Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 13

Jirinụ Obi Unu Niile Hụ Ibe Unu n’Anya

Jirinụ Obi Unu Niile Hụ Ibe Unu n’Anya

“Nweenụ ịhụnanya siri ike n’ebe ibe unu nọ site n’obi unu.”​—1 PITA 1:22.

ABỤ NKE 109 Jirinụ Obi Unu Niile Hụ Ibe Unu n’Anya

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

N’abalị ikpeazụ Jizọs na ndịozi ya nọrọ, o kwusiri okwu ike gbasara ịhụnanya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 1 na nke 2)

1. Olee iwu doro anya Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya? (Kọwaa ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)

N’ABALỊ bọtara ụbọchị Jizọs nwụrụ, o nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu doro anya. Ọ sịrị ha: “Dị nnọọ ka m hụrụ unu n’anya, ka unu na-ahụrịtakwa ibe unu n’anya.” Ọ sịkwara: “Mmadụ niile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.”​—Jọn 13:​34, 35.

2. Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị hụ ụmụnna anyị n’anya?

2 Jizọs kwuru na ọ bụrụ na ndị na-eso ụzọ ya ahụ ndị ọzọ n’anya otú yanwa si hụ ha, mmadụ niile ga-eji ya mata na ha bụ ezigbo ndị na-eso ụzọ ya. Ihe ahụ Jizọs kwuru mere n’oge ndịozi ya. Ọ na-emekwa ugbu a. Ọ bụ ya mere o ji dị ezigbo mkpa ka anyị hụ ụmụnna anyị n’anya ọ bụrụgodị na o siiri anyị ike.

3. Olee ihe anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu a?

3 Ezughị okè na-eme ka o siere anyị ike iji obi anyị niile hụ ụmụnna anyị n’anya. N’agbanyeghị ya, anyị kwesịrị ịgbalị na-eme ka Kraịst. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’otú ịhụnanya ga-esi nyere anyị aka ịna-eme udo, ghara ịna-ele mmadụ anya n’ihu, na-elekwa ndị ọzọ ọbịa. Ka ị na-amụ ihe a, jụọ onwe gị, sị: ‘Olee ihe m ga-amụta n’aka ụmụnna ndị na-akwụsịghị ịhụ ụmụnna ha n’anya n’agbanyeghị na o siiri ha ike?’

NA-EME UDO

4. Dị ka e kwuru na Matiu 5:​23, 24, gịnị mere anyị ji kwesị ịgbalịsi ike ka anyị na nwanna na-ewere anyị iwe mee udo?

4 Jizọs kụziiri anyị uru ọ ga-abara anyị ma anyị na nwanna na-ewere anyị iwe mee udo. (Gụọ Matiu 5:​23, 24.) O kwusiri ike na anyị na ndị ọzọ kwesịrị ịdị ná mma ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ihe dị Chineke mma. Obi na-adị Jehova ụtọ ma ọ bụrụ na anyị emee ihe niile anyị nwere ike ime ka anyị na ụmụnna anyị dịrị n’udo. Ọ gaghị anabata ofufe anyị ma anyị buuru mmadụ iwe n’obi ma gharadị ịgbalị ka anyị na ya mee udo.​—1 Jọn 4:20.

5. Gịnị mere o ji siere otu nwanna ike ime udo?

5 O nwere ike isiri anyị ike ime udo. N’ihi gịnị? Chegodị gbasara ihe mere otu nwanna aha ya bụ Mark. * Iwe were ya mgbe otu nwanna baara ya mba ma gwa ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ha ihe na-adịghị mma gbasara ya. Gịnịzi ka Mark mere? Ọ sịrị: “Iwe were m, mụ abaara ya mba.” Ma, ihe Mark mere mechara wute ya, ya agbalịa ịrịọ nwanna ahụ mgbaghara ma mee udo. Ma, nwanna ahụ ekweghị ka ha mee udo. Ná mbido, Mark chere, sị, ‘Gịnị mere mụnwa ga-eji na-agbalị ka anyị mee udo ebe ọ bụ na yanwa achọghị?’ Ma, onye nlekọta sekit gwara ya ka ọ ghara ịda mbà. Gịnị ka Mark mechara mee?

6. (a) Olee ihe Mark mere iji mee udo? (b) Olee otú Mark si mee ihe Ndị Kọlọsi 3:​13, 14 kwuru?

