Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 9

Kwe Ka Jehova Mee Ka Obi Ruo Gị Ala

Kwe Ka Jehova Mee Ka Obi Ruo Gị Ala

“Mgbe m nwere ọtụtụ nchegbu n’ime obi m, nkasi obi gị malitere ime ka ahụ́ ruo mkpụrụ obi m ala.”—ỌMA 94:19.

ABỤ NKE 44 Ekpere Onye Ọ Na-enweghị Ka Ọ Hà Ya

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Gịnị nwere ike ime ka mmadụ na-echegbu onwe ya? Gịnịkwa ka o nwere ike ime ka onye ahụ chewe gbasara onwe ya?

È NWETỤLA mgbe i chegburu onwe gị? * O nwere ike ịbụ n’ihi ihe ndị ọzọ kwuru ma ọ bụ ihe ha mere na-ewute gị, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ ihe gịnwa kwuru ma ọ bụ mee. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ na i mere mmehie ma na-eche na Jehova emekataghị gbaghara gị. I nwekwara ike ịna-eche na i nweghịzi okwukwe nakwa na ị bụ onye ọjọọ ebe ọ bụ na ihe ahụ mere ka ị na-echegbu onwe gị. Ma, ọ̀ bụ eziokwu?

2. Olee ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl gosiri na mmadụ ichegbu onwe ya apụtaghị na o nweghị okwukwe?

2 Ka anyị kwuo gbasara ndị ụfọdụ a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl. Hana bụ nwaanyị nwere ezigbo okwukwe. Ọ bụ ya mechara mụọ Samuel onye amụma. N’agbanyeghị ya, o chegburu onwe ya mgbe otu onye ezinụlọ ha kpasoro ya àgwà ọjọọ. (1 Sam. 1:7) Pọl onyeozi nwere ezigbo okwukwe, ma o ‘chegburu onwe ya maka ọgbakọ niile.’ (2 Kọr. 11:28) Eze Devid nwere okwukwe siri ike n’ebe Jehova nọ, nke mere ka Jehova hụ ya n’anya nke ukwuu. (Ọrụ 13:22) Ma Devid mere mmehie dị oké njọ, nke mere ka o chegbuo onwe ya. (Ọma 38:4) Jehova kasiri onye nke ọ bụla n’ime ha obi ma mee ka obi ruo ya ala. Ka anyị leba anya n’ihe anyị nwere ike ịmụta n’akụkọ gbasara ha.

IHE ANYỊ GA-AMỤTA N’AKA HANA

3. Olee otú ihe ndị ọzọ kwuru nwere ike isi mee ka anyị na-echegbu onwe anyị?

3 Ọ bụrụ na ndị mmadụ agwa anyị okwu ọjọọ ma ọ bụ mee anyị ihe na-adịghị mma, o nwere ike ime ka anyị chegbuwe onwe anyị. Ọ na-akadị njọ ma ọ bụrụ na onye ahụ bụ ezigbo enyi anyị ma ọ bụ onye ezinụlọ anyị. Anyị nwere ike ichegbuwe onwe anyị na anyị na onye ahụ adịghịzi ná mma. Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịbụ na onye ahụ ebughị n’obi ịgwa anyị okwu ọjọọ, ma ihe o kwuru nwere ike ịgbawa anyị obi. (Ilu 12:18) Mmadụ nwedịrị ike ịkpachara anya kwuo ihe ga-agbawa anyị obi. Ihe a mere otu nwanna nwaanyị na-eto eto. Ọ sịrị: “Afọ ole na ole gara aga, onye m chere na ọ bụ enyi m malitere ikwu ihe ndị na-abụghị eziokwu gbasara m n’ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet. Ọ gbawara m obi, mụ ana-echegbukwa onwe m. Amaghị m ihe mere o ji mewaa m obi otú a.” Ọ bụrụ na e nweela ezigbo enyi gị ma ọ bụ onye ezinụlọ unu mejọrọ gị, i nwere ike ịmụta ihe n’ihe mere Hana.

