Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 6

Jehova Nna Anyị Hụrụ Anyị n’Anya nke Ukwuu

Jehova Nna Anyị Hụrụ Anyị n’Anya nke Ukwuu

“Ya mere, kpeenụ ekpere otú a: ‘Nna anyị nke bi n’eluigwe.’”—MAT. 6:9.

ABỤ NKE 135 Jehova Ji Obiọma Na-arịọ: “Mara Ihe, Nwa M”

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Olee ihe mmadụ ga-eme ma ọ chọọ ịhụ eze Peshia?

WEREGODỊ ya na i bi na Peshia oge ochie. E nwere ihe dị mkpa ị chọrọ ịgwa eze na-achị mgbe ahụ. N’ihi ya, ị gara n’obodo Shushan bụ́ ebe eze ahụ bi. Ma, ị ma na ị gaghị ahụli eze ahụ ma ọ bụrụ na i bughị ụzọ nata ya ikike. Ime otú ahụ nwere ike ịta isi gị.—Esta 4:11.

2. Olee otú Jehova chọrọ ka obi dị anyị ma a bịa n’ịgwa ya okwu?

2 Obi dị anyị ezigbo ụtọ na Jehova adịghị ka eze Peshia. Jehova karịrị eze ọ bụla. Ma, ọ na-ekwe ka anyị gwa ya okwu mgbe ọ bụla anyị chọrọ. Ọ chọrọ ka anyị ghara ịtụ ụjọ ịgwa ya okwu. Dị ka ihe atụ, n’agbanyeghị na a na-etu ya nnukwu aha ndị dị ka Onye Okike Ukwu, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, nakwa Ọkaakaa Onyenwe anyị, ọ chọrọ ka anyị na-akpọ ya “Nna.” (Mat. 6:9) Obi dị anyị ezigbo ụtọ na Jehova chọrọ ka anyị were ya ka Nna anyị na ya dị n’ezigbo mma.

3. Olee ihe mere anyị nwere ike iji kpọọ Jehova “Nna”? Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu a?

3 Ọ dabara adaba ịkpọ Jehova “Nna” n’ihi na ọ bụ ya nyere anyị ndụ. (Ọma 36:9) Ebe ọ bụ Nna anyị, anyị kwesịrị ịna-erubere ya isi. Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe ndị ọ na-agwa anyị, ọ ga na-agọzi anyị. (Hib. 12:9) Ihe ndị so ná ngọzi ahụ bụ ndụ ebighị ebi n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa. Irubere ya isi na-abakwara anyị uru ugbu a. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe gosiri na Jehova bụ Nna hụrụ anyị n’anya ugbu a, nakwa ihe mere obi kwesịrị iji sie anyị ike na o mekataghị gbahapụ anyị n’ọdịnihu. Ma, ka anyị buru ụzọ leba anya n’ihe mere obi kwesịrị iji sie anyị ike na Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya ma na-elekọta anyị.

JEHOVA BỤ NNA HỤRỤ ANYỊ N’ANYA MA NA-ELEKỌTA ANYỊ

Jehova chọrọ ka anyị na ya dịrị ná mma otú ahụ nna hụrụ ụmụ ya n’anya si achọ ka ya na ha dịrị ná mma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 4)

4. Olee ihe mere o ji esiri ụfọdụ ndị ike iwere Jehova ka Nna ha?

4 Ọ̀ na-esiri gị ike iwere Jehova ka Nna gị? Ụfọdụ nwere ike iche na o nweghị ihe Jehova ji ha kpọrọ n’ihi otú o si dị elu. Ọ na-esiri ha ike ikweta na Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile na-eche banyere onye nke ọ bụla n’ime ha. Ma, Nna anyị hụrụ anyị n’anya achọghị ka anyị na-eche otú ahụ. O nyere anyị ndụ, chọọkwa ka anyị na ya dịrị ná mma. Mgbe Pọl onyeozi kwuchara na Chineke chọrọ ka anyị chọọ ya ma chọta ya, ọ kọwaara ndị na-ege ya ntị n’Atens na Jehova ‘anọghị n’ebe dị anya n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ.’ (Ọrụ 17:24-29) Chineke chọrọ ka onye ọ bụla n’ime anyị na-abịakwute ya otú ahụ nwatakịrị na-abịakwute nna ya hụrụ ya n’anya, na-elekọtakwa ya.

