe gị ajụjụ ndị a: ‘Ọ̀ pụtara na anyị na Jehova adịghịzi ná mma? Ọ̀ ga-eme ka anyị kwụsị ife Jehova kpamkpam? Ọ̀ bụ m kwaga obodo ọzọ ebe m ga-efe Jehova otú m chọrọ?’ N’isiokwu a, anyị ga-atụle ajụjụ ndị a, tụlee otú anyị nwere ike isi nọgide na-efe Jehova ma ọ bụrụ na a machie ọrụ anyị, tụleekwa ihe ndị anyị na-ekwesịghị ime n’oge ahụ.

MKPAGBU Ọ̀ NA-EGOSI NA ANYỊ NA CHINEKE ADỊGHỊZI NÁ MMA?

3. Dị ka e kwuru ná 2 Ndị Kọrịnt 11:23-27, olee mkpagbu ndị bịaara Pọl onyeozi, oleekwa ihe ọ na-akụziri anyị?

3 Ọ bụrụ na ndị ọchịchị amachie ọrụ anyị, anyị nwere ike chewe na ihe kpatara ya bụ na anyị na Chineke adịghịzi ná mma. Ma, cheta na mkpagbu a na-akpagbu anyị apụtaghị na Jehova na-ewesa anyị iwe. Ka anyị were ihe mere Pọl onyeozi maa atụ. O doro anya na ya na Chineke dị ná mma. O dere akwụkwọ iri na anọ n’ime Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, bụrụkwa onyeozi nke ndị mba ọzọ. Ma, ọ hụsiri anya n’aka ndị na-akpagbu ya. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 11:23-27.) Ihe mere Pọl onyeozi na-akụziri anyị na Jehova na-ekwe ka a kpagbuo ndị na-efe ya.

4. Gịnị mere ụwa ji kpọ anyị asị?

4 Jizọs kọwara ihe mere anyị kwesịrị iji na-atụ anya mkpagbu. Ọ sịrị na a ga-akpọ anyị asị n’ihi na anyị abụghị nke ụwa. (Jọn 15:18, 19) Mkpagbu anaghị egosi na anyị na Jehova adịghịzi ná mma. Kama, ọ na-egosi na anyị na-eme ihe dị mma.

A MACHIE ỌRỤ ANYỊ, Ọ̀ GA-EME KA ANYỊ KWỤSỊ IFE JEHOVA KPAMKPAM?

5. Ndị mmadụ hà nwere ike ịkwụsị ofufe Chineke? Kọwaa.

5 Mmadụ nkịtị agaghị enweli ike ịkwụsị ofufe Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile bụ́ Jehova. Ọtụtụ agbalịala ime ya, ma ha kụrụ afọ n’ala. Ka anyị tụlee ihe mere n’oge Agha Ụwa nke Abụọ. N’oge ahụ, ndị ọchịchị obodo dị iche iche mekpọrọ ndị Chineke ọnụ. Ọ bụghị naanị ndị òtù Nazi nke Jamanị machiri ọrụ Ndịàmà Jehova, kama, ndị ọchịchị Ọstrelia, Kanada, na obodo ndị ọzọ machikwara ya. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, n’afọ 1939, mgbe agha ahụ bidoro, Ndịàmà Jehova e nwere n’ụwa niile dị iri puku asaa na abụọ, narị anọ na iri asaa na ise. Mgbe agha biri n’afọ 1945, ngọzi Jehova mere ka ndị ya jiri ihe karịrị okpukpu abụọ karịa ihe ha dị ná mbido ya. Ha dịzi otu narị puku, iri puku ise na isii, narị abụọ na iri itoolu na itoolu.

6. Olee ihe ọma ndị nwere ike ime ma a kpagbuwe anyị? Nye ihe atụ.

6 Kama mkpagbu ga-eme ka anyị kwụsị ife Jehova, ọ ga-emedị ka anyị jirikwuo ya kpọrọ ihe. Dị ka ihe atụ, e nwere otu di na nwunye biri n’otu obodo a machiri ọrụ anyị. Ha nwere otu nwata nwoke. Kama ha iji ụjọ selata aka n’ozi ha na-ejere Jehova, ha malitere ịsụ ụzọ oge niile. Nwanna nwaanyị ahụ kwụsịdịrị ọrụ a na-akwụ ya ezigbo ụgwọ ka o nwee ike ịsụ ụzọ. Di ya kwuru na mmachi ahụ a machiri ọrụ anyị mere ka ọtụtụ ndị chọwa ịmatakwu gbasara Ndịàmà Jehova. Nke ahụ mere ka ọ dịziere ya mfe ịmalite ọtụtụ ọmụmụ Baịbụl. E nwekwara ihe ọma ọzọ si ná mmachi ahụ pụta. Otu okenye n’obodo ahụ kwuru na ọtụtụ ndị kwụsịrịla ife Jehova maliteghachiri ịbịa ọmụmụ ihe na ozi ọma.