4. Olee nsogbu ndị tara akpụ bịaara Hana?

4 E nwere nsogbu ndị tara akpụ bịaara Hana. Ọ mụtaghị nwa ruo ọtụtụ afọ. (1 Sam. 1:2) N’Izrel, a na-ewere nwaanyị na-amụtaghị nwa ka onye a bụrụ ọnụ. O mere ka ezigbo ihere na-eme Hana. (Jen. 30:1, 2) Nke kadị njọ bụ na di Hana nwere nwunye ọzọ aha ya bụ Penina. Ọ mụtara ụmụ. Penina weere Hana ka onye ya na ya na-azọ ihe, ‘na-akpasukwa ya iwe nke ukwuu iji mee ka obi ghara iru ya ala.’ (1 Sam. 1:6) Ná mmalite, ihe ahụ nọ na-ewe Hana ezigbo iwe. Ụdị iwe na-ewe ya mere ka “ọ na-akwa ákwá ma ghara iri nri.” “Ọ na-ewutekwa ya ná mkpụrụ obi.” (1 Sam. 1:7, 10) Gịnị nyeere Hana aka?

5. Olee otú ekpere si nyere Hana aka?

5 Hana kpere ekpere ma kọọrọ Jehova otú ọ dị ya n’obi. Mgbe o kpechara ekpere, ọ kọwaara Ilaị Nnukwu Onye Nchụàjà ihe ya na ya na-alụ. Ilaị gwara ya, sị: “Laa n’udo, ka Chineke Izrel meekwara gị ihe ị rịọrọ ya.” Gịnị meziri? Hana lawara “ma riwe ihe, ihu ya agbarụghịkwa agbarụ ọzọ.” (1 Sam. 1:17, 18) Ekpere mere ka obi ruo Hana ala.

Olee otú anyị ga-esi na-eme ka obi ruo anyị ala otú ahụ Hana mere n’oge ochie? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6 ruo na nke 10)

6. Olee ihe ndị anyị nwere ike ịmụta gbasara ekpere n’aka Hana nakwa n’ihe e kwuru ná Ndị Filipaị 4:6, 7?

6 Obi ga-eru anyị ala ma ọ bụrụ na anyị akwụsịghị ikpe ekpere. Hana nọ na-agwa Nna ya nke eluigwe okwu ruo ogologo oge. (1 Sam. 1:12) Anyị nwekwara ike iwepụta oge kọọrọ Jehova ihe na-echegbu anyị, ihe bụ́ ụjọ anyị, na ihe ndị anyị na-anaghị emeta. Anyị kpewe ekpere, ọ bụghị iwu na anyị ga-ekwutecha ihe niile ma ọ bụ mee ka ọ dị ụtọ ná ntị. Mgbe ụfọdụ, anyị nwedịrị ike ibewe ákwá ma anyị na-akọrọ Jehova otú nsogbu anyị si na-ewute anyị. N’agbanyeghị ya, ike agaghị agwụ Jehova ige anyị ntị. Ihe ọzọ anyị kwesịrị ime bụ ịna-echeta ihe e kwuru ná Ndị Filipaị 4:6, 7. (Gụọ ya.) Pọl gwara anyị na anyị kwesịrị ịna-ekele Jehova maka ihe ndị ọ na-emere anyị. E nwere ọtụtụ ihe anyị kwesịrị ịna-ekele Jehova maka ha. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ikele ya maka ndụ o nyere anyị, maka ihe ndị o kere, maka na ọ hụrụ anyị n’anya, nakwa maka olileanya magburu onwe ya o nyere anyị. Olee ihe ọzọ anyị nwere ike ịmụta n’aka Hana?

