Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 16

Na-eme Ka Jehova Ma Gị na Ụmụnna Gị Mekọwa Ihe

Na-eme Ka Jehova Ma Gị na Ụmụnna Gị Mekọwa Ihe

“Kwụsịnụ ile mmadụ anya n’ihu wee na-ekpe ikpe, kama na-ekpenụ ikpe ziri ezi.”​—JỌN 7:24.

ABỤ NKE 101 Anyị Na-arụkọ Ọrụ ma Dịrị n’Otu

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Olee ihe na-akasi obi Baịbụl gwara anyị gbasara Jehova?

Ị̀ GA-ACHỌ ka ndị mmadụ jiri ụcha gị, otú ihu gị dị, ma ọ bụkwanụ otú ị hà na-ekpebi ụdị onye ị bụ? O nwere ike ị gaghị achọ. Ọ na-akasi anyị obi ịmara na Jehova anaghị eji ihe anya na-ahụ ekpebi ụdị mmadụ anyị bụ. Dị ka ihe atụ, mgbe Samuel hụrụ ụmụ Jesi, ọ hụghị ihe Jehova hụrụ. Jehova gwara Samuel na otu n’ime ụmụ Jesi ndị nwoke ga-abụ eze Izrel. Ma, ònye ka ọ ga-abụ? Mgbe Samuel hụrụ ọkpara Jesi bụ́ Elayab, ọ sịrị: “N’ezie, onye Jehova tere mmanụ guzo n’ihu ya.” Otú Elayab dị mere ka Samuel chee na ọ bụ ya ga-abụ eze. “Ma Jehova sịrị Samuel: ‘Elela anya n’ọdịdị ya na ogo ya, n’ihi na ajụwo m ya.’” Gịnị ka anyị na-amụta n’ihe a? Jehova gwaziri ya, sị: “Mmadụ na-ahụ ihe anya na-ahụ; ma Jehova na-ahụ ihe dị n’obi.”​—1 Sam. 16:​1, 6, 7.

2. Dị ka e kwuru na Jọn 7:​24, gịnị mere anyị ekwesịghị iji otú mmadụ dị kpebie ụdị onye ọ bụ? Nye ihe atụ.

2 Ebe anyị bụ ụmụ mmadụ na-ezughị okè, anyị niile na-ejikarị otú mmadụ dị ekpebi ụdị onye ọ bụ. (Gụọ Jọn 7:24.) Ma, ọ bụ naanị obere ihe ka ihe anya anyị na-ahụ nwere ike ime ka anyị mata banyere mmadụ. Iji maa atụ, ọ bụrụgodị na dọkịta bụ aka ochie, ọ gaghị eji naanị ile onye ahụ́ na-adịghị anya n’ihu mata ihe na-arịa ya. Ọ ga-ege ya ntị nke ọma ka ọ mata ma ò nwere ọrịa ọ na-arịabu, otú obi dị ya ma ọ bụkwanụ otú o si eme ya. Dọkịta ahụ nwere ike ịgwa ya ka ọ gaa ka e nyochaa ya ime ahụ́. Ma ọ́ bụghị ya, dọkịta ahụ nwere ike ịgwọwa ihe na-abụghị ihe na-arịa ya. Otú ahụ ka ọ dịkwa anyịnwa. Anyị agaghị eji naanị otú ụmụnna anyị dị aghọta ha nke ọma. Anyị kwesịrị ịgbalị ghọta ụdị mmadụ ha bụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị anaghị ahụ ihe dị ndị ọzọ n’obi. N’ihi ya, anyị agaghị aghọtali ha otú Jehova si aghọta ha. Ma anyị nwere ike ime ike anyị niile iji mee ka Jehova. Olee otú anyị ga-esi mee ya?

3. Olee otú ịtụle otú Jehova si meso ndị anyị ga-amụ gbasara ha n’isiokwu a ga-esi nyere anyị aka ịna-eme ka Jehova?

3 Olee otú Jehova si emeso ndị na-efe ya? Ọ na-ege ha ntị. Ọ na-aghọta otú ihe si dịrị ha na ihe mere ha ji eme ihe ha na-eme. Ọ na-enwekwara ha ọmịiko. Ka anyị na-eleba anya n’otú Jehova si meso Jona, Ịlaịja, Hega, na Lọt, chọpụta otú anyị nwere ike isi na-eme ka Jehova ma anyị mesowe ụmụnna anyị ihe.

