Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 5

Anyị Ga-eso Unu

Anyị Ga-eso Unu

“Anyị ga-eso unu, n’ihi na anyị anụwo na Chineke nọnyeere unu.”—ZEK. 8:23.

ABỤ NKE 26 Unu Meere M Ya

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

Obi dị ndị so n’atụrụ ọzọ, ya bụ, “ndị ikom iri” ahụ, ụtọ na ha so ndị e tere mmanụ, ya bụ, “onye Juu,” na-efe Jehova (A ga-akọwa ya na paragraf nke 1 na nke 2)

1. Olee ihe Jehova kwuru ga-eme n’oge anyị a?

JEHOVA kwuru gbasara oge anyị a, sị: “Ndị ikom iri ndị si n’asụsụ niile nke mba dị iche iche ga-ejide, ee, ha ga-ejide uwe mwụda nke nwoke bụ́ onye Juu, sị, ‘Anyị ga-eso unu, n’ihi na anyị anụwo na Chineke nọnyeere unu.’” (Zek. 8:23) “Onye Juu” ahụ amaokwu a kwuru okwu ya bụ ndị Chineke ji mmụọ nsọ tee mmanụ. Baịbụl kpọkwara ha “Izrel nke Chineke.” (Gal. 6:16) “Ndị ikom iri” ahụ bụ ndị nwere olileanya ibi n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi. Ha ma na Jehova ahọrọla ndị a e tere mmanụ. Obi dịkwa ha ezigbo ụtọ iso ha na-efe ya.

2. Olee otú “ndị ikom iri” ahụ si ‘eso’ ndị e tere mmanụ?

2 Ọ bụ eziokwu na anyị agaghị amatali aha onye nke ọ bụla so ná ndị e tere mmanụ n’ụwa taa, * ndị nwere olileanya ibi n’ụwa ‘ga-esoli’ ndị a e tere mmanụ. Olee otú ha ga-esi eme ya? Baịbụl kwuru na “ndị ikom iri” ahụ “ga-ejide uwe mwụda nke nwoke bụ́ onye Juu, sị, ‘Anyị ga-eso unu, n’ihi na anyị anụwo na Chineke nọnyeere unu.’” Amaokwu ahụ kwuru banyere otu onye Juu. Ma, “unu” o kwuru gosiri na ọ naghị ekwu banyere naanị otu onye. Ọ pụtara na onye Juu ahụ abụghị otu onye, kama ọ nọchiri anya ndị niile e tere mmanụ. Ndị so n’atụrụ ọzọ so ndị e tere mmanụ na-efe Jehova. Ma, ha anaghị ele ndị e tere mmanụ anya ka ndị ndú, ebe ha ma na ọ bụ Jizọs bụ Onye Ndú anyị.—Mat. 23:10.

3. Olee ajụjụ ndị a ga-aza n’isiokwu a?

3 Ebe ọ bụ na a ka nwere ụfọdụ ndị Chineke taa e tere mmanụ, ụfọdụ nwere ike ịna-eche: (1) Olee otú ndị e tere mmanụ kwesịrị isi na-ele onwe ha anya? (2) Olee otú anyị kwesịrị isi na-emeso ndị na-ata achịcha e ji eme Ncheta Ọnwụ Jizọs? (3) Ọ bụrụ na mmadụ ole sịrị na ha bụ ndị e tere mmanụ na-ebukwu ibu, ò kwesịrị ịna-echu anyị ụra? A ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu a.

OLEE OTÚ NDỊ E TERE MMANỤ KWESỊRỊ ISI NA-ELE ONWE HA ANYA?

4. Olee ndụmọdụ dị ná 1 Ndị Kọrịnt 11:27-29 ndị e tere mmanụ kwesịrị ichebasiri echiche ike? N’ihi gịnị?

Ndị e tere mmanụ kwesịrị ichesi echiche ike banyere ndụmọdụ dị ná 1 Ndị Kọrịnt 11:27-29. (Gụọ ya.) Olee otú onye e tere mmanụ nwere ike isi taa achịcha e ji eme Ncheta Ọnwụ Jizọs “n’erughị eru”? Ọ bụ ịta achịcha ahụ na ịṅụ mmanya ahụ ma na-enupụrụ iwu Jehova isi. (Hib. 6:4-6; 10:26-29) Ndị e tere mmanụ na-echeta na ha kwesịrị ịna-erubere Jehova isi ma ọ bụrụ na ha chọrọ ‘inweta ihe a na-agbata n’ọsọ, bụ́ òkù a kpọrọ ha ịga eluigwe, nke Chineke kpọrọ site n’aka Kraịst Jizọs.’—Fil. 3:13-16.

