Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ 47

Ihe Ndị Anyị Na-amụta n’Akwụkwọ Levitikọs

Ihe Ndị Anyị Na-amụta n’Akwụkwọ Levitikọs

“Akwụkwọ Nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke.”—2 TIM. 3:16.

ABỤ NKE 98 Akwụkwọ Nsọ Si n’Ike Mmụọ Nsọ Chineke

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1-2. Gịnị mere Ndị Kraịst taa kwesịrị iji mụọ gbasara akwụkwọ Levitikọs?

PỌL onyeozi chetaara enyi ya bụ́ Timoti na “Akwụkwọ Nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke” nakwa na “ọ bara uru iji ya zie ihe.” (2 Tim. 3:16) Levitikọs so n’Akwụkwọ Nsọ ahụ. Olee ihe i chere gbasara akwụkwọ Levitikọs? Ụfọdụ nwere ike ịna-eche na ihe juru na ya bụ iwu ndị na-abaghịzi uru taa. Ma, ezigbo Ndị Kraịst anaghị eche otú ahụ.

2 E dere Levitikọs n’ihe dị ka puku afọ atọ na narị ise gara aga. Ma, Jehova mere ka e chebe ya “iji nye anyị ntụziaka.” (Rom 15:4) Ebe ọ bụ na Levitikọs na-eme ka anyị mata ihe Jehova chere, anyị kwesịrị ịchọ ịmụ gbasara ya. Nke bụ́ eziokwu bụ na e nwere ọtụtụ ihe anyị nwere ike ịmụta n’akwụkwọ ahụ e ji ike mmụọ nsọ dee. Ka anyị leba anya n’anọ n’ime ha.

OTÚ ANYỊ SI EME IHE DỊ JEHOVA MMA

3. Gịnị mere ndị Izrel ji achụ àjà n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie a na-eme kwa afọ?

3 Ihe mbụ anyị ga-amụta: Anyị na Jehova kwesịrị ịdị ná mma tupu ya anabata àjà ọ bụla anyị na-achụ. N’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie, mba Izrel na-abịakọta ọnụ, were anụmanụ chụọ àjà. Àjà ndị ahụ na-echetara ha na e kwesịrị ịsacha ha mmehie. Ma, tupu nnukwu onye nchụàjà ejiri ọbara anụ e ji achụ àjà banye n’Ebe Kacha Nsọ n’ụbọchị ahụ, e nwere ihe ọzọ ọ na-ebu ụzọ eme, nke dị mkpa karịa ịgbaghara ndị Izrel mmehie ha.

(A ga-akọwa ya na paragraf nke 4) *

4. Dị ka e kwuru na Levitikọs 16:12, 13, gịnị ka nnukwu onye nchụàjà na-eme n’oge mbụ ọ ga-abanye n’Ebe Kacha Nsọ n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie? (Lee ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)

4 Gụọ Levitikọs 16:12, 13. Were ya na ị na-ahụ ihe na-eme n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie ahụ: Nnukwu onye nchụàjà na-abanye n’ụlọikwuu. Nke a bụ nke mbụ n’ime ugboro atọ ọ ga-abanye n’Ebe Kacha Nsọ n’ụbọchị ahụ. O ji ihe e ji tinye ihe nsure ọkụ na-esi ìsì ụtọ n’otu aka, jiri ihe ịgụ ọkụ e ji ọlaedo mee, nke icheku ọkụ juru, n’aka nke ọzọ. Ọ kwụsịtụrụ n’ihu ákwà mgbochi kpuchiri ebe e si abanye n’Ebe Kacha Nsọ. Otú o si banye n’Ebe Kacha Nsọ ma guzoro n’ihu igbe ọgbụgba ndụ gosiri na ọ na-akwanyere Chineke ùgwù. E nwere ike ikwu na o guzo n’ihu Jehova Chineke. Onye nchụàjà ahụ weturu obi wụnye ihe nsure ọkụ ahụ n’ime icheku ọkụ ahụ, ísì ọma ya eju ụlọ ahụ niile. * O mechaa, ọ ga-eji ọbara anụ ahụ e ji achụ àjà banyeghachi n’Ebe Kacha Nsọ. Ị ga-achọpụta na ọ na-ebu ụzọ suree ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ tupu ya ejiri ọbara ahụ chụọ àjà.

