Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 11

Ị̀ Dịla Njikere Ime Baptizim?

Ị̀ Dịla Njikere Ime Baptizim?

“[Baptizim] na-azọpụtakwa unu ugbu a.”​—1 PITA 3:21.

ABỤ NKE 28 Ịbụ Enyi Jehova

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Gịnị ka mmadụ kwesịrị ime tupu ya ebido ịrụ ụlọ?

KA E were ya na mmadụ chọrọ ịrụ ụlọ. Ọ ma ụdị ụlọ ọ chọrọ ịrụ. Ò kwesịrị ịga ahịa ozugbo zụọ ihe ndị ọ ga-eji arụ ụlọ, bidokwa ịrụ ya? Mba. Tupu ya ebido, e nwere ihe dị mkpa o kwesịrị ime. Ọ ga-ebu ụzọ gbakọọ ihe ịrụ ụlọ ahụ ga-efu ya. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na o kwesịrị ibu ụzọ mata ma ò nwere ego ga-ezuru ya ịrụcha ụlọ ahụ. Ibu ụzọ gbakọọ ihe ọ ga-efu ya nwere ike ime ka o nwee ike ịrụcha ụlọ ahụ ọ chọrọ ịrụ.

2. Dị ka e kwuru na Luk 14:​27-30, gịnị ka i kwesịrị ichebara echiche nke ọma tupu gị emee baptizim?

2 Ịhụ Jehova n’anya na inwe obi ụtọ maka ihe ndị o meere gị ò meela ka i chewe gbasara ime baptizim? Ọ bụrụ otú ahụ, i kwesịrị ikpebi ụdị ihe ahụ onye chọrọ ịrụ ụlọ ga-ekpebi. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Chegodị ihe Jizọs kwuru na Luk 14:​27-30. (Gụọ ya.) Ihe Jizọs na-ekwu bụ ihe ịbụ onye na-eso ụzọ ya pụtara. Onye chọrọ ịbụ onye na-eso ụzọ ya kwesịrị ịdị njikere maka “ihe ọ ga-efu” ya, ya bụ, idi nsogbu na ịhapụ ihe ụfọdụ. (Luk 9:​23-26; 12:​51-53) N’ihi ya, tupu gị emee baptizim, i kwesịrị iche echiche nke ọma gbasara ihe niile ya na ya so. Ọ ga-eme ka ị dị njikere iji obi gị niile na-efe Jehova ma i mechaa baptizim.

3. Olee ihe anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu a?

3 Mmadụ ò kwesịrị ịgbalị mee baptizim n’agbanyeghị ihe ọ ga-efu ya? Ee. O kwesịrị. Baptizim na-eme ka ọtụtụ ngọzi ruo mmadụ aka, ma ugbu a ma n’ọdịnihu. Ka anyị leba anya n’ajụjụ ụfọdụ dị mkpa gbasara baptizim. Ọ ga-enyere gị aka ịza ajụjụ bụ́, “Àdịla m njikere ime baptizim?”

IHE I KWESỊRỊ ỊMA GBASARA INYEFE CHINEKE ONWE GỊ NA IME BAPTIZIM

4. (a) Olee otú mmadụ si enyefe Chineke onwe ya? (b) Gịnị ka mmadụ ‘ịjụ onwe ya’ e kwuru okwu ya na Matiu 16:24 pụtara?

4 Olee otú mmadụ si enyefe Chineke onwe ya? Tupu gị emee baptizim, i kwesịrị inyefe Chineke onwe gị. Otú ị ga-esi nyefee Chineke onwe gị bụ iji obi gị niile kpee ekpere, gwa ya na ị ga-eji ndụ gị na-efe ya ruo mgbe ebighị ebi. I nyefee Chineke onwe gị, ị ‘ga-ajụ onwe gị.’ (Gụọ Matiu 16:24.) Ị bụzi nke Jehova, nke bụ́kwanụ ezigbo ihe ọma. (Rom 14:8) Ihe ị na-agwa Jehova bụ na malite ugbu a gawa, ihe ga-akacha gị mkpa bụ ife ya, ọ bụghị ime ihe ga-adị gị mma. Inyefe Chineke onwe gị pụtara na i kwere ya nkwa ị na-agaghị eji gwuo egwu. Jehova anaghị amanye anyị ikwe ya ụdị nkwa ahụ. Ma, anyị kwehaala ya nkwa, ọ na-atụ anya ka anyị mezuo ya.​—Ọma 116:​12, 14.