5. Olee otú ndị e tere mmanụ kwesịrị isi na-ele onwe ha anya?

5 Mmụọ nsọ Jehova na-enyere ndị ohu ya aka ịdị umeala n’obi, ọ bụghị ịdị mpako. (Efe. 4:1-3; Kọl. 3:10, 12) N’ihi ya, ndị e tere mmanụ anaghị eche na ha ka ndị ọzọ mma. Ha ma na ịbụ ndị e tere mmanụ apụtaghị na Jehova na-enye ha mmụọ nsọ karịrị nke ọ na-enye ndị ohu ya ndị ọzọ. Ha anaghị eche na ha na-aghọta eziokwu Baịbụl karịa onye ọ bụla ọzọ. Ha agaghịkwa agwa onye ọzọ na Chineke eteela ya mmanụ nakwa na o kwesịrị ịtawa achịcha na ịṅụ mmanya e ji eme Ncheta Ọnwụ Jizọs. Kama ime otú ahụ, ha na-adị umeala n’obi, marakwa na ọ bụ naanị Jehova na-ahọrọ ndị ga-aga eluigwe.

6. Dị ka e kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 4:7, 8, olee otú ndị e tere mmanụ kwesịrị isi na-akpa àgwà?

6 Ọ bụ eziokwu na ndị e tere mmanụ ghọtara na ọ bụ ihe ọma ka Chineke meere ha họrọ ha ịga eluigwe, ha anaghị atụ anya ka ndị ọzọ na-akwanyere ha ùgwù pụrụ iche. (Fil. 2:2, 3) Ha makwa na mgbe Jehova tere ha mmanụ, ọ maaraghị ya ụwa niile n’ọkwa. N’ihi ya, ọ gaghị eju onye e tere mmanụ anya ma ọ bụrụ na ụfọdụ ndị ekwetaghị ozugbo na ọ bụ onye e tere mmanụ. Ọ ma na Baịbụl gwara anyị na mmadụ kwuo na Chineke enyela ya ọrụ pụrụ iche, anyị ekwesịghị ikweta ngwa ngwa. (Mkpu. 2:2) Ebe ọ bụ na onye e tere mmanụ anaghị atụ anya ka ndị ọzọ na-akwanyere ya ùgwù pụrụ iche, ọ gaghị na-eme, ya hụhaala mmadụ, ya asị onye ahụ na ya bụ onye e tere mmanụ. Ọ gaghị eji ihe o nwere olileanya ime n’eluigwe na-etu ọnụ.—Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 4:7, 8.

7. Olee ihe ndị e tere mmanụ na-ekwesịghị ịna-eme? N’ihi gịnị?

Ndị e tere mmanụ anaghị eche na ọ bụ naanị ndị ọzọ e tere mmanụ ka ha na ha ga na-anọrị, ya adịzie ka hà nọ n’òtù. Ha anaghị achọwa ndị ọzọ sịrị na ha bụ ndị e tere mmanụ ka ha na ha kwuwe gbasara ịbụ ndị e tere mmanụ ma ọ bụ zukọwa na-amụ Baịbụl. (Gal. 1:15-17) Ọgbakọ agaghị adị n’otu ma ọ bụrụ na ha ana-eme otú ahụ. Ime otú ahụ ga-egosi na ha na-alụso mmụọ nsọ ọgụ. Ọ bụ mmụọ nsọ ka Chineke ji enyere ndị ya aka inwe udo ma dịrị n’otu.—Rom 16:17, 18.

OLEE OTÚ ANYỊ KWESỊRỊ ISI NA-EMESO NDỊ E TERE MMANỤ?

Anyị ekwesịghị ịna-eme ndị e tere mmanụ ma ọ bụ ndị ọzọ Jehova ji na-eduzi ọgbakọ ya ka ndị a ma ama n’ụwa (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8) *

8. Gịnị mere i ji kwesị ịkpachara anya n’otú i si emeso ndị na-ata achịcha e ji eme Ncheta Ọnwụ Jizọs? (Kwuo ihe dị n’ala ala peeji.)

