Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Tụkwasị Jehova Obi Mgbe A Na-achọ Gị Okwu

Tụkwasị Jehova Obi Mgbe A Na-achọ Gị Okwu

Ndị na-achọ anyị okwu nwere ike ime anyị ihe ga-afụ anyị ụfụ n’obi nakwa n’ahụ́. Ha nwedịrị ike ime ka anyị mebie iwu Jehova ma ọ bụrụ na anyị ekwe ka ha menye anyị ụjọ mgbe ha na-emegide anyị maka na anyị na-efe Jehova. Olee otú ị ga-esi echebe onwe gị ka onye na-achọ gị okwu ghara inweta gị?

E nweela ọtụtụ ndị fere Jehova a chọrọ okwu, mana ha meriri nsogbu ahụ n’ihi na ha tụkwasịrị Jehova obi. (Ọma 18:17) Dị ka ihe atụ, Esta agbachighị nkịtị mgbe nwoke ọjọọ na-achọ okwu aha ya bụ Heman kpara nkata igbu ndi Juu. Esta gbara ya n’anwụ. (Esta 7:1-6) Mana, tupu ya emee otú ahụ, o buru ọnụ. Ihe a gosiri na ọ tụkwasịrị Jehova obi. (Esta 4:14-16) Jehova gọziri ihe o mere ma chebe ya na ndị obodo ya.

Ndị na-eto eto, ọ bụrụ na mmadụ achọọ unu okwu, rịọnụ Jehova ka o nyere unu aka, kọsakwaranụ onye torola eto, dị ka mama unu ma ọ bụ papa unu, ihe merenụ. Ka obi sie unu ike na Jehova ga-enyere unu aka otú ahụ o nyeere Esta. Olee ihe ọzọ ga-enyere unu aka idi okwu a na-achọ unu?

LEENỤ VIDIO BỤ́ IHE MERE MGBE M NA-ETO ETO—GỊNỊ GA-ENYERE M AKA IDI OKWU A NA-ACHỌ M?, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Gịnị ka ndị na-eto eto nwere ike ịmụta n’aka Charlie na Ferin?

  • Gịnị ka ndị mụrụ ụmụ nwere ike ịmụta n’ihe Charlie na Ferin kwuru gbasara inyere ụmụntakịrị aka idi okwu a na-achọ ha?