5. Olee ihe anyị na-amụta n’ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ ndị Izrel surere n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie?

5 Olee ihe anyị na-amụta n’ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ ndị Izrel surere n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie? Baịbụl kwuru na ekpere ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi yiri ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ. (Ọma 141:2; Mkpu. 5:8) Cheta na otú nnukwu onye nchụàjà na-esi eweta ihe nsure ọkụ ahụ na-esi ísì ụtọ n’ihu Jehova na-egosi na ọ na-akwanyere Jehova ezigbo ùgwù. Anyị kpewe ekpere, anyị kwesịrị ikpe ya otú ga-egosi na anyị na-akwanyere Chineke ezigbo ùgwù. Anyị na-atụ egwu Chineke. Obi dị anyị ụtọ na Onye kere eluigwe na ala kwere ka anyị na-agwa ya mkpa anyị ma na-abịaru ya nso, otú ahụ nwatakịrị na-abịaru nna ya nso. (Jems 4:8) O kwere ka anyị bụrụ ndị enyi ya. (Ọma 25:14) N’ihi otú obi si dị anyị ezigbo ụtọ na anyị na ya bụ enyi, anyị agaghị achọ ime ihe ọ bụla ga-ewe ya iwe.

6. Olee ihe anyị na-amụta n’otú ahụ nnukwu onye nchụàjà na-esure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ tupu ya achụọ àjà ọ chọrọ ịchụ?

6 Cheta na nnukwu onye nchụàjà na-esure ihe nsure ọkụ ahụ na-esi ísì ụtọ tupu ya achụọ àjà ọ chọrọ ịchụ. Ime ihe a na-eme ka o doo ya anya na o meela ihe niile Chineke chọrọ ka o mee tupu ya achụọ àjà ahụ. Gịnị ka ihe a na-akụziri anyị? Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o nwere ihe dị mkpa o kwesịrị ime tupu ya enwee ike iji ndụ ya chụọ àjà. Ihe ahụ dị mkpa karịa ịzọpụta ụmụ mmadụ. Gịnị ka ọ bụ? O kwesịrị ibu ụzọ rubere Jehova isi n’oge niile ọ nọ n’ụwa ka Jehova nwee ike ịnabata àjà ọ bịara ịchụ. Jizọs ga-esi otú ahụ gosi na ime ihe Jehova chọrọ bụ otú mmadụ kwesịrị isi bie ndụ. Jizọs ga-eme ka o doo anya na ọ bụ Nna ya kwesịrị ịchị nakwa na otú o si achị kacha mma.

7. Gịnị mere otú Jizọs si bie ndụ n’ụwa ji mee Nna ya obi ụtọ?

7 N’oge niile Jizọs biri n’ụwa, o rubeere Nna ya isi n’ihe niile. N’agbanyeghị na ọtụtụ ọnwụnwa bịaara ya, ya amarakwa na ọ ga-ata ahụhụ ma nwụọ, o kpebisiri ike ime ka ndị mmadụ mata na ọ bụ otú Nna ya si achị kacha mma. (Fil. 2:8) Mgbe ọnwụnwa bịaara Jizọs, “o ji ibesi ákwá ike na anya mmiri kpesie ekpere ike.” (Hib. 5:7) Otú o si jiri obi ya niile kpee ekpere gosiri na ọ na-erubere Jehova isi, meekwa ka o kpebisikwuo ike ime ihe Nna ya chọrọ. Jehova weere ekpere Jizọs ka ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ. Otú Jizọs si bie ndụ mere Nna ya ezigbo obi ụtọ, meekwa ka o doo anya na ọ bụ ọchịchị Chineke kacha mma.