5. Olee ihe anyị mụtara n’ihe mere otu nwanna nwaanyị?

5 O nwekwara ndị ọ na-esiri ike iwere Jehova ka Nna ha n’ihi na nna mụrụ ha ahụghị ha n’anya. Otu nwanna nwaanyị sịrị: “Papa m na-agwakarị m okwu ọjọọ. Mgbe m malitere ịmụ Baịbụl, o siiri m ike iwere Jehova ka Nna m nke eluigwe. Ma, mgbe m matara onye Jehova bụ nke ọma, ihe gbanwere.” Ọ̀ na-adị gị otú ahụ ọ dị nwanna nwaanyị a? Ọ bụrụ otú ahụ, obi sie gị ike na i nwere ike imecha were Jehova ka Nna kacha mma i nwere.

6. Dị ka e kwuru na Matiu 11:27, olee otu ụzọ Jehova si nyere anyị aka ka anyị nwee ike iwere ya ka Nna hụrụ anyị n’anya?

6 Otu ụzọ Jehova si nyere anyị aka ka anyị nwee ike iwere ya ka Nna hụrụ anyị n’anya bụ na o mere ka e dee ihe ndị Jizọs kwuru na ihe ndị o mere na Baịbụl. (Gụọ Matiu 11:27.) Jizọs mere nnọọ ka Nna ya. Ọ bụ ya mere o ji sị: “Onye hụrụ m ahụwokwa Nna m.” (Jọn 14:9) Jizọs kwuru ọtụtụ ugboro na Jehova bụ Nna. Naanị n’akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn, Jizọs kpọrọ Jehova “Nna” ihe dị ka ugboro otu narị na iri isii na ise. Gịnị mere Jizọs ji kpọruo ya otú ahụ? Otu ihe mere o ji mee ya bụ ka ndị mmadụ mata na Jehova bụ Nna hụrụ anyị n’anya.—Jọn 17:25, 26.

7. Olee ihe anyị mụtara gbasara Jehova n’otú o si meso Ọkpara ya?

7 Ka anyị leba anya n’ihe anyị ga-amụta gbasara Jehova n’otú o si meso Ọkpara ya bụ́ Jizọs. Ọ nụrụ ekpere niile Jizọs kpere. Ọ bụghị naanị na ọ nụrụ ha, kama ọ zakwara ha. (Jọn 11:41, 42) N’agbanyeghị nsogbu ọ bụla bịaara Jizọs, ọ ma na Nna ya hụrụ ya n’anya ma na-akwado ya.—Luk 22:42, 43.

8. Olee ihe ndị Jehova meere Jizọs?

8 Jizọs matara na ọ bụ Nna ya nyere ya ndụ, jirikwa ya ndụ. O kwuru, sị: ‘M dị ndụ n’ihi Nna m.’ (Jọn 6:57) Jizọs tụkwasịrị Nna ya obi ya niile. Jehova nyekwara ya ihe niile dị ya mkpa ná ndụ. Nke ka nke bụ na o nyeere Jizọs aka ịna-eme uche ya.—Mat. 4:4.

9. Olee otú Jehova si gosi na ya hụrụ Jizọs n’anya?

9 Jehova hụrụ Jizọs n’anya. Ọ bụ ya mere o ji mee ka Jizọs mata na ya kwụ ya n’azụ. (Mat. 26:53; Jọn 8:16) Ọ bụ eziokwu na Jehova emeghị ka nsogbu ghara ịbịara Jizọs, o nyeere ya aka idi ha. Obi siri Jizọs ike na nsogbu ọ bụla bịaara ya agaghị adịte aka. (Hib. 12:2) Jehova gosiri na ọ hụrụ Jizọs n’anya. Otú o si mee ya bụ na o gere ntị n’ekpere Jizọs, nye ya ihe ndị dị ya mkpa, kụziere ya ihe, kwadokwa ya. (Jọn 5:20; 8:28) Ka anyị kwuzie otú Nna anyị nke eluigwe si enyere anyị aka otú ahụ o nyeere Jizọs.