6 Mark ji ire ya gụọ ezé ya ọnụ, chọpụta na ya adịghị umeala n’obi nakwa na ya na-achọkarị igosi na ya ka ndị ọzọ mma. Ọ matara na ya kwesịrị ịgbanwe àgwà ya. (Kọl. 3:​8, 9, 12) O weturu obi gakwuru nwanna ahụ ọzọ, rịọ ya mgbaghara maka ihe o mere. Mark dekwaara ya akwụkwọ ozi, sị ya na ihe ahụ merenụ wutere ya nakwa na ya chọrọ ka ha kpezie. Mark nyedịrị nwanna ahụ ụmụ obere onyinye o chere ga-amasị ya. Ma, ọ dị mwute na nwanna ahụ ka nọkwa na-eburu ya iwe n’obi. N’agbanyeghị ya, Mark akwụsịghị ịhụ nwanna ahụ n’anya ma na-agbaghara ya otú ahụ Jizọs kwuru. (Gụọ Ndị Kọlọsi 3:​13, 14.) Ọ bụrụgodị na anyị agbachaa mbọ ka anyị na ndị ọzọ mee udo, ma ha ajụ, ezigbo ịhụnanya Ndị Kraịst ga-eme ka anyị ghara ịkwụsị ịgbaghara ha ma na-ekpe ekpere ka anyị na ha dịkwa ná mma.​—Mat. 18:​21, 22; Gal. 6:9.

Ọ bụrụ na mmadụ na-ewere anyị iwe, o nwere ike ịdị mkpa ka anyị gbalịa ugboro ugboro ka anyị na ya mee udo (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7 na nke 8) *

7. (a) Olee ihe Jizọs gwara anyị mee? (b) Olee ihe mere otu nwanna nwaanyị?

7 Jizọs gwara anyị ka anyị na-emeso ndị ọzọ otú anyị chọrọ ka e si na-emeso anyị. O kwukwara na anyị ekwesịghị ịna-ahụ naanị ndị hụrụ anyị n’anya n’anya. (Luk 6:​31-33) Ọ bụ eziokwu na ọ naghị emekarị, ọ bụrụkwanụ na nwanna na-agbara gị ọsọ ma jụ ikele gị? Ọ bụ ihe mere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Lara. Ọ sịrị: “Otu nwanna nwaanyị anaghị atụpụrụ m ọnụ. Amaghịkwa m ihe kpatara ya. Ọ gbawara m obi, mee ka ịga ọmụmụ ihe ghara ịna-atọ m ụtọ.” Ná mbido, Lara chere, sị: ‘O nweghị ihe m mere ya. A sịdị ka e kwuwe, ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ na-ekwukwa na o nwere otú nwanna nwaanyị a si akpa àgwà.’

8. Olee ihe otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Lara mere iji mee udo? Gịnịkwa ka akụkọ ya na-akụziri anyị?

8 Lara gbalịrị ime udo. O kpere ekpere ma kpebie ịgakwuru nwanna nwaanyị ahụ. Ha kwuru gbasara nsogbu ahụ, ha abụọ amakụọ, meekwa udo. O yiri ka okwu ahụ ò biela. Lara sịrị: “Ma, nwanna nwaanyị ahụ mechara kwụsịkwa ịtụpụrụ m ọnụ otú ahụ o mere ná mbido. Ihe ahụ o mere wutere m.” Ná mmalite, Lara chere na naanị ihe ga-eme ka obi dịwakwa ya ụtọ bụ ma nwanna nwaanyị ahụ gbanwee. Ma, o mechara chọpụta na ihe kacha mma ọ ga-eme bụ ka ọ ghara ịkwụsị ịhụ ya n’anya na ‘ịna-agbaghara ya kpamkpam.’ (Efe. 4:32–5:2) Lara chetara na ezigbo ịhụnanya Ndị Kraịst anaghị “agụkọ ihe ọjọọ. Ọ na-edi ihe niile, na-ekwere ihe niile, na-enwe olileanya ihe niile, na-atachi obi n’ihe niile.” (1 Kọr. 13:​5, 7) Obi ruziri ya ala. Nwanna nwaanyị nke ọzọ ahụ mechara mesapụwara ya ihu. Ọ bụrụ na ị na-agbalị ka gị na ụmụnna gị na-adị n’udo ma na-ahụ ha n’anya, ka obi sie gị ike na “Chineke nke ịhụnanya na nke udo ga-anọnyekwara” gị.​—2 Kọr. 13:11.

