Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NDỤ

Ịmụta Ihe n’Aka Ndị Na-eme nke Ọma Mere Ka Jehova Gọzie M

Ịmụta Ihe n’Aka Ndị Na-eme nke Ọma Mere Ka Jehova Gọzie M

MGBE m na-eto eto, ikwusa ozi ọma na-esiri m ike. Ka oge na-aga, e nyere m ọrụ ndị m chere na agaghị m arụli. Ka m kọọrọ gị ụfọdụ n’ime ndị na-eme nke ọma nyeere m aka ịkwụsị ịtụ ụjọ, ozi m ana-atọkwa m ụtọ n’ime iri afọ ise na asatọ m jerela ozi oge niile.

A mụrụ m na Kwebek Siti, nke dị n’ime Kwebek bụ́ ebe a na-asụ French na Kanada. Papa m na mama m bụ́ Louis na Zélia hụrụ m n’anya nke ukwuu. Papa m bụ onye ihere, ịgụ ihe na-amasịkwa ya. Ide ihe na-atọ m ụtọ. M bukwa n’obi na otu ụbọchị, m ga-abụ onye nta akụkọ.

Mgbe m dị ihe dị ka afọ iri na abụọ, otu onye ya na papa m na-arụkọ ọrụ aha ya bụ Rodolphe Soucy bịara n’ụlọ anyị, ya na enyi ya nwoke. Ha bụ Ndịàmà Jehova. Amachaghị m gbasara Ndịàmà Jehova. N’ihi ya, achọghị m ịma ihe gbasara okpukpe ha. Ma, otú ha si wetuo obi jiri Baịbụl zaa ajụjụ niile anyị jụrụ ha masịrị m. Ọ masịkwara mama m na papa m. N’ihi ya, anyị kwetara ka a mụwara anyị Baịbụl.

N’oge ahụ, m na-aga ụlọ akwụkwọ ndị Katọlik. Mgbe ụfọdụ, mụ na ụmụ klas anyị na-ekwurịta ihe m mụtara na Baịbụl. Ndị nkụzi anyị bụ́ ndị ụkọchukwu mechara mata gbasara ya. Kama iji Baịbụl gosi na ihe m na-ekwu abụghị eziokwu, otu n’ime ha kwuru n’ihu ndị klas anyị niile na m bụ onye nnupụisi. Ọ bụ eziokwu na ọ dịghịrị m mfe, ma o mechara baa uru n’ihi na o nyeere m aka ịmata na ihe gbasara okpukpe a na-akụzi n’ụlọ akwụkwọ ahụ dị iche n’ihe Baịbụl kwuru. M chọpụtara na ekwesịghị m ịnọ ebe ahụ. M natara papa m na mama m ikike gafee n’ụlọ akwụkwọ ọzọ.

OTÚ OZI ỌMA SI TỌWA M ỤTỌ

M ka nọkwa na-amụ Baịbụl, ma anaghị m emecha nke ọma n’ihi na ụjọ ozi ụlọ n’ụlọ na-atụ m. Chọọchị Katọlik na-akpa ike n’oge ahụ. Ha gbalịsiri ike ịkwụsị ozi ọma anyị. Ọ bụ Maurice Duplessis na-achị Kwebek n’oge ahụ. Ya na Chọọchị Katọlik bụ nnu na mmanụ. Ìgwè mmadụ na-eji iwe amaja Ndịàmà Jehova, na-alụsodị ha ọgụ, ya ana-akwado ha. Onye na-akataghị obi agaghị ekwusali ozi ọma.

