Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Ịhụnanya Chineke Pụrụ Iche Na-echebe Anyị Ka Ụgha Setan Ghara Imegharị Anyị Anya

Ịhụnanya Chineke Pụrụ Iche Na-echebe Anyị Ka Ụgha Setan Ghara Imegharị Anyị Anya

Setan chọrọ ka ndị mmadụ kwere na ọ bụ Jehova na-akpata ihe ọjọọ ndị na-eme (Job 8:4)

Ọ chọrọ ka anyị chee na Jehova achọghị ịma ma ànyị na-erubere ya isi ma ọ bụ na anyị anaghị erubere ya isi (Job 9:20-22; w15 7/1 12 ¶3)

Ịhụnanya Jehova pụrụ iche na-enyere anyị aka ka Setan ghara iji ụgha ya ghọgbuo anyị, ọ na-enyekwara anyị aka ịkwụsi ike n’ebe Jehova nọ (Job 10:12; Ọma 32:7, 10; w21.11 6 ¶14)

MEGODỊ IHE A: Iji mee ka okwukwe gị sie ike mgbe ọnwụnwa bịaara gị, gbalịa chọpụta ụzọ dị iche iche Jehova si na-egosi gị ịhụnanya ya pụrụ iche, deekwa ha edee ma na-eleba ha anya ugboro ugboro.