Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ 49

“E Nwere Oge A Kara Aka Maka” Ịrụ Ọrụ na Izu Ike

“E Nwere Oge A Kara Aka Maka” Ịrụ Ọrụ na Izu Ike

“Bịanụ ka anyị gaa zurutụ ike n’ebe ndị mmadụ na-adịghị anọkarị.”​—MAK 6:31.

ABỤ NKE 143 Na-agba Mbọ, Na-elekwa Anya Ụbọchị Jehova

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Olee otú ọtụtụ ndị si ele ịrụ ọrụ anya?

OLEE otú ọtụtụ ndị n’ebe i bi si ele ịrụ ọrụ anya? N’ọtụtụ obodo, ndị mmadụ na-arụsikwu ọrụ ike, jirikwa ọtụtụ awa na-arụ ọrụ ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Ndị na-arụgbu onwe ha n’ọrụ anaghị enwe ohere izu ike, ha na ezinụlọ ha ịnọrị, ma ọ bụ ime ihe gbasara ofufe Chineke. (Ekli. 2:23) E nwekwara ndị na-achọghị ịrụ ọrụ ọ bụla. Ihe ha na-eme bụ ịchọ ihe ha ga-akụdo aka ghara ịrụ ọrụ.​—Ilu 26:​13, 14.

2-3. Olee otú Jehova na Jizọs si ele ịrụ ọrụ anya?

2 N’ụwa taa, e nwere ọtụtụ ndị na-arụgbu onwe ha n’ọrụ, nweekwa ndị na-anaghị achọ ịrụ ọrụ. Mana, ka anyị lee otú Jehova na Jizọs si ele ịrụ ọrụ anya. Anyị ma na Jehova na-arụsi ọrụ ike. Jizọs mere ka o doo anya. O kwuru, sị: “Nna m anọwo na-arụ ọrụ ruo ugbu a, anọwokwa m na-arụ ọrụ.” (Jọn 5:17) Chegodị gbasara ụdị ọrụ Jehova rụrụ mgbe o kere ọtụtụ ndị mmụọ ozi na kpakpando na ihe ndị ọzọ dị n’eluigwe. Anyị na-ahụkwa ọtụtụ ihe mara mma Chineke kere n’ụwa anyị a. Ọ bụ ya mere ọbụ abụ ji kwuo, sị: “Jehova, lee ka ọrụ gị si dị ọtụtụ! I ji amamihe rụọ ha niile. Ụwa jupụtara n’ihe ị rụrụ.”​—Ọma 104:24.

3 Jizọs mere ka Nna ya. N’akwụkwọ Ilu, a kpọrọ Ọkpara Chineke amamihe, kwuokwa na o nyeere Chineke aka ‘mgbe ọ kwadebere eluigwe.’ Ọ bụ “onye ọkà ọrụ” nọ n’akụkụ Jehova. (Ilu 8:​27-31) Mgbe Jizọs mechara bịa n’ụwa, ọrụ ọ rụrụ enweghị atụ. O weere ọrụ ahụ ka nri. Ihe ndị ọ rụrụ gosikwara na ọ bụ Chineke zitere ya.​—Jọn 4:34; 5:36; 14:10.

4. Gịnị ka anyị na-amụta n’aka Jehova na Jizọs gbasara izu ike?

4 Otú Jehova na Jizọs si arụsi ọrụ ike ọ̀ na-egosi na anyị ekwesịghị ịna-ezu ike? Mbanụ. Ike anaghị agwụ Jehova. N’ihi ya, ọ dịghị mkpa ka o zuwe ike. Ma Baịbụl kwuru na mgbe Jehova kechara eluigwe na ụwa, “o zuru ike wee nweta ume.” (Ọpụ. 31:17) Ma, o doro anya na ọ pụtara na Jehova kwụsịrị ike ihe, lee ihe ndị o kere anya ma nwee obi ụtọ. Ọ bụ eziokwu na Jizọs rụsiri ọrụ ike mgbe o bi n’ụwa, o wepụtara oge zuo ike, ya na ndị enyi ya erikọọkwa nri.​—Mat. 14:13; Luk 7:34.

