Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ 40

Na-ekwusasi Ozi Ọma Ike ná Ngwụcha “Oge Ikpeazụ A”

Na-ekwusasi Ozi Ọma Ike ná Ngwụcha “Oge Ikpeazụ A”

“Guzosienụ ike, bụrụnụ ndị kwụ chịm, ndị nwere ọtụtụ ihe ha na-arụ mgbe niile n’ọrụ Onyenwe anyị.”​—1 KỌR. 15:58.

ABỤ NKE 58 Anyị Na-achọ Ndị Udo

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Gịnị mere obi ji sie anyị ike na anyị bi “n’oge ikpeazụ”?

À MỤRỤ gị mgbe afọ 1914 gachara? Ọ pụtara na i bi “n’oge ikpeazụ” nke ụwa ochie a kemgbe a mụrụ gị. (2 Tim. 3:1) Anyị niile anụla gbasara ihe ndị ahụ Jizọs kwuru ga na-eme n’oge anyị a, ya bụ, ihe ndị dị ka agha, ụkọ nri, ala ọma jijiji, ọrịa na-efe efe, mmebi iwu na-arị elu, na mkpagbu a na-akpagbu ndị Jehova. (Mat. 24:​3, 7-9, 12; Luk 21:​10-12) Anyị ahụkwala ka ndị mmadụ na-akpa àgwà otú ahụ Pọl onyeozi buru n’amụma. (Gụọ igbe bụ́ “ Àgwà Ndị Mmadụ Na-akpa Ugbu A.”) Obi siri anyị bụ́ ndị na-efe Jehova ike na anyị bi “n’oge ikpeazụ.”​—Maị. 4:1.

2. Olee ajụjụ ndị anyị kwesịrị ịmata azịza ha?

2 Ebe ọ bụ na ọtụtụ afọ agaala kemgbe afọ 1914, ọ ga-abụrịrị na anyị bizi ná ngwụcha “oge ikpeazụ.” Ebe ọ bụ na ọgwụgwụ ụwa a dịzi ezigbo nso, ajụjụ ụfọdụ dị mkpa anyị kwesịrị ịmata azịza ha bụ: Olee ihe ndị ga-eme ná ngwụcha “oge ikpeazụ” a? Olee ihe Jehova chọrọ ka anyị na-eme mgbe anyị na-echere ka ihe ndị ahụ mee?

OLEE IHE NDỊ GA-EME NÁ NGWỤCHA “OGE IKPEAZỤ” A?

3. Dị ka e buru n’amụma ná 1 Ndị Tesalonaịka 5:​1-3, olee ọkwa ndị ọchịchị ụwa ga-ama?

3 Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 5:​1-3. Pọl kwuru banyere “ụbọchị Jehova.” N’amaokwu Baịbụl ahụ, ọ pụtara na oge ahụ ga-amalite mgbe a ga-alụso “Babịlọn Ukwu ahụ” ọgụ, ya bụ, okpukpe ụgha niile dị n’ụwa, jirikwa Amagedọn pịachie. (Mkpu. 16:​14, 16; 17:5) Tupu “ụbọchị” ahụ ebido, ndị ọchịchị ụwa ga-ama ọkwa na e nweela “udo na obi iru ala.” (E nwere Baịbụl kpọrọ ya “udo na ịnọ ná ntụkwasị obi.”) Mgbe ụfọdụ, ndị ọchịchị ụwa na-ekwu ụdị ihe ahụ ma ha kwuwe otú mba dị iche iche ga-esi dịkwuo ná mma. * Ma, “udo na obi iru ala” ahụ Baịbụl kwuru na a ga-ama ọkwa ya ga-adị iche. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na, a maa ọkwa ahụ, ndị mmadụ nwere ike iche na ndị ọchịchị ụwa emeela ka udo dị n’ụwa, meekwa ka obi ruo onye ọ bụla ala. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na “mbibi mberede” ga-abịakwasị ha n’oge “oké mkpagbu” ahụ.​—Mat. 24:21.