7. (a) Olee ihe Levitikọs 26:36, 37 na-akụziri anyị? (b) Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na a machie ọrụ anyị n’obodo i bi?

7 Ọ bụrụ na ndị iro akpagbuwe anyị, ebumnobi ha bụ ka ha menye anyị ụjọ ka anyị kwụsị ife Jehova. Ha nwekwara ike ịgbasa akụkọ ụgha gbasara anyị, ziga ndị uwe ojii ka ha gaa chọọ ma è nwere ihe ha ga-ahụ n’ụlọ anyị, kpụpụ anyị n’ụlọikpe ma ọ bụdị tụọ ụfọdụ n’ime anyị mkpọrọ. Ha chere na ebe ọ bụ na ha atụọla ole na ole n’ime anyị mkpọrọ, ezigbo ụjọ ga-ejide anyị. Ọ bụrụ na anyị ekwe ka ha menye anyị ụjọ, o nwedịrị ike ime ka anyị jiri aka anyị “machie” onwe anyị ife Jehova. Anyị agaghị achọ ịdị ka ndị ahụ e kwuru okwu ha na Levitikọs 26:36, 37. (Gụọ.) Anyị agaghị ekwe ka ụjọ mee ka anyị selata aka n’ozi anyị ma ọ bụ kwụsị ife Jehova. Anyị tụkwasịrị Jehova obi anyị niile. Anyị agaghị atụ ụjọ ọ bụla. (Aịza. 28:16) Anyị na-arịọ Jehova ka o duzie anyị. Anyị ma na ebe Jehova kwụ anyị n’azụ, e nweghị ọchịchị mmadụ ọ bụla ga-egbochili anyị iji obi anyị niile na-efe Chineke, otú ọ sọrọ ya siruo n’ike.—Hib. 13:6.

Ọ̀ BỤ M KWAGA OBODO ỌZỌ?

8-9. (a) Olee ihe onyeisi ezinụlọ ọ bụla ma ọ bụ onye ọ bụla ga-eji aka ya kpebie? (b) Olee ihe ga-enyere mmadụ aka ikpebi ihe dị mma?

8 Ọ bụrụ na ndị ọchịchị amachie ọrụ anyị n’obodo i bi, i nwere ike ịna-eche ma ọ̀ ga-aka mma ịkwaga obodo ọzọ ebe a na-agaghị egbochi gị ife Jehova. Ọ bụ gịnwa ga-ekpebi ihe ị ga-eme, o nweghị onye ga-ekpebiri gị ya. Tupu mmadụ ekpebie ihe ọ ga-eme, o nwere ike ibu ụzọ tụlee ihe Ndị Kraịst mere mgbe a na-akpagbu ha n’oge ndịozi. Mgbe ndị iro tụgbuchara Stivin, ndị na-eso ụzọ Jizọs gbagara Judia na Sameria. Ha rudịrị Finishia, Saịprọs, na Antiọk. (Mat. 10:23; Ọrụ 8:1; 11:19) Ma, ndị ọzọ nwekwara ike ịtụle ihe Pọl onyeozi mere mgbe a kpagburu Ndị Kraịst. O kpebiri ịnọrọ ebe ahụ, n’agbanyeghị na o nwere ike ịbanye ná nsogbu. Ihe o ji mee ya bụ ka o nwee ike ịna-ekwusa ozi ọma ma na-agba ụmụnna ndị nọ ebe ahụ a na-echi ha ọnụ n’ala ume.—Ọrụ 14:19-23.

9 Olee ihe akụkọ ndị a na-akụziri anyị? Onyeisi ezinụlọ ọ bụla ga-ekpebi ma hà ga-akwapụ ma hà ga-anọrọ. Tupu ya ekpebie ihe ọ ga-eme, o kwesịrị ikpe ekpere ma chee otú ihe si dịrị n’ezinụlọ ya na uru na ọghọm nwere ike ịdị ma ọ bụrụ na ha akwapụ. N’okwu a, Onye Kraịst ọ bụla “ga-ebu ibu nke ya.” (Gal. 6:5) Anyị ekwesịghị ikpewe ndị ọzọ ikpe maka ihe ha kpebiri ime.

OLEE OTÚ ANYỊ GA-ESI NA-EFE CHINEKE MA A MACHIE ỌRỤ ANYỊ?

