Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ 44

Mee Ka Gị na Ụmụnna Gị Dịkwuo ná Mma Tupu Ọgwụgwụ Eruo

Mee Ka Gị na Ụmụnna Gị Dịkwuo ná Mma Tupu Ọgwụgwụ Eruo

“Ezi enyi nwere ịhụnanya mgbe niile.”—ILU 17:17.

ABỤ NKE 101 Anyị Na-arụkọ Ọrụ ma Dịrị n’Otu

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

Ezigbo ndị enyi ga-abara anyị uru n’oge “oké mkpagbu” na-abịanụ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 2) *

1-2. Dị ka e kwuru na 1 Pita 4:7, 8, olee ihe ga-enyere anyị aka idi nsogbu ndị bịaara anyị?

KA ANYỊ na-eru ná ngwụcha “oge ikpeazụ” a, nsogbu ndị tara akpụ nwere ike ịbịara anyị. (2 Tim. 3:1) Dị ka ihe atụ, mgbe e mechara ntụliaka n’otu obodo dị n’ebe ndịda Afrịka, ọgba aghara na tigbuo zọgbuo bidoro. Ruo ihe karịrị ọnwa isii, ụmụnna anyị enweghị ike ịgagharị agagharị n’ihi ọgụ a na-alụ n’ebe niile. Olee ihe nyeere ha aka idi nsogbu ahụ? Ụfọdụ gbagara n’ụlọ ụmụnna ha ndị bi n’ebe ọgụ ahụ na-erubeghị. Otu nwanna kwuru, sị: “Mgbe ihe a mere, obi tọrọ m ụtọ na m nwere ndị enyi gbara m gburugburu. Anyị gbara ibe anyị ume.”

2 Mgbe “oké mkpagbu ahụ” ga-amalite, obi ga-adị anyị ụtọ na anyị nwere ezigbo ndị enyi hụrụ anyị n’anya. (Mkpu. 7:14) N’ihi ya, anyị kwesịrị ime ka anyị na ụmụnna anyị na-adịkwu ná mma ugbu a. (Gụọ 1 Pita 4:7, 8.) Anyị nwere ike ịmụta ọtụtụ ihe n’ihe mere Jeremaya. Ndị enyi ya zọrọ ya ndụ obere oge tupu e bibie Jeruselem. * Olee otú anyị nwere ike isi mee ka Jeremaya?

MỤTA IHE N’IHE MERE JEREMAYA

3. (a) Olee ihe gaara eme ka Jeremaya nọwara onwe ya? (b) Gịnị ka Jeremaya gwara Barọk bụ́ odeakwụkwọ ya? Oleekwa uru ọ bara?

3 Ruo iri afọ anọ ma ọ bụ karịa, Jeremaya biri n’ebe ọtụtụ ndị na-anaghị erubere Chineke isi, ma ndị agbata obi ya ma ikekwe ụfọdụ ndị ikwu ya si n’obodo ha bụ́ Anatọt. (Jere. 11:21; 12:6) Ma, o meghị ka ọ nọwara onwe ya. N’eziokwu, ọ gwara Barọk bụ́ odeakwụkwọ ya ọ tụkwasịrị obi otú obi dị ya. Ihe o dere emeekwala ka anyị mata otú obi dị ya. (Jere. 8:21; 9:1; 20:14-18; 45:1) O doro anya na ka Barọk na-ede ihe ahụ Jeremaya kọọrọ ya, o mere ka ha abụọ hụ ibe ha n’anya ma na-akwanyere ibe ha ùgwù.—Jere. 20:1, 2; 26:7-11.