7. Gịnị ka Hana na di ya na-eme kwa afọ?

7 N’agbanyeghị nsogbu ndị bịaara Hana, ọ na-eso di ya aga Shaịlo kwa afọ, bụ́ ebe a na-efe Jehova. (1 Sam. 1:1-5) Ọ bụ mgbe ọ nọ n’ụlọikwuu Jehova ka Ilaị Nnukwu Onye Nchụàjà gbara ya ume, gwa ya ka Jehova meere ya ihe ọ na-arịọ ya.—1 Sam. 1:9, 17.

8. Olee otú ịga ọmụmụ ihe nwere ike isi nyere anyị aka? Kọwaa.

8 Obi nwere ike iru anyị ala ma ọ bụrụ na anyị ana-aga ọmụmụ ihe. N’ekpere mmeghe a na-ekpe n’ọmụmụ ihe, a na-arịọ Jehova ka o nye anyị mmụọ nsọ ya. Udo so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ. (Gal. 5:22) Anyị gaa ọmụmụ ihe, ọ bụrụgodị na e nwere ihe na-echegbu anyị, anyị na-enye Jehova na ụmụnna anyị ohere ịgba anyị ume na inyere anyị aka ka obi ruo anyị ala. Ekpere na ọmụmụ ihe bụ ihe dị mkpa Jehova ji eme ka obi ruo anyị ala. (Hib. 10:24, 25) Ka anyị kwuo gbasara ihe ọzọ anyị nwere ike ịmụta n’aka Hana.

9. Olee ihe na-agbanweghị ná nsogbu Hana, ma gịnị nyeere ya aka?

9 Ihe mere ka Hana na-echegbu onwe ya akwụsịghị ozugbo. Mgbe Hana si n’ụlọikwuu ebe ọ gara ife Chineke lọta, ya na Penina ka bikwa n’otu ụlọ. Baịbụl ekwughịkwa na otú Penina si akpaso ya àgwà gbanwere. N’ihi ya, ọ ga-abụ na Hana nọ na-edi okwu ọjọọ Penina na-agwa ya. Ma, iwe anọghịzi na-ewe Hana. Cheta na mgbe Hana kọchaara Jehova nsogbu ya, ọ kwụsịrị ichegbu onwe ya. O kwere ka Jehova kasie ya obi ma mee ka obi ruo ya ala. Mgbe e mechara, Jehova gọziri Hana, mee ka ọ mụta ụmụ.—1 Sam. 1:19, 20; 2:21.

10. Olee ihe anyị na-amụta n’akụkọ Hana?

10 Obi nwere ike iru anyị ala ọ bụrụgodị na nsogbu anyị akwụsịghị. Ọ bụrụgodị na anyị na-ekpesi ekpere ike, na-agakwa ọmụmụ ihe mgbe niile, o nwere ike ụfọdụ nsogbu anyị agaghị akwụsị. Ma ihe anyị mụtara n’akụkọ Hana bụ na e nweghị ihe ga-emeli ka Jehova ghara ime ka obi ruo anyị ala. Jehova agaghị echefu anyị. Mee elu mee ala, ọ ga-agọzi anyị maka na anyị akwụsịghị iji obi anyị niile na-efe ya.—Hib. 11:6.

IHE ANYỊ GA-AMỤTA N’AKA PỌL ONYEOZI

11. Olee ihe ndị mere Pọl ji na-echegbu onwe ya?

11 E nwere ọtụtụ ihe mere ka Pọl chegbuwe onwe ya. Dị ka ihe atụ, ebe ọ bụ na ọ hụrụ ụmụnna ya n’anya, ọ na-echegbu onwe ya gbasara nsogbu ndị bịaara ha. (2 Kọr. 2:4; 11:28) Ka Pọl na-ekwusa ozi ọma, ndị na-akpagbu ya tiri ya ihe ugboro ugboro ma tụọ ya mkpọrọ. E nwekwara mgbe ihe siiri ya ike, ya ana-echegbu onwe ya. (Fil. 4:12) Ihe ọzọkwa bụ na ebe ọ bụ na ụgbọ ọ nọ na ya ekpuola ọ dịkarịa ala ugboro atọ, ọ ga-abụ na ọ na-echegbu onwe ya mgbe ọ bụla ọ nọ n’ụgbọ mmiri. (2 Kọr. 11:23-27) Gịnị nyeere Pọl aka mgbe ọ na-echegbu onwe ya?