Otu nwanna nyeere m aka ịkwụsị ụjọ m na-atụ bụ John Rae. Ọ gara klas nke itoolu n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Nwanna John bụ aka ochie n’ọgbakọ. Ọ dị umeala n’obi. Ọ bụghị onye ndị mmadụ na-agbara ọsọ. Ọ na-esi ike ya enye m ndụmọdụ. Ma amụtara m ọtụtụ ihe n’ihe ndị ọ na-eme. Nwanna John amachaghị asụsụ French. N’ihi ya, m na-esokarị ya aga ozi ọma, na-enyekwara ya aka n’asụsụ French. Oge ndị ahụ mụ na Nwanna John nọrọ nyeere m aka ikpebi ịghọ Onyeàmà Jehova. M mere baptizim n’abalị iri abụọ na isii n’ọnwa Mee afọ 1951, ya bụ, afọ iri mụ na Ndịàmà Jehova kwuru okwu na nke mbụ ya.

Àgwà ọma Nwanna John Rae (A) nyeere m (B) aka ịkwụsị ịtụ ụjọ n’ozi ụlọ n’ụlọ

Ndị ọsụ ụzọ oge niile juru eju n’obere ọgbakọ anyị dị na Kwebek Siti. Àgwà ọma ha mere ka m ghọọ onye ọsụ ụzọ. N’oge ahụ, naanị ihe anyị ji aga ozi ụlọ n’ụlọ bụ Baịbụl. Ebe anyị na-enweghị akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl, anyị na-agbakwu mbọ iji Baịbụl ezi ozi ọma nke ọma. N’ihi ya, m gbara mbọ mụta amaokwu Baịbụl ndị ga-enyere m aka ịkụzi eziokwu nke ọma. Ma, ọtụtụ ndị anaghị ekwe agụ Baịbụl ọ bụla Chọọchị Katọlik na-anabataghị.

N’afọ 1952, m lụrụ otu ezigbo nwanna nwaanyị nọ n’ọgbakọ anyị aha ya bụ Simone Patry. Anyị kwagara Mọntriọl. N’ime otu afọ anyị lụrụ, anyị mụtara nwa anyị nwaanyị aha ya bụ Lise. Ọ bụ eziokwu na akwụsịrị m ịsụ ụzọ obere oge tupu anyị alụọ, mụ na nwunye m gbalịrị ghara ịna-ebi ndụ okomoko ka ezinụlọ anyị nwee ike iwepụtakwu oge na-eme ihe ndị a na-eme n’ọgbakọ.

Afọ iri gara tupu mụ echesiwe echiche ike gbasara ịsụ ụzọ. N’afọ 1962, m gara Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze maka ndị okenye, nke were otu ọnwa na Betel dị na Kanada. E tinyere mụ na nwanna aha ya bụ Camille Ouellette n’otu ọnụ ụlọ. Otú Nwanna Ouellette si anụ ọkụ n’obi n’ozi ọma masịrị m, karịchaa ebe ọ bụ na o nwere ezinụlọ. N’oge ahụ, o siri ezigbo ike na Kwebek ịhụ nne ma ọ bụ nna na-asụ ụzọ mgbe ha ka na-azụ ụmụ. Ma, ọ bụ ihe Nwanna Ouellette chọrọ ime. Mgbe ahụ mụ na ya nọ, ọ gbara m ume ka m chee gbasara otú ihe si dịrị m. N’ime ọnwa ole na ole, o doro m anya na m nwere ike ịsụwa ụzọ ọzọ. Ụfọdụ ndị kwuru na ihe m kpebiri ime adịghị mma. Ma, m malitere ịsụ ụzọ n’ihi na obi siri m ike na Jehova ga-enyere m aka.

ANYỊ LAGHACHIRI KWEBEK SITI BỤRỤ NDỊ ỌSỤ ỤZỌ PỤRỤ ICHE

N’afọ 1964, a họpụtara mụ na nwunye m ka anyị bụrụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche n’obodo anyị bụ́ Kwebek Siti. Anyị jere ozi ebe ahụ afọ ole na ole. N’oge ahụ, a naghịzi akpagbu anyị otú e si akpagbu anyị na mbụ.