ELELA MMADỤ ANYA N’IHU

9. Dị ka e kwuru n’Ọrụ Ndịozi 10:​34, 35, gịnị mere anyị ekwesịghị ịna-ele mmadụ anya n’ihu?

9 Jehova anaghị ele mmadụ anya n’ihu. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 10:​34, 35.) Ọ bụrụ na anyị anaghị ele mmadụ anya n’ihu, anyị na-egosi na anyị bụ ụmụ ya. Anyị na-erubekwa isi n’iwu ahụ sịrị ka anyị hụ ndị agbata obi anyị n’anya dị ka onwe anyị. Anyị na-emekwa ka udo dịrị n’ọgbakọ.​—Rom 12:​9, 10; Jems 2:​8, 9.

10-11. Olee otú otu nwanna nwaanyị si kwụsị iche ihe na-adịghị mma gbasara ndị obodo ọzọ?

10 O nwere ike ịna-esiri ụfọdụ ndị ike ịghara ile mmadụ anya n’ihu. Dị ka ihe atụ, chee gbasara ihe mere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Ruth. Mgbe ọ ka na-eto eto, onye si n’obodo ọzọ mere ya ihe na-adịghị mma. Gịnị ka ọ kpataara ya? Ruth sịrị: “M kpọrọ ihe niile gbasara obodo ahụ asị. M chere na ndị niile bụ́ ndị obodo ahụ bụ otu, ma ụmụnna anyị.” Olee otú Ruth si kwụsị iche ihe na-adịghị mma gbasara ndị obodo ahụ?

11 Ruth chọpụtara na ya kwesịrị ịgbalị kwụsị iche otú ahụ. Ọ gụrụ akụkọ gbasara ndị obodo ahụ n’Akwụkwọ Mgbaafọ. O kwuru, sị: “M gbalịrị na-eche ihe dị mma gbasara ndị obodo ahụ. M bidoro ịchọpụta na ụmụnna ndị obodo ahụ na-anụ ọkụ n’obi n’ozi Jehova. M ghọtara na ha so n’ụmụnna anyị nọ n’ụwa dum.” Ka oge na-aga, Ruth ghọtara na ya kwesịrị ịna-ahụkwu ndị ọzọ n’anya. O kwuru, sị: “Mgbe ọ bụla m hụrụ ụmụnna ndị obodo ahụ, m na-agbalịsi ike ka mụ na ha bụrụ enyi. M na-akpanyere ha ụka, matakwa ha nke ọma.” Gịnị meziri? Ọ sịrị: “M mechara kwụsị iche otú ahụ gbasara ha.”

Ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị niile hụ ụmụnna anyị niile n’anya, anyị agaghị na-ele mmadụ anya n’ihu (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12 na nke 13) *

12. Olee nsogbu otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Sarah nwere?

12 Ụfọdụ nwere ike ịna-ele mmadụ anya n’ihu n’amaghị ama. Dị ka ihe atụ, otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Sarah chere na ya anaghị ele mmadụ anya n’ihu n’ihi na ọ naghị eji agbụrụ mmadụ, otú ego mmadụ hà, ma ọ bụ ọrụ mmadụ na-arụ n’ọgbakọ ekpebi ụdị onye ọ bụ. Ma, o kwuru, sị: “M malitere ịchọpụta na m na-ele mmadụ anya n’ihu.” Olee otú o si eme ya? Sarah si n’ezinụlọ ndị gụrụ oké akwụkwọ, ya ana-achọkwa ka ya na ndị gụrụ oké akwụkwọ na-akpakọrịta. E nwedịrị mgbe ọ gwara otu enyi ya, sị: “Ụmụnna ndị mụ na ha na-akpakọrịta bụ ndị gụrụ oké akwụkwọ. M na-eze ndị na-agụghị akwụkwọ eze.” O doro anya na Sarah kwesịrị ịgbanwe otú o si eche echiche. Olee ihe nyeere ya aka?

13. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’otú Sarah si gbanwee?

