Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 2

Ị Ga-enyeliri Ndị Ọzọ Aka, Mee Ka Ha Dị Ike

Ị Ga-enyeliri Ndị Ọzọ Aka, Mee Ka Ha Dị Ike

“Ndị a bụ ndị ọrụ ibe m maka alaeze Chineke, ndị a aghọwokwa ndị na-enyere m aka, na-eme ka m dị ike.”—KỌL. 4:11.

ABỤ NKE 90 Ka Anyị Na-agbarịta Ibe Anyị Ume

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Olee nsogbu ndị na-agbawa obi na-abịara ọtụtụ ndị na-efe Jehova?

N’ỤWA niile, nsogbu na-abịara ọtụtụ ndị na-efe Jehova. Ụfọdụ nsogbu ndị ahụ na-ekowe mmadụ obi n’elu ma ọ bụdị na-agbawa obi. Ị̀ chọpụtala ya n’ọgbakọ unu? Ụfọdụ Ndị Kraịst na-arịa ezigbo ọrịa ma ọ bụkwanụ, ya abụrụ na ọnwụ egbuola onye nke ha. E nwere ndị obi na-agbawa maka na onye ezinụlọ ha ma ọ bụ ezigbo enyi ha hapụrụ ọgbakọ. E nwekwara ndị ọdachi na-emere onwe ya na-echi ọnụ n’ala. E kwesịrị ịna-enyere ndị a niile aka. Olee otú anyị ga-esi nyere ha aka?

2. Gịnị mere o ji dị mkpa mgbe ụfọdụ ka a gbaa Pọl onyeozi ume?

2 Ọtụtụ mgbe, e nwere nsogbu ndị chọrọ ịta isi Pọl onyeozi. (2 Kọr. 11:23-28) Ọ nọkwa na-edi ‘ogwu dị ya n’anụ ahụ́,’ nke nwere ike ịbụ ọrịa ọ na-arịa. (2 Kọr. 12:7) O nwekwara mgbe Dimas ya na ya rụkọrọ ọrụ hapụrụ ya “n’ihi na [Dimas] hụrụ usoro ihe dị ugbu a n’anya.” (2 Tim. 4:10) Pọl bụ Onye Kraịst e tere mmanụ nwere obi ike. O jikwa obi ya niile nyere ndị ọzọ aka. Ma, e nwere mgbe ụfọdụ obi dara ya mbà.—Rom 9:1, 2.

3. Ole ndị gbara Pọl ume ma nyere ya aka?

3 A gbara Pọl ume ma nyere ya ezigbo aka. Olee otú e si mee ya? Jehova ji mmụọ nsọ ya mee ka Pọl dị ike. (2 Kọr. 4:7; Fil. 4:13) Jehova sikwa n’aka Ndị Kraịst ndị ọzọ nyere Pọl aka. Pọl kwuru na ụfọdụ n’ime ndị ha na ya rụkọrọ ọrụ ‘nyeere ya aka, meekwa ka ọ dị ike.’ (Kọl. 4:11) Ụfọdụ ndị ọ kpọrọ aha nyeere ya aka bụ Arịstakọs, Tikikọs, na Mak. Ha mere ka Pọl dị ike, nyekwara ya aka idi nsogbu ndị bịaara ya. Olee ihe nyeere ụmụnna atọ ndị a aka ịgba Pọl ume? Olee otú anyị ga-esi mee ka ha mgbe anyị na-agbalị ịna-enyere ụmụnna anyị aka ma na-agba ha ume?

BỤRỤ EZIGBO ENYI KA ARỊSTAKỌS

Anyị nwere ike ịbụ ezigbo enyi ka Arịstakọs ma ọ bụrụ na anyị anọrọ ụmụnna anyị nso ‘n’oge nsogbu’ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 4 na nke 5) *