8. Olee otú anyị ga-esi mee ka Jizọs?

8 Anyị ga-emeli ka Jizọs ma ọ bụrụ na anyị na-agbalịsi ike ịna-erubere Jehova isi ma jiri obi anyị niile na-efe ya. Ọ bụrụ na ọnwụnwa abịara anyị, anyị ga-ekpesi ekpere ike ka Jehova nyere anyị aka n’ihi na anyị chọrọ ime ihe dị ya mma. Anyị ga-esi otú ahụ gosi na anyị na-akwado ọchịchị ya. Anyị ma na Jehova agaghị aza ekpere anyị ma ọ bụrụ na anyị na-eme ihe na-adịghị ya mma. Ma, ọ bụrụ na anyị na-eme ihe dị Jehova mma, obi ga-esi anyị ike na ekpere anyị ga-adị ya ka ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ. Obi ga-esikwa anyị ike na otú anyị si erubere Nna anyị nke eluigwe isi ma jiri obi anyị niile na-efe ya ga-eme ya obi ụtọ.—Ilu 27:11.

IHE MERE ANYỊ JI EFE JEHOVA BỤ NA OBI DỊ ANYỊ ỤTỌ MAKA IHE NDỊ Ọ NA-EMERE ANYỊ

(A ga-akọwa ya na paragraf nke 9) *

9. Olee ihe mere ndị Izrel ji achụ àjà udo?

9 Ihe nke abụọ anyị ga-amụta: Anyị na-efe Jehova n’ihi na obi dị anyị ụtọ maka ihe ndị ọ na-emere anyị. Iji mee ka o doo anya, ka anyị leba anya n’ihe mere ndị Izrel ji achụrụ Jehova àjà udo. * N’akwụkwọ Levitikọs, anyị mụtara na onye Izrel nwere ike ịchụ àjà udo “iji nye ekele.” (Lev. 7:11-13, 16-18) Ihe mere o ji achụ àjà ahụ abụghị na iwu ji ya ịchụ ya, kama na ọ bụ ihe ọ chọrọ ime. O ji obi ya niile chọọ ime ya n’ihi na ọ hụrụ Jehova Chineke n’anya. Onye ahụ na-achụ àjà ahụ, ndị ezinụlọ ya, na ndị nchụàjà ga-eri anụ ahụ e ji chụọ àjà. Ma e nwere ụfọdụ ebe n’anụ ahụ ha ga-enye naanị Jehova. Olee ebe ndị ọ bụ?

(A ga-akọwa ya na paragraf nke 10) *

10. Olee otú àjà udo e kwuru okwu ya na Levitikọs 3:6, 12, 14-16 si yie ofufe Jizọs fere Jehova?

10 Ihe nke atọ anyị ga-amụta: Otú anyị si hụ Jehova n’anya na-eme ka anyị jiri ike anyị niile na-efe ya. Jehova na-ele abụba anụ anya ka ebe kacha mma n’anụmanụ ọ bụla. O kwukwara na ya anaghị eji akụrụ na ebe ndị ọzọ dị mkpa n’anụmanụ egwu egwu. (Gụọ Levitikọs 3:6, 12, 14-16.) Ọ bụ ya mere obi ji adị Jehova ezigbo ụtọ mgbe ọ bụla onye Izrel ji obi ya niile jiri ma ebe ndị ahụ dị mkpa ma abụba anụ ahụ chụọrọ ya àjà. Onye ji ihe ndị ahụ chụọrọ Jehova àjà na-egosi na ọ chọrọ inye ya ihe kacha mma o nwere. Otú ahụkwa ka Jizọs si jiri obi ya niile nye Jehova ihe kacha mma o nwere. Otú o si mee ya bụ na o ji ike ya niile fee Jehova n’ihi na ọ hụrụ ya n’anya. (Jọn 14:31) Ime uche Chineke tọgburu Jizọs atọgbu. O ji iwu Chineke kpọrọ ihe. (Ọma 40:8) Obi dị Jehova ezigbo ụtọ ịhụ na Jizọs ji obi ya niile na-efe ya.