13 Otu onye nlekọta sekit nyeere Sarah aka ịgbanwe. Sarah sịrị: “Ọ jara m mma maka ozi m ji obi m niile na-eje, azịza dị mma m na-aza n’ọmụmụ ihe, nakwa otú m si mara Baịbụl. Ọ kọwaziiri m na ka anyị na-amụtakwu Baịbụl, anyị kwesịrị ịna-akpakwu àgwà ọma e ji mara Ndị Kraịst, dị ka ịdị umeala n’obi, ịma ebe ike anyị ruru, na ime ebere.” Sarah mere ihe ahụ onye nlekọta sekit gwara ya. O kwuru, sị: “M chọpụtara na ihe kacha mkpa bụ ka anyị hụ ndị ọzọ n’anya ma na-emere ha obiọma.” N’ihi ya, otú o si ele ụmụnna ya anya gbanwere. Ọ sịrị: “M gbalịrị ịghọta àgwà ndị mere ka Jehova hụ ha n’anya nke ukwuu.” Anyịnwa kwanụ? Anyị ekwesịghị iche na anyị ka ndị ọzọ mma n’ihi ebe anyị gụruru akwụkwọ. Ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị niile hụ ụmụnna anyị niile n’anya, anyị agaghị na-ele mmadụ anya n’ihu.​—1 Pita 2:17.

NA-ELE NDỊ ỌZỌ ỌBỊA

14. Dị ka e kwuru ná Ndị Hibru 13:​16, olee otú obi na-adị Jehova ma anyị lee ndị ọzọ ọbịa?

14 Jehova anaghị eji ile ọbịa egwu egwu. (Gụọ Ndị Hibru 13:16.) Ọ na-ewere ya ka ofufe anyị na-efe ya, karịchaa ma ọ bụrụ ndị ihe na-esiri ike ka anyị nyeere aka. (Jems 1:27; 2:​14-17) Ọ bụ ihe mere Baịbụl ji gwa anyị ka anyị ‘na-ele ọbịa.’ (Rom 12:13) Ọ bụrụ na anyị ana-ele ndị ọzọ ọbịa, anyị na-egosi ha na anyị ji ha kpọrọ ihe, hụ ha n’anya ma chọọ ka anyị na ha bụrụ enyi. Obi na-adị Jehova ụtọ ma ọ bụrụ na anyị enye ndị ọzọ ihe e ji atagharị ọnụ, ihe ha ga-aṅụ, nri, ma ọ bụ wepụta oge ka anyị na ha nọrịa. (1 Pita 4:​8-10) Ma, e nwere ihe ndị nwere ike ime ka o siere anyị ike ile ndị ọzọ ọbịa.

“M cheburu na agaghị m eleli ndị ọzọ ọbịa. Ma, m gbanwere echiche ahụ, nke mere ka obi na-adịkwu m ụtọ” (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16) *

15-16. (a) Olee ihe nwere ike ime ka ụfọdụ ndị chee na ha agaghị eleli ndị ọzọ ọbịa? (b) Olee ihe nyeere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Edit aka ilewe ndị ọzọ ọbịa?

15 Otú ihe si dịrị anyị nwere ike ime ka anyị chee na anyị agaghị eleli ndị ọzọ ọbịa. Chegodị gbasara otu nwanna nwaanyị di ya nwụrụ aha ya bụ Edit. Mgbe ọ na-abụbeghị Onyeàmà Jehova, ọ na-akara ya mma ịnọrọ onwe ya. Edit chere na ndị ọzọ ga-aka enwe ike ile ọbịa nke ọma.

16 Mgbe Edit ghọrọ Onyeàmà Jehova, ọ gbanwere otú o si eche echiche. Ọ gbawara mbọ ịna-ele ọbịa. Ọ sịrị: “Mgbe a na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị, otu okenye gwara m gbasara di na nwunye na-abịa inye aka n’ọrụ ahụ, rịọkwa m ka ha biri n’ụlọ m ruo izu abụọ. M chetara otú Jehova si gọzie nwaanyị Zarefat ahụ di ya nwụrụ.” (1 Eze 17:​12-16) Edit kwetara ka di na nwunye ahụ biri n’ụlọ ya. Jehova ọ̀ gọziri ya? Ọ sịrị: “Izu abụọ ahụ mechara ghọọ ọnwa abụọ. N’oge ahụ, mụ na ha ghọrọ ezigbo enyi.” Otú ọzọ Jehova si gọzie ya bụ na o nweela ọtụtụ ndị enyi n’ọgbakọ. Ọ bụzi ọsụ ụzọ oge niile ugbu a. Obi na-adịkwa ya ụtọ ịkpọ ndị ya na ha rụrụ n’ozi ọma ka ha bịa n’ụlọ ya metụ ihe n’ọnụ. O kwuru, sị: “Inye ihe na-eme m obi ụtọ. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ na-eme ka Jehova si ọtụtụ ụzọ na-agọzi m.”​—Hib. 13:​1, 2.