NA-EGE HA NTỊ NKE ỌMA

4. Gịnị mere anyị nwere ike iji lee Jona anya ka onye na-abụghị ezigbo mmadụ?

4 Ebe ọ bụ na anyị amaghị ihe niile gbasara Jona, anyị nwere ike iche na ọ bụ onye a na-agaghị atụkwasịli obi ma ọ bụdị onye nnupụisi. Jehova nyere ya iwu ka ọ gaa gwa ndị Ninive na ọ ga-ebibi ha. Kama irubere Jehova isi, ọ banyere ụgbọ na-aga ebe ọzọ ka ọ “gbapụ n’ihu Jehova.” (Jona 1:​1-3) Ọ bụrụ gị, ị̀ gaara enye Jona ohere ọzọ ka ọ gaa zie ndị Ninive ozi ahụ? O nwere ike ị gaghị eme otú ahụ. Ma, Jehova kpebiri inye ya ohere ọzọ.​—Jona 3:​1, 2.

5. Gịnị ka ihe Jona kwuru na Jona 2:​1, 2, 9 kụziiri gị gbasara ya?

5 Ekpere Jona kpere mere ka a mata ụdị onye ọ bụ. (Gụọ Jona 2:​1, 2, 9.) Ekpere ahụ o kpere n’afọ azụ̀, nke o doro anya na ọ bụ otu n’ime ọtụtụ ekpere ndị Jona kpere, mere ka anyị ghara ịmara ya ka naanị onye gbaara ọrụ e nyere ya ọsọ. Ihe ndị o kwuru n’ekpere ahụ gosiri na ọ dị umeala n’obi, na obi dị ya ụtọ n’ihi ihe ọma Chineke meere ya, nakwa na o kpebisiri ike irubere Jehova isi. Ka a sịkwa ihe mere na Jehova elekwasịghị anya n’ihe o mejọrọ. Kama, ọ zara ekpere ya, kwekwa ka ọ ka bụrụ onye amụma.

Ọ bụrụ na anyị amata otú ihe si mee, ọ ga-eme ka anyị na-enwekwuru ndị mmadụ ọmịiko (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6) *

6. Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị na-ege ndị mmadụ ntị nke ọma?

6 Iji gee ndị ọzọ ntị nke ọma, anyị kwesịrị ịdị umeala n’obi ma na-enwe ndidi. E nwere ihe atọ mere anyị ji kwesị ime ihe ndị a. Nke mbụ, o nwere ike ime ka anyị ghara ikpebi ihe na-abụghị eziokwu gbasara ndị mmadụ. Nke abụọ, o nwere ike ime ka anyị na-aghọta ụmụnna anyị na otú obi dị ha, nke ga-eme ka anyị na-enwekwuru ha ọmịiko. Nke atọ, anyị nwere ike isi otú ahụ nyere mmadụ aka ịmụta gbasara onwe ya. Mgbe ụfọdụ, anyị anaghị aghọtacha otú ihe dị anyị n’obi ruo mgbe anyị kwupụtara ya. (Ilu 20:5) Otu okenye bi n’Eshia kwuru, sị: “E nwere mgbe m kwuru okwu tupu mụ achọpụta ihe merenụ. M gwara otu nwanna nwaanyị na o kwesịrị ime ka otú o si aza ajụjụ n’ọmụmụ ihe ka mma. Ma, m mechara chọpụta na ọ na-esiri ya ike ịgụ ihe nakwa na ọ na-agba ezigbo mbọ iji zaa ajụjụ.” Ihe a gosiri na ọ dị ezigbo mkpa ka okenye ọ bụla na-achọpụta otú ihe si mee tupu ya enye ndụmọdụ.​—Ilu 18:13.