4. Olee otú Arịstakọs si gosi na ya bụ ezigbo enyi Pọl?

4 Arịstakọs bụ Onye Kraịst si na Tesalonaịka, bụ́ obodo dị na Masedonia. Ọ bụ ezigbo enyi Pọl. Mgbe mbụ a kpọrọ aha Arịstakọs na Baịbụl bụ mgbe Pọl gara Efesọs, na nke ugboro atọ ọ gara ikwusa ozi ọma ná mba ọzọ. Ìgwè mmadụ ji iwe dọkpụrụ ya mgbe ya na Pọl so. (Ọrụ 19:29) Mgbe ha mechara hapụ ya, ọ gbaghị ọsọ iji zọwa isi onwe ya. Kama, o ji obi ya niile nọrọ ebe Pọl nọ. Mgbe ọnwa ole na ole gara, Arịstakọs ka sokwa Pọl nọrọ na Gris n’agbanyeghị na ndị mmegide ka nọkwa na-achọ igbu Pọl. (Ọrụ 20:2-4) N’ihe dị ka afọ 58, mgbe Pọl bụ onye mkpọrọ a kpọ na-aga Rom, Arịstakọs so ya gaa ebe ahụ dị ezigbo anya. Ha abụọ sokwa mgbe ụgbọ mmiri ha kpuru n’ụzọ. (Ọrụ 27:1, 2, 41) Ọ dị ka ò so Pọl nọtụ n’ụlọ mkpọrọ mgbe ha ruru Rom. (Kọl. 4:10) Ka a sịkwa ihe mere obi ji sie Pọl ike n’ihi otú Arịstakọs si nọnyere ya.

5. Dị ka e kwuru n’Ilu 17:17, olee otú anyị ga-esi bụụrụ ụmụnna anyị ezigbo enyi?

5 Anyị ga-abụli ezigbo enyi ụmụnna anyị otú ahụ Arịstakọs mere. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịna-anọnyere ha ma n’oge ihe dị mma ma ‘n’oge nsogbu.’ (Gụọ Ilu 17:17.) O nwere ike ịdị mkpa ka anyị na-enyere nwanna aka mgbe nsogbu bịaara ya kwụsịchara. E nwere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Frances. * Ọrịa kansa gburu nne ya na nna ya n’ime ọnwa atọ. Ọ sịrị: “Achọpụtala m na nsogbu tara akpụ na-akpa mmadụ aka ọjọọ ruo ogologo oge. Obi dị m ụtọ maka aka ezigbo ndị enyi anyị nyeere anyị n’ihi na ha echefughị na ọnwụ nne na nna anyị ka ga na-enye anyị nsogbu n’agbanyeghị na o teela o mere.”

6. Gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị bụ ezigbo enyi?

6 Ezigbo ndị enyi na-ahapụ ihe ụfọdụ dị ha mkpa iji nyere ụmụnna ha aka. Dị ka ihe atụ, a chọpụtara na otu nwanna aha ya bụ Peter na-arịa ọrịa jọgburu onwe ya, nke ga-emecha gbuo ya. Nwunye ya Kathryn sịrị: “Otu nwanna na nwunye ya, bụ́ ndị ọgbakọ anyị, kpọgara anyị ebe a chọpụtara ihe gbasara ọrịa di m. Ozugbo ahụ ka ha kpebiri na ha ga na-enyere anyị aka ka anyị nwee ike idi nsogbu ahụ. Ha ahapụbeghị anyị kemgbe ahụ.” Obi na-esi anyị ike ma anyị nwee ezigbo ndị enyi ga-enyere anyị aka ịtachi obi mgbe anyị nọ ná nsogbu.

KWESỊ NTỤKWASỊ OBI KA TIKIKỌS

Anyị nwere ike ịbụ enyi kwesịrị ntụkwasị obi ka Tikikọs mgbe nsogbu bịaara ndị ọzọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7 ruo na nke 9) *

7-8. Dị ka e kwuru ná Ndị Kọlọsi 4:7-9, olee otú Tikikọs si gosi na o kwesịrị ntụkwasị obi?

7 Tikikọs bụ Onye Kraịst si n’ógbè Eshia nke ndị Rom chịrị n’oge ochie. Ọ bụ enyi Pọl tụkwasịrị obi. (Ọrụ 20:4) N’ihe dị ka afọ 55, Pọl haziri ka ọgbakọ dị iche iche wekọta ego a ga-eji nyere Ndị Kraịst nọ na Judia aka. Ọ ga-abụ na o nyere Tikikọs ọrụ ahụ dị mkpa ka ọ rụọ. (2 Kọr. 8:18-20) Mgbe e mechara tụọ Pọl mkpọrọ nke mbụ ya na Rom, ọ bụ Tikikọs nọ na-ejere ya ozi. Ọ bụ ya gara nye ọgbakọ ndị dị n’Eshia akwụkwọ ozi Pọl degaara ha, ziekwa ha ozi na-agba ume Pọl ziri ha.—Kọl. 4:7-9.