8 Olee otú anyị kwesịrị isi na-emeso ụmụnna bụ́ ndị e tere mmanụ? Ọ gaghị adị mma ka anyị na-ebuli nwanna elu, ọ bụrụgodị onye e tere mmanụ. (Mat. 23:8-12) Mgbe Baịbụl kwuru banyere ndị okenye, ọ gwara anyị ka anyị ‘na-eṅomi okwukwe ha.’ Ma, ọ gwaghị anyị na anyị nwere ike ime mmadụ ọ bụla onye ndú anyị. (Hib. 13:7) Ọ bụ eziokwu na Baịbụl kwuru na e kwesịrị inye ụfọdụ ndị “nsọpụrụ okpukpu abụọ.” Ma, ọ bụ n’ihi na ha “na-arụ ọrụ nlekọta” ha nke ọma, ‘na-arụsikwa ọrụ ike n’ikwu okwu na izi ihe,’ ọ bụghị n’ihi na ha bụ ndị e tere mmanụ. (1 Tim. 5:17) Ọ bụrụ na anyị na-enye ndị e tere mmanụ otuto na nsọpụrụ pụrụ iche, anyị nwere ike ime ka ihere mewe ha. * Nke kadị njọ bụ na o nwere ike ime ka ha dịzie mpako. (Rom 12:3) O nweghị onye n’ime anyị ga-achọ ime ihe ọ bụla nwere ike ime ka otu n’ime ụmụnna Kraịst e tere mmanụ kpawa ụdị àgwà ọjọọ ahụ.—Luk 17:2.

9. Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị na-akwanyere Ndị Kraịst e tere mmanụ ùgwù?

9 Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị na-akwanyere ndị Jehova tere mmanụ ùgwù? Anyị agaghị ajụwa ha otú ha si ghọọ ndị e tere mmanụ. Ọ bụ naanị ha ka ọ gbasara. N’ihi ya, anyị agaghị etinyewe ọnụ n’ihe na-agbasaghị anyị. (1 Tesa. 4:11; 2 Tesa. 3:11) Anyị ekwesịghịkwa iche na di ha ma ọ bụ nwunye ha, papa ha na mama ha, ma ọ bụ ndị ezinụlọ ha ndị ọzọ bụkwa ndị e tere mmanụ. Mmadụ anaghị esi n’ezinụlọ ya keta olileanya ya. Ọ bụ Jehova na-ete mmadụ mmanụ. (1 Tesa. 2:12) Anyị ekwesịghịkwa ịjụwa ajụjụ nwere ike iwute ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, anyị ekwesịghị ịjụwa nwanna nwaanyị di ya bụ́ onye e tere mmanụ otú obi na-adị ya maka na di ya agaghị eso ya dịrị ndụ ebighị ebi n’ụwa. A sị ka e kwuwe, obi kwesịrị isi anyị ike na n’ụwa ọhụrụ, Jehova ‘ga-ewere ihe na-agụ ihe ọ bụla dị ndụ nyejuo ya afọ.’—Ọma 145:16.

10. Olee nsogbu anyị ga-agbara ọsọ ma ọ bụrụ na anyị anaghị ‘enwe mmasị n’ihe mmadụ bụ’?

10 Ọ bụrụ na anyị anaghị eme ndị e tere mmanụ ka hà ka ndị ọzọ, ọ ga-eme ka anyị gbaara nsogbu ọsọ. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Baịbụl gwara anyị na ụfọdụ ndị e tere mmanụ nwere ike ịdapụ n’ọgbakọ. (Mat. 25:10-12; 2 Pita 2:20, 21) Ma, ọ bụrụ na anyị anaghị ‘enwe mmasị n’ihe ndị mmadụ bụ,’ anyị agaghị na-eso ndị mmadụ, ọ bụrụgodị ndị e tere mmanụ ma ọ bụ ụmụnna a ma ama ma ọ bụ ndị ferela Jehova ọtụtụ afọ. (Jud 16) Ọ bụrụzie na ha ahapụ ọgbakọ Jehova, okwukwe anyị agaghị anyụ ka ọkụ ma ọ bụ anyị akwụsị ife Jehova.