7. Gịnị ka ị mụtara n’otú Jehova si meso Ịlaịja?

7 Ọ na-esiri ụfọdụ ụmụnna anyị ike ikwu otú obi dị ha n’ihi ihe ndị merela ha ná ndụ, omenala ha ma ọ bụkwanụ ụdị mmadụ ha bụ. Olee otú anyị nwere ike isi mee ka ọ dịrị ha mfe ịkọrọ anyị otú obi dị ha? Cheta otú Jehova si meso Ịlaịja mgbe ọ gbara ọsọ n’ihi Jezibel. O were Ịlaịja ọtụtụ ụbọchị tupu ya agwa Nna ya nke eluigwe otú ọ dị ya n’obi. Jehova gere ya ntị nke ọma. Ọ gbaziri Ịlaịja ume ma nye ya ọrụ dị mkpa ọ ga-arụ. (1 Eze 19:​1-18) O nwere ike iwe oge tupu ahụ́ eruo ụmụnna anyị ala ịkọrọ anyị otú ọ dị ha n’obi. Ma, ọ bụ ya ga-eme ka anyị ghọta otú obi dị ha n’eziokwu. Ọ bụrụ na anyị ana-enwe ndidi ka Jehova, o nwere ike ime ka obi sie ụmụnna anyị ike ịkọrọ anyị otú obi dị ha. Ha gwawakwanụ anyị otú obi dị ha, anyị kwesịrị ige ha ntị nke ọma.

MATA ỤMỤNNA GỊ NKE ỌMA

8. Dị ka e kwuru na Jenesis 16:​7-13, olee otú Jehova si nyere Hega aka?

8 Ohu nwaanyị Seraị, aha ya bụ Hega, malitere ịkpa àgwà ọjọọ mgbe ọ ghọrọ nwunye Ebram. Mgbe Hega dịịrị ime, ọ malitere ịkparị Seraị n’ihi na o nweghị nwa. Ihe bịara ka njọ nke na ọ gbara ọsọ n’ihi otú Seraị si meso ya ihe. (Jen. 16:​4-6) Ebe ọ bụ na anyị ezughị okè, anyị nwere ike iwere ya na Hega bụ onye mpako nke ghọọrọ mkpụrụ ọ kụrụ. Ma, ọ bụghị otú ahụ ka Jehova si were Hega. O zigaara ya otu mmụọ ozi. Mgbe mmụọ ozi ahụ bịakwutere ya, o nyeere ya aka ịgbanwe àgwà ya. Ọ gọzikwara ya. Hega chọpụtara na Jehova nọ na-ahụ ya, marakwa otú ihe si dịrị ya. Obi tọrọ ya ụtọ, ya akpọọ ya “Chineke nke na-ahụ ụzọ, . . . onye ahụ nke na-ahụ m.”​—Gụọ Jenesis 16:​7-13.

9. Gịnị mere Jehova ji nweere Hega ọmịiko?

9 Gịnị ka Jehova chọpụtara gbasara Hega? Ọ ma ihe ndị mere Hega n’oge gara aga nakwa nsogbu ndị bịaara ya. (Ilu 15:3) Hega bụ onye Ijipt. Ma, o bi n’ụlọ onye Hibru. Ò nwere mgbe ọ dị ya ka o nweghị onye chọrọ ịma gbasara ya? Agụụ ndị ezinụlọ ya na ndị obodo ya ọ̀ gụrụ ya? Ọ bụghị naanị ya bụ nwunye Ebram. N’oge ahụ, ụfọdụ ndị fere Chineke lụrụ karịa otu nwaanyị. Ma, ọ bụghị otú Jehova chọrọ ka ọ dịrị ná mmalite. (Mat. 19:​4-6) Ọ bụ ya mere anyaụfụ na ibu iwe n’obi ji adịkarị n’ezinụlọ nwoke lụrụ karịa otu nwaanyị. Ọ bụ eziokwu na Jehova ma na mkparị Hega kparịrị Seraị adịghị mma, ọ ghọtara otú obi dị Hega na otú ihe si dịrị ya. N’ihi ya, o nweere ya ọmịiko.