Ekwela ka ọkwa ndị ọchịchị ụwa ga-ama na e nweela “udo na obi iru ala” megharịa gị anya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 3 ruo na nke 6) *

4. (a) Olee ihe ndị anyị na-amaghị gbasara ọkwa ahụ a ga-ama na e nweela “udo na obi iru ala”? (b) Olee ihe anyị ma gbasara ya?

4 E nwere ihe ndị anyị ma gbasara ọkwa ahụ a ga-ama na e nweela “udo na obi iru ala.” Ma, e nwere ihe ndị anyị na-amaghị. Anyị amaghị ihe ga-eme ka ha maa ọkwa ahụ ma ọ bụ otú ha ga-esi ama ya. Anyị amaghịkwa ma hà ga-ama ya naanị otu ugboro, ka hà ga-ama ya ugboro ugboro. Nke ọ bụla ọ bụ, ihe anyị ma bụ na anyị ekwesịghị ikwe ka ndị ọchịchị ụwa mee ka anyị chee na ha ga-emeli ka ezigbo udo dị n’ụwa. Kama, ihe a gwara anyị bụ ka anyị na-atụ anya mgbe a ga-ama ọkwa ahụ. Ọ ga-egosi na “ụbọchị Jehova” agawala ibido.

5. Olee otú 1 Ndị Tesalonaịka 5:​4-6 si enyere anyị aka ijikere maka “ụbọchị Jehova”?

5 Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 5:​4-6. Pọl gwara anyị ihe anyị kwesịrị ime iji jikere maka “ụbọchị Jehova.” Anyị ekwesịghị “ịnọ na-ehi ụra dị ka ndị ọzọ na-ehi.” Anyị kwesịrị ‘ịmụrụ anya’ ma na-eche nche. Dị ka ihe atụ, anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara itinye aka n’agha ma ọ bụ na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ụwa a. Anyị tinye aka n’ụdị ihe ahụ, anyị nwere ike ịbụzi “nke ụwa.” (Jọn 15:19) Anyị ma na ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-eme ka udo dị n’ụwa a.

6. Gịnị ka anyị kwesịrị inyere ndị ọzọ aka ka ha mee? Maka gịnị?

6 E wezụga anyịnwa ịmụrụ anya, anyị kwesịkwara inyere ndị ọzọ aka ka ha mata ihe Baịbụl kwuru ga-eme n’ụwa a. Ka anyị cheta na ozugbo oké mkpagbu ahụ bidoro, ndị mmadụ agaghịzi abịali fewe Jehova, n’ihi na oge agaala. Ọ bụ ya mere o ji dị ezigbo mkpa ka anyị kwusaa ozi ọma ugbu a. *

NA-EKWUSASI OZI ỌMA IKE

Ka anyị na-ekwusa ozi ọma taa, anyị na-eme ka a mata na ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-eme ka e nwee ezigbo udo na obi iru ala n’ụwa (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7 ruo na nke 9)

7. Gịnị ka Jehova chọrọ ka anyị mee ugbu a?

7 N’obere oge a fọrọnụ tupu “ụbọchị Jehova” amalite, Jehova chọrọ ka anyị na-ekwusasi ozi ọma ike. Anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike ka anyị ‘nwee ọtụtụ ihe anyị na-arụ mgbe niile n’ọrụ Onyenwe anyị.’ (1 Kọr. 15:58) Jizọs buru amụma ihe anyị ga-eme. Mgbe ọ na-ekwu gbasara ihe niile gbara ọkpụrụkpụ ga-eme n’oge ikpeazụ a, o kwukwara, sị: “A ghaghịkwa ibu ụzọ kwusaa ozi ọma ahụ ná mba niile.” (Mak 13:​4, 8, 10; Mat. 24:14) Chegodị echiche. Mgbe ọ bụla ị gara ozi ọma, i so na-emezu amụma ahụ Baịbụl buru.