10. Olee ntụziaka alaka ụlọ ọrụ na ndị okenye ga-enye?

10 Olee otú i nwere ike isi nọgide na-efe Jehova ma a machie ọrụ anyị n’ebe i bi? Alaka ụlọ ọrụ ga-agwa ndị okenye ọgbakọ otú unu ga-esi na-enweta ihe ndị unu ga-eji na-amụ ihe, nakwa otú unu ga-esi na-enwe ọmụmụ ihe ma na-ekwusa ozi ọma. Ọ bụrụ na ha enwetalighị ndị okenye, ndị okenye ga-enyere gị na ndị niile nọ n’ọgbakọ unu aka ịnọgide na-efe Jehova. Ha ga-eji ihe ndị e dere na Baịbụl na n’akwụkwọ anyị na-eduzi unu.—Mat. 28:19, 20; Ọrụ 5:29; Hib. 10:24, 25.

11. Gịnị mere obi ji kwesị isi gị ike na ị ga na-enweta ihe niile dị gị mkpa iji nọgide na-efe Chineke, oleekwa otú i nwere ike isi chekwaa Baịbụl gị na ihe ndị i ji amụ Baịbụl?

11 Jehova kwere nkwa na ndị na-efe ya ga na-enweta ihe niile dị ha mkpa iji nọgide na-efe ya. (Aịza. 65:13, 14; Luk 12:42-44) N’ihi ya, obi kwesịrị isi gị ike na nzukọ ya ga-agba mbọ hụ na i nwetara ihe niile ga-eme ka ị nọgide na-efe Jehova. Ma, olee ihe gịnwa nwere ike ime? Ọ bụrụ na a machie ọrụ anyị, chọta ebe dị mma ị ga na-ezo Baịbụl gị na ihe ndị e ji amụ Baịbụl. Kpachara anya ka ị ghara ịhapụ ha n’ebe a ga-ahụ ha ngwa ngwa, ma ndị nke e biri ebi ma ndị nke dị n’ekwentị ma ọ bụ na kọmputa. Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịgba mbọ hụ na ọ nọgidere na-efe Jehova.

Ebe Jehova nọnyeere anyị, anyị nwere ike inwe ọmụmụ ihe n’atụghị ụjọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12) *

12. Olee otú ndị okenye ga-esi hazie ọmụmụ ihe ka ndị iro ghara ịmata?

12 Oleekwanụ maka ịga ọmụmụ ihe anyị? Ndị okenye ga-ahazi otú a ga-esi na-aga ha ka ndị iro anyị ghara ịma. Ha nwere ike ịhazi ka unu na-amụ ihe n’obere ìgwè n’obere ìgwè. Ọtụtụ mgbe, ha nwekwara ike ịna-agbanwe oge ọmụmụ ihe ndị ahụ na ebe unu ga-anọ na-enwe ha. I nwere ike inye aka chebe ụmụnna gị ma ọ bụrụ na i wedata olu ala ma ị na-ekwu okwu mgbe ị na-abịa na mgbe ị na-ala ọmụmụ ihe ahụ. O nwekwara ike ịdị mkpa ka i jikere otú a na-agaghị ama na ị na-aga ọmụmụ ihe.

Ọ bụrụgodị na ndị ọchịchị amachie ọrụ anyị, anyị agaghị akwụsị ikwusa ozi ọma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13) *

13. Olee ihe anyị ga-amụta n’aka ụmụnna anyị ndị nọ n’ebe bụbu Sọviet Yuniọn?

13 A bịa n’ihe gbasara ikwusa ozi ọma, ọ bụghị otú ihe dị n’otu ebe ka ọ ga-adị n’ebe ọzọ. Ma, ebe anyị hụrụ Jehova n’anya, chọọkwa ịgwa ndị ọzọ banyere Alaeze ya, anyị ga-agbalịsi ike hụ na anyị kwusara ozi ọma. (Luk 8:1; Ọrụ 4:29) Mgbe otu ọkọ akụkọ ihe mere eme aha ya bụ Emily B. Baran na-ekwu gbasara ozi ọma Ndịàmà Jehova n’ebe bụbu Sọviet Yuniọn, o kwuru, sị: “Mgbe ndị ọchịchị gwara ha ka ha kwụsị ikwusa ozi ọma, ha nọ na-agwa ndị agbata obi ha, ndị ọrụ ibe ha, nakwa ndị enyi ha gbasara Chineke. Ọ bụrụ na a tụọ ha mkpọrọ maka ya, ha eziwe ndị mkpọrọ ibe ha ozi ọma.” N’agbanyeghị na a machiri ọrụ ha n’ebe bụbu Sọviet Yuniọn, ụmụnna anyị ndị nọ ebe ahụ akwụsịghị ikwusa ozi ọma. Ọ bụrụ na a machie ọrụ anyị n’ebe i bi, ekpere anyị bụ ka ị kata ụdị obi ụmụnna anyị ndị a katara.