Gbalịa mata ụmụnna gị nke ọma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10 ruo na nke 12) *

10. Olee otú anyị nwere ike isi mata ụmụnna anyị nke ọma?

10 Anyị nwere ike ịgbalị na-aghọta ụmụnna anyị si otú ahụ na-eme ka Jehova. Gbalịa mata ụmụnna gị nke ọma. Gị na ha na-ekwurịta okwu tupu a malite ọmụmụ ihe nakwa ma a gbasaa. Gị na ha na-arụ n’ozi ọma. O kwe omume, kpọọ ha ka ha bịa rie nri n’ụlọ gị. Ị na-eme otú ahụ, i nwere ike ịchọpụta na nwanna nwaanyị i chere na ọ naghị emesapụ ihu bụ onye ihere. I nwekwara ike ịchọpụta na nwanna i chere na ọ na-achụ ego ọnwụ ọnwụ na-emesapụ aka, ma ọ bụkwanụ na nwanna nwaanyị na ụmụ ya na-abịakarị ọmụmụ ihe n’azụ oge na-edi mkpagbu n’ụlọ ha. (Jems 4:12) Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị ekwesịghị ịbụ “ndị na-etinye ọnụ n’ihe na-agbasaghị ha.” (1 Tim. 5:13) Ma, anyị kwesịrị ịmata ụmụnna anyị na ihe ndị merela ha ná ndụ. O nwere ike ime ka anyị na-aghọtakwu ha.

11. Gịnị mere o ji dị mkpa ka ndị okenye mata ụmụnna ha nke ọma?

11 Ndị okenye karịchaa, kwesịrị ịma ụmụnna ndị ha na-elekọta nke ọma. Ka anyị kwuo banyere otu onye nlekọta sekit aha ya bụ Artur. Ya na okenye ọzọ gara leta otu nwanna nwaanyị yiri ka ọ̀ na-eme ihere. Nwanna Artur sịrị: “Ọ gwara anyị na di ya nwụrụ obere oge ha lụrụ. N’agbanyeghị na ọ dịrịghị ya mfe, ọ zụrụ ụmụ ya nwaanyị abụọ otú mere ka ha hụ Jehova n’anya ma na-efe ya. Ọ bụ eziokwu na ọ naghị ahụcha ụzọ nke ọma, obi ana-adakwa ya mbà, ọ ka hụrụ Jehova n’anya, okwukwe ya sikwara ezigbo ike. Anyị chọpụtara na e nwere ọtụtụ ihe anyị ga-amụta n’aka nwanna nwaanyị ahụ.” (Fil. 2:3) Onye nlekọta sekit ahụ mere ka Jehova. Jehova ma atụrụ ya nke ọma, marakwa nsogbu ndị ha na ya na-alụ. (Ọpụ. 3:7) Ndị okenye ga-aka enyere ụmụnna ha aka ma ha mata ha nke ọma.

12. Olee otú ịmata nwanna nwaanyị ọzọ nọ n’ọgbakọ ha si baara Nwanna Nwaanyị Yip Yee uru?

12 Ọ bụrụ na e nwere nwanna ihe ya na-ewe gị iwe, ịmata ya nke ọma nwere ike ime ka ị na-enwekwuru ya ọmịiko. Legodị otu ihe atụ. Otu nwanna nwaanyị bi n’Eshia aha ya bụ Yip Yee kwuru, sị: “E nwere otu nwanna nwaanyị nọ n’ọgbakọ anyị na-eti mkpu ma o kwuwe okwu. O mere ka m were ya ka onye àgwà ọjọọ. Ma mgbe mụ na ya rụrụ n’ozi ọma, ọ gwara m na ọ na-ereburu mama ya na papa ya azụ̀ n’ahịa. Ọ na-eti mkpu ka o nwee ike inweta ndị ahịa.” Yip Yee kwukwara, sị: “Ihe m mụtara n’ihe ahụ bụ na ihe ga-enyere m aka ịghọta ụmụnna m bụ ịmatakwu ha.” Ọ naghị adị mfe ịmata ụmụnna anyị nke ọma. Ma, ọ bụrụ na i meghee obi gị otú ahụ Baịbụl kwuru, ị ga na-eme ka Jehova, onye hụrụ “ụdị mmadụ niile” n’anya.​—1 Tim. 2:​3, 4; 2 Kọr. 6:​11-13.