5. Olee ihe dị iche n’inyefe Chineke onwe gị na ime baptizim?

5 Olee ihe dị iche n’inyefe Chineke onwe gị na ime baptizim? Ọ bụ naanị gị na Jehova ma mgbe i nyefere ya onwe gị. Ma, a na-eme baptizim n’ihu ọtụtụ ndị. Ọ na-abụkarị ná mgbakọ. I mee baptizim, ị na-egosi ndị ọzọ na i nyefeela Jehova onwe gị. * N’ihi ya, baptizim i mere na-egosi ndị ọzọ na i ji obi gị niile, mkpụrụ obi gị niile, uche gị niile, na ike gị niile hụ Jehova n’anya nakwa na i kpebiela ife ya ruo mgbe ebighị ebi.​—Mak 12:30.

6-7. Dị ka e kwuru na 1 Pita 3:​18-22, olee ihe abụọ mere baptizim ji dị mkpa?

6 Ime baptizim ọ̀ dị mkpa n’eziokwu? Chegodị gbasara ihe e kwuru na 1 Pita 3:​18-22. (Gụọ ya.) Otú ahụ ụgbọ Noa rụrụ si gosi na o nwere okwukwe, ka baptizim si egosi na i nyefeela Jehova onwe gị. Ma, baptizim ọ̀ dị mkpa n’eziokwu? Ee. Ọ dị mkpa. Pita kwuru ihe mere o ji dị mkpa. Nke mbụ bụ na ọ ‘na-azọpụta gị.’ Baptizim nwere ike ịzọpụta anyị ma anyị mee ihe gosiri na anyị nwere okwukwe na Jizọs nakwa na anyị kwetara na ọ nwụrụ n’ihi anyị, na a kpọlitere ya ya agaa eluigwe, nakwa na ọ nọ “n’aka nri Chineke” ugbu a.

7 Nke abụọ bụ na baptizim na-eme ka anyị nwee ‘ezi akọnuche.’ Anyị nyefee Chineke onwe anyị ma mee baptizim, anyị na Chineke ga-adị n’ezigbo mma. Chineke ga-agbaghara anyị mmehie anyị n’ihi na anyị ji obi anyị niile chegharịa ma nwee okwukwe n’àjà ahụ Jizọs chụrụ. Ọ ga-eme ka anyị nwee ezi akọnuche n’ebe Chineke nọ.

8. Olee ihe kwesịrị ime ka i kpebie ime baptizim?

8 Gịnị kwesịrị ime ka i kpebie ime baptizim? Ị mụọla Baịbụl nke ọma mụta ọtụtụ ihe gbasara Jehova, ma àgwà ya ma otú o si eme ihe. Ihe ndị ị mụtara gbasara ya metụrụ gị n’obi, meekwa ka ị hụ ya n’anya nke ukwuu. Ihe kacha mkpa mere i ji kpebie ime baptizim kwesịrị ịbụ na ị hụrụ Jehova n’anya.

9. Gịnị ka ime baptizim n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ e kwuru na Matiu 28:​19, 20 pụtara?

9 Ihe ọzọ mere ị ga-eji kpebie ime baptizim bụ na i kwetara na ihe ndị ị mụtara na Baịbụl bụ eziokwu. Chegodị ihe Jizọs kwuru mgbe o nyere iwu ka e mee ndị na-eso ụzọ. (Gụọ Matiu 28:​19, 20.) Dị ka Jizọs kwuru, a ga-eme ndị mmadụ baptizim “n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ.” Gịnị ka ọ pụtara? I kwesịrị iji obi gị niile kweta ihe Baịbụl kwuru gbasara Jehova, Ọkpara ya bụ́ Jizọs, nakwa mmụọ nsọ. Eziokwu ndị a na-akpa ike. Ha nwere ike iru gị n’obi. (Hib. 4:12) Ka anyị leba anya n’ụfọdụ n’ime ha.

10-11. Olee eziokwu gbasara Nna anyị nke eluigwe ị mụtara ma kweta?