OTÚ NNA ANYỊ HỤRỤ ANYỊ N’ANYA SI ELEKỌTA ANYỊ

Nna hụrụ ụmụ ya n’anya (1) na-ege ha ntị, (2) na-egboro ha mkpa ha, (3) na-akụziri ha ihe, (4) na-emekwa ka ahụ́ ruo ha ala. Otú ahụkwa ka Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya na-emere anyị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10 ruo na nke 15) *

10. Dị ka e kwuru n’Abụ Ọma 66:19, 20, olee otú Jehova si egosi na ọ hụrụ anyị n’anya?

10 Jehova na-anụ ekpere anyị. (Gụọ Abụ Ọma 66:19, 20.) Ọ chọghị ka anyị na-ekpe ekpere naanị n’ebe ụfọdụ ma ọ bụ mgbe ụfọdụ. Kama, ọ chọrọ ka anyị na-ekpe ekpere mgbe niile. (1 Tesa. 5:17) Anyị nwere ike ikpe ekpere mgbe ọ bụla, n’agbanyeghị ebe anyị nọ. Chineke dị njikere ige anyị ntị mgbe ọ bụla. O nweghị mgbe ọ na-agaghị enwe ohere ige anyị ntị. Anyị mata na Jehova na-anụ ekpere anyị, ọ ga-eme ka anyị hụkwuo ya n’anya. Otu ọbụ abụ sịrị: “Ịhụnanya juru m obi n’ihi na Jehova na-anụ olu m.”—Ọma 116:1.

11. Gịnị ka Jehova na-eme ma anyị kpee ekpere?

11 Ihe Nna anyị nke eluigwe na-eme abụghị naanị ịnụ ekpere anyị, kama ọ na-aza ya. Jọn onyeozi gwara anyị, sị: “Ihe ọ bụla nke anyị rịọrọ [Chineke] dị ka uche ya si dị, ọ na-anụ olu anyị.” (1 Jọn 5:14, 15) Ọ bụ eziokwu na Jehova nwere ike ọ gaghị esi otú anyị tụrụ anya ya za ekpere anyị, ọ ma ihe ga-akacha abara anyị uru. N’ihi ya, mgbe ụfọdụ ọ naghị emere anyị ihe anyị rịọrọ ya ma ọ bụkwanụ ya achọọ ka anyị cheretụ.—2 Kọr. 12:7-9.

12-13. Olee ụzọ dị iche iche Nna anyị nke eluigwe si enye anyị ihe ndị dị anyị mkpa?

12 Jehova na-enye anyị ihe ndị dị anyị mkpa. Ọ na-eme ihe ọ chọrọ ka nna ọ bụla na-eme. (1 Tim. 5:8) Ọ na-egboro ụmụ ya mkpa ha. Ọ chọghị ka anyị na-echegbu onwe anyị banyere nri, uwe, na ebe anyị ga-ebi. (Mat. 6:32, 33; 7:11) Ebe ọ bụ Nna hụrụ anyị n’anya, ọ haziela otú anyị ga-esi nweta ihe niile ga-adị anyị mkpa n’ọdịnihu.

13 Nke ka nke, Jehova na-enye anyị ihe ndị ga-eme ka anyị na ya dịrị ná mma. O ji Okwu ya bụ́ Baịbụl mee ka anyị mata ihe ndị bụ́ eziokwu gbasara ya, nzube ya, ihe mere o ji kee anyị, nakwa ihe ga-eme n’ọdịnihu. O ji nne na nna anyị ma ọ bụkwanụ ndị ọzọ nyere anyị aka ịmata ya. Ọ ka na-ejikwa ndị okenye na ụmụnna ndị ọzọ ma nke a na-akọ n’ọgbakọ enyere anyị aka ịbụ enyi ya. Ihe ọzọkwa bụ na Jehova ji ọmụmụ ihe anyị na-akụziri anyị na ụmụnna anyị ihe. Jehova na-esi otú a na ụzọ ndị ọzọ egosi anyị na ya bụ Nna hụrụ anyị niile n’anya.—Ọma 32:8.