8. Olee ihe gosiri na ozi ọma anyị na-ekwusa na-aga nke ọma?

8 Ozi ọma anyị na-ekwusa ọ̀ na-aga nke ọma? Kwa afọ, ọ na-aga n’ihu n’ihu. Dị ka ihe atụ, chegodị otú e si nwekwuo ndị nkwusa Alaeze n’ụwa niile n’oge ikpeazụ a. N’afọ 1914, e nwere puku ndị nkwusa ise, otu narị na iri ise na ise ná mba iri anọ na atọ. Taa, e nwere ihe dị ka nde ndị nkwusa asatọ na ọkara na narị mba abụọ na iri anọ. N’agbanyeghị nke ahụ, anyị ekwusachabeghị ozi ọma a. Anyị ka kwesịrị ịna-ekwusa na ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-akwụsị nsogbu anyị niile.​—Ọma 145:​11-13.

9. Gịnị mere anyị agaghị akwụsị ịna-ekwusa ozi ọma?

9 Anyị agaghị akwụsị ozi ọma anyị na-ekwusa ruo mgbe Jehova ga-asị na o zuola. Ọ̀ bụ afọ ole fọọrọ ndị mmadụ ịbịa mara Jehova Chineke na Jizọs Kraịst? (Jọn 17:3) Anyị amaghị. Ihe anyị ma bụ na ruo mgbe oké mkpagbu ahụ ga-amalite, ndị ọ bụla “nwere ezi obi maka inweta ndụ ebighị ebi” ka nwere ike ịnabata ozi ọma ma chegharịa. (Ọrụ 13:48) Olee otú anyị nwere ike isi nyere ndị ahụ aka tupu oge agaa?

10. Olee otú Jehova si enyere anyị aka ịkụziri ndị mmadụ eziokwu?

10 Jehova ji nzukọ ya na-enye anyị ihe niile anyị ga-eji na-akụziri ndị mmadụ eziokwu. Dị ka ihe atụ, a na-azụ anyị kwa izu n’ọmụmụ ihe etiti izu. Ọmụmụ ihe a na-enyere anyị aka ịma ihe anyị ga-ekwu ná mkparịta ụka nke mbụ nakwa ná nletaghachi. Ọ na-akụzikwara anyị otú anyị ga-esi na-eduzi ọmụmụ Baịbụl. Nzukọ Jehova enyekwala anyị Ihe Ndị Anyị Ji Akụziri Ndị Mmadụ Ihe. Ihe ndị a na-enyere anyị aka . . .

  • ịmalite mkparịta ụka,

  • ikwusa ozi ọma otú ga-eme ka ndị mmadụ nwee mmasị,

  • inyere ndị mmadụ aka ka ha chọọ ịmụtakwu gbasara Baịbụl,

  • ịkụzi eziokwu mgbe anyị na-amụrụ mmadụ Baịbụl, nakwa

  • ịgwa ndị nwere mmasị ka ha gaa n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet nakwa ka ha bịa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.

N’eziokwu, inwe ihe ndị a abụghị ebe okwu biri. Anyị kwesịrị iji ha na-enyere ndị mmadụ aka. * Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na gị na onye nwere mmasị ekwuchaa gbasara Baịbụl, gị enye ya traktị ma ọ bụ magazin, ọ ga-enwe ike ịna-agụ ya ruo mgbe gị na ya ga-ahụ ọzọ. Anyị kwesịrị ịna-agbalịsi ike na-ekwusa ozi ọma kwa ọnwa.

11. Gịnị mere e ji wepụta Online Bible Study Lessons?

11 Ihe ọzọ na-egosi otú Jehova si na-enyere ndị mmadụ aka ịmụta eziokwu bụ Online Bible Study Lessons dị na jw.org®. Gịnị mere e ji wepụta ya? Kwa afọ, ọtụtụ puku mmadụ n’ụwa niile na-aga n’Ịntanet na-achọ ịmata ihe ụfọdụ gbasara Baịbụl. Ihe ahụ dị na jw.org nwere ike ime ka ụdị ndị ahụ mụta eziokwu Baịbụl na-akụzi. O nwekwara ike ụfọdụ ndị ị na-ahụ n’ozi ọma agaghị ekweta ozugbo ka ị mụwara ha Baịbụl. Ị hụ ụdị ndị ahụ, gosi ha ihe a dị n’Ịntanet ma ọ bụ gị esi n’Ịntanet zigara ha ihe ga-enyere ha aka imepe ya. *