NA-ENWERE HA ỌMỊIKO

13. Dị ka e dere na Jenesis 19:​15, 16, gịnị ka ndị mmụọ ozi ahụ mere mgbe Lọt nọ na-egbu oge, n’ihi gịnịkwa?

13 N’oge ihe siiri Lọt ike, o meghị ihe Jehova gwara ya ozugbo. Ndị mmụọ ozi abụọ gara na nke Lọt ma gwa ya ka ọ kpọrọ ndị ezinụlọ ya pụọ na Sọdọm. N’ihi gịnị? Ha sịrị ya: “Anyị ga-ebibi ebe a.” (Jen. 19:​12, 13) N’ụtụtụ echi ya, Lọt na ndị ezinụlọ ya ka nọ n’ụlọ. N’ihi ya, ndị mmụọ ozi ahụ bịakwara ọzọ gwa ya ka ọ gbapụ. Ma, “ọ nọ na-egbu oge.” Anyị nwere ike iche na Lọt achọghị ime ihe Jehova gwara ya mee, ma ọ bụkwanụ na ọ dị isi ike. Ma, Jehova akwụsịghị inyere ya aka. Ndị mmụọ ozi ahụ seere ya na ndị ezinụlọ ya n’aka kpọpụ ha ná mpụga obodo ahụ “n’ihi ọmịiko Jehova nwere n’ebe ọ nọ.”​—Gụọ Jenesis 19:​15, 16.

14. Olee ihe ndị o nwere ike ịbụ ya mere Jehova ji nweere Lọt ọmịiko?

14 E nwere ọtụtụ ihe ndị ọ ga-abụ ha mere Jehova ji nweere Lọt ọmịiko. O nwere ike ịbụ na Lọt gburu oge ịgbapụ n’ihi na ụjọ ndị nọ ná mpụga obodo ahụ na-atụ ya. E nwekwara ihe ndị ọzọ nwere ike imenye ya ụjọ. Ọ ga-abụ na ọ ma banyere ndị eze abụọ dabara n’olulu bitumen na ndagwurugwu dị obodo ahụ nso. (Jen. 14:​8-12) Ebe ọ bụ onyeisi ezinụlọ, o nwere ike ịbụ na ọ na-eche gbasara ndị ezinụlọ ya. Ihe ọzọkwa bụ na Lọt bụ ọgaranya. O nwere ike ịbụ na o nwere ụlọ mara mma na Sọdọm. (Jen. 13:​5, 6) N’eziokwu, o nweghị nke ọ bụla n’ime ihe ndị a kwesịrị ime ka Lọt ghara ime ihe Jehova gwara ya ozugbo. Ma, Jehova elekwasịghị anya n’ihe ndị Lọt mejọrọ. Kama, o weere ya ka “onye ezi omume.”​—2 Pita 2:​7, 8.

Ọ bụrụ na anyị egee ndị mmadụ ntị nke ọma, anyị nwere ike ịghọta otú anyị nwere ike isi nweere ha ọmịiko (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15 na nke 16) *

15. Kama ịkatọwa mmadụ, gịnị ka anyị kwesịrị ime?

15 Kama ịkatọ ihe mmadụ mere, gbalịa ka ị ghọta otú ihe si dịrị ya. Otu nwanna nwaanyị bi na Yurop aha ya bụ Veronica gbalịrị mee ihe a. Ọ sịrị: “E nwere otu nwanna nwaanyị na-emekarị ka onye obi na-ajọ njọ. Ọ na-anọpụkarị iche. Mgbe ụfọdụ, ụjọ ịgwa ya okwu na-atụ m. Ma, m chere, sị, ‘Ọ bụrụ m ka ọ dị otú a ọ dị ya, m ga-achọ onye ga-akpa m nso.’ N’ihi ya, m kpebiri ịjụ ya otú o mere. Mgbe m jụrụ ya, ọ gwara m ihe dị ya n’obi. Ugbu a, m na-aghọtazi ya karịa mgbe mbụ.”

16. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-arịọ Jehova ka o nyere anyị aka ịna-enwere ndị ọzọ ọmịiko?

16 Naanị onye na-aghọta ihe niile gbasara anyị bụ Jehova. (Ilu 15:11) N’ihi ya, rịọ ya ka o nyere gị aka iwere ndị ọzọ otú o si were ha nakwa ka o nyere gị aka ịma otú ị ga-esi na-enwere ha ọmịiko. Ekpere nyeere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Anzhela aka ịna-enwekwuru ndị ọzọ ọmịiko. E nwere otu nwanna nwaanyị nọ n’ọgbakọ ha ihe na-anaghị adabachara ya na ya. Anzhela kwuru, sị: “Ọ gaara adịrị m mfe ịmalite katọwa nwanna nwaanyị ahụ, zewekwa ya ezewe. Ma, m rịọrọ Jehova ka o nyere m aka ịna-enwere nwanna nwaanyị ahụ ọmịiko.” Jehova ọ̀ zara ekpere ya? O kwuru, sị: “Mụ na ya rụrụ n’ozi ọma, kwuokwa okwu ruo ọtụtụ awa mgbe anyị mechiri. M gere ya ntị nke ọma. Ugbu a, ahụkwuola m ya n’anya, kpebisiekwa ike ịna-enyere ya aka.”

17. Gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ịna-eme?

17 I kwesịghị ịhọrọ ụmụnna ị ga na-enwere ọmịiko. O nwere ike ịbụ na ụfọdụ n’ime ha na-ata ahụhụ ihe ha metara, dị ka Jona, Ịlaịja, Hega, na Lọt. Nke bụ́ eziokwu bụ na e nweela mgbe onye ọ bụla n’ime anyị ji aka ya kpatara onwe ya nsogbu. Ọ bụ ya mere Jehova ji agwa anyị ka ihe banyere ụmụnna anyị na-emetụ anyị n’obi. (1 Pita 3:8) Ọ bụrụ na anyị emee ihe a Jehova gwara anyị, ọ ga-eme ka anyị na ụmụnna anyị nọ n’ụwa niile na-adị n’otu. N’ihi ya, anyị kwesịrị ikpebisi ike ịna-eme ka Jehova ma anyị mesowe ụmụnna anyị ihe.

ABỤ NKE 87 Bịa Ka A Gbaa Gị Ume

^ par. 5 Ebe anyị bụ ụmụ mmadụ na-ezughị okè, ọ naghị esiri anyị ike ikpebi ụdị onye mmadụ bụ ma ọ bụ ihe onye ahụ bu n’obi. Ma, Jehova “na-ahụ ihe dị n’obi.” (1 Sam. 16:7) N’isiokwu a, anyị ga-atụle otú Jehova si meso Jona, Ịlaịja, Hega, na Lọt. Ọ ga-enyere anyị aka ime ka ya ma anyị na ụmụnna anyị mekọwa ihe.

^ par. 52 NKỌWA FOTO: Ebe iwe na-ewe otu nwanna katarala ahụ́ maka na nwanna nke ọzọ ka na-eto eto abịaghị ọmụmụ ihe n’oge. Ma, o mechara chọpụta na ihe kpatara ya bụ na ụgbọala ya kpọkara.

^ par. 54 NKỌWA FOTO: Otu onye nlekọta ìgwè cheburu na otu nwanna nwaanyị anaghị emesapụ ihu. Ma o mechara chọpụta na ọ bụ onye ihere, nakwa na ahụ́ anaghị eru ya ala ma ya na ndị ọ na-amaghị nke ọma nọrọ.

^ par. 56 NKỌWA FOTO: Otu nwanna nwaanyị chere na nwanna nwaanyị nke ọzọ anaghị eche gbasara ndị ọzọ mgbe mbụ ọ hụrụ ya n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ma, mgbe ọ matara ya nke ọma, ọ chọpụtara na ọ dịghị otú ahụ.