MMADỤ OLE NA-ATA ACHỊCHA Ò KWESỊRỊ ICHUWE ANYỊ ỤRA?

11. Gịnị ka a chọpụtara gbasara mmadụ ole na-ata achịcha e ji eme Ncheta Ọnwụ Jizọs?

11 Ruo ọtụtụ afọ, mmadụ ole na-ata achịcha e ji eme Ncheta Ọnwụ Jizọs nọ na-agbada agbada. Ma, n’oge na-adịbeghị anya, ha na-agbago kwa afọ. Ò kwesịrị ichuwe anyị ụra? Mba. Ka anyị leba anya n’ihe ndị dị mkpa anyị kwesịrị iburu n’obi.

12. Gịnị mere na mmadụ ole na-ata achịcha e ji eme Ncheta Ọnwụ Jizọs ekwesịghị ịna-echu anyị ụra?

12 “Jehova maara ndị bụ́ ndị ya.” (2 Tim. 2:19) Ndị na-agụkọ mmadụ ole na-ata achịcha e ji eme Ncheta Ọnwụ Jizọs amaghị ndị bụ́ ndị e tere mmanụ n’eziokwu otú Jehova ma. N’ihi ya, ha na-agụnye ndị chere na ha bụ ndị e tere mmanụ, ma ha abụghị. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị na-atabu achịcha mechara kwụsị. Ụfọdụ nwekwara ike ịbụ ndị isi na-akpakọchaghị ọnụ ma ọ bụ ndị nsogbu ọzọ mere ka ha chee na ha ga-eso Kraịst bụrụ eze n’eluigwe. O doro anya na anyị amaghị mmadụ ole n’ime ndị e tere mmanụ fọrọ n’ụwa taa.

13. Baịbụl ò kwuru mmadụ ole bụ́ ndị e tere mmanụ ga-anọ n’ụwa mgbe oké mkpagbu ga-amalite?

13 A ga-enwe ndị e tere mmanụ n’ọtụtụ ebe n’ụwa mgbe Jizọs ga-abịa ịkpọrọ ha gaa eluigwe. (Mat. 24:31) Ihe Baịbụl kwuru gosiri na n’oge ikpeazụ a, a ga-enwe mmadụ ole na ole bụ́ ndị e tere mmanụ fọrọ n’ụwa. (Mkpu. 12:17) Ma o kwughị mmadụ ole n’ime ha ga-afọ n’ụwa mgbe oké mkpagbu ga-amalite.

Olee otú anyị kwesịrị isi na-emeso onye na-ata achịcha e ji eme Ncheta Ọnwụ Jizọs? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14)

14. Dị ka e kwuru ná Ndị Rom 9:11, 16, gịnị ka anyị kwesịrị ịghọta banyere ndị Jehova họọrọ ka ha bụrụ ndị e tere mmanụ?

14 Ọ bụ Jehova na-ekpebi mgbe ọ ga-ahọrọ ndị e tere mmanụ. (Rom 8:28-30) Jehova malitere ịhọrọ ndị e tere mmanụ mgbe ọ kpọlitechara Jizọs n’ọnwụ. O yiri ka ndị niile bụ́ ezigbo Ndị Kraịst n’oge ndịozi Jizọs hà bụ ndị e tere mmanụ. Ruo ọtụtụ narị afọ malite mgbe ahụ, ọtụtụ n’ime ndị nọ na-ekwu na ha na-eso ụzọ Kraịst bụ Ndị Kraịst adịgboroja. Ma n’afọ ndị ahụ, Jehova tere mmadụ ole na ole bụ́ ezigbo Ndị Kraịst mmanụ. Ha yiri ọka wit ahụ Jizọs kwuru ga-eto n’etiti ata. (Mat. 13:24-30) N’oge ikpeazụ a, Jehova ka na-ahọrọ ndị ga-eso n’otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ. * N’ihi ya, ọ bụrụ na Chineke ekpebie ịhọrọ ụfọdụ ndị mgbe ọ fọrọ obere ka e bibie ụwa ochie a, o kwesịghị imewe anyị obi abụọ ma ihe ọ na-eme ọ̀ dịkwa mma. (Gụọ Ndị Rom 9:11, 16.) * Anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara ịkpa àgwà ka ndị ọrụ ahụ Jizọs kwuru gbasara ha n’otu ihe atụ o mere. Ha tamuru ntamu banyere otú nna ha ukwu si meso ndị malitere ịrụ ọrụ n’awa nke ikpeazụ.—Mat. 20:8-15.

