Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Otú Anyị Ga-esi Mụta Ịhụ Chineke na Ndị Agbata Obi Anyị n’Anya

Otú Anyị Ga-esi Mụta Ịhụ Chineke na Ndị Agbata Obi Anyị n’Anya

Ọ bụ eziokwu na iwu ejighị Ndị Kraịst idebe Iwu Mozis, ma, iwu abụọ kachanụ n’Iwu ahụ, ya bụ, ịhụ Chineke na ịhụ ndị agbata obi anyị n’anya, dị ha ezigbo mkpa iji mee ihe Jehova chọrọ ha n’aka. (Mat. 22:37-39) Mmadụ anaghị ebu ụdị ịhụnanya a apụta ụwa. A na-amụta ya amụta ya. Olee otú e si amụta ya? Otu ụzọ dị ezigbo mkpa anyị ga-esi amụta ya bụ ịna-agụ Baịbụl kwa ụbọchị. Ọ bụrụ na anyị ana-atụgharị uche n’àgwà ọma ndị Chineke nwere anyị gụtara n’Akwụkwọ Nsọ, anyị ga-ahụ “ịdị mma Jehova.” (Ọma 27:4) Ọ ga-eme ka anyị nwekwuo ịhụnanya maka Chineke, na-echekwa echiche ka ya. Ọ ga-akpalikwa anyị irubere iwu ya isi, ma nke kwuru ka anyị na-ahụ ndị ọzọ n’anya. (Jọn 13:34, 35; 1 Jọn 5:3) Lee ihe atọ ga-enye aka mee ka ịgụ Baịbụl na-atọkwu gị ụtọ:

  • Jiri uche gị na-ahụ ihe ị na-agụ. Were ya na ị nọ ebe ahụ ihe ị na-agụ gbasara ya na-eme. Olee ihe ndị ị na-ahụ, ihe ndị ị na-anụ na ísìsì ndị na-esi ebe ahụ? Olee otú obi dị ndị nọ ebe ahụ?

  • Na-agbanwe otú i si na-agụ ya. Lee ihe ụfọdụ i nwere ike ime: Na-agụpụta ihe agụpụta ma ọ bụkwanụ na-ele anya na Baịbụl gị mgbe nke a na-egere egere na-akpọ. Gụọ gbasara otu onye a kọrọ akụkọ ya na Baịbụl ma ọ bụ otu isiokwu, kama isi n’otu isiakwụkwọ gụrụ banyere n’ọzọ. Dị ka ihe atụ, i nwere ike iji isi nke 4 ma ọ bụ isi nke 16 nke akwụkwọ bụ́ Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịghọta Baịbụl gụọ gbasara Jizọs. Gụchaa isiakwụkwọ Baịbụl e si nweta ihe mmụta dịịrị ụbọchị ọ bụla. Chọpụta mgbe e dere akwụkwọ Baịbụl dị iche iche, malitezie na nke e bu ụzọ dee gụrụ gawa.

  • Na-agụ ya otú ga-eme ka ị ghọta ya. Kama ịchọwa ka ị gụchaa ọtụtụ isiakwụkwọ n’otu ụbọchị, ọ ka mma na ị gụrụ otu isiakwụkwọ ghọta ya, tụgharịakwa uche na ya. Chee echiche gbasara ebe ihe ahụ ị na-agụ mere, oge o mere, nakwa ihe ndị gbara ya gburugburu. Jiri map na ntụaka etiti peeji na-agụ ya. Meekwa nchọnchọ gbasara ọ dịkarịala otu ihe ị na-aghọtaghị. O kwe mee, jirikwa oge hà ka oge iji gụọ ihe, tụgharịa uche.