4. Gịnị ka Jehova gwara Jeremaya ka o mee? Oleekwa otú ọrụ a o nyere ya si mee ka ya na Barọk dịkwuo ná mma?

4 Ruo ọtụtụ afọ, Jeremaya katara obi na-adọ ndị Izrel aka ná ntị gbasara ihe na-aga ime Jeruselem. (Jere. 25:3) Ná mbọ ọzọ Jehova gbara ime ka ndị ya chegharịa, ọ gwara Jeremaya ka o dee aka ná ntị ahụ ọ dọrọ ha n’akwụkwọ mpịakọta. (Jere. 36:1-4) Ka ha abụọ gbakọrọ aka na-arụ ọrụ a Chineke nyere ha, ikekwe ruo ọnwa ụfọdụ, o doro anya na ha nọ na-ekwurịta ihe mere ka okwukwe ha sie ike.

5. Olee otú Barọk si gosi na ọ bụ ezigbo enyi Jeremaya?

5 Mgbe oge ruru ka a mata ihe e dere n’akwụkwọ mpịakọta ahụ, Jeremaya tụkwasịrị Barọk obi na ọ ga-agwa ndị mmadụ ihe e dere na ya. (Jere. 36:5, 6) Barọk katara obi mee ihe a n’agbanyeghị na o nwere ike ịta isi ya. Chegodị otú obi si tọọ Jeremaya ụtọ mgbe ọ hụrụ ka Barọk banyere n’ogige ụlọ nsọ ahụ mee ihe ahụ ọ gwara ya. (Jere. 36:8-10) Ndị isi Juda nụrụ ihe Barọk mere ma nye ya iwu ka ọ gụpụtara ha ihe e dere n’akwụkwọ mpịakọta ahụ. (Jere. 36:14, 15) Ndị isi ahụ kpebiri ịgwa Eze Jehoyakim ihe Jeremaya kwuru. Ha meteere Barọk ebere, sị ya: “Gị na Jeremaya gaa zoo, ka mmadụ ọ bụla ghara ịma ebe unu nọ.” (Jere. 36:16-19) Ndụmọdụ a ha nyere ya dị mma.

6. Olee ihe Jeremaya na Barọk mere mgbe a nọ na-akpagbu ha?

6 Mgbe a gụụrụ Eze Jehoyakim ihe Jeremaya dere, ụdị iwe were ya mere ka ọ gbaa akwụkwọ mpịakọta e ji dee ya ọkụ, nyekwa iwu ka a nwụchie Jeremaya na Barọk. Ma, Jeremaya atụghị ụjọ. O nyere Barọk akwụkwọ mpịakọta ọzọ. Ka ọ na-agwa Barọk ihe Jehova kwuru, Barọk dere “ihe niile . . . dị n’akwụkwọ ahụ Jehoyakim eze Juda gbara ọkụ.”—Jere. 36:26-28, 32.

7. Olee ihe o nwere ike ịbụ ya mere mgbe Jeremaya na Barọk na-arụkọ ọrụ?

7 Mmadụ abụọ gbakọọ aka die nsogbu, ọ na-eme ka ha dịkwuo ná mma. N’ihi ya, o nwere ike ịbụ na ka Jeremaya na Barọk gbakọrọ aka na-edeghachi ihe e dere n’akwụkwọ ahụ Eze Jehoyakim gbara ọkụ, ha abụọ matakwuru àgwà ọma ibe ha, ha adịkwuo ná mma. Olee otú ihe mmadụ abụọ a kwesịrị ntụkwasị obi mere nwere ike isi baara anyị uru?

NA-AKỌRỌ NDỊ ENYI GỊ OTÚ OBI DỊ GỊ

8. Olee ihe nwere ike ime ka o siere anyị ike ịgbalịwa ka anyị na ndị ọzọ dị n’ezigbo mma? Gịnịkwa mere na anyị ekwesịghị iche na anyị agaghị emeli ya?