Anyị na-enye Jehova ihe kacha mma anyị nwere maka na anyị hụrụ ya n’anya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11 na nke 12) *

11. Olee otú ofufe anyị na-efe Jehova si dị ka àjà udo? Oleekwa otú nke ahụ si eme anyị obi ụtọ?

11 Ofufe anyị na-efe Jehova dị ka àjà udo n’ihi na ọ bụ otú anyị si egosi Jehova na anyị hụrụ ya n’anya. Anyị na-enye Jehova ihe kacha mma anyị nwere n’ihi na anyị ji obi anyị niile hụ ya n’anya. O doro anya na obi dị Jehova ezigbo ụtọ ịhụ ọtụtụ nde mmadụ ji obi ha niile na-efe ya n’ihi na ha hụrụ ya n’anya. Anyị na-enwe ezigbo obi ụtọ ma anyị cheta na Jehova na-ahụ mbọ anyị na-agba na ihe mere anyị ji agba mbọ ndị ahụ ma jiri ha kpọrọ ihe. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na i meela agadi, ya abụrụkwa na ị naghịzi emeli ihe ndị ị ga-achọ ime, obi sie gị ike na Jehova ghọtara otú ọ dị gị. O nwere ike ịna-adị gị ka ihe ị na-emere Jehova ọ̀ dị obere. Ma, Jehova na-ahụ ụdị ịhụnanya i nwere n’ebe ọ nọ nke mere i ji na-emere ya ihe ndị ị ga-emeli. Obi dịkwa ya ụtọ maka ihe ndị ahụ i nwere ike imere ya.

12. Olee otú àjà udo ndị Izrel chụrụ mere ka obi dị Jehova? Oleekwa otú nke ahụ si emesi anyị obi ike?

12 Gịnị ka anyị nwere ike isi n’àjà udo ahụ mụta? Ka ọkụ na-ere ebe ndị ahụ kacha mkpa si n’anụmanụ ahụ, anwụrụ ọkụ si na ya na-ala elu, obi ana-adịkwa Jehova ụtọ. N’ihi ya, obi kwesịrị isi gị ike na obi dị Jehova ụtọ maka ozi i ji obi gị niile na-ejere ya. (Kọl. 3:23) Chegodị otú ihe a ị na-eme si eme Jehova obi ụtọ. Ma ihe ị ga-emeliri Jehova ò buru ibu ma ọ̀ dị ntakịrị, Jehova ji ya kpọrọ ihe, ọ gaghịkwa echefu ya echefu ruo mgbe ebighị ebi.—Mat. 6:20; Hib. 6:10.

JEHOVA NA-AGỌZI NZUKỌ YA

13. Dị ka e kwuru na Levitikọs 9:23, 24, olee otú Jehova si gosi na obi dị ya ụtọ maka ndị nchụàjà ahụ a họpụtara?

13 Ihe nke anọ anyị ga-amụta: Jehova na-agọzi nzukọ ya dị n’ụwa. Chegodị gbasara ihe mere n’afọ 1512 Tupu Oge Ndị Kraịst, mgbe a rụrụ ụlọikwuu n’ala ala Ugwu Saịnaị. (Ọpụ. 40:17) Mozis bụ onyeisi n’ememme e mere iji mee Erọn na ụmụ ya ndị nchụàjà. Ndị Izrel gbakọtara ka ha hụ àjà mbụ Erọn na ụmụ ya ga-achụ. (Lev. 9:1-5) Olee otú Jehova si gosi na obi dị ya ụtọ maka ndị nchụàjà ọhụrụ ahụ a họpụtara? Ka Erọn na Mozis na-agọzi ndị Izrel, Jehova mere ka ọkụ repịa àjà nsure ọkụ ahụ dị n’elu ebe ịchụàjà.—Gụọ Levitikọs 9:23, 24.