12. Olee ihe mmadụ ga-amụta na Online Bible Study Lessons?

12 Isiokwu ndị gbara na Online Bible Study Lessons kwuru gbasara Baịbụl na onye e dere uche ya na ya, ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl, na ihe Baịbụl kwuru mere ka anyị nwee olileanya. Ihe mmadụ ga-amụta n’isiokwu ndị ahụ bụ:

  • Otú Baịbụl nwere ike isi nyere mmadụ aka

  • Onye Jehova na Jizọs bụ nakwa ndị bụ́ ndị mmụọ ozi

  • Ihe mere Chineke ji kee ndị mmadụ

  • Ihe mere ndị mmadụ ji ata ahụhụ na ihe mere ihe ọjọọ ji dịrị

N’isiokwu ndị ahụ, a kọwakwara otú Jehova ga-esi . . .

  • mee ka ịta ahụhụ na ọnwụ kwụsị,

  • kpọlite ndị nwụrụ anwụ,

  • jirikwa Alaeze ya dochie ọchịchị ụmụ mmadụ na-enweghị isi na ọdụ.

13. È ji ihe a dị n’Ịntanet dochie Baịbụl anyị na-amụrụ ndị mmadụ? Kọwaa.

13 E jighị ihe a dị n’Ịntanet dochie Baịbụl anyị na-amụrụ ndị mmadụ. Jizọs nyere anyị ọrụ ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ ya. Anyị na-atụ anya na ndị nwere mmasị ga-aga mụọ ihe ahụ dị n’Ịntanet, ya atọmịrị ha, ha achọọkwa ịmụtakwu ihe ndị ọzọ. O nwere ike ime ka ha kweta ka a mụwara ha Baịbụl. Ná ngwụcha ihe ọmụmụ nke ọ bụla, a na-agwa onye ahụ ka o dejupụta fọm kwuo na ọ chọrọ ka e zitere ya onye ga-amụwara ya ihe. Kwa ụbọchị, n’ụwa niile, ndị na-esi n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet ekwu ka a bịa mụwara ha ihe karịrị narị mmadụ abụọ na iri atọ. Baịbụl ahụ a na-amụrụ ndị mmadụ otu otu dị ezigbo mkpa.

NA-AGBALỊSI IKE IME KA NDỊ MMADỤ BỤRỤ NDỊ NA-ESO ỤZỌ JIZỌS

14. Dị ka Jizọs kwuru na Matiu 28:​19, 20, gịnị ka anyị ga-agbalịsi ike na-eme? Maka gịnị?

14 Gụọ Matiu 28:​19, 20. Ka anyị na-amụrụ ndị mmadụ Baịbụl, anyị ga-agbalịsi ike ‘na-eme ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs, na-ezi ha ka ha debe ihe niile o nyere anyị n’iwu.’ Anyị kwesịrị ịna-enyere ndị mmadụ aka ịghọta na ha kwesịrị ikpebi ifewe Jehova, na-akwadokwa Alaeze ya. Ihe ọ pụtara bụ na anyị kwesịrị ịna-enyere ndị mmadụ aka ka ha na-eme ihe ha mụtara, nyefee Jehova onwe ha, e meekwa ha baptizim. Ọ bụ naanị ihe ga-eme ka ha lafere ụbọchị Jehova.​—1 Pita 3:21.

15. Gịnị ka anyị na-ekwesịghị ime? Maka gịnị?

15 Dị ka anyị kwuburu, oge fọrọ tupu e bibie ụwa ochie a dị ezigbo ntakịrị. N’ihi ya, o doo anya na mmadụ achọghị ịbụ onye na-eso ụzọ Kraịst, anyị ekwesịghị ịnọ na-amụrụ ya Baịbụl. (1 Kọr. 9:26) Oge anyị ga-eji zie ozi ọma na-akụzi kwarapụ kwarapụ. E nwere ọtụtụ ndị e kwesịrị izi ozi ọma Alaeze Chineke tupu oge agaa.