14. Gịnị mere Jehova ji akụziri anyị ihe? Oleekwa otú o si eme ya?

14 Jehova na-akụziri anyị ihe. Anyị ezughị okè otú ahụ Jizọs zuru. Jehova na-adọ anyị aka ná ntị mgbe ụfọdụ ma ọ kụziwere anyị ihe. Ọ gwara anyị n’Okwu ya, sị: “Onye Jehova hụrụ n’anya ka ọ na-adọ aka ná ntị.” (Hib. 12:6, 7) Jehova na-esi ọtụtụ ụzọ adọ anyị aka ná ntị. Dị ka ihe atụ, ihe anyị gụtara na Baịbụl ma ọ bụ ihe anyị nụrụ n’ọmụmụ ihe nwere ike ime ka anyị gbanwee àgwà anyị ma ọ bụ echiche anyị. Ndị okenye nwekwara ike inyere anyị aka. Mgbe ọ bụla Jehova dọrọ anyị aka ná ntị, ọ bụ n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya n’agbanyeghị otú o si dọọ anyị ya.—Jere. 30:11.

15. Olee ụzọ ụfọdụ Jehova si enyere anyị aka?

15 Jehova na-enyere anyị aka idi nsogbu. Otú ahụ nna hụrụ ụmụ ya n’anya na-enyere ha aka ma ha nọrọ ná nsogbu ka Nna anyị nke eluigwe na-enyere anyị aka ma nsogbu bịara anyị. Ọ na-eji mmụọ nsọ ya enyere anyị aka ka ihe ọ bụla ghara ime ka anyị na ya ghara ịdịzi ná mma. (Luk 11:13) Jehova na-enyekwara anyị aka ma anyị chegbuwe onwe anyị. Dị ka ihe atụ, o mere ka anyị nwee olileanya magburu onwe ya. Olileanya ahụ na-eme ka anyị nwee ike idi nsogbu ndị na-abịara anyị. Chegodị ihe a: N’agbanyeghị ihe ọjọọ ọ bụla mere anyị, Jehova ga-eme ka ahụhụ ọ bụla ọ kpataara anyị kwụsị kpamkpam. Nsogbu ọ bụla bịaara anyị agaghị adịte aka. Ma, ngọzi si n’aka Jehova na-adịru mgbe ebighị ebi.—2 Kọr. 4:16-18.

NNA ANYỊ NKE ELUIGWE EMEKATAGHỊ GBAHAPỤ ANYỊ

16. Gịnị mere mgbe Adam nupụụrụ Nna ya hụrụ ya n’anya isi?

16 Otú Jehova si meso Adam mgbe o nupụụrụ ya isi gosiri na ọ hụrụ anyị n’anya. Isi Adam nupụụrụ Nna ya nke eluigwe mere ka ya na ụmụ ndị ọ ga-amụta gharazie iso n’ezinụlọ Jehova. (Rom 5:12; 7:14) Ma, Jehova mere ihe iji nyere ụmụ Adam aka.

17. Gịnị ka Jehova mere ozugbo Adam nupụchaara ya isi?

17 Jehova tara Adam ahụhụ ihe o metara. Ma o kwere nkwa inyere ụmụ ọ ga-amụta aka. O kwuru ozugbo na ndị rubeere ya isi ga-emecha sorokwa n’ezinụlọ ya. (Jen. 3:15; Rom 8:20, 21) Jehova haziri ihe ga-eme ka o kwe omume. O mere ka Jizọs, bụ́ Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya, jiri ndụ ya chụọ àjà. Ihe ahụ o mere gosiri na ọ hụrụ anyị n’anya nke ukwuu.—Jọn 3:16.