10 Cheta mgbe ị mụtara eziokwu ndị a gbasara Nna anyị nke eluigwe: ‘Aha ya bụ Jehova,’ na ọ bụ ‘naanị ya Kasị Elu n’ụwa niile,’ nakwa na ọ bụ naanị ya bụ “ezi Chineke.” (Ọma 83:18; Aịza. 37:16) Ọ bụ Jehova kere anyị. Ọ bụkwa ya “nwe nzọpụta.” (Ọma 3:8; 36:9) Ọ haziri otú a ga-esi zọpụta anyị n’aka mmehie na ọnwụ, meekwa ka anyị nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. (Jọn 17:3) Inyefe Chineke onwe gị na ime baptizim ga-eme ka a mata na ị ghọọla Onyeàmà Jehova. (Aịza. 43:​10-12) Ị ga-eso ná ndị na-efe Chineke n’ụwa niile, ndị ji obi ụtọ na-aza aha ya, na-emekwa ka ndị ọzọ mara gbasara ya.​—Ọma 86:12.

11 Ịghọta ihe Baịbụl na-akụzi gbasara Nna anyị nke eluigwe bụ ihe ọma na-enweghị atụ. I kweta eziokwu ndị a magburu onwe ha, obi gị ga-agwa gị ka i kpebie na ị ga-enyefe Jehova onwe gị ma mee baptizim.

12-13. Olee eziokwu gbasara Ọkpara Chineke ị mụtara ma kweta?

12 Gịnị ka i mere mgbe ị mụtara eziokwu ndị a gbasara Ọkpara Chineke? Jizọs bụ onye nke abụọ kachanụ n’eluigwe na ụwa. Ọ bụ Onye Mgbapụta anyị. O ji obi ya niile kweta ịnwụ maka anyị. Ọ bụrụ na omume anyị egosi na anyị nwere okwukwe n’àjà ahụ ọ chụrụ, Chineke ga-agbaghara anyị mmehie anyị, anyị na ya adịrị ná mma, anyị enwetakwa ndụ ebighị ebi. (Jọn 3:16) Jizọs bụ Nnukwu Onye Nchụàjà. Ọ chọrọ inyere anyị aka ka anyị rite uru n’àjà ahụ ọ chụrụ nakwa ka anyị na Chineke dịrị n’ezigbo mma. (Hib. 4:15; 7:​24, 25) Ebe ọ bụ Eze nke Alaeze Chineke, ọ bụ ya ka Chineke ga-esi n’aka ya mee ka e doo aha ya nsọ, mee ka ihe ọjọọ kwụsị, meekwa ka ndị mmadụ nweta ngọzi ebighị ebi na Paradaịs na-abịanụ. (Mat. 6:​9, 10; Mkpu. 11:15) Ọ bụ Jizọs ka anyị kwesịrị ịna-eso nzọụkwụ ya. (1 Pita 2:21) O ji ndụ ya niile mee uche Chineke, sikwa otú ahụ gosi anyị ihe anyị kwesịrị ime.​—Jọn 4:34.

13 I kweta ihe Baịbụl na-akụzi gbasara Jizọs, ị ga-ahụ Ọkpara Chineke n’anya. Ịhụnanya ahụ ga-eme ka ị chọọ iji ndụ gị na-eme uche Chineke otú ahụ Jizọs mere. Ọ ga-emekwa ka ị chọọ inyefe Jehova onwe gị ma mee baptizim.

14-15. Olee eziokwu gbasara mmụọ nsọ ị mụtara ma kweta?

14 Olee ihe i chere mgbe ị mụtara eziokwu ndị a gbasara mmụọ nsọ? Mmụọ nsọ abụghị Chineke. Kama ọ bụ ike Chineke. Jehova ji mmụọ nsọ ya gwa ndị dere Baịbụl ihe ha dere, jirikwa ya na-enyere anyị aka ịghọta ihe anyị gụtara na ya ma na-eme ya eme. (Jọn 14:26; 2 Pita 1:21) Jehova na-eji mmụọ nsọ ya enye anyị “ike karịrị ike nkịtị.” (2 Kọr. 4:7) Mmụọ nsọ na-enye anyị ike ikwusa ozi ọma, imeri ọnwụnwa, ịtachi obi ná nsogbu bịaara anyị, na-emekwa ka anyị ghara ịda mbà n’obi. Ọ na-enyere anyị aka ịna-akpa àgwà ndị magburu onwe ha so ná “mkpụrụ nke mmụọ nsọ.” (Gal. 5:22) Chineke na-enye ndị tụkwasịrị ya obi mmụọ nsọ ma ha jiri obi ha niile na-arịọ ya.​—Luk 11:13.