IHE NDỊ ANYỊ KWESỊRỊ IZERE

Anyị kwesịrị ịma mgbe anyị ga-agbachi nkịtị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14) *

14. Olee ihe Abụ Ọma 39:1 nwere ike inyere anyị aka izere?

14 Kpachara anya maka ihe ị na-agwa ndị ọzọ. Ọ bụrụ na a machie ọrụ anyị, anyị kwesịrị ịma na e nwere oge anyị kwesịrị “ịgbachi nkịtị.” (Ekli. 3:7) Anyị ekwesịghị ịgwa ndị ọzọ ihe ndị dị ka, aha ụmụnna anyị, ebe anyị na-ezukọ, otú anyị si ezi ozi ọma, nakwa otú anyị si enweta akwụkwọ anyị na ihe ndị ọzọ e ji amụ Baịbụl. Anyị ekwesịghị ịgwa ha ndị ọchịchị, ndị enyi anyị ma ọ bụ ndị ikwu anyị bi n’obodo anyị ma ọ bụ ná mba ọzọ. Ọ bụrụ na anyị agwa ha, anyị na-etinye ụmụnna anyị ná nsogbu.—Gụọ Abụ Ọma 39:1.

15. Olee ihe Ekwensu ga-agbalị ime anyị, oleekwa otú anyị nwere ike isi zere ya?

15 Ekwela ka obere ihe kpatara unu nkewa. Ekwensu ma na ụlọ ọ bụla kewara ekewa agaghị eguzo. (Mak 3:24, 25) Ọ ga na-agbalị mgbe niile ime ihe ga-eme ka anyị kewaa. Ihe mere o ji na-eme ya bụ ka anyị lụsowe ụmụnna anyị ọgụ kama ịlụso yanwa.

16. Olee ezigbo ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka Nwanna Nwaanyị Gertrud Poetzinger?

16 Ụmụnna ndị ma nke a na-akọ n’ọgbakọ kwesịkwara ịkpachara anya maka ihe a. Ka anyị tụlee ihe mere n’etiti ụmụnna nwaanyị abụọ e tere mmanụ aha ha bụ Gertrud Poetzinger na Elfriede Löhr. A tụrụ ha abụọ na ụmụnna nwaanyị ndị ọzọ mkpọrọ n’ogige ịta ahụhụ ndị Nazi. Nwanna Nwaanyị Gertrud meere Nwanna Nwaanyị Elfriede anyaụfụ mgbe o kwuchara okwu gbara ụmụnna nwaanyị ndị ọzọ nọ n’ogige ahụ ume. Mgbe e mechara, ihe o mere wutere ya, ya arịọwa Jehova ka o nyere ya aka ịkwụsị ya. O dere, sị: “Ọ bụrụ na onye ọzọ nwere nkà karịa anyị ma ọ bụ na e nyere ya ọrụ karịrị nke anyị, anyị ekwesịghị imere ya anyaụfụ.” Gịnị nyeere ya aka ịkwụsị inwe anyaụfụ? Nwanna Nwaanyị Gertrud malitere ilekwasị anyị n’àgwà ọma ndị Nwanna Nwaanyị Elfriede nwere nakwa n’otú o si emesapụ ihu. Nke a nyere aka mee ka ha abụọ bụrụghachi enyi ọzọ. Ha abụọ mechara si n’ogige ịta ahụhụ ahụ pụta, nọgidekwa na-efe Jehova ruo mgbe ha nwụrụ. Ọ bụrụ na anyị agbalịa dozie okwu ọ bụla anyị na ụmụnna anyị nwere, ọ ga-eme ka a ghara inwe ihe ọ bụla ga-ekewa anyị.—Kọl. 3:13, 14.