Ọ bụrụ na anyị esila n’ebe Jehova nọ kpafuo ma chegharịa, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova, bụ́ Nna hụrụ anyị n’anya, dị njikere ịnabata anyị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 18)

18. Gịnị mere obi ga-eji sie anyị ike na Jehova chọrọ ka anyị bụrụ ụmụ ya, ọ bụrụgodị na anyị akpafuo?

18 N’agbanyeghị na anyị ezughị okè, Jehova chọrọ ka anyị soro n’ezinụlọ ya. Ọ naghịkwa ewere ya na anyị na-enye ya nsogbu. Anyị nwere ike mejọọ ya ma ọ bụ kpafutụ, ma ọ ka ga na-atụ anya na anyị ga-alọghachikwute ya. Jizọs ji akụkọ gbasara nwa mmefu gosi otú Jehova hụruru ụmụ ya n’anya. (Luk 15:11-32) N’akụkọ ahụ, nna nwa ahụ akwụsịghị ịtụ anya mgbe nwa ya ga-alọta. Mgbe ọ lọtara, nna ya ji obi ụtọ nabata ya. Ọ bụrụ na anyị esi n’ebe Jehova nọ kpafuo ma chegharịa, obi kwesịrị isi anyị ike na Nna anyị hụrụ anyị n’anya dị njikere ịnabata anyị.

19. Olee otú Jehova ga-esi mezie ihe niile Adam mebiri?

19 Nna anyị nke eluigwe ga-emezi ihe niile Adam mebiri. Mgbe Adam nupụchaara Jehova isi, Jehova kpebiri isi n’etiti ụmụ mmadụ họrọ otu narị puku mmadụ na iri puku anọ na puku anọ ga-eso Ọkpara ya bụrụ ndị eze na ndị nchụàjà n’eluigwe. Jizọs na ndị ga-eso ya chịa ga-enyere ndị na-erubere Chineke isi aka ka ha zuo okè n’ụwa ọhụrụ. Chineke ga-eme ka ha dịrị ndụ ebighị ebi ma ha gafechaa ule ikpeazụ nke ga-eme ka a mata na ha na-erubere ya isi. Obi ga-adịzi Jehova ụtọ ịhụ na ndị juru n’ụwa bụ ụmụ ya ndị nwoke na ndị nwaanyị zuru okè. Oge ahụ ga-amagbu onwe ya.

20. Olee ụzọ ndị Jehova si gosi na ọ hụrụ anyị n’anya? Gịnịkwa ka anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu na-esonụ?

20 Jehova egosila na ọ hụrụ anyị n’anya nke ukwuu. O nweghị Nna a ga-eji tụnyere ya. Ọ na-anụ ekpere anyị, na-egboro anyị mkpa anyị, na-enyekwara anyị aka ịna-eme uche ya. Ọ na-akụziri anyị ihe ma na-akwado anyị. Ọ ga-emekwara anyị ihe ndị magburu onwe ha n’ọdịnihu. Obi dị anyị ezigbo ụtọ ịmata na Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya ma na-elekọta anyị. N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-eleba anya n’ihe anyị bụ́ ụmụ ya ga-eme iji gosi na obi dị anyị ụtọ na ọ hụrụ anyị n’anya.

ABỤ NKE 108 Ịhụnanya Chineke

^ par. 5 Anyị na-ekwukarị na Jehova bụ Onye kere anyị nakwa Ọkaakaa Eluigwe na Ala. Ma, e nwere ezigbo ihe mere anyị ga-eji kwuo na ọ bụ Nna hụrụ anyị n’anya. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe mere anyị ga-eji kwuo otú ahụ. Anyị ga-amụtakwa ihe mere obi kwesịrị iji sie anyị ike na Jehova emekataghị gbahapụ anyị.

^ par. 59 NKỌWA FOTO: Foto anọ ndị a gosiri ebe nna na nwa ya nọ: ebe nna na-ege nwa ya nwoke ntị, ebe nna na-egboro nwa ya nwaanyị mkpa ya, ebe nna na-akụziri nwa ya nwoke ihe, na ebe nna na-agụgụ nwa ya nwoke. Aka Jehova e sere n’azụ foto anọ ndị a na-echetara anyị na Jehova na-eme ihe yiri ihe ndị a iji na-elekọta anyị.