Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Ndị Ọzụzụ Atụrụ Ndị Na-arụ Ọrụ Na-abara Ndị Jehova Uru

Ndị Ọzụzụ Atụrụ Ndị Na-arụ Ọrụ Na-abara Ndị Jehova Uru

Ọtụtụ ndị anaghị atụkwasị ndị nọ n’isi obi. Anyị ghọtara ihe kpatara ya. O teela ndị nọ n’isi jiwere ikike e nyere ha na-eme ihe na-abara naanị onwe ha uru. (Maị. 7:3) Obi dị anyị ezigbo ụtọ na a zụrụ ndị okenye ọgbakọ ka ha jiri ikike e nyere ha na-eme ihe ga-abara ndị Jehova uru.—Esta 10:3; Mat. 20:25, 26.

Ndị okenye anaghị eme ka ndị nọ n’isi n’ụwa a. Ihe mere ha ji agbalị ka ha ruo eruo ịbụ ndị nlekọta bụ maka na ha hụrụ Jehova na ndị ya n’anya. (Jọn 21:16; 1 Pita 5:1-3) Ndị ọzụzụ atụrụ ndị a na-eso ntụziaka Jizọs. Ha na-enyere onye nkwusa nke ọ bụla aka ka obi ruo ya ala n’ezinụlọ Jehova nakwa ka ya na Jehova dịrị n’ezigbo mma. Ha anaghị egbu oge ịgba atụrụ Jehova ume nakwa inyere ha aka ma ihe gbata gbata mee ma ọ bụkwanụ ma e nwee ọdachi. I nwere ike ịgakwuru otu okenye nọ n’ọgbakọ unu ma ọ bụrụ na ị chọrọ ka ndị okenye nyere gị aka.—Jems 5:14.

LEENỤ VIDIO BỤ́ NDỊ ỌZỤZỤ ATỤRỤ NA-ELEKỌTA ATỤRỤ, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Olee otú aka ndị okenye nyeere Mariana si baara ya uru?

  • Olee otú aka ndị okenye nyeere Elias si baara ya uru?

  • Olee otú ihe ụmụnna ndị a kọrọ si mee ka ị na-ele ọrụ ndị okenye na-arụ anya?