GBAARA IHE Ọ BỤLA GBASARA OKPUKPE ỤGHA ỌSỌ

16. Dị ka e kwuru ná Mkpughe 18:​2, 4, 5, 8, gịnị ka anyị niile kwesịrị ime? (Kwuokwa ihe e dere n’ala ala peeji.)

16 Gụọ Mkpughe 18:​2, 4, 5, 8Amaokwu ndị a mere ka anyị mata ihe ọzọ Jehova chọrọ ka ndị na-efe ya mee. Ezigbo Ndị Kraịst niile kwesịrị ịsa anya na mmiri ka ha ghara itinye aka n’ihe ọ bụla gbasara okpukpe ụgha. Tupu mmadụ amụta eziokwu Baịbụl, o nwere ike ịbụ na ọ nọbu n’okpukpe ụgha, soro ha na-efe ofufe, na-eme ihe ndị ha na-eme ma ọ bụ na-atụrụ ha ụtụ. Tupu onye a na-amụrụ ihe aghọọ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim, ọ ga-esepụ aka n’ihe ọ bụla jikọrọ ya na okpukpe ụgha. Ọ ga-ede akwụkwọ ozi gwa ha na o nweghịzi ihe jikọrọ ha na ya ma ọ bụ mee ka o doo anya na o nweghịzi ihe jikọrọ ya na chọọchị ahụ ọ nọbu nakwa n’òtù ọ bụla ọzọ ya na Babịlọn Ukwu ahụ na-emekọ ihe. *

17. Olee ụdị ọrụ Onye Kraịst na-ekwesịghị ịrụ? Maka gịnị?

17 Ezigbo Onye Kraịst kwesịrị ịgbasi mbọ ike ka ọrụ ya ghara inwe ihe jikọrọ ya na Babịlọn Ukwu ahụ. (2 Kọr. 6:​14-17) Dị ka ihe atụ, ọ gaghị ekwe ka chọọchị wee ya n’ọrụ. Onye Kraịst ụlọ ọrụ ha dunyere ọrụ ekwesịghịkwa ịga rụọ ọrụ buru ibu n’ụlọ e ji akwado okpukpe ụgha. Ọ bụrụ onye nwere ụlọ ọrụ nke ya, ọ gaghị agbalịwa ka okpukpe ọ bụla so na Babịlọn Ukwu ahụ nye ya ọrụ ọ ga-arụ. Ha nyegodị ya, ọ gaghị ekwe arụ. Gịnị mere anyị ejighị ụdị ihe a egwu egwu? Ọ bụ n’ihi na anyị achọghị ka aka anyị dịrị n’ihe na-abụghị eziokwu okpukpe ụgha na-akụzi nakwa n’ihe ọjọọ ndị ha na-eme Chineke kpọrọ asị.​—Aịza. 52:11. *

18. Olee otú otu nwanna si rubere ihe Baịbụl kwuru isi n’ihe gbasara ọrụ ya?

18 Ọtụtụ afọ gara aga, a kpọrọ otu okenye nwere ụlọ ọrụ nke ya ka ọ bịa rụọ obere ọrụ kapịnta n’otu chọọchị dị n’ebe o bi. Onye kpọrọ nwanna ahụ ọrụ ahụ ma na ọ na-ekwu mgbe niile na ya agaghị arụ ọrụ ọ bụla na chọọchị. Ma nwoke ahụ chọsiri ike inweta onye ga-arụ ọrụ ahụ. N’agbanyeghị nke ahụ, nwanna ahụ ekweghị arụ ọrụ ahụ n’ihi ihe Baịbụl kwuru. N’izu na-eso ya, foto ebe nwoke ọzọ bụ́ kapịnta na-ekonye obe na chọọchị gbara n’otu akwụkwọ akụkọ ndị obodo ahụ. A sị na nwanna ahụ kwere gaa rụọ ọrụ ahụ, ọ bụ foto ya gaara agba n’akwụkwọ akụkọ ahụ. Chegodị otú ụmụnna gaara esi na-ele nwanna ahụ anya ma ọ bụrụ ya ka e sere n’akwụkwọ akụkọ ahụ. Cheekwa otú obi gaara adị Jehova.

GỊNỊ KA ANYỊ MỤTARA?

19-20. (a) Olee ihe ndị anyị mụtara n’isiokwu a? (b) Oleekwa ihe ndị ọzọ anyị kwesịrị ịmata?