14. Gịnị mere otú ahụ Jehova si gosi na ọ nabatara Erọn na ụmụ ya ka ha bụrụ ndị nchụàjà ji gbasa anyị taa?

14 Olee ihe ọkụ ahụ si n’eluigwe bịa repịa ihe ahụ e ji chụọ àjà na-egosi? Jehova zitere ọkụ ahụ iji gosi na ya nabatara Erọn na ụmụ ya ịbụ ndị nchụàjà ọ họpụtara. Mgbe ndị Izrel hụrụ ihe gosiri na Jehova kwadoro ndị nchụàjà ahụ, ha matara na ha kwesịkwara iji obi ha niile kwadoo ha. Ò nwere uru ihe a ha mere baara anyị? Ee. Ndị nchụàjà Izrel nọchiri anya ndị nchụàjà ọzọ ka ha mkpa. Kraịst bụ Nnukwu Onye Nchụàjà ka nke ndị Izrel. E nwekwara otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ga-abụ ndị eze na ndị nchụàjà, ndị ga-eso Jizọs chịa n’eluigwe.—Hib. 4:14; 8:3-5; 10:1.

Jehova na-eduzi nzukọ ya ma na-agọzi ya. Anyị ji obi anyị niile na-akwado nzukọ ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15 ruo na nke 17) *

15-16. Olee otú Jehova sirila gosi na ọ na-akwado “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche”?

15 N’afọ 1919, Jizọs họpụtara ụmụnna ya ole na ole o tere mmanụ ka ha bụrụ “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche.” Ohu ahụ na-ebute ụzọ n’ikwusa ozi ọma, na-enyekwa ndị na-eso ụzọ Jizọs “nri ha n’oge kwesịrị ekwesị.” (Mat. 24:45) Ànyị na-ahụ ihe gosiri na Chineke na-akwado ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche?

16 Setan na ụwa ya na-agbasi mbọ ike ịkwụsị ọrụ ohu ahụ na-arụ. A sị na Chineke anọnyereghị ohu ahụ, ha agaraghị enwe ike ịrụ ọrụ a. A lụọla agha ụwa nke mbụ na nke abụọ, nweekwa ụkọ ego n’ụwa niile. A na-akpagbukwa ndị Chineke ma na-echi ha ọnụ n’ala. N’agbanyeghị ihe a niile, ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche ka na-enye ndị na-eso ụzọ Jizọs n’ụwa nri n’oge ya. Chegodị gbasara ọtụtụ ihe nzukọ Jehova na-ewepụtara anyị taa n’efu n’ihe karịrị narị asụsụ itoolu. Ihe a kwesịrị ime ka o doo ewu na ọkụkọ anya na Chineke na-akwado ohu ahụ. Ozi ọma anyị na-ekwusa bụ ihe ọzọ gosiri na Jehova na-agọzi ohu ahụ. N’eziokwu, a na-ekwusa ozi ọma a “n’elu ụwa dum mmadụ bi.” (Mat. 24:14) A naghị ajụ ajụ ma Jehova ọ̀ na-eduzi nzukọ ya ma na-agọzi ya taa.

17. Olee otú anyị ga-esi egosi na anyị na-akwado nzukọ Jehova ji na-arụ ọrụ?

17 Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘Obi ọ̀ dị m ụtọ na m nọ ná nzukọ Jehova?’ N’oge Mozis na Erọn, Jehova zitere ọkụ si n’eluigwe iji gosi na ọ nabatara ndị ọ họpụtara. Otú ahụkwa ka Jehova si mee ka o doo anyị anya na o ji nzukọ ya arụ ọrụ taa. N’eziokwu, e nwere ọtụtụ ihe mere anyị ji kwesị ịna-ekele ya. (1 Tesa. 5:18, 19) Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị na-akwado nzukọ a Jehova ji arụ ọrụ? Ọ bụ ịna-eme ihe e ji Baịbụl na-akụziri anyị n’akwụkwọ anyị, n’ọmụmụ ihe nakwa ná mgbakọ. Otú ọzọ anyị ga-esi egosi na anyị na-akwado nzukọ a bụ ịna-agbasi mbọ ike n’ikwusa ozi ọma na ịkụziri ndị ọzọ Baịbụl.—1 Kọr. 15:58.