8 Tikikọs akwụsịghị ịbụ enyi Pọl tụkwasịrị obi. (Taị. 3:12) Ọ bụghị Ndị Kraịst niile e nwere n’oge ahụ kwesịrị ntụkwasị obi ka Tikikọs. N’ihe dị ka afọ 65, mgbe a tụrụ Pọl mkpọrọ nke ugboro abụọ, o kwuru na ọtụtụ ụmụnna nọ n’ógbè Eshia gbakụtara ya azụ. O nwere ike ịbụ n’ihi na ha na-atụ ụjọ ndị mmegide. (2 Tim. 1:15) Ma, Tikikọs emeghị ka ha. Ọ bụ ya mere Pọl ji tụkwasị ya obi, nyekwa ya ọrụ ọzọ ọ ga-arụ. (2 Tim. 4:12) O doro anya na obi dị Pọl ụtọ na o nwere ezigbo enyi dị ka Tikikọs.

9. Olee otú anyị nwere ike isi mee ka Tikikọs?

9 Anyị nwere ike ịbụ enyi kwesịrị ntụkwasị obi ka Tikikọs. Dị ka ihe atụ, ihe anyị na-eme abụghị naanị ikwe ụmụnna anyị ihe siiri ike nkwa na anyị ga-enyere ha aka, kama anyị na-enyere ha aka. (Mat. 5:37; Luk 16:10) Ọ bụrụ na ndị nwere nsogbu amara na anyị ga-enyere ha aka, ọ ga-akasi ha ezigbo obi. Otu nwanna nwaanyị kwuru ihe kpatara ya. Ọ sịrị: “Ị gaghị echegbuwe onwe gị ma onye sịrị na ya ga-enyere gị aka ọ̀ ga-emekwa ihe o kwuru mgbe o kwesịrị ime ya.”

10. Dị ka e kwuru n’Ilu 18:24, olee ndị nwere ike inyere ndị nsogbu bịaara aka?

10 Ọ bụrụ na nsogbu abịara mmadụ, obi ga-adịtụ ya mma ma ọ kọọrọ ya enyi ọ tụkwasịrị obi. (Gụọ Ilu 18:24.) Obi gbawara otu nwanna aha ya bụ Bijay mgbe a chụrụ nwa ya nwoke n’ọgbakọ. O kwuru, sị: “M chọrọ onye m ga-atụkwasịli obi m ga-akọrọ otú obi dị m.” A kwụsịrị otu nwanna aha ya bụ Carlos ọrụ na-atọ ya ụtọ ọ na-arụ n’ọgbakọ n’ihi na o mere ihe na-adịghị mma. O kwuru, sị: “Ihe dị m mkpa n’oge ahụ bụ ndị m ga-akọrọ otú obi dị m n’atụghị ụjọ na ha ga-akatọwa m.” Carlos mechara kọọrọ ndị okenye otú obi dị ya. Ha nyekwaara ya aka imeri nsogbu ahụ. Ihe ọzọ mere ka obi ruo ya ala bụ na ọ ma na ndị okenye agaghị agwa ndị ọzọ ihe ọ gwara ha.

11. Olee otú anyị nwere ike isi bụrụ ezigbo enyi ndị ọzọ ga-atụkwasịli obi?

11 Ị chọọ ịbụ ezigbo enyi ndị ọzọ ga-atụkwasịli obi, ị ga-amụta ịna-enwe ndidi. Mgbe di otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Zhanna hapụrụ ya kwaga ebe ọzọ, o nwetatụrụ onwe ya mgbe ọ kọọrọ ezigbo ndị enyi ya otú obi dị ya. O kwuru, sị: “Ha gere m ntị nke ọma n’agbanyeghị na ọ dị ka m̀ nọ na-ekwughachi otu ihe ọtụtụ ugboro.” Ị ga-abụkwa ezigbo enyi ma ọ bụrụ na ị na-ege ndị mmadụ ntị nke ọma.

DỊRỊ NJIKERE IJERE NDỊ ỌZỌ OZI KA MAK

Pọl tachiri obi maka otú Mak si jiri obiọma nyere ya aka. Anyị nwekwara ike inyere ụmụnna anyị aka mgbe ọdachi dakwasịrị ha (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12 ruo na nke 14) *

12. Ònye bụ Mak? Oleekwa otú o si gosi na ọ dị njikere ijere ndị ọzọ ozi?

12 Mak bụ Onye Kraịst si Jeruselem. Banabas bụ́ onye ikwu ya bụ onye ozi ala ọzọ a ma ama. (Kọl. 4:10) O yiri ka ndị ezinụlọ Mak hà bụ aka ji akụ̀. Ma, ịchụwa akụnụba abụghị ihe kacha Mak mkpa ná ndụ. Ná ndụ ya niile, ọ dị njikere ijere ndị ọzọ ozi. Ọ na-atọkwa ya ụtọ. Dị ka ihe atụ, ya na Pọl onyeozi na Pita onyeozi jekọrọ ozi ọtụtụ ugboro. O nwere ike ịbụ Mak na-azụtara ha nri, na-achọtara ha ebe ha ga-ebi, na-emekwara ha ihe ndị ọzọ. (Ọrụ 13:2-5; 1 Pita 5:13) Pọl kwuru na Mak so ná ‘ndị ọrụ ibe ya maka alaeze Chineke,’ bụrụkwa onye ‘na-eme ka ọ dị ike.’—Kọl. 4:10, 11.