N’otu ehihie Satọdee, a nwụchiri m na Sent-Mari, bụ́ obere obodo na-adịghị anya na Kwebek Siti. Otu onye uwe ojii kpụụrụ m gaa n’ụlọ ọrụ ha ma kpọchie m n’ihi na m na-ekwusa ozi ọma n’ụlọ n’ụlọ n’anataghị ikike. E mechara kpụpụ m n’ihu otu ọkàikpe aha ya bụ Baillargeon, bụ́ nwoke a na-atụ ụjọ. Ọ jụrụ m onye ga-ekpechite ọnụ m n’ụlọikpe. Mgbe m gwara ya na ọ bụ Glen How, * ọkàiwu a ma ama bụ́ Onyeàmà Jehova, ụjọ bịara ya, ya asị m: “Ị̀ sịrị ònye? Ya abụkwala ya.” Nwanna Glen How bụ onye a ma ama na-ekpechite ọnụ Ndịàmà Jehova n’oge ahụ. O teghị aka, ụlọikpe ahụ agwa m na a kagbuola ebubo ndị e boro m.

Mkpagbu ahụ a na-akpagbu anyị na Kwebek mere ka ọ na-esiri anyị ike inweta ebe dị mma anyị ga-anọ na-amụ ihe. Naanị ebe obere ọgbakọ anyị chọtaliri bụ ebe merela ochie a na-adọba ụgbọala nke na-ajụ ezigbo oyi n’oge oyi. Iji mee ka o kpoo ọkụ, ụmụnna na-amụnye ọkụ n’ihe a na-agbanye mmanụ. Anyị na-anọ gburugburu ọkụ ahụ awa ole na ole tupu ọmụmụ ihe ebido, na-akọrọ ibe anyị ihe ndị ga-agba ha ume.

Obi dị m ezigbo ụtọ ịhụ uru ozi ọma anyị bara kemgbe ọtụtụ afọ. N’agbata afọ 1961 na 1969, e nwere naanị ọgbakọ ole na ole na Kwebek Siti, Kot Nọd, na Gaspe Peninsula. Taa, e nwere ihe karịrị sekit abụọ n’ebe ndị ahụ. Ụmụnna anyị nwekwara ọmarịcha Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị ha na-anọ amụ ihe.

MGBE A KPỌRỌ M KA M BỤRỤ ONYE NLEKỌTA SEKIT

N’afọ 1977, m gara nnọkọ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na Toronto dị na Kanada

A kpọrọ mụ na nwunye m ka anyị bido ọrụ sekit n’afọ 1970. N’afọ 1973, a gwara anyị ka anyị rụwa ọrụ distrikti. N’afọ ndị ahụ, m mụtara ọtụtụ ihe n’aka ụmụnna ma nke a na-akọ, dị ka Nwanna Laurier Saumur * na Nwanna David Splane. * Ha abụọ bụ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị. E mechaa mgbakọ, mụ na Nwanna Splane na-agwa ibe anyị ihe anyị ga-eme ka otú anyị si akụzi ihe kakwuo mma. Echetara m mgbe Nwanna Splane sịrị m: “Léonce, okwu ikpeazụ gị tọrọ m ezigbo ụtọ. Ọ mara mma. Ma, ọ bụrụ m, m gaara eji ihe ndị i kwuru na ya kwuo ụzọ okwu atọ.” M na-etinye ihe karịrị akarị n’okwu m. M kwesịrị ịmụta otú e si egbubilata ihe ndị m ga-ekwu.