8 O nwere ike ịna-esiri anyị ike ịgwa ndị ọzọ ihe dị anyị n’obi ma ọ bụrụ na mmadụ mewara anyị obi n’oge gara aga. (Ilu 18:19, 24) Anyị nwekwara ike na-eche na anyị enweghị oge na ike anyị ga-eji mee ka anyị na ndị ọzọ na-adị ná mma. Ma, anyị ekwesịghị iche na anyị agaghị emeli ya. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ụmụnna anyị nyere anyị aka ma nsogbu bịara anyị, anyị kwesịrị ịgbalị ka anyị na ha dịrị n’ezigbo mma ugbu a. Otu ụzọ dị mkpa anyị ga-esi eme ya bụ ịna-agwa ha ihe anyị na-eche na otú obi dị anyị.—1 Pita 1:22.

9. (a) Olee otú Jizọs si gosi na ọ tụkwasịrị ndị enyi ya obi? (b) Olee otú ịkọrọ ndị enyi anyị ihe dị anyị n’obi nwere ike isi mee ka anyị na ha na-adịkwu ná mma? Nye ihe atụ.

9 Jizọs gwara ndị enyi ya ihe niile dị ya n’obi. O nweghị nke o zooro ha. Ihe a o mere gosiri na ọ tụkwasịrị ha obi. (Jọn 15:15) Anyị na-eme ka Jizọs ma ọ bụrụ na anyị na-agwa ndị ọzọ ihe ndị mere anyị obi ụtọ, ihe ndị na-echegbu anyị, na ihe ndị kpasuru anyị iwe. Na-ege ntị nke ọma ma onye ọzọ na-agwa gị okwu. O nwere ike ime ka ị chọpụta na obi gị na ya bụ otu n’ọtụtụ ihe nakwa na e nwere ọtụtụ ihe ị chọrọ ime yanwa chọkwara ime. Chegodị gbasara otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Cindy, dị afọ iri abụọ na itoolu. Nwanna nwaanyị o metara enyi bụ́ ọsụ ụzọ aha ya bụ Marie-Louise, onye dị afọ iri isii na asaa. Ha abụọ na-arụ n’ozi ọma n’ụtụtụ Tọzdee ọ bụla. Ha nọrọ n’ozi ọma, ha na-ekwu gbasara ihe dị iche iche. Cindy kwuru, sị: “Ọ na-atọ m ụtọ ma mụ na ndị enyi m kparịtawa ụka n’ihi na ọ na-eme ka m matakwuo ha ma na-aghọta ha.” Ezigbo mkparịta ụka na-eme ka enyi na enyi na-adịkwu ná mma. Ọ bụrụ na i mee ka Cindy, na-akọrọ ndị enyi gị ihe dị gị n’obi, o nwere ike ime ka gị na ha na-adịkwu ná mma.—Ilu 27:9.

GỊ NA NDỊ ỌZỌ RỤKỌWA ỌRỤ

Ndị bụ́ ezigbo ndị enyi na-arụ n’ozi ọma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10)

10. Dị ka e kwuru n’Ilu 27:17, olee ihe ọma nwere ike ime ma anyị na ụmụnna anyị na-arụkọ ọrụ?

10 Anyị nwere ike ime otú ahụ Jeremaya na Barọk mere. Ọ bụrụ na anyị na ụmụnna anyị ana-arụkọ ọrụ, anyị ana-ahụkwa àgwà ọma ndị ha nwere, anyị ga na-amụta ihe n’aka ha, anyị na ha adịkwuokwa ná mma. (Gụọ Ilu 27:17.) Dị ka ihe atụ, olee otú obi na-adị gị ma gị na enyi gị nọrọ n’ozi ọma, gị anụ ka o ji obi ike kọwaa ihe mere o ji kwere ihe ndị o kweere ma ọ bụ jiri obi ya niile kwuo ihe ndị o kweere gbasara Jehova na nzube ya? O nwere ike ime ka ị hụkwuo ya n’anya.

11-12. Nye ihe atụ gosiri otú anyị na ụmụnna anyị ịrụ n’ozi ọma nwere ike isi mee ka anyị na ha dịkwuo ná mma.