12. Gịnị mere ka nchegbu Pọl belata?

12 Pọl chegburu onwe ya gbasara nsogbu ndị bịaara ụmụnna ya. Ma ọ gbalịwaghị ka o jiri aka ya kwụsị nsogbu ndị ahụ niile. Ọ ma na ọ gaghị emeli ihe niile. Ọ haziri ka ndị ọzọ nyere ya aka n’ilekọta ọgbakọ. Dị ka ihe atụ, o nyere ụmụ nwoke ndị a ga-atụkwasịli obi dị ka Timoti na Taịtọs ọtụtụ ọrụ n’ọgbakọ. O doro anya na ọrụ ụmụnna ndị ahụ rụrụ mere ka nchegbu ya belata.—Fil. 2:19, 20; Taị. 1:1, 4, 5.

Dị ka anyị mụtara n’aka Pọl onyeozi, olee ihe anyị ga-eme ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13 ruo na nke 15)

13. Olee otú ndị okenye ga-esi na-eme ka Pọl?

13 Gwa ndị ọzọ ka ha nyere gị aka. E nwere ọtụtụ ndị okenye taa dị obiọma ka Pọl. Ha na-echegbu onwe ha gbasara ụmụnna ha ndị nsogbu bịaara. Ma, e nwere ike okenye agaghị enyeliri ndị niile nọ n’ọgbakọ aka. Ọ bụrụ na ọ ghọta na naanị ya agaghị emeli ihe niile, ọ ga-enye ụmụnna nwoke ndị ọzọ ruru eru ọrụ ụfọdụ ma zụọ ụmụ okorobịa ka ha nyere ya aka n’ilekọta atụrụ Chineke.—2 Tim. 2:2.

14. Gịnị ka Pọl na-echegbughị onwe ya gbasara ya? Gịnịkwa ka anyị ga-amụta n’aka ya?

14 Mata na e kwesịrị ịkasi gị obi. Pọl dị umeala n’obi. Ọ bụ ya mere o ji gakwuru ndị enyi ya ka ha kasie ya obi. Ha kasikwara ya obi. O chegbuweghị onwe ya na ndị ọzọ ga-eche na o sighị ike n’ihi na ndị ọzọ kasiri ya obi. N’akwụkwọ ozi Pọl degaara Faịlimọn, ọ sịrị: “Enwetara m ọṅụ na nkasi obi dị ukwuu n’ịhụnanya gị.” (Faị. 7) Pọl kpọkwara aha ụfọdụ ụmụnna ndị ya na ha rụkọrọ ọrụ, ndị gbara ya ezigbo ume mgbe nsogbu bịaara ya. (Kọl. 4:7-11) Ọ bụrụ na anyị adị umeala n’obi ma mata na e kwesịrị ịkasi anyị obi, ụmụnna anyị ga-eji obi ụtọ nyere anyị aka.