13. Olee otú 2 Timoti 4:11 si gosi na obi dị Pọl ụtọ maka ozi Mak ji obi ya niile jee?

13 Mak so ná ndị bụ́ ezigbo enyi Pọl. Dị ka ihe atụ, mgbe a tụrụ Pọl mkpọrọ nke ikpeazụ ya na Rom, n’ihe dị ka afọ 65, o dere akwụkwọ Timoti nke Abụọ. N’akwụkwọ ozi ahụ, Pọl gwara Timoti ka ọ bịa Rom, gwakwa ya ka ọ kpọrọ Mak ma ọ bịawa. (2 Tim. 4:11) O doro anya na obi dị Pọl ụtọ maka ozi Mak ji obi ya niile jee n’oge gara aga. Ọ bụ ya mere o ji sị ka a kpọtara ya Mak n’oge ahụ dị ezigbo mkpa. Mak nyeere Pọl aka, na-emere ya ihe ụfọdụ, ikekwe na-ewetara ya nri ma ọ bụ ihe ndị o ji ede akwụkwọ ozi ya. O nwere ike ịbụ na otú ahụ Mak si kwado ya ma gbaa ya ume nyeere ya aka ịtachi obi n’ụbọchị ole na ole fọrọnụ tupu e gbuo ya.

14-15. Gịnị ka Matiu 7:12 na-akụziri anyị gbasara inyere ndị ọzọ aka?

14 Gụọ Matiu 7:12. Nsogbu bịara anyị, obi na-adị anyị ụtọ ma ndị ọzọ nyere anyị aka. Otu nwanna aha ya bụ Ryan papa ya nwụrụ n’ihe mberede sịrị: “Mmadụ ruwe uju, e nwere ọtụtụ ihe onye ahụ na-emebu mgbe niile ga-adịzi ya ka ọ gaghị emeli ha. Ihe ọ bụla e meere onye ahụ ga-abara ya ezigbo uru, ọ bụrụgodị obere ihe.”

15 Ọ bụrụ na anya ruru anyị ala, anyị nwere ike ịmata otú anyị ga-esi nyere ndị ọzọ aka. Dị ka ihe atụ, ọ̀ kwa i chetara Nwanna Peter na Kathryn nwunye ya anyị kwuburu okwu ha? Otu nwanna nwaanyị ji aka ya kpebie inyere ha aka ịga ụlọ ọgwụ mgbe ọ bụla a sịrị ha bịa. Ha anaghịzi anyali ụgbọala. N’ihi ya, nwanna nwaanyị ahụ depụtara ihe nyeere ndị ọgbakọ ha wepụtara onwe ha aka ịna-ebu nwanna ahụ na nwunye ya. Ihe a o mere ò nyeere ha aka? Nwanna Nwaanyị Kathryn kwuru, sị: “Ọ dị anyị nnọọ ka è bupụrụ ibu na-anyịgbu anyị.” Echefukwala na obere ihe ọ bụla i mere iji nyere ndị mmadụ aka nwere ike ịgba ha ezigbo ume.

16. Olee ihe bara uru anyị ga-amụta n’aka Mak banyere inyere ndị ọzọ aka?

16 O doro anya na Mak bụ Onye Kraịst na-arụsi ọrụ ike. Ọ rụrụ ọrụ ndị dị mkpa n’ozi Jehova, deekwa Oziọma Mak. N’agbanyeghị ya, o wepụtara oge ya mee ihe ndị gbara Pọl ume, nke mere Pọl ji jiri obi ya niile kpọọ ya ka ọ bịa nyere ya aka. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Angela, onye e gburu nne nne ya, nwere obi ụtọ maka otú ụmụnna si kasie ya obi mgbe ahụ. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na ndị enyi gị ejiri obi ha chọọ inyere gị aka, ha na-adị njikere ige ntị. Ha anaghịkwa egbu oge inyere gị aka.” Anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị: ‘Àma m ka onye na-adị njikere inyere ụmụnna m aka?’