11 Ka anyị leba anya n’akụkọ abụọ gosiri otú ịrụ n’ozi ọma nwere ike isi mee ka anyị na ndị ọzọ dịkwuo ná mma. Otu nwanna nwaanyị dị afọ iri abụọ na atọ aha ya bụ Adeline gwara enyi ya bụ́ Candice ka o soro ya gaa kwusaa ozi ọma n’ebe a na-anaghị ezikarị ozi ọma na ya. O kwuru, sị: “Anyị chọrọ ijikwu ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma, chọọkwa ka ozi ọma tọkwuo anyị ụtọ. Anyị chọkwara ihe ga-agba anyị ume, mee ka anyị jiri obi anyị niile jeere Jehova ozi.” Olee otú ịrụ n’ozi ọma si baara ha uru? Adeline kwuru, sị: “Anyị jechaa ozi ọma n’ụbọchị ọ bụla, anyị na-ekwurịta otú obi dị anyị, ihe gbara anyị ume n’ihe ndị anyị kwurịtara nakwa ihe anyị chọpụtara bụ́ otú Jehova si nyere anyị aka n’ozi ọma n’ụbọchị ahụ. Ihe ndị ahụ anyị na-ekwurịta tọrọ anyị ụtọ, meekwa ka anyị matakwuo ibe anyị.”

12 E nwere ụmụnna nwaanyị abụọ bụ́ ndị Frans aha ha bụ Laïla na Marianne. Ha alụbeghị di. Ha ji izu ise gaa kwusaa ozi ọma n’obodo na-ekwo ekwo aha ya bụ Bangui, bụ́ isi obodo Sentral Afrịkan Ripọblik. Laïla kwuru, sị: “E nwere ebe ụfọdụ ihe na-anaghị adabachara mụ na Marianne. Ma, ezigbo ịhụnanya na ikwurịta okwu nke ọma mere ka anyị na-adịkwu ná mma. M bidoro ịkwanyekwuru Marianne ùgwù mgbe m hụrụ otú ebe ọhụrụ ahụ si mara ya ahụ́ ozugbo, otú o si hụ ndị ebe ahụ n’anya, na otú o si jiri ozi ọma kpọrọ ihe.” Ọ bụghị iwu na ị ga-akwaga mba ọzọ tupu gị erite uru ndị a. Mgbe ọ bụla gị na nwanna nọ n’ọgbakọ unu rụrụ n’ozi ọma, ọ bụ ohere ị ga-eji matakwuo ya nke ọma, meekwa ka gị na ya dịkwuo ná mma.

LEKWASỊ ANYA N’ÀGWÀ ỌMA NDỊ ENYI GỊ, NA-AGBAGHARAKWA HA

13. Olee ihe nwere ike isiri anyị ike ma anyị na ndị enyi anyị rụkọwa ọrụ?

13 Mgbe ụfọdụ, anyị na ndị enyi anyị rụkọwa ọrụ, anyị na-amata ebe ha na-eme nke ọma na ebe ha na-emejọ. Olee ihe ga-enyere anyị aka ka anyị na ha na-adị ná mma n’agbanyeghị ebe ndị ha na-emejọ? Ka anyị leba anya ọzọ n’ihe Jeremaya mere. Olee ihe nyeere ya aka ịhụ àgwà ọma ndị ọzọ ma na-eleghara ihe ha na-anaghị emeta anya?