15. Gịnị ka Pọl mere mgbe ezigbo nsogbu bịaara ya?

15 Tụkwasị Okwu Chineke obi. Pọl ma na Okwu Chineke ga-akasi ya obi. (Rom 15:4) Ọ ga-emekwa ka ọ mara otú ọ ga-esi die nsogbu ọ bụla bịaara ya. (2 Tim. 3:15, 16) Mgbe a tụrụ Pọl mkpọrọ nke ugboro abụọ na Rom, obi ya gwara ya na ọnwụ ya eruwela. N’ihi ya, gịnị ka Pọl mere? Ọ gwara Timoti ka ọ bịa ozugbo ma wetara ya “akwụkwọ mpịakọta.” (2 Tim. 4:6, 7, 9, 13) N’ihi gịnị? N’ihi na ọ ga-abụ na ihe dị n’akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ bụ ebe ụfọdụ n’Akwụkwọ Nsọ Hibru Pọl nwere ike iji mụọ ihe. Ọ bụrụ na anyị ana-amụ Okwu Chineke mgbe niile otú ahụ Pọl mere, Jehova ga-eji ya mee ka obi ruo anyị ala n’agbanyeghị ụdị nsogbu bịaara anyị.

IHE ANYỊ GA-AMỤTA N’AKA EZE DEVID

Dị ka anyị hụrụ n’akụkọ Eze Devid, gịnị ga-enyere anyị aka ma anyị mee mmehie dị oké njọ? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16 ruo na nke 19)

16. Olee otú obi dị Devid mgbe o mere ezigbo ihe ọjọọ?

16 Devid mere ezigbo ihe ọjọọ mere obi ji kwesị ịna-ama ya ikpe. Ya na Bat-shiba kwara iko, ya ahazie ka e gbuo di Bat-shiba, gbalịakwa ikpuchi ihe o mere. (2 Sam. 12:9) Ná mbido, Devid leghaara obi ahụ na-ama ya ikpe anya. Ihe ahụ o mere kpara adịm ná mma ya na Jehova aka ọjọọ, mee ka ọ na-echegbu onwe ya, meekwa ka ọ rịawa ọrịa. (Ọma 32:3, 4) Gịnị nyeere Devid aka ibelata nchegbu ihe ọjọọ o mere kpataara ya? Oleekwa ihe ga-enyere anyị aka ma ọ bụrụ na anyị emee ezigbo ihe ọjọọ?

17. Olee otú ihe Devid kwuru n’Abụ Ọma 51:1-4 si gosi na o ji obi ya niile chegharịa?

17 Rịọ Jehova mgbaghara. Devid mechara kpee ekpere ka Jehova gbaghara ya. O ji obi ya niile chegharịa ma gwa Jehova mmehie ya niile. (Gụọ Abụ Ọma 51:1-4.) O mere ka obi ruo ya ala, obi adịkwa ya ụtọ. (Ọma 32:1, 2, 4, 5) I mee mmehie dị oké njọ, agbalịla ikpuchi ya. Kama, kpee ekpere gwa Jehova ihe i mere. Obi ga-erutụ gị ala. Obi agaghịzi na-amacha gị ikpe. Ma ọ bụrụ na ị chọrọ ka gị na Jehova dịkwa ná mma, e nwere ihe ọzọ ị ga-eme.

18. Gịnị ka Devid mere mgbe a dọrọ ya aka ná ntị?

18 Nabata aka ná ntị a dọrọ gị. Mgbe Jehova dunyere Netan onye amụma ka ọ gaa gwa Devid mmehie ya, Devid azọwaghị onwe ya ma ọ bụ kwuo na mmehie ahụ adịchaghị njọ. Ihe o kwuru ozugbo gosiri na o kwetara na ọ bụghị naanị di Bat-shiba ka o mehiere, kama na onye ọ kacha mehie bụ Jehova. Devid nabatara aka ná ntị Jehova dọrọ ya, Jehova agbagharakwa ya. (2 Sam. 12:10-14) Anyị mee mmehie dị oké njọ, anyị kwesịrị ịgwa ndị Jehova họpụtara ka ha na-elekọta anyị. (Jems 5:14, 15) Anyị ekwesịghị ịzọwa onwe anyị. Ọ bụrụ na anyị anabata aka ná ntị a dọrọ anyị ma mee ihe a chọrọ ka anyị mee ozugbo, ọ gaghị ewe oge, obi eruo anyị ala, anyị enwewekwa obi ụtọ.

