Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Nyere Ndị Na-enweghị Mmasị n’Okpukpe Aka Ka Ha Mata Onye Kere Ha

Nyere Ndị Na-enweghị Mmasị n’Okpukpe Aka Ka Ha Mata Onye Kere Ha

È nwere mgbe ị na-ahapụ izi ndị na-enweghị mmasị n’okpukpe ozi ọma, na-eche na o nwere ike ha agaghị ege ntị? Ọ bụrụ otú ahụ, cheta na e nwere ọtụtụ ndị na-enweghị mmasị n’okpukpe nakwa ndị na-ekweghị na Chineke dị bụ́ Ndịàmà Jehova ugbu a. Ọtụtụ mgbe, naanị ihe dị mkpa bụ inyere ha aka ka ha leba anya n’ihe ndị gosiri na Chineke dị adị.—Rom 1:20; 10:14.

LEENỤ VIDIO BỤ́ CHETA NA NDỊ NA-ENWEGHỊ OKWUKWE NWERE IKE IMECHA NWEE OKWUKWE—NDỊ NA-ENWEGHỊ OKPUKPE HA NỌ NA YA, ZAAKWANỤ AJỤJỤ A:

Olee otú akụkọ Tommaso si nyere gị aka ịghọta na i kwesịrị ịna-ezi ndị na-enweghị mmasị n’okpukpe ozi ọma?