15. Ọ̀ bụ ndị niile e tere mmanụ so ‘n’ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche,’ e kwuru okwu ya na Matiu 24:45-47? Kọwaa.

15 Ọ bụghị ndị niile nwere olileanya ịga eluigwe so ‘n’ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche.’ (Gụọ Matiu 24:45-47.) Taa, Jehova na Jizọs si n’aka mmadụ ole na ole na-akụziri ọtụtụ ndị ihe otú ahụ ọ dị n’oge ndịozi Jizọs. Ọ bụ naanị mmadụ ole na ole n’ime Ndị Kraịst e tere mmanụ ka Jehova nyere mmụọ nsọ ide Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Taakwa, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole n’ime Ndị Kraịst e tere mmanụ ka Chineke si n’aka ha na-enye ndị ya ‘nri n’oge kwesịrị ekwesị.’

16. Olee ihe ị mụtara n’isiokwu a?

16 Gịnị ka anyị mụtara n’isiokwu a? Jehova ekpebiela ime ka ọtụtụ ndị ohu ya dịrị ndụ ebighị ebi n’ụwa, meekwa ka mmadụ ole na ole ga-eso Jizọs chịa dịrị ndụ n’eluigwe. Ọ ga-akwụ ndị ohu ya niile ụgwọ ọrụ, ma “onye Juu” ahụ ma “ndị ikom iri” ahụ Zekaraya kwuru banyere ha. Jehova chọrọ ka ha niile na-erubere otu iwu ahụ isi ma jiri obi ha niile na-efe ya. Ha niile kwesịrị ịdị umeala n’obi, jirikwa otu obi na-ejere ya ozi. Ha kwesịkwara ịna-agbalịsi ike ka udo dịrị n’ọgbakọ. Ka ụwa ochie a na-agba egwú ụla, ka anyị niile nọsie ike n’ozi Jehova, bụrụkwa “otu ìgwè atụrụ” na-eso Kraịst.—Jọn 10:16.

^ par. 5 N’afọ a, a ga-eme Ncheta Ọnwụ Jizọs na Tuzdee, abalị asaa n’ọnwa Eprel. Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ndị na-ata achịcha e ji eme Ncheta Ọnwụ Jizọs anya? Ò kwesịrị ịna-echu anyị ụra ma ọ bụrụ na mmadụ ole sịrị na ha bụ ndị e tere mmanụ na-ebukwu ibu? Anyị ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu a. Isiokwu a si na nke gbara n’Ụlọ Nche Jenụwarị 2016.

^ par. 2 Ihe e kwuru n’Abụ Ọma 87:5, 6 gosiri na n’ọdịnihu, Chineke nwere ike ime ka a mata aha ndị niile ha na Jizọs na-achị n’eluigwe.—Rom 8:19.

^ par. 8 Gụọ ihe e kwuru n’igbe bụ́ “Ịhụnanya ‘Adịghị Akpa Àgwà Na-ekwesịghị Ekwesị,’n’Ụlọ Nche Jenụwarị 2016, peeji nke 26.

^ par. 14 Ọ bụ eziokwu na Ọrụ Ndịozi 2:33 kwuru na Jizọs wụpụrụ mmụọ nsọ, ọ bụ Jehova na-ahọrọ onye a ga-ete mmanụ.

^ par. 14 Ị chọọ ịhụ ebe a kọwakwuru ya, gụọ “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ,” n’Ụlọ Nche May 1, 2007.

ABỤ NKE 34 Ekpebiela M Ime Ezi Omume

^ par. 56 NKỌWA FOTO: Ka e were ya na onye na-anọchite anya isi ụlọ ọrụ anyị na nwunye ya bịara mgbakọ ukwu, ndị mmadụ agbaa ha gburugburu, na-azọ onye ga-ebu ụzọ see ha foto. Ọ gaghị egosi na ha na-akwanyere ha ùgwù.