17. Olee ihe otu nwanna aha ya bụ Luke na nwunye ya chọpụtara?

17 O nwere ike ịbụ na anyị na-ele ndị ọzọ ọbịa. Ma, ànyị ka nwere ike ịna-emekwu nke ọma n’ile ọbịa? Dị ka ihe atụ, otu nwanna aha ya bụ Luke na nwunye ya na-ele ndị ọzọ ọbịa. Ha na-akpọkarị nne na nna ha, ndị ikwu ha, ndị enyi ha, ndị nlekọta sekit na ndị nwunye ha ka ha bịa n’ụlọ ha. Ma, Luke kwuru, sị: “Anyị chọpụtara na naanị ndị anyị na-akpọ n’ụlọ anyị bụ ndị anyị na ha dị ná mma.” Olee otú Luke na nwunye ya si na-emekwu nke ọma n’ile ndị ọzọ ọbịa?

18. Olee otú Luke na nwunye ya si na-emekwu nke ọma n’ile ndị ọzọ ọbịa?

18 Luke na nwunye ya gbanwere otú ha si ele ọbịa mgbe ha chechara gbasara ihe Jizọs kwuru. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na ọ bụ ndị hụrụ unu n’anya ka unu hụrụ n’anya, olee ụgwọ ọrụ unu nwere?” (Mat. 5:​45-47) Ha chọpụtara na ha kwesịrị ịna-eme ka Jehova, bụ́ onye na-emere mmadụ niile ihe ọma. N’ihi ya, ha kpebiri ịna-akpọ ụmụnna ndị ha na-akpọtụbeghị n’ụlọ ha. Luke kwuru, sị: “Oge ndị a anyị ji anọrị na-eme anyị niile ezigbo obi ụtọ. Ọ na-eme ka anyị na ibe anyị dịrị ná mma, anyị na Jehova adịrịkwa ná mma.”

19. Olee otú anyị si egosi na anyị bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs? Oleekwa ihe i kpebisiri ike ime?

19 Anyị amụtala otú iji obi anyị niile hụ ụmụnna anyị n’anya ga-esi nyere anyị aka ịna-eme udo, ịghara ile mmadụ anya n’ihu, nakwa ịna-ele ọbịa. Anyị ekwesịghị ịna-eche ihe na-adịghị mma gbasara ụmụnna anyị. Anyị kwesịkwara iji obi anyị niile hụ ha n’anya. Anyị mee otú ahụ, anyị ga-enwe obi ụtọ ma gosi na anyị bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs n’eziokwu.​—Jọn 13:​17, 35.

ABỤ NKE 88 Mee Ka M Mara Ụzọ Gị

^ par. 5 Jizọs kwuru na ọ bụ ịhụnanya ka a ga-eji mata ndị bụ́ ezigbo Ndị Kraịst. Otú anyị si hụ ụmụnna anyị n’anya na-eme ka anyị na-eme udo, ghara ịna-ele mmadụ anya n’ihu, na-elekwa ndị ọzọ ọbịa. Ọ bụghị mgbe niile ka ọ ga-adịrị anyị mfe ime otú ahụ. N’isiokwu a, anyị ga-amụta otú anyị nwere ike isi jiri obi anyị niile na-ahụ ụmụnna anyị n’anya.

^ par. 5 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

^ par. 57 NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna nwaanyị na-agbalị ime udo. Ná mbido, onye nke ọzọ jụrụ ajụ. Ma ọ kwụsịghị ịgbalị. Ha mechara mee udo n’ihi na ọ kwụsịghị igosi onye nke ọzọ na ọ hụrụ ya n’anya.

^ par. 59 NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna katarala ahụ́ na-eche na a jụrụ ya ajụ n’ọgbakọ.

^ par. 61 NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna nwaanyị nke cheburu na ya agaghị eleli ọbịa gbanwere echiche ya, nke mere ka obi na-adịkwu ya ụtọ.