17. Gịnị mere o ji dị mma ịna-erubere nzukọ Jehova isi mgbe niile?

17 Na-erubere nzukọ Jehova isi. Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe niile ụmụnna ndị anyị tụkwasịrị obi na-edu ndú n’ọgbakọ gwara anyị, anyị ga-ezere nsogbu. (1 Pita 5:5) Dị ka ihe atụ, n’otu mba a machiri ọrụ anyị, ụmụnna na-edu ndú gwara ndị nkwusa ka ha ghara inye ndị mmadụ akwụkwọ n’ozi ọma. Ma, otu nwanna bụ́ ọsụ ụzọ jụrụ ime ihe ha kwuru ma nye ndị mmadụ akwụkwọ. Gịnị mechara mee? O teghị aka ya na ụmụnna ndị ọzọ zichara ndị ebe ahụ ozi ọma, ndị uwe ojii abịa gbawa ha ajụjụ. Ọ ga-abụ na ndị na-arụrụ ndị ọchịchị ọrụ nọ na-eso ha n’azụ ma na-anakọtakwa ndị mmadụ akwụkwọ niile ụmụnna ndị ahụ nyere ha. Olee ihe ihe a merenụ na-akụziri anyị? Anyị kwesịrị ịna-erube isi ọ bụrụgodị na ihe a gwara anyị mee adịchaghị anyị mma. Jehova ga na-agọzi anyị ma ọ bụrụ na anyị ana-erubere ndị ọ họpụtara ka ha na-edu ndú n’etiti anyị isi.—Hib. 13:7, 17.

18. Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịna-emere ndị ọzọ iwu ndị na-enweghị isi?

18 Emela iwu ndị na-enweghị isi. Ọ bụrụ na ndị okenye ana-eme iwu na-enweghị isi, ọ ga-eme ka ihe siere ndị ọzọ ike. Nwanna Juraj Kaminský chetara ihe merenụ mgbe a machiri ọrụ anyị n’ebe bụbu Chekoslovakia. Ọ sịrị: “Mgbe a nwụchichara ọtụtụ ndị okenye, ụfọdụ ndị nke fọrọnụ na-edu ndú n’ọgbakọ nakwa na sekit malitere imere ndị nkwusa iwu, na-agwa ha ihe ha ga-eme na ihe ha na-agaghị eme.” Jehova enyeghị anyị ikike ikpebiri ndị ọzọ ihe ha ga-eme. Onye ọ bụla na-emere nwanna ya ụdị iwu ndị a ebughị ọdịmma nwanna ya ahụ n’obi, kama, ọ na-emezi ka ọ̀ bụ ya nwe okwukwe nwanna ya.—2 Kọr. 1:24.

AKWỤSỊKWALA IFE JEHOVA

19. N’agbanyeghị mgbalị Setan, olee otú ihe e kwuru na 2 Ihe E Mere 32:7, 8 si eme ka obi sie anyị ike?

19 Onye iro anyị kachanụ bụ́ Ekwensu agaghị akwụsị ịkpagbu ndị na-efe Jehova. (1 Pita 5:8; Mkpu. 2:10) Ya na ndị òtù ya ga-agbalị ike ha ịmachi anyị ife Jehova. Ma, anyị ekwesịghị ikwe ka ha mee ka anyị kwụsị ife Jehova. (Diut. 7:21) Jehova nọnyeere anyị, ọ ga-anọgidekwa na-akwado anyị a sịgodị na ha amachie ọrụ anyị.—Gụọ 2 Ihe E Mere 32:7, 8.

20. Gịnị ka i kpebiri ime?

20 Ka anyị niile kpebie ime ụdị ihe ahụ ụmụnna anyị mere n’oge ndịozi. Ha gwara ndị ọchịchị, sị: “Kpebienụ n’onwe unu ma ò ziri ezi n’anya Chineke ige unu ntị kama ige Chineke ntị. Ma anyị onwe anyị apụghị ịkwụsị ikwu banyere ihe ndị anyị hụrụ na ihe ndị anyị nụrụ.”—Ọrụ 4:19, 20.

ABỤ NKE 73 Mee Ka Anyị Ghara Ịtụ Egwu

^ par. 5 Olee ihe anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ndị ọchịchị amachie anyị ife Jehova? N’isiokwu a anyị ga-amụta ihe ndị anyị ga-eme na ihe ndị anyị na-ekwesịghị ime iji nwee ike ịnọgide na-efe Chineke.

^ par. 59 NKỌWA FOTO: Foto niile dị n’isiokwu a na-egosi ụmụnna ndị na-eje ozi ná mba ndị a machiri anyị ime ihe ụfọdụ. Na foto a, ụmụnna ụfọdụ gbakọrọ na-enwe ọmụmụ ihe n’ebe otu nwanna na-akwakọba ihe.

^ par. 61 NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna nwaanyị (n’aka ekpe) na nwaanyị ọzọ na-akparịta ụka, ya ana-achọ otú ọ ga-esi zie ya ozi ọma.

^ par. 63 NKỌWA FOTO: Ebe ndị uwe ojii na-agba otu nwanna ajụjụ, ya ajụ ịgwa ha gbasara ọgbakọ ha.