18. Gịnị ka i kpebisiri ike ime?

18 Ka anyị kpebisie ike na anyị ga na-eme ihe anyị mụtara n’akwụkwọ Levitikọs. Anyị chọrọ ka Jehova nabata àjà anyị na-achụrụ ya. Ka anyị na-ejere Jehova ozi n’ihi na obi dị anyị ụtọ maka ihe ndị ọ na-emere anyị. Ka anyị jiri ike anyị niile na-ejere ya ozi n’ihi na anyị ji obi anyị niile hụ ya n’anya. Ka anyị na-eme ihe niile anyị nwere ike ime iji na-akwado nzukọ a o ji na-arụ ọrụ taa. Anyị mee ihe ndị a, ọ ga-egosi Jehova na obi dị anyị ụtọ maka na o kwere ka anyị bụrụ Ndịàmà ya na-ejere ya ozi.

ABỤ NKE 96 Okwu Chineke Bụ Akụ̀

^ par. 5 N’akwụkwọ Levitikọs, ị ga-ahụ iwu dị iche iche Jehova nyere ndị Izrel oge ochie. Ebe anyị bụ Ndị Kraịst, anyị anaghị edebe iwu ndị ahụ. Ma ha ka nwere ike ịbara anyị uru taa. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe ndị bara uru anyị ga-amụta n’akwụkwọ Levitikọs.

^ par. 4 Ihe nsure ọkụ ahụ na-esi ísì ụtọ a na-esure n’ụlọikwuu dị nsọ. N’Izrel oge ochie, a na-eji ya eme naanị ihe gbasara ofufe Jehova. (Ọpụ. 30:34-38) Baịbụl ekwughị ihe ọ bụla gosiri na Ndị Kraịst oge mbụ surere ihe nsure ọkụ mgbe ha na-efe Chineke.

^ par. 9 Ị chọọ ịmatakwu gbasara àjà udo, gụọ Insight on the Scriptures, Mpịakọta nke 2, peeji nke 526 na Ụlọ Nche Jenụwarị 15, 2012, peeji nke 19, paragraf nke 11.

^ par. 54 NKỌWA FOTO: N’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie, nnukwu onye nchụàjà Izrel na-eji ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ na icheku ọkụ banye n’Ebe Kacha Nsọ iji mee ka ebe ahụ na-esi ísì ọma. E mechaa, ya ejiri ọbara anụ e ji achụ àjà mkpuchi mmehie banyekwa n’Ebe Kacha Nsọ.

^ par. 56 NKỌWA FOTO: Ebe onye Izrel na-enye onye nchụàjà atụrụ ọ chọrọ iji chụọ àjà udo ya na ezinụlọ ya ji na-ekele Jehova.

^ par. 58 NKỌWA FOTO: Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o rubeere iwu Chineke isi ma na-enyere ndị na-eso ụzọ ya aka imekwa otú ahụ. Ọ bụ otú o si gosi na ọ hụrụ Jehova n’anya.

^ par. 60 NKỌWA FOTO: N’agbanyeghị na ahụ́ esighịzi otu nwanna nwaanyị ike, ọ na-ede akwụkwọ ozi o ji ezi ndị mmadụ ozi ọma iji gosi na ọ na-enye Jehova ihe kacha mma o nwere.

^ par. 62 NKỌWA FOTO: N’ọnwa Febụwarị afọ 2019, Nwanna Gerrit Lösch, onye so n’Òtù Na-achị Isi, wepụtaara ụmụnna Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke e degharịrị edegharị n’asụsụ Jaman, obi abụrụ ha sọ aṅụrị. Taa, ndị nkwusa nọ na Jamanị na-eme ihe ụmụnna nwaanyị abụọ a na-eme. Ha ji obi ụtọ na-agụrụ mmadụ Baịbụl ọhụrụ a n’ozi ọma.