14. Olee ihe Jeremaya mụtara gbasara Jehova? Oleekwa uru ọ baara ya?

14 Ọ bụ Jeremaya dere akwụkwọ Jeremaya. O nwekwara ike ịbụ ya dere Ndị Eze nke Mbụ na nke Abụọ. O doro anya na ọrụ ahụ mere ka ọ ghọta otú Jehova si emere ụmụ mmadụ na-ezughị okè ebere. Dị ka ihe atụ, ọ ma na mgbe Eze Ehab chegharịrị n’ihe ọjọọ ndị o mere, Jehova mere ka ọ ghara ịnọ ndụ hụ mgbe e gburu ezinụlọ ya niile. (1 Eze 21:27-29) Jeremaya makwa na Manase mere ihe ọjọọ karịrị nke Ehab mere. Ma, Jehova gbaghaara Manase maka na o chegharịrị. (2 Eze 21:16, 17; 2 Ihe 33:10-13) Ọ ga-abụrịrị na akụkọ ndị a nyeere Jeremaya aka ịna-enwere ndị enyi ya ndidi, na-emekwara ha ebere otú ahụ Jehova na-eme.—Ọma 103:8, 9.

15. Olee otú Jeremaya si mee ka Jehova n’otú o si nweere Barọk ndidi mgbe ihe ụfọdụ megharịtụrụ ya anya?

15 Chegodị otú Jeremaya si nyere Barọk aka mgbe ihe ụfọdụ megharịtụrụ ya anya. Jeremaya echeghị ozugbo na Barọk agaghị agbanwe. Kama o nyeere Barọk aka. Otú o si mee ya bụ ịgwa ya hoo haa ihe ga-abara ya uru Chineke gwara ya. (Jere. 45:1-5) Olee ihe ndị anyị nwere ike ịmụta n’akụkọ a?

Ndị bụ́ ezigbo ndị enyi na-agbaghara ibe ha (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16)

16. Dị ka e kwuru n’Ilu 17:9, olee ihe anyị kwesịrị ime ka anyị na ụmụnna anyị na-adịkwu ná mma?

16 Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị ekwesịghị ịtụ anya na ụmụnna anyị ga na-emetacha ihe niile. N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị na mmadụ abụrụ enyi, anyị ga-agbalịsi ike ka anyị na onye ahụ bụrụ enyi na-aga. E nwee ihe enyi anyị mejọrọ, o nwere ike ịdị mkpa ka anyị jiri Baịbụl na olu ọma gwa ya hoo haa ihe Baịbụl kwuru. (Ọma 141:5) Ha mejọọ anyị, anyị kwesịrị ịgbaghara ha. Anyị gbaghara ha, anyị ekwesịghị ikwuwe gbasara ya n’ọdịnihu. (Gụọ Ilu 17:9.) Ọ dị ezigbo mkpa n’oge ikpeazụ a ka anyị na-elekwasị anya n’ebe ụmụnna anyị na-emeta kama ịna-elekwasị anyị n’ebe ha na-emejọ. Ọ bụrụ na anyị na-eme otú ahụ, ọ ga-eme ka anyị na ha na-adịkwu ná mma. Anyị kwesịrị ime otú ahụ ugbu a n’ihi na ezigbo ndị enyi ga-abara anyị uru n’oge oké mkpagbu ahụ.

NA-EGOSI HA NA Ị HỤRỤ HA N’ANYA

17. Olee otú Jeremaya si gosi na ya bụ ezigbo enyi n’oge e nwere nsogbu?

17 Jeremaya onye amụma gosiri na ọ bụ ezigbo enyi n’oge e nwere nsogbu. Dị ka ihe atụ, mgbe Ibed-melek onye na-eje ozi n’obí eze dọpụtachara Jeremaya n’olulu apịtị juru ka ọ ghara ịnọ ebe ahụ nwụọ, Ibed-melek tụwara ụjọ ihe ndị isi nwere ike ime yanwa. Mgbe Jeremaya nụrụ ya, ọ gbaghị nkịtị nọrọ na-eche na Ibed-melek ga-ama ihe ọ ga-eme. N’agbanyeghị na Jeremaya nọ n’ụlọ mkpọrọ, o mere ike ya niile iji gbaa Ibed-melek ume. Otú o si mee ya bụ na ọ gwara ya nkwa Jehova kwere.—Jere. 38:7-13; 39:15-18.

