Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Kpebie Ịkwado Alaeze Chineke Ugbu A

Kpebie Ịkwado Alaeze Chineke Ugbu A

Were ya na ajọ ifufe na-aga ịkpa mkpamkpa n’ebe i bi, gọọmentị ana-agwa onye ọ bụla, sị: “GBAPỤNỤ! CHỌỌNỤ EBE UNU GA-AGBABA!” Olee ihe kacha mma i kwesịrị ime? O doro anya na ị ga-agbaga ebe ihe ọ bụla na-agaghị eme gị.

E nwere ike ikwu na anyị niile bi n’ebe a na-aga inwe ajọ ifufe. Jizọs kpọrọ ya “oké mkpagbu.” (Matiu 24:21) Anyị agaghị agbagali ebe ọzọ. Ma, o nwere ihe anyị nwere ike ime iji chebe onwe anyị. Gịnị ka ọ bụ?

Mgbe Jizọs nọ n’elu ugwu na-akụzi ihe, o kwuru, sị: “N’ihi ya, burunụ ụzọ na-achọ Alaeze Chineke na ezi omume Chineke.” (Matiu 6:33) Olee otú anyị ga-esi eme ya?

Buru ụzọ na-achọ Alaeze Chineke. Otú anyị ga-esi eme ya bụ iwere Alaeze Chineke ka ihe kacha mkpa. (Matiu 6:25, 32, 33) Gịnị mere anyị kwesịrị iji were ya otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na ụmụ mmadụ agaghị emeli ka nsogbu ụwa a kwụsị. Ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-emeli ya.

Na-achọ ezi omume Chineke. Anyị kwesịrị ịgbalịsi ike na-edebe iwu Chineke ma na-eso ntụziaka ya. Ọ bụ n’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ bụrụ na anyị ejiri aka anyị na-ekpebiri onwe anyị ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ, anyị ga-aba ná nsogbu. (Ilu 16:25) Ma, ọ bụrụ na anyị ana-edebe iwu Chineke, obi ga na-atọ Chineke ụtọ, anyịnwa ga-eritekwa uru.​—Aịzaya 48:17, 18.

Buru ụzọ na-achọ Alaeze Chineke na ezi omume Chineke. Jizọs kwuru na ụfọdụ ndị ga-ekwe ka ihe ụfọdụ megharịa ha anya, ha echee na ịkpata ego buru ibu ga-eme ka nsogbu ha niile laa. E nwekwara ndị ga-ekwe ka nchegbu nke ndụ mee ka ha ghara inwe oge ha ga-eji na-achọ Alaeze Chineke.​—Matiu 6:19-21, 25-32.

Ma, Jizọs kwere nkwa na ndị niile na-akwado Alaeze Chineke ga-enweta ihe ndị dị ha mkpa ugbu a, nwetakwa ọtụtụ ngọzi n’ọdịnihu.​—Matiu 6:33.

N’agbanyeghị na Ndị Kraịst oge mbụ bu ụzọ chọọ Alaeze Chineke na ezi omume Chineke, ha adịghị ndụ hụ mgbe nsogbu na ahụhụ ga-akwụsị. Ma, e chebere ha. Olee otú e si chebe ha?

Ha debere iwu Chineke. O mere ka ha ghara inwe ọtụtụ nsogbu ndị na-anaghị erubere Chineke isi na-enwe. Okwukwe siri ike ha nwere na Alaeze Chineke ga-abịa mere ka ha die ọtụtụ nsogbu, ma ndị nke kachaa taa akpụ. Chineke nyekwara ha “ike karịrị ike mmadụ” iji die nsogbu ha.​—2 Ndị Kọrịnt 4:7-9.

Ị̀ GA-EBU ỤZỌ NA-ACHỌ ALAEZE CHINEKE?

Ndị Kraịst oge mbụ bu ụzọ chọọ Alaeze Chineke otú ahụ Jizọs kwuru ka e mee. Ha kwusara ozi ọma Alaeze Chineke n’ógbè niile ha bi. (Ndị Kọlọsi 1:23) Ò nwere ndị na-eme otú ahụ taa?

Ee. Ndịàmà Jehova ma na n’oge na-adịghị anya, Alaeze Chineke ga-ebibi ụwa ọjọọ a. N’ihi ya, ha na-eme ike ha niile iji mezuo ihe a Jizọs kwuru, nke bụ́: “A ga-ekwusakwa ozi ọma Alaeze Chineke n’ebe niile n’ụwa ka ọ bụụrụ mba niile àmà, mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.”​—Matiu 24:14.

Olee ihe ị ga-eme ma ị nụ ozi ọma Alaeze Chineke? Anyị na-agba gị ume ka i mee ihe ahụ ndị bi na Masedonia dị na Beria mere n’oge ndịozi. Mgbe Pọl onyeozi ziri ha ozi ọma Alaeze Chineke, ha “ji obi ha niile” nabata ya. Ha ‘nyochara Akwụkwọ Nsọ nke ọma’ iji mara ma ihe a gwara ha ọ̀ bụ eziokwu, ha mekwara ihe ndị ha mụtara.​—Ọrụ Ndịozi 17:​11, 12.

Gịnwa nwekwara ike ime otú ahụ. Otú ị ga-esi eme ya bụ ibu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke na ezi omume Chineke. I mee otú ahụ, a ga-echebe gị ugbu a, gị enweekwa udo na obi iru ala n’ọdịnihu.