KPEBISIE IKE ỊNA-ENYERE NDỊ ỌZỌ AKA

17. Olee otú ịtụgharị uche n’ihe e kwuru ná 2 Ndị Kọrịnt 1:3, 4 nwere ike isi mee ka anyị na-akasi ndị ọzọ obi?

17 Ọ dị mfe ịhụ ụmụnna ndị chọrọ ka e nyere ha aka. Anyị nwedịrị ike iji okwu ndị ọzọ ji gbaa anyị ume gbaa mmadụ ume. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Nino nne nne ya nwụrụ kwuru, sị: “Jehova nwere ike iji anyị kasie ndị ọzọ obi ma ọ bụrụ na anyị ekwe ka o jiri anyị mee otú ahụ.” (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 1:3, 4.) Nwanna Nwaanyị Frances anyị kwuburu okwu ya sịrị: “Ihe 2 Ndị Kọrịnt 1:4 kwuru bụ eziokwu. Anyị nwere ike iji ihe e ji kasie anyị obi kasie ndị ọzọ obi.”

18. (a) Gịnị mere ụfọdụ ndị ji atụ ụjọ ịkasi ndị ọzọ obi? (b) Olee otú anyị nwere ike isi kasie ndị ọzọ obi nke ọma? Nye ihe atụ.

18 Anyị kwesịrị ịchọ otú anyị ga-esi nyere ndị ọzọ aka, ọ bụrụgodị na ụjọ na-atụ anyị. Dị ka ihe atụ, ụjọ anyị nwere ike ịbụ na anyị amaghị ihe anyị ga-ekwu ma ọ bụ ihe anyị ga-eme ma e nwee onye e kwesịrị ịkasi obi. Otu okenye aha ya bụ Paul chetara mbọ ụfọdụ ndị gbara mgbe nna ya nwụrụ. Ọ sịrị: “Achọpụtara m na ọ dịghịrị ha mfe ịbịakwute m. Ha amaghị ihe ha ga-agwa m agwa. Ma, obi dị m ụtọ na ha chọrọ ịkasi m obi ma kwado m.” Otu nwanna aha ya bụ Tajon kwuru ihe yiri ya mgbe nnukwu ala ọma jijiji mechara. Ọ sịrị: “Anaghị m echeta ozi niile ndị mmadụ ziteere m mgbe ala ọma jijiji ahụ mechara. Ma, m na-echeta na ozi ndị ahụ gosiri na ihe gbasara m na-emetụ ha n’obi.” Anyị ga na-akasi ndị ọzọ obi nke ọma ma ọ bụrụ na anyị ana-egosi na ha dị anyị n’obi.

19. Gịnị mere i ji kpebisie ike ‘ịna-enyere ndị ọzọ aka, mee ka ha dị ike’?

19 Ka anyị na-eru n’ọgwụgwụ ụwa ochie a, nsogbu ụwa ga na-aka njọ, ihe ana-esikwukwa ike. (2 Tim. 3:13) Nsogbu ndị anyị na-ekotere onwe anyị n’ihi mmehie na ezughị okè anyị ketara ga-eme ka anyị na-achọ ka a kasie anyị obi. Pọl onyeozi tachiri obi ruo mgbe ọ nwụrụ. Ihe so nyere ya aka bụ otú Ndị Kraịst ibe ya si na-agba ya ume. Ka anyị bụrụ ezigbo enyi ka Arịstakọs, kwesị ntụkwasị obi ka Tikikọs, dịkwa njikere ijere ndị ọzọ ozi ka Mak. Anyị mee otú ahụ, anyị nwere ike inyere ụmụnna anyị aka ka okwukwe ha sie ike.—1 Tesa. 3:2, 3.

^ par. 5 Ọtụtụ nsogbu bịaara Pọl onyeozi ná ndụ ya. N’oge ihe siiri ya ike, ụfọdụ ụmụnna nyeere ya ezigbo aka. Anyị ga-achọpụta ihe atọ mere ụmụnna ndị a ji na-eme nke ọma n’inyere ndị ọzọ aka. Anyị ga-amatakwa ihe ndị anyị ga na-eme iji na-enyere ndị ọzọ aka otú ahụ ha mere.

^ par. 5 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

ABỤ NKE 111 Ihe Mere Anyị Ji Enwe Ọṅụ

^ par. 56 NKỌWA FOTO: Ebe ụgbọ mmiri Pọl na Arịstakọs hà kpuru.

^ par. 58 NKỌWA FOTO: Ebe Pọl nyere Tikikọs akwụkwọ ozi ndị ọ ga-enye ọgbakọ dị iche iche.

^ par. 60 NKỌWA FOTO: Ebe Mak na-enye Pọl ihe o wetaara ya.