Ndị bụ́ ezigbo ndị enyi na-enyere ụmụnna ha aka n’oge nsogbu (A ga-akọwa ya na paragraf nke 18)

18. Dị ka e kwuru n’Ilu 17:17, olee ihe anyị kwesịrị ime ma nsogbu bịara enyi anyị?

18 Taa, nsogbu dị iche iche na-abịara ụmụnna anyị. Dị ka ihe atụ, ọdachi na-emere onwe ya ma ọ bụ nke mmadụ kpatara na-akpa ọtụtụ ụmụnna anyị aka ọjọọ. Ụdị ihe a mee, ụfọdụ n’ime anyị nwere ike ịgwa ụmụnna ka ha bịa nọrọ n’ụlọ ha. Ndị ọzọ nwekwara ike iji ego ha nyere ha aka. Ma, anyị niile ga-arịọli Jehova n’ekpere ka o nyere ụmụnna anyị aka. Ọ bụrụ na anyị amata na e nwere nwanna dara mbà, o nwere ike anyị agaghị ama ihe anyị ga-ekwu ma ọ bụ ihe anyị ga-eme. Ma, anyị niile ga-enyeliri ya aka. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike iwepụta oge gaa nọnyere ya. Anyị nwere ike imeda obi gee ya ntị mgbe ọ na-ekwu obi ya. Anyị nwekwara ike ịgwa ya gbasara amaokwu Baịbụl kacha amasị anyị ga-akasi ya obi. (Aịza. 50:4) Ihe kacha mkpa bụ na i wepụtara oge gaa nyere ndị enyi gị aka mgbe ha chọrọ enyemaka.—Gụọ Ilu 17:17.

19. Olee otú anyị na ụmụnna anyị ịdị ná mma ugbu a ga-esi enyere anyị aka n’ọdịnihu?

19 Ka anyị kpebisie ike na anyị ga na-eme ka anyị na ụmụnna anyị dịkwuo ná mma ugbu a. N’ihi gịnị? N’ihi na ndị iro anyị ga na-agbalị ịgwa anyị ihe na-abụghị eziokwu gbasara ụmụnna anyị iji kewaa anyị. Ha ga na-agbalị ime ka anyị na ụmụnna anyị sewe okwu. Ma, mbọ ha ga-akụ afọ n’ala. Ha agaghị emeli ka anyị kwụsị ịhụ ụmụnna anyị n’anya. Anyị agaghị ekwe ka ha mee ka anyị na ụmụnna anyị ghara ịdị ná mma. N’eziokwu, anyị na ụmụnna anyị ga na-adị ná mma ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụghị naanị ruo n’ọgwụgwụ ụwa ochie a.

ABỤ NKE 24 Bịanụ n’Ugwu Jehova

^ par. 5 Ka ọgwụgwụ ụwa a na-eru nso, anyị niile kwesịrị ime ka anyị na ụmụnna anyị na-adịkwu ná mma. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe anyị nwere ike ịmụta n’ihe mere Jeremaya. Anyị ga-elebakwa anya n’otú anyị na ụmụnna anyị ịdị ná mma ugbu a ga-esi baara anyị uru ma nsogbu bịara anyị.

^ par. 2 E deghị ihe ndị a kọrọ n’akwụkwọ Jeremaya n’usoro ha si mee.

^ par. 57 NKỌWA FOTO: Ihe e sere ebe a bụ ihe nwere ike ime n’oge “oké mkpagbu” na-abịanụ. Ihe a bụ ebe ụmụnna ụfọdụ gara zoo n’ụlọ otu nwanna. Ha na-akasi ibe ha obi n’oge nsogbu n’ihi na ha dị n’ezigbo mma. Foto atọ dị ebe a gosiri na ụmụnna ndị ahụ na ibe ha adịla n’ezigbo mma tupu oké mkpagbu ahụ amalite.