Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | MATIU 20-21

“Onye Ọ Bụla Nke Na-achọ Ịbụ Onye Ukwu n’Etiti Unu Aghaghị Ịbụ Onye Na-ejere Unu Ozi”

“Onye Ọ Bụla Nke Na-achọ Ịbụ Onye Ukwu n’Etiti Unu Aghaghị Ịbụ Onye Na-ejere Unu Ozi”

20:28

Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii dị mpako na-achọkarị ka ndị mmadụ na-ahụ ma na-ekele ha n’ọma ahịa

Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii dị mpako. Ha na-achọkarị ime ihe na-amasị ndị mmadụ, nakwa ịbụ ndị a ma ama. (Mat. 23:5-7) Ma, Jizọs dị iche. Baịbụl kwuru, sị: “Dị nnọọ ka Nwa nke mmadụ bịara, ọ bụghị ka e jeere ya ozi, kama ka o jee ozi.” (Mat. 20:28) Anyị nwere ike ịjụ onwe anyị sị: ‘Ọrụ ndị m na-achọ ịrụ n’ọgbakọ, ọ̀ bụ naanị ndị ga-eme ka ndị ọzọ hụ m ma too m?’ Anyị ga-abụ ndị ukwu n’anya Jehova ma ọ bụrụ na anyị ana-ejere ndị ọzọ ozi otú ahụ Kraịst mere. Ọtụtụ mgbe, ọ bụ Jehova naanị na-ahụ ọrụ ọma ahụ anyị na-arụ. (Mat. 6:1-4) Onye Kraịst dị umeala n’obi ga . . .

  • na-eso na-elekọta ma na-edowe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha

  • na-ewepụta onwe ya enyere ndị agadi na ndị ọzọ aka

  • na-enye onyinye iji kwado ọrụ Alaeze