Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Eziokwu Banyere Alaeze Chineke

Eziokwu Banyere Alaeze Chineke

Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere, sị: “Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ. Ka Alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” (Matiu 6:9, 10) Gịnị bụ Alaeze Chineke? Olee ihe ọ ga-emere anyị? Olee ihe mere anyị ga-eji ekpe ekpere ka ọ bịa?

Jizọs bụ Eze Alaeze Chineke.

Luk 1:31-33: “Ị ga-agụkwa ya Jizọs. Onye a ga-abụ onye ukwu, a ga-akpọkwa ya Ọkpara nke Onye Kacha Elu. Jehova Chineke ga-enyekwa ya ocheeze nna ya bụ́ Devid. Ọ ga-achị ezinụlọ Jekọb ruo mgbe ebighị ebi, Alaeze ya agaghịkwa agwụ agwụ.”

Alaeze Chineke bụ isi ihe Jizọs kụziiri ndị mmadụ.

Matiu 9:35: “Jizọs wee malite ijegharị n’obodo ukwu nakwa n’obodo nta niile, na-ezi ihe n’ụlọ nzukọ ha, na-ekwusakwa ozi ọma Alaeze Chineke ma na-agwọ ụdị ọrịa ọ bụla.”

Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ihe ndị ha ga-eji ama na Alaeze ahụ eruwela nso.

Matiu 24:7: “N’ihi na mba ga-alụso mba ọzọ agha, alaeze ga-alụsokwa alaeze ọzọ agha. A ga-enwekwa ụkọ nri na ala ọma jijiji n’ebe dị iche iche.”

Ndị na-eso ụzọ Jizọs na-ekwusa gbasara Alaeze Chineke n’ụwa niile ugbu a.

Matiu 24:14: “A ga-ekwusakwa ozi ọma Alaeze Chineke n’ebe niile n’ụwa ka ọ bụụrụ mba niile àmà, mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.”