5. Olee ihe na-esiri ọtụtụ ndị ike?

5 Baịbụl gwara ndị Chineke ka ọrụ na-atọ ha ụtọ. Ndị na-efe Chineke kwesịrị ịna-arụsi ọrụ ike, kama ịdị umengwụ. (Ilu 15:19) O nwere ike ịbụ na ị na-arụ ọrụ ego iji lekọta ezinụlọ gị. Ọrụ ndị niile na-eso ụzọ Kraịst nwere bụ ikwusa ozi ọma. Ma, i kwesịkwara ịna-ezu ike nke ọma. Ọ̀ na-esiri gị ike mgbe ụfọdụ iwepụta oge ga-ezuru gị ịrụ ọrụ gị, ịga ozi ọma, na izu ike? Olee otú anyị ga-esi mata mgbe anyị ga-arụru ọrụ na mgbe anyị kwesịrị izu ike?

MGBE Ị GA-ARỤRU ỌRỤ NA MGBE I KWESỊRỊ IZU IKE

6. Olee otú Mak 6:​30-34 si gosi na Jizọs ma mgbe ọ ga-arụru ọrụ na mgbe o kwesịrị izu ike?

6 Anyị kwesịrị ịmata mgbe anyị ga-arụru ọrụ na mgbe anyị kwesịrị izu ike. Eze Sọlọmọn si n’ike mmụọ nsọ dee, sị: “E nwere oge a kara aka maka . . . ihe ọ bụla a na-eme.” O kwuru gbasara ịkụ ihe, irụ ụlọ, ibe ákwá, ịchị ọchị, ịgba egwú, na ihe ndị ọzọ. (Ekli. 3:​1-8) O doro anya na ihe abụọ dị mkpa mmadụ na-eme bụ ịrụ ọrụ na izu ike. Jizọs ma mgbe ọ ga-arụru ọrụ na mgbe o kwesịrị izu ike. O nwere mgbe ndịozi ya si ozi ọma lọta. Ihe ha na-arụ mere ka ha ghara ‘inwe ohere ọ bụla iri nri.’ Jizọs sịrị ha: “Bịanụ ka anyị gaa zurutụ ike n’ebe ndị mmadụ na-adịghị anọkarị.” (Gụọ Mak 6:​30-34.) Ọ bụ eziokwu na ọ bụghị mgbe niile ka Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya na-enwe ohere izu ike otú ha chọrọ, ọ ma na ha niile kwesịrị ịna-ezu ike.

7. Olee uru ịmụ gbasara Ụbọchị Izu Ike Jehova nyere ndị Izrel iwu ka ha na-edebe ga-abara anyị?

7 Mgbe ụfọdụ, ọ na-adị mkpa ka anyị zurutụ ike ma ọ bụ gbanwetụ otú anyị si eme ihe ndị anyị na-eme kwa ụbọchị. N’oge ochie, Chineke nyere ndị Izrel iwu ka ha na-edebe Ụbọchị Izu Ike kwa izu. Anyị leruo iwu ahụ anya, anyị ga-achọpụta na izu ike dị mkpa. Anyị anaghị edebe Iwu Mozis. Ma, ịmụta ihe iwu ahụ kwuru gbasara Ụbọchị Izu Ike ga-abara anyị uru. Ihe anyị mụtara na ya ga-enyere anyị aka ịmata ma ànyị ma mgbe anyị ga-arụru ọrụ na mgbe anyị kwesịrị izu ike.

ỤBỌCHỊ IZU IKE BỤ MAKA IZU IKE NA IFE CHINEKE

8. Dị ka e kwuru n’Ọpụpụ 31:​12-15, olee ihe a na-eme n’ụbọchị izu ike?

8 Baịbụl kwuru na mgbe Chineke ji ụbọchị isii kechaa ihe, ọ kwụsịrị ike ihe n’ụwa. (Jen. 2:2) Ma, ịrụ ọrụ na-atọ Jehova ụtọ. E nwere ihe ndị ọzọ ọ ka ‘na-arụ.’ (Jọn 5:17) Jehova rụrụ ọrụ ụbọchị isii, zuo ike n’ụbọchị nke asaa. Ọ gwakwara ndị Izrel ka ha na-ezu ike n’ụbọchị nke asaa n’izu. Chineke kwuru na Ụbọchị Izu Ike ahụ bụ ihe àmà dị n’etiti ya na ndị Izrel. Ọ bụ ụbọchị “a ga-ezu naanị ike na ya. Ọ bụ ihe dị nsọ nye Jehova.” (Gụọ Ọpụpụ 31:​12-15.) E nweghị onye ga-arụ ọrụ n’ụbọchị ahụ, ma ụmụaka, ma ndị ohu, ma anụ ụlọ. (Ọpụ. 20:10) O mere ka ndị mmadụ nwee ike imekwu ihe gbasara ofufe Chineke.

