Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe e ji ụrọ kpụọ e dere aha Belshaza na ya (Ihe a bụ otú ọ hà n’eziokwu)

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Olee otú ihe ndị mgbe ochie si gosi na e nwere onye bụ́ Belshaza chịrị Babịlọn?

RUO ọtụtụ afọ, ndị na-akatọ Baịbụl kwuru na Eze Belshaza a kpọrọ aha ya n’akwụkwọ Daniel enwetụdịghị mgbe ọ dịrị ndụ. (Dan. 5:1) Ihe mere ha ji chee otú ahụ bụ na ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie ahụghị ihe gosiri na e nwere mgbe ọ dịrị ndụ. Ma egwú dagharịrị n’afọ 1854. N’ihi gịnị?

N’afọ ahụ, onye na-anọchite anya mba Briten aha ya bụ J. G. Taylor nọ na-achọ ma è nwere ihe ọ ga-ahụ ná mkpọmkpọ ebe dị n’ebe bụ́bu obodo Ọọ, nke dịzi n’ebe ndịda Ịrak. N’ebe ahụ, nwoke ahụ hụrụ ihe ụfọdụ e ji ụrọ kpụọ dị n’otu nnukwu ụlọ elu. Nke ọ bụla n’ime ihe ndị ahụ dị ihe dị ka inch anọ n’ogologo. Ihe e ji dee ihe na ha bụ ụdị ide ihe a na-akpọ cuneiform. Ihe e dere n’otu n’ime ha bụ ekpere e kpere ka eze Babịlọn aha ya bụ Nabonaịdọs na ọkpara ya bụ́ Belshaza dịrị ogologo ndụ. Ihe a mere ka ndị ahụ na-akatọ Baịbụl kweta na e nwere mgbe Belshaza dịrị ndụ.

Ma, Baịbụl kwuru na e nwere mgbe Belshaza dịrị ndụ, kwuokwa na ọ bụ eze. Ndị na-akatọ Baịbụl ekwetakwaghị. Dị ka ihe atụ, n’ihe dị ka afọ 1875, otu onye sayensị bụ́ onye Briten aha ya bụ William Talbot dere na ụfọdụ ndị na-ekwu na “Bel-sar-ussur [Belshaza] chịrị n’otu oge ahụ Nabonaịdọs nna ya chịrị. Ma, e nwetụdịghị ihe gosiri na ihe a bụ eziokwu.”

Ma, a matara nke bụ́ eziokwu mgbe a hụrụ ihe ndị ọzọ e ji ụrọ kpụọ gosiri na e nwere mgbe Eze Nabonaịdọs, bụ́ nna Belshaza, na-anọghị n’isi obodo ha ruo afọ ụfọdụ. Olee ihe mere mgbe ahụ ọ na-anọghị ya? Akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Britannica kwuru, sị: “Mgbe Nabonaịdọs nọ n’obodo ọzọ, o nyefere Belshaza ọchịchị nakwa ihe ka ọtụtụ ná ndị agha ya.” N’ihi ya, e nwere ike ikwu na Belshaza nọ n’ocheeze nna ya na-achị n’oge ahụ nna ya na-anọghị ya. Ọ bụ ya mere otu ọkà mmụta n’ihe gbasara asụsụ na ihe ndị mgbe ochie aha ya bụ Alan Millard ji kwuo na ọ dabara adaba na “Akwụkwọ Daniel kpọrọ Belshaza ‘eze.’”

Ma, ihe kacha egosi ndị ohu Chineke na akwụkwọ Daniel kwuru eziokwu, sikwa n’ike mmụọ nsọ bụ na o so n’akwụkwọ ndị dị na Baịbụl.—2 Tim. 3:16.