Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ole ndị bụ ndị uwe ojii ụlọ nsọ nke ndị Juu? Gịnị bụ ọrụ ha?

Otu n’ime ọrụ ndị si n’ebo Livaị na-abụghị ndị nchụàjà na-arụ bụ ọrụ yiri ọrụ ndị uwe ojii. Onye na-elekọta ọrụ ahụ bụ onyeisi ndị nche ụlọ nsọ. Otu onye Juu na-ede akwụkwọ, aha ya bụ Faịlo, kọwara ọrụ ndị ahụ na-arụ, sị: “Ụfọdụ n’ime ha na-anọ n’ọnụ ụzọ e si abata ụlọ nsọ ahụ, na-eche ya nche. E nwekwara ndị na-anọ n’ihu ebe nsọ, na-eche ya nche. Ha anaghị ekwe ka onye ọ bụla na-ekwesịghị ịbata n’ebe nsọ ahụ bata, ọ bụrụgodị na onye ahụ amaghị ama. Ụfọdụ na-aga ụlọ nsọ ahụ gburugburu, na-eche ya nche ehihie na abalị, ụfọdụ chee n’ehihie, ụfọdụ echee n’abalị.”

Ndị Sanhedrin nwere ike ịgwa ndị uwe ojii ụlọ nsọ ka ha nyere ha aka. Ọ bụ naanị ndị a ka ndị ọchịchị Rom hapụrụ ka ha na-eji mma agha.

Otu ọkà mmụta aha ya bụ Joachim Jeremias sịrị: “Ihe ahụ Jizọs ji iwe gwa ndị bịara ịnwụchi ya, nke bụ́ na kwa ụbọchị ọ kụziri ihe n’Ụlọ Nsọ, ha anwụchighị ya, ga-akacha doo anya ma ọ bụrụ na ọ bụ ndị uwe ojii Ụlọ Nsọ bịara ịnwụchi ya.” (Mat. 26:55) Ọkà mmụta ahụ kweere na ọ bụkwa ndị uwe ojii ụlọ nsọ ka e dunyere ka ha gaa nwụchie Jizọs tupu mgbe ahụ. (Jọn 7:​32, 45, 46) Ndị Sanhedrin mechara dunye onyeisi ndị nche ụlọ nsọ na ụfọdụ ndị ha na ya na-arụ ka ha gaa kpụta ndịozi Jizọs. Ọ dịkwa ka ọ̀ bụ ha si n’ụlọ nsọ dọkpụrụ Pọl onyeozi gawa.​—Ọrụ 4:​1-3; 5:​17-27; 21:​27-30.