9. N’oge Jizọs, olee ihe na-adịghị mma ụfọdụ ndị chere gbasara Ụbọchị Izu Ike?

9 Ụbọchị Izu Ike ahụ baara ndị Chineke uru. Ma, ọtụtụ ndị ndú okpukpe mere iwu ndị mere ka idebe Ụbọchị Izu Ike ahụ siere ndị Juu ezigbo ike. Ha sịrị na mmadụ ekwesịghị ịghọrọ ọka ma ọ bụ gwọọ onye ahụ́ na-adịghị n’ụbọchị ahụ. (Mak 2:​23-27; 3:​2-5) Ma ọ bụghị ihe Chineke chọrọ. Jizọs mekwara ka ndị mmadụ mata na ọ bụghị ihe Nna ya chọrọ.

Jizọs na ndị ezinụlọ ha ji Ụbọchị Izu Ike na-efe Chineke (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10) *

10. Olee ihe anyị na-amụta na Matiu 12:​9-12 gbasara otú Jizọs si lee Ụbọchị Izu Ike anya?

10 Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya bụ́ ndị Juu debere Ụbọchị Izu Ike n’ihi na ha na-edebe Iwu Mozis. * Ma, ọtụtụ ihe Jizọs kwuru na ihe ndị o mere gosiri na ọ dịghị njọ imere ndị mmadụ ihe ọma n’Ụbọchị Izu Ike. Ọ sịrị: “Ọ bụ ihe iwu kwadoro ime ezi ihe n’ụbọchị izu ike.” (Gụọ Matiu 12:​9-12.) O cheghị na ọ dị njọ inyere ndị mmadụ aka n’Ụbọchị Izu Ike. Ihe ndị Jizọs mere gosiri na ọ ghọtara ihe dị mkpa mere Chineke ji gwa ndị ya ka ha zuo ike n’Ụbọchị Izu Ike. Ebe ọ bụ na ha agaghị arụ ọrụ n’ụbọchị ahụ, ha ga-ejizi ya mee ihe gbasara ofufe Chineke. Ọ ga-abụrịrị na ndị ezinụlọ Jizọs ji Ụbọchị Izu Ike ahụ mee ihe gbasara ofufe Chineke. Ihe mere anyị ji mata bụ ihe anyị gụrụ gbasara Jizọs mgbe ọ nọ n’obodo ya bụ́ Nazaret. Baịbụl kwuru gbasara Jizọs, sị: “Ọ banyere n’ụlọ nzukọ, dị ka ọ na-emekarị n’ụbọchị izu ike, o wee guzo ọtọ ka ọ gụọ ihe.”​—Luk 4:​15-19.

OLEE OTÚ I SI ELE ỊRỤ ỌRỤ ANYA?

11. Olee onye Jizọs si n’aka ya mụta ịrụsi ọrụ ike?

11 O doro anya na Josef kụziiri Jizọs ọrụ ịkwá nkà, kụziekwara ya otú Chineke si ele ịrụ ọrụ anya. (Mat. 13:​55, 56) Jizọs hụkwara Josef ka ọ na-arụsi ọrụ ike iji lekọta ezinụlọ ya buru ibu. Jizọs mechara gwa ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Onye ọrụ kwesịrị ụgwọ ọrụ ya.” (Luk 10:7) O doro anya na Jizọs rụsiri ọrụ ike.

12. Olee amaokwu Baịbụl ndị gosiri ihe Baịbụl kwuru gbasara ịrụsi ọrụ ike?

12 Pọl onyeozi rụsikwara ọrụ ike. Ọrụ ọ kacha rụọ bụ ịgwa ndị ọzọ gbasara Jizọs na ihe ndị ọ kụziri. Ma Pọl rụkwara ọrụ o ji na-egbo mkpa ya. Ụmụnna nọ na Tesalonaịka ma otú o si ‘dọgbuo onwe ya n’ọrụ’ “abalị na ehihie” ka ọ ghara ibo onye ọ bụla “oké ibu arọ.” (2 Tesa. 3:8; Ọrụ 20:​34, 35) O nwere ike ịbụ ịkpa ákwà ụlọikwuu ka Pọl na-ekwu okwu ya. Na Kọrịnt, ọ na-anọ n’ụlọ Akwịla na Prisila. “Ha rụkọkwara ọrụ, n’ihi na aka ọrụ ha bụ ịkpa ákwà ụlọikwuu.” Pọl kwuru na ya rụrụ ọrụ “abalị na ehihie.” Ma ọ pụtaghị na o nweghị mgbe ọ kwụsịrị ịrụ ọrụ. E nwere mgbe ọ na-akwụsịtụ ịkpa ákwà ụlọikwuu, dị ka n’Ụbọchị Izu Ike. Ọ na-eji ụbọchị ahụ ezi ndị Juu ozi ọma n’ihi na hanwa anaghịkwa arụ ọrụ n’Ụbọchị Izu Ike.​—Ọrụ 13:​14-16, 42-44; 16:13; 18:​1-4.

13. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka Pọl onyeozi?

13 E nwere ezigbo ihe anyị ga-amụta n’aka Pọl. Ọ rụrụ ọrụ ego. Ma, o wepụtara oge mgbe niile rụọ “ọrụ dị nsọ nke ozi ọma banyere Chineke.” (Rom 15:16; 2 Kọr. 11:23) Ọ gbakwara ndị ọzọ ume ka ha mee otú ahụ. N’ihi ya, Akwịla na Prisila bụ ‘ndị ọrụ ibe ya n’ime Kraịst Jizọs.’ (Rom 12:11; 16:3) Pọl gwara ụmụnna nọ na Kọrịnt ka ha nwee “ọtụtụ ihe ha na-arụ mgbe niile n’ọrụ Onyenwe anyị.” (1 Kọr. 15:58; 2 Kọr. 9:8) Jehova medịrị ka Pọl onyeozi dee, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla achọghị ịrụ ọrụ, ya erila ihe.”​—2 Tesa. 3:10.

14. Gịnị ka ihe Jizọs kwuru na Jọn 14:12 pụtara?

14 Ọrụ kacha mkpa n’oge ikpeazụ a bụ ikwusa ozi ọma na ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Kraịst. Nke bụ́ eziokwu bụ na Jizọs buru amụma na ndị na-eso ụzọ ya ga-arụ ọrụ karịrị nke yanwa rụrụ. (Gụọ Jọn 14:12.) Ihe ọ na-ekwu abụghị na ha ga-arụ ọrụ ebube otú ahụ ọ rụrụ. Kama, ebe ndị na-eso ụzọ ya ga-ekwusa ozi ọma ga-akarị ebe yanwa kwusara. Ndị ha ga-ezi ozi ọma na oge ha ga-eji ezi ya ga-akarịkwa nke ya.

15. Olee ajụjụ ndị i kwesịrị ịjụ onwe gị, n’ihi gịnịkwa?

15 Ọ bụrụ na ị na-arụ ọrụ ego, jụọ onwe gị, sị: ‘N’ebe m na-arụ ọrụ, à maara m ka onye na-arụsi ọrụ ike? M̀ na-arụcha ọrụ m n’oge, jirikwa ike m niile rụọ ya?’ Ọ bụrụ na ị ga-azali ee n’ajụjụ ndị a, o nwere ike ime ka onye ị na-arụrụ ọrụ tụkwasị gị obi. O nwekwara ike ime ka ndị na-ahụ àgwà gị chọkwuo ige ntị n’ozi ọma. N’ihe gbasara ikwusa ozi ọma na ịkụziri ndị mmadụ Baịbụl, jụọ onwe gị, sị: ‘À ma m ka onye na-ekwusasi ozi ọma ike? M̀ na-akwadebe nke ọma tupu mụ agaa ozi ụlọ n’ụlọ? M̀ na-agaghachi na nke ndị nwere mmasị n’ozi ọma n’egbughị oge? M̀ na-ewepụta oge mgbe niile na-esi n’ụzọ dị iche iche ezi ozi ọma?’ Ọ bụrụ na ị ga-azali ee n’ajụjụ ndị a, ozi ọma ga na-atọ gị ụtọ.