19. Gịnị ka anyị ga-ekpebisi ike ime?

19 Kpebisie ike na ị gaghị eme mmehie ahụ ọzọ. Eze Devid ma na ọ bụ Jehova ga-enyere ya aka ka ọ ghara ime mmehie ahụ ọzọ. (Ọma 51:7, 10, 12) Mgbe Jehova gbaghachaara Devid, o kpebiri na ya agaghị na-eche ihe ọjọọ n’obi ya. Ọ bụ ihe mere ka obi ruo ya ala.

20. Olee otú anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ na Jehova na-agbaghara anyị?

20 Anyị na-egosi na obi dị anyị ụtọ na Jehova na-agbaghara anyị ma ọ bụrụ na anyị arịọ ya ka ọ gbaghara anyị, nabata aka ná ntị a dọrọ anyị, gbalịsiekwa ike ka anyị ghara ime mmehie ahụ ọzọ. Ọ bụrụ na anyị emee ihe ndị a, obi ga-eru anyị ala. Otu nwanna mere mmehie dị oké njọ aha ya bụ James chọpụtara na ihe a bụ eziokwu. Ọ sịrị: “Mgbe m gwara ndị okenye ihe m mere, ọ dịzi m ka è bupụrụ ibu dị ezigbo arọ m bu. Obi malitere iru m ala.” Obi dị anyị ezigbo ụtọ ịma na “Jehova nọ ndị obi ha tiwara etiwa nso. Ọ na-azọpụtakwa ndị e gburu mmụọ ha.”—Ọma 34:18.

21. Olee otú anyị ga-esi kwe ka Jehova mee ka obi ruo anyị ala?

21 Ka oge ikpeazụ a na-akụ kwarapụ kwarapụ, ihe ndị na-eme ka anyị na-echegbu onwe anyị nwekwara ike ịkarị akarị. Ọ bụrụ na e nwee ihe na-eme ka ị na-echegbu onwe gị, rịọ Jehova ozugbo ka o nyere gị aka. Na-amụ Baịbụl mgbe niile. Mụta ihe n’ihe Hana, Pọl, na Devid mere. Rịọ Nna gị nke eluigwe ka o nyere gị aka ịchọpụta ihe mere i ji na-echegbu onwe gị. (Ọma 139:23) Kwe ka o nyere gị aka ná nsogbu gị, karịchaa ndị nke ọ na-enweghị ihe ị ga-emeli gbasara ha. I mee otú ahụ, o nwere ike ịdị gị otú ọ dị ọbụ abụ ahụ gwara Jehova, sị: “Mgbe m nwere ọtụtụ nchegbu n’ime obi m, nkasi obi gị malitere ime ka ahụ́ ruo mkpụrụ obi m ala.”—Ọma 94:19.

ABỤ NKE 4 “Jehova Bụ Onye Na-azụ M Dị Ka Atụrụ”

^ par. 5 E nwere mgbe ụfọdụ anyị na-echegbu onwe anyị gbasara nsogbu ndị na-abịara anyị. N’isiokwu a, anyị ga-amụ gbasara ndị ohu Jehova atọ a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl chegburu onwe ha, mụọkwa gbasara otú Jehova si kasie onye nke ọ bụla n’ime ha obi, meekwa ka ahụ́ ruo ya ala.

^ par. 1 NKỌWAKWU: Nchegbu na-eme ka obi koro mmadụ n’elu. Ihe ndị nwere ike ịkpata ya bụ ihe isi ike, ọrịa, nsogbu ezinụlọ ma ọ bụkwanụ nsogbu ndị ọzọ. Ihe ndị ọzọ nwere ike ịna-echegbu anyị bụ ihe ọjọọ ndị anyị mere n’oge gara aga. Anyị nwekwara ike ịna-echegbu onwe anyị gbasara nsogbu ndị nwere ike ịbịara anyị n’ọdịnihu.