19 Amụma e buru na Baịbụl na-egosi na ihe ọzọ dị ezigbo mkpa ga-eme n’ụwa n’oge na-adịghị anya bụ na ndị ọchịchị ụwa ga-ama ọkwa na e nweela “udo na obi iru ala.” Ihe Jehova na-akụziri anyị mere ka anyị mara na ndị ọchịchị agaghị emeli ka ezigbo udo dị n’ụwa. Olee ihe anyị kwesịrị ime tupu a maa ọkwa a, mbibi mberede esochiekwa ya? Jehova chọrọ ka anyị na-ekwusasi ozi ọma Alaeze ya ike ma na-emekwu ka ndị ọzọ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ọ chọkwara ka a ghara inwe ihe ọ bụla ga-ejikọ anyị na okpukpe ụgha. Ihe ọ pụtara bụ na anyị ga-akwụsị ịbụ ndị òtù ha, jụkwa ịrụ ọrụ ọ bụla nwere ihe jikọrọ ya na Babịlọn Ukwu ahụ.

20 E nwere ihe ndị ọzọ ga-emenụ ná ngwụcha “oge ikpeazụ” a ma a machaa ọkwa ahụ. E nwekwara ihe ndị ọzọ Jehova chọrọ ka anyị mee. Gịnị bụ ihe ndị ahụ? Olee otú anyị ga-esi jikere maka ihe niile ga-emenụ n’oge na-adịghị anya? A ga-amata azịza ajụjụ ndị a n’isiokwu na-esonụ.

ABỤ NKE 71 Anyị Bụ Ndị Agha Jehova

^ par. 5 N’oge na-adịghị anya, anyị na-atụ anya ịnụ ka ndị ọchịchị ụwa na-ama ọkwa na e nweela “udo na obi iru ala.” Ọ bụ ihe ga-egosi na oké mkpagbu ahụ achọwala ịmalite. Gịnị ka Jehova chọrọ ka anyị na-eme tupu a maa ọkwa ahụ? Isiokwu a ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ a.

^ par. 3 Dị ka ihe atụ, n’ebe Òtù Mba Ụwa na-edebe ihe n’Ịntanet, ha kwuru na ha “na-eme ka e nwee udo na obi iru ala ná mba niile.”

^ par. 10 Ị chọọ ịhụ ebe a kọwara otú anyị ga-esi jiri ihe ndị ahụ na-akụziri ndị mmadụ ihe, gụọ isiokwu bụ́ “Na-akụzi Eziokwu,” nke gbara n’Ụlọ Nche Ọktoba afọ 2018.

^ par. 11 E nwere ya ugbu a naanị na Bekee nakwa na Pọtugiiz. A ga-emecha nwee ya n’asụsụ ndị ọzọ.

^ par. 16 Anyị ekwesịghịkwa iso n’òtù ọ bụla nwere ihe jikọrọ ya na okpukpe ụgha, dị ka òtù ndị ntorobịa, ma ọ bụ iso n’ihe omume okpukpe ụgha haziiri ndị ntorobịa ma ọ bụkwanụ ịga n’ebe ha mepere maka imega ahụ́. Ọtụtụ n’ime òtù ndị ahụ e hiwere maka ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa na-agbalị ime ihe ụfọdụ na-eme ka ndị mmadụ chee na e nwechaghị ihe jikọrọ ha na okpukpe. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụ ndị okpukpe ụgha hiwere òtù ndị ahụ iji mezuo ihe ha bu n’obi.

^ par. 17 Ị chọọ ịhụ ebe a kọwakwuru ihe Baịbụl kwuru banyere ịrụ ọrụ ego gbasara okpukpe ụgha, gụọ “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ,” nke gbara n’Ụlọ Nche April 15, 1999.

^ par. 83 NKỌWA FOTO: Ndị nọ n’ebe a na-eritụ ihe kporopụrụ anya na-ele tiivi mgbe a na-ama ọkwa na e nweela “udo na obi iru ala.” Di na nwunye gara ozi ọma nọ ebe ahụ na-emetụ ihe n’ọnụ. Ma, ha ekweghị ka akụkọ ahụ megharịa ha anya.