M jere ozi n’ọtụtụ obodo dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Kanada

A gwara ndị nlekọta distrikti ka ha na-agba ndị nlekọta sekit ume. Ma, ọtụtụ ndị nkwusa nọ na Kwebek ma m nke ọma. Ha na-achọkarị ka mụ na ha na-arụ n’ozi ọma ma m bịa ileta sekit ha. Ọ bụ eziokwu na ọ na-atọ m ụtọ ka mụ na ha rụọ n’ozi ọma, o mere ka m ghara ịna-ewepụtachara onye nlekọta sekit oge. E nwere otu mgbe onye nlekọta sekit weturu obi sị m: “Ọ dị mma na ị na-ewepụtara ụmụnna oge. Ma, echefukwala na ọ bụ m ka ị bịara ileta n’izu a. I kwesịkwara ịna-agba m ume.” M mụtara ezigbo ihe na ndụmọdụ ahụ o ji obiọma nye m.

N’afọ 1976, otu ihe gbawara m obi mere, nke m na-atụghị anya ya. Ezigbo ọrịa bịara Simone nwunye ọma m ma gbuo ya. Ọ bụ ezigbo nwaanyị n’ihi na ọ hụrụ Jehova n’anya nke ukwuu. Ọ naghịkwa eche naanị gbasara onwe ya. Ihe nyeere m aka idi ọnwụ ya bụ ịna-agbasi mbọ ike n’ozi Jehova. M na-ekelekwa Jehova maka otú o si kasie m obi n’oge ahụ ọ nwụrụ. Mgbe e mechara, m lụrụ otu nwanna nwaanyị na-asụ Bekee aha ya bụ Carolyn Elliott. Ọ bụ ọsụ ụzọ na-anụ ọkụ n’obi. Ọ bịara Kwebek na-eje ozi n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa. Ọ bụghị onye ndị mmadụ na-agbara ọsọ. O nwekwara mmasị n’ebe ndị mmadụ nọ, karịchaa ndị na-eme ihere ma ọ bụ ndị owu na-ama. O nyeere m ezigbo aka mgbe o sonyeere m n’ọrụ distrikti.

AFỌ DỊ EZIGBO MKPA

Na Jenụwarị afọ 1978, a gwara m ka m kụzie ihe n’Ụlọ Akwụkwọ Ndị Ọsụ Ụzọ mbụ e nwere na Kwebek. Ụjọ tụrụ m n’ihi na agatụbeghị m ụlọ akwụkwọ ahụ ma ọ bụ hụtụ otú akwụkwọ ha dị. Ihe niile dị m ọhụrụ n’anya otú ahụ ọ dị ụmụ akwụkwọ ndị ahụ. Obi dị m ụtọ na ọtụtụ ndị ọsụ ụzọ ma nke a na-akọ nọ na klas mbụ ahụ. N’agbanyeghị na m bụ onye nkụzi ha, amụtara m ọtụtụ ihe n’aka ha.

N’afọ 1978 ahụ, e mechara mee Mgbakọ Mba Niile isiokwu ya bụ “Okwukwe Na-enwe Mmeri” n’Ámá Egwuregwu Olimpik nke Mọntriọl. Ọ bụ mgbakọ kachanụ e metụrụla na Kwebek. Ndị bịara ya karịrị iri puku mmadụ asatọ. Arụrụ m ọrụ na Ngalaba Na-ahụ Maka Mgbasa Ozi ná mgbakọ ahụ. Mụ na ọtụtụ ndị nta akụkọ kparịtara. Obi dịkwa m ụtọ ịhụ ọtụtụ ihe ọma ha dere gbasara anyị. E ji ihe karịrị awa iri abụọ kwuo gbasara ya na tiivi na redio, deekwa ọtụtụ narị isiokwu gbasara ya n’akwụkwọ akụkọ. O mere ka ọtụtụ ndị matakwuo gbasara Jehova na ndị ya.

MGBE M GAFERE N’EBE ỌZỌ

Nnukwu ihe gbanwere n’ozi m n’afọ 1996. E zigara m ka m gaa jewe ozi na distrikti a na-asụ Bekee na ya, nke dị na Toronto. Kemgbe m mere baptizim, ọ bụ na Kwebek bụ́ ebe a na-asụ French ka m nọ na-eje ozi. M cheta otú m ga-esi na-egbujasị Bekee ma m mewe ihe omume, obi awụba m n’afọ. Echeghịkwa m na m ga-emeli ya. O mere ka m na-ekpekwu ekpere, na-atụkwasịkwu Jehova obi.