OLEE OTÚ I SI ELE IZU IKE ANYA?

16. Olee ihe dị iche n’otú Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya si lee izu ike anya na otú ọtụtụ ndị taa si ele ya anya?

16 Jizọs ma na mgbe ụfọdụ, ya na ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị izu ike. Ma, n’oge ahụ nakwa n’oge anyị a, ọtụtụ ndị na-eme ka nwoke ahụ bara ọgaranya Jizọs ji mee ihe atụ. Nwoke ahụ gwara onwe ya, sị: “Tụsara ahụ́, na-eri, na-aṅụ, mee onwe gị obi ụtọ.” (Luk 12:19; 2 Tim. 3:4) Ihe kacha ya mkpa bụ izu ike na ikpori ndụ. Ma, ihe kacha Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya mkpa abụghị ime onwe ha obi ụtọ.

Ịma mgbe anyị ga-arụru ọrụ na mgbe anyị kwesịrị izu ike ga-eme ka anyị lekwasị anya n’ime ihe bara uru ga na-eme anyị obi ụtọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17) *

17. Olee ihe anyị na-eji oge anyị na-anọghị n’ọrụ eme?

17 Taa, anyị na-agbalị ime ka Jizọs. Otú anyị si eme ya bụ iji oge anyị na-anọghị n’ọrụ na-ezi ndị mmadụ ozi ọma, na-agakwa ọmụmụ ihe, ọ bụghị naanị iji ya ezu ike. Ịga ozi ọma na ọmụmụ ihe dị anyị ezigbo mkpa. Ọ bụ ihe mere anyị ji agbalịsi ike ịna-aga ha mgbe niile. (Hib. 10:​24, 25) Ọ bụrụgodị na anyị agaa ezumike, anyị na-aga ọmụmụ ihe ebe ọ bụla anyị nọ. Anyị na-agbalịkwa na-agwa ndị mmadụ gbasara Baịbụl.​—2 Tim. 4:2.

18. Gịnị ka Eze anyị bụ́ Jizọs Kraịst chọrọ ka anyị mee?

18 Obi dị anyị ezigbo ụtọ na Eze anyị bụ́ Jizọs Kraịst anaghị atụ anya ka anyị mee ihe anyị na-agaghị emeli. Ọ na-enyekwara anyị aka ịmata mgbe anyị ga-arụru ọrụ na mgbe anyị kwesịrị izu ike. (Hib. 4:15) Ọ chọrọ ka anyị zuo ike mgbe anyị kwesịrị izu ike. Ọ chọkwara ka anyị rụsie ọrụ ike iji na-egbo mkpa anyị ma na-ekwusa ozi ọma. N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-eleba anya n’ihe Jizọs mere iji napụta anyị n’ohu jọgburu onwe ya ụmụ mmadụ na-agba.

ABỤ NKE 38 Ọ Ga-eme Ka I Sie Ike

^ par. 5 Baịbụl na-akụziri anyị otú anyị kwesịrị isi na-ele ịrụ ọrụ na izu ike anya. Ihe isiokwu a ga-akọwa gbasara Ụbọchị Izu Ike a gwara ndị Izrel ka ha na-edebe kwa izu ga-enyere anyị aka iche gbasara otú anyị si ele ịrụ ọrụ na izu ike anya.

^ par. 10 Ndị na-eso ụzọ Jizọs ejighị Ụbọchị Izu Ike gwuo egwu. Ọ bụ ya mere ha ji kwụsị ịkwadebe ihe na-esi ísì ụtọ ha ga-ete ozu Jizọs ruo mgbe Ụbọchị Izu Ike gachara.​—Luk 23:​55, 56.

^ par. 55 NKỌWA FOTO: Ebe Josef kpọ ezinụlọ ya na-aga n’ụlọ nzukọ n’Ụbọchị Izu Ike.

^ par. 57 NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna nke na-arụ ọrụ o ji elekọta ezinụlọ ya ji oge ọ na-anọghị n’ọrụ na-eme ihe gbasara ofufe Chineke, ma mgbe ya na ezinụlọ ya gara ezumike.