15 Obi dị anyị ụtọ ịmata na mmụọ nsọ ga-enyere ndị na-efe Chineke aka ịna-ejere ya ozi. I kweta eziokwu ndị ị mụtara gbasara mmụọ nsọ, ọ ga-eme ka ị chọọ inyefe Chineke onwe gị ma mee baptizim.

16. Gịnị na gịnị ka anyị mụtarala n’isiokwu a?

16 Ikpebi inyefe Chineke onwe gị ma mee baptizim dị ezigbo mkpa. Dị ka anyị mụtara, i kwesịrị ịdị njikere maka ihe ọ ga-efu gị, ya bụ, idi nsogbu na ịhapụ ihe ụfọdụ. Ma uru ị ga-erite na ya karịrị ihe ọ bụla o furu gị. Baptizim nwere ike ịzọpụta gị, meekwa ka i nwee ezi akọnuche n’ebe Chineke nọ. Ihe kacha mkpa mere i ji kpebie ime baptizim kwesịrị ịbụ na ị hụrụ Jehova Chineke n’anya. I kwesịkwara iji obi gị niile kweta eziokwu ndị ahụ ị mụtara gbasara Nna, Ọkpara, na mmụọ nsọ. I chechaa gbasara ihe niile anyị mụrụla n’isiokwu a, gịnị ka ị ga-aza n’ajụjụ bụ́, “Àdịla m njikere ime baptizim?”

IHE I KWESỊRỊ IME TUPU GỊ EMEE BAPTIZIM

17. Olee ihe ụfọdụ mmadụ kwesịrị ime tupu e mee ya baptizim?

17 Ọ bụrụ na i chere na ị dịla njikere ime baptizim, ọ ga-abụ na i meela ọtụtụ ihe ga-eme ka gị na Jehova dị ná mma. * Ịmụ Baịbụl emeela ka ị mata ọtụtụ ihe gbasara Jehova na Jizọs. I nweela okwukwe. (Hib. 11:6) I ji obi gị niile kweta nkwa ndị Jehova kwere na Baịbụl, obi esiekwa gị ike na okwukwe i nwere n’àjà Jizọs chụrụ ga-anapụtali gị n’aka mmehie na ọnwụ. I chegharịala ná mmehie gị. Ihe ọjọọ ndị i mere na-ewuteru gị n’ọkpụkpụ. Ị rịọkwala Jehova ka ọ gbaghara gị. I chigharịala, ya bụ, ị kwụsịla ndụ ọjọọ ị na-ebi ma bido ibi ndụ otú ga-adị Chineke mma. (Ọrụ 3:19) Ọ na-agụ gị agụụ ịgwa ndị ọzọ ihe i kweere. I ruola eru ịbụ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim, sorokwa ọgbakọ na-aga ozi ọma. (Mat. 24:14) Jehova ji gị eme ọnụ n’ihi na i meela ihe ndị a dị ezigbo mkpa. I meela ka obi dị ya ezigbo ụtọ.​—Ilu 27:11.

18. Olee ihe ọzọ ị ga-eme tupu gị emee baptizim?

18 Tupu e mee gị baptizim, e nwere ihe ndị ọzọ i kwesịrị ime. Dị ka anyị mụtara, ị ga-enyefe Jehova onwe gị. Kpee ekpere, jiri obi gị niile kwe ya nkwa na ị ga-eji ndụ gị na-eme uche ya. (1 Pita 4:2) Gwazie onye na-ahaziri ndị okenye ọrụ n’ọgbakọ unu na ị chọrọ ime baptizim. Ọ ga-agwa ndị okenye ụfọdụ ka gị na ha nọkọọ. Biko, ụjọ ha atụla gị. Cheta na ụmụnna ndị a ma gị. Ha nwere obiọma, hụkwa gị n’anya. Gị na ha ga-eleba anya n’ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ Baịbụl na-akụzi ị mụtara. Ha chọrọ ijide n’aka na ị ghọtara ihe ndị ahụ Baịbụl na-akụzi nakwa na ị ma ihe mere mmadụ ji kwesị inyefe Chineke onwe ya ma mee baptizim. Ha kweta na ị dịla njikere ime baptizim, ha ga-agwa gị na ị ga-eme ya ná mgbakọ ọzọ unu ga-aga.

