Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Jiri Ihe Ndị Na-agba n’Isimbido JW.ORG Na-ekwusa Ozi Ọma

Jiri Ihe Ndị Na-agba n’Isimbido JW.ORG Na-ekwusa Ozi Ọma

N’isimbido ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet, e nwere isiokwu na vidio dị iche iche na-amasị ndị obi ha dị ọcha na-abụghị Ndịàmà Jehova. (Ọrụ 13:48) Ihe isiokwu ndị ahụ na vidio ndị ahụ na-ekwu bụ ihe ndị gbara n’akụkọ ụwa ma ọ bụ okwu ndị mmadụ kpụ n’ọnụ.

Olee otú anyị nwere ike isi jiri ihe ndị na-agba n’isimbido jw.org na-ekwusa ozi ọma?

  • Na-aga n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet mgbe niile. Chọpụta isiokwu ndị gbara ọhụrụ n’ebe ahụ, chebakwara ha echiche ka ị mata otú i nwere ike isi jiri ha nyere onye nwere mmasị aka. (Ị chọọ ịhụ ihe ndị ọzọ gbara n’isimbido jw.org n’oge na-adịchabeghị anya, pịa ebe e dere “Hụkwuo Ihe Ndị Ọzọ.”) Ịga n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet ugboro ugboro ga-enyere gị aka inweta ihe ọhụrụ ndị ị ga na-eji ezi ozi ọma.

  • Jiri isiokwu na vidio ndị na-agba n’isimbido jw.org na-amalite mkparịta ụka. Ihe e kwuru n’ebe ndị a nwere ike ime ka anyị mata okwu ndị mmadụ kpụ n’ọnụ n’ókèala anyị.

  • Gosi ndị mmadụ ihe ndị gbara n’isimbido jw.org. Kwuo gbasara isiokwu ụfọdụ gbara na ya, gosikwa ha otú ha ga-esi hụ ihe ndị ọzọ dị na jw.org.

  • Na-ezigara ndị ọzọ ihe ga-ebuga ha na jw.org. Ụfọdụ ndị anaghị achọ ka anyị na ha na-ekwu okwu ihu na ihu, mana ọ na-amasị ha ịga n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet. N’ihi ya, na-ezigara ndị nwere mmasị ihe ga-ebuga ha n’isimbido jw.org ma ọ bụkwanụ n’otu isiokwu ma ọ bụ vidio gbara n’ebe ahụ.