Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mbọ Ndị Mmadụ Na-agba Ịmata Eziokwu

Mbọ Ndị Mmadụ Na-agba Ịmata Eziokwu

Ịmata eziokwu ga-eme ka anyị dịrị ndụ. Dị ka ihe atụ, chegodị uru ịmata azịza ajụjụ a baarala anyị: Olee otú ọrịa na-efe efe si agbasa?

Ruo ọtụtụ puku afọ, o nweghị onye ma azịza ajụjụ ahụ. N’oge ndị ahụ, ọrịa na-efe efe nọkwa na-egbu ọtụtụ nde mmadụ. Ma, ndị sayensị mechara chọpụta nke bụ́ eziokwu. Ha chọpụtara na ihe na-akpatakarị ọrịa bụ ụmụ nje dị iche iche. Eziokwu a ha chọpụtara enyerela ndị mmadụ aka igbochi ọrịa na ịgwọ ọtụtụ ọrịa. O meekwala ka ahụ́ gbasikwuo ọtụtụ ijeri mmadụ ike, ha ana-adịkwu ogologo ndụ.

Gịnịkwanụ gbasara ajụjụ ndị ọzọ dị mkpa? Olee uru i chere ịmata nke bụ́ eziokwu gbasara azịza ajụjụ ndị a ga-abara gị?

  • Ònye bụ Chineke?

  • Ònye bụ Jizọs Kraịst?

  • Gịnị bụ Alaeze Chineke?

  • Olee otú ihe ga-adị n’ọdịnihu?

Ọtụtụ nde mmadụ achọpụtala azịza ajụjụ ndị ahụ. O meekwala ka ndụ ha kakwuo mma. Azịza ndị ahụ nwekwara ike ịbara gị uru.

Ì NWERE IKE ỊMATALI EZIOKWU?

I nwere ike ịna-eche sị, ‘Olee otú m ga-esi amatali nke bụ́ eziokwu n’ihe ọ bụla?’ A sị kwuwe, ịmata nke bụ́ eziokwu gbasara ọtụtụ ihe yiri ka ọ̀ na-esiwanye ike. N’ihi gịnị?

Ọtụtụ mmadụ atụkwasịghị ndị ọchịchị, ndị ahịa ma ọ bụ ụlọ ọrụ mgbasa ozi obi ka ha gwa ha eziokwu. Ọ naghị adịrị ha mfe ịmata mgbe mmadụ na-ekwu eziokwu, mgbe ọ na-ekwu ihe o chere, mgbe ọ na-ezochiri ha ihe ụfọdụ ma ọ bụ mgbe ọ na-aghara ha ụgha. N’oge anyị a, ndị mmadụ anaghịzi atụkwasị ibe ha obi, ọtụtụ ihe ndị mmadụ na-ekwu anaghịkwa abụ eziokwu. O meela ka ndị mmadụ gharazie ịna-ekweta nke bụ́ eziokwu, ha anaghịkwa achọ ịma otú o si gbasa ha.

N’agbanyeghị ihe ndị a, ị ga-amatali azịza ajụjụ ndị kacha echu ndị mmadụ ụra. Olee otú ị ga-esi eme ya? Ọ bụ ime otu ihe ahụ ị na-eme ma ị chọọ ịmata azịza ajụjụ ndị na-adịchaghị mkpa.

IHE Ị GA-EME KA Ị MATA EZIOKWU

Kwa ụbọchị, o nwere ihe ụfọdụ ị na-agba mbọ ịmata eziokwu banyere ha. Chegodị gbasara ihe Jessica mere. Ọ sịrị: “Ahụekere anatụghị adị nwa m nwaanyị mma n’ahụ́, nke na o nwere ike ịnwụ ma o rie nri ọ bụla nwere obere protin si n’ahụekere.” Jessica kwesịrị ịma ma nri ọ chọrọ ịzụtara nwa ya, ọ̀ ga-adị ya mma n’ahụ́. O kwuru sị: “Ihe mbụ m na-eme bụ iji nwayọọ gụọ ihe a mapawara n’ahụ́ nri ahụ ka m mata ihe ndị e ji mee ya. M na-emezi nchọnchọ, jụọkwa ụlọ ọrụ mepụtara nri ahụ ajụjụ, iji jide n’aka na e nwetụghị protin si n’ahụekere a gwakọtara na ya mgbe a na-emepụta ya. M na-emekwu nchọchọ n’ebe ndị m ma ga-agwa m eziokwu iji mee ka obi sie m ike na otú ụlọ ọrụ ahụ si emepụta nri ha dị mma.”

O nwere ike ịbụ na ajụjụ ndị ị na-agba mbọ ịmata azịza ha kwa ụbọchị adịchaghị mkpa ka nke Jessica. Ma, i nwere ike ime ihe ndị na-esonụ ka ị mata azịza ajụjụ ndị na-echu gị ụra otú ahụ Jessica mere:

  • Chọpụta nke bụ́ eziokwu.

  • Mekwuo nchọnchọ.

  • Jide n’aka na a naghị enyo ebe i si amata nke bụ́ eziokwu enyo.

Ime ihe ndị a nwere ike inyere gị aka ịchọpụta azịza ajụjụ ndị ahụ na-echu gị ụra. Olee otú ị ga-esi eme ya?

AKWỤKWỌ PỤRỤ ICHE NKE NA-AKỤZI EZIOKWU

Mgbe Jessica na-achọ ịmata eziokwu Baịbụl, o mekwara ihe ndị ahụ ọ na-eme iji chọpụta nri ndị na-agaghị enye nwa ya nsogbu n’ahụ́. Ọ sịrị: “Iwetu obi gụọ Baịbụl na ime ezigbo nchọnchọ nyeere m aka ịmata eziokwu Baịbụl.” Ọtụtụ nde mmadụ emeela ka Jessica. Ha amụtala ihe Baịbụl kwuru gbasara ajụjụ ndị a:

  • Gịnị ka Chineke bu n’obi kee anyị?

  • Olee ebe mmadụ na-aga ma ọ nwụọ?

  • Gịnị mere ndị mmadụ ji ata ahụhụ?

  • Olee ihe Chineke na-eme iji kwụsị ahụhụ ndị mmadụ na-ata?

  • Olee otú anyị nwere ike isi na-enwe obi ụtọ n’ezinụlọ anyị?

I nwere ike inweta azịza ajụjụ ndị a nakwa ndị ọzọ ma ị gụọ Baịbụl, mekwuokwa nchọnchọ na www.pr418.com/ig.