IHE I KWESỊRỊ IME MA I MECHAA BAPTIZIM

19-20. Gịnị ka i kwesịrị ime ma i mechaa baptizim? Oleekwa otú ị ga-esi eme ya?

19 I mechaa baptizim, olee ihe i kwesịrị ịna-eme? * Cheta na inyefe Chineke onwe gị pụtara na i kwela ya nkwa. Jehova na-atụkwa anya ka i mezuo ya. N’ihi ya, i mechaa baptizim, otú i si ebi ndụ kwesịrị igosi na ị na-emezu nkwa ahụ i kwere Jehova. Olee otú ị ga-esi mee ya?

20 Ụkwụ sie gị ike n’ọgbakọ. Ebe ị bụ Onye Kraịst e mere baptizim, i so n’ụmụnna zuru ụwa ọnụ. (1 Pita 2:17) Ụmụnna gị ndị nwoke na ndị nwaanyị dị ka ndị ezinụlọ gị. Ịga ọmụmụ ihe niile ga-eme ka gị na ha na-adịkwu ná mma. Na-agụ Okwu Chineke kwa ụbọchị ma na-echebara ihe ị gụrụ echiche. (Ọma 1:​1, 2) Ị gụchaa otu ebe na Baịbụl, wepụta oge chebara ihe ị gụrụ echiche. Ọ ga-eme ka ihe ị gụrụ ruo gị n’obi. “Na-ekpe ekpere mgbe niile.” (Mat. 26:41) Ekpere si gị n’ala ala obi ga-eme ka gị na Jehova na-adịkwu ná mma. ‘Buru ụzọ na-achọ alaeze Chineke.’ (Mat. 6:33) Otú ị ga-esi eme ya bụ iwere ozi ọma ka ihe kacha mkpa ná ndụ gị. Ikwusa ozi ọma mgbe niile ga-eme ka okwukwe gị na-esi ike. I nwekwara ike inyere ndị ọzọ aka ka ha nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi.​—1 Tim. 4:16.

21. Gịnị ka ime baptizim ga-eme ka i nweta?

21 Ikpebi inyefe Jehova onwe gị na ime baptizim bụ ihe kacha mkpa mmadụ nwere ike ikpebi ime ná ndụ ya. Ọ bụ eziokwu na ọ ga-efu gị ihe, ma ì kwesịrị ime ya n’agbanyeghị ihe ọ ga-efu gị? Ee. Nsogbu ọ bụla ga-abịara gị n’ụwa ochie a “na-adịru nwa oge, dịkwa mfe.” (2 Kọr. 4:17) Ma, ime baptizim ga-eme ka ndụ gị ka mma ugbu a, gị enweekwa olileanya inweta “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie.” (1 Tim. 6:19) N’ihi ya, biko chesie echiche ike ma kpee ekpere gbasara ihe ị ga-aza n’ajụjụ ahụ bụ́, “Àdịla m njikere ime baptizim?”

ABỤ NKE 50 Ekpere M Ji Nyefee Chineke Onwe M

^ par. 5 Ị̀ na-eche echiche ime baptizim? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ bụ gị ka e bu n’obi dee isiokwu a. Anyị ga-eleba anya n’ajụjụ ụfọdụ gbara ọkpụrụkpụ n’okwu a dị mkpa. Ihe ị ga-aza ga-enyere gị aka ikpebi ma ị̀ dịla njikere ime baptizim.

^ par. 19 Ọ bụrụ na ị mụchabeghị akwụkwọ bụ́ Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị? na Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke,” gị na onye na-amụrụ gị ihe kwesịrị ịna-amụ ya ruo mgbe ị mụchara ha abụọ.