M cheta ihe mere mgbe ahụ, m ga-ejili obi m niile kwuo na ozi m jere na Toronto afọ abụọ tọrọ m ezigbo ụtọ. Carolyn nwunye m weturu obi na-enyere m aka ịna-akatakwu obi ma m sụwa Bekee. Ụmụnna nyeere m ezigbo aka, na-agbakwa m ume. Anyị metara ọtụtụ ndị enyi n’egbughị oge.

E wezụga ọtụtụ ihe m na-arụ iji kwadebe maka mgbakọ a ga-eme ná ngwụcha izu, m na-ewepụtakarị ihe dị ka otu awa ná mgbede Fraịdee gaa ozi ụlọ n’ụlọ. Ụfọdụ nwere ike ịna-ajụ, sị: ‘Gịnị mere ị ga-eji na-aga ozi ọma n’agbanyeghị na ọrụ ga-eju gị aka ná mgbakọ a ga-eme ná ngwụcha izu ahụ?’ Ma, m chọpụtara na ezigbo mkparịta ụka mụ na ndị mmadụ na-enwe n’ozi ọma na-agba m ume. Ruo ugbu a, ikwusa ozi ọma ka na-emekwa m obi ụtọ.

N’afọ 1998, a gwara mụ na nwunye m ka anyị gaa Mọntriọl gaa bụrụ ọsụ ụzọ pụrụ iche. Ruo ọtụtụ afọ, ọrụ m bụ ịhazi otú a ga-esi kwusaa ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị, nakwa iso ndị nta akụkọ rụọ ọrụ iji mee ka ndị mmadụ mata nke bụ́ eziokwu gbasara Ndịàmà Jehova. Ugbu a, mụ na nwunye m na-ezi ndị mba ọzọ bịara ọhụrụ na Kanada nakwa ndị chọrọ ịmatakwu gbasara Baịbụl ozi ọma.

Mụ na nwunye m Carolyn

M chewe gbasara iri afọ isii na asatọ m jeerela Jehova ozi kemgbe e mere m baptizim, obi na-atọgbu m atọgbu. Obi na-adị m ezigbo ụtọ n’ihi na amụtala m otú m ga-esi na-ezi ozi ọma ya ana-atọ m ụtọ, nyekwara ọtụtụ ndị aka ịbata n’ọgbakọ. Mgbe nwa m nwaanyị bụ́ Lise na di ya zụchara ụmụ ha, ha malitere ịsụ ụzọ oge niile. Otú o si ka na-anụ ọkụ n’obi n’ozi ọma na-eme m obi ụtọ. M na-ekele ụmụnna ndị àgwà ọma ha na ndụmọdụ ha mere ka mụ na Jehova dịkwuo ná mma, nyekwara m aka ịrụ ọrụ dị iche iche n’ọgbakọ. M chọpụtala na naanị ihe ga-enyere anyị aka iji obi anyị niile na-eje ozi anyị bụ ikwe ka Jehova jiri mmụọ nsọ ya dị ike nyere anyị aka. (Ọma 51:11) M ka na-ekele Jehova maka na o kwere ka m soro na-eto aha ya.—Ọma 54:6.

^ par. 16 Gụọ akụkọ ndụ Nwanna Glen How n’isiokwu bụ́ “Ọ Bụghị Unu Nwe Agha nke A, Kama Ọ Bụ Chineke.” Ọ gbara na Teta! Mee 8, 2000.

^ par. 20 Gụọ akụkọ ndụ Laurier Saumur, nke gbara n’Ụlọ Nche Bekee nke November 15, 1976.

^ par. 20 David Splane so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova.