Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 14

Agha Ga-esi n’Ebe Ugwu Bịa

Agha Ga-esi n’Ebe Ugwu Bịa

“Ọ dị mba . . . nke gbagotere wee bata n’ala m.”​—JOEL 1:6.

ABỤ NKE 95 Ìhè Na-enwusikwu Ike

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Olee otú Nwanna Russell na ndị enyi ya si mụọ Baịbụl? Oleekwa uru ọ baara ha?

IHE karịrị otu narị afọ gara aga, Nwanna C. T. Russell na ndị enyi ya, ya bụ, mmadụ ole na ole na-amụ Okwu Chineke, malitere inwe nnọkọ. Ha chọrọ ịmata ma hà ga-amụta ihe Baịbụl na-akụzi n’eziokwu gbasara Jehova, Jizọs, ndị nwụrụ anwụ, na ihe mgbapụta ahụ. Otú ha si amụ ihe dị mfe. Otu onye jụọ ajụjụ, mmadụ niile eleba anya n’amaokwu Baịbụl niile kwuru gbasara ajụjụ ahụ. E mechaa, ha edepụta ihe ndị ha chọpụtara. Jehova nyeere Ndị Kraịst ndị a nwere ezi obi aka ha amata ọtụtụ eziokwu gbara ọkpụrụkpụ Baịbụl na-akụzi. Eziokwu ndị ahụ na-abakwara anyị uru taa.

2. Gịnị nwere ike ime mgbe ụfọdụ ka anyị ghọtahie amụma Baịbụl?

Ndị mmụta Baịbụl ahụ mechara chọpụta na ọ dị mfe ịmata ihe Baịbụl na-akụzi gbasara otu isiokwu karịa ịghọta ihe otu amụma Baịbụl pụtara. Gịnị mere o ji dị otú ahụ? Otu bụ na mgbe a na-akacha aghọta ihe amụma Baịbụl pụtara bụ mgbe ọ na-emezu ma ọ bụ mgbe o mezuchara. Ma e nwekwara ihe ọzọ. Iji ghọta amụma Baịbụl nke ọma, ọ na-akacha mma ileba anya n’ihe ndị gbara amụma ahụ gburugburu. Ọ bụrụ na anyị eleba anya n’otu ihe dị n’amụma ahụ ma hapụ ndị ọzọ, anyị nwere ike ịghọtahie ya. O yiri ka ọ̀ bụ ihe a ka anyị mere n’otu amụma e buru n’akwụkwọ Joel. Ka anyị leba anya n’amụma ahụ ọzọ ma kwuo ihe mere anyị ji kwesị ịgbanwe otú anyị si ghọta ya.

3-4. Olee otú anyị sibu ghọta ihe e kwuru na Joel 2:​7-9?

3 Gụọ Joel 2:​7-9. Joel buru amụma na igurube ga-ala ihe dị n’ala Izrel n’iyi. Ha ga-eji ezé ha dị ka ezé ọdụm richapụ ahịhịa ndụ niile dị n’ala Izrel. (Joel 1:​4, 6) Ruo ọtụtụ afọ, anyị ghọtara na amụma ahụ na-ekwu gbasara otú ndị Jehova si ekwusa ozi ọma n’akwụsịghị akwụsị ka igurube a na-agaghị akwụsịli akwụsị. Anyị ghọtara na ozi ọma ahụ na-emekpa “ala” ahụ ma ọ bụ ndị ndị ndú okpukpe na-eduzi ahụ́. *

4 Ọ bụrụ na anyị agụọ naanị ihe e dere na Joel 2:​7-9, anyị nwere ike ikwu na ihe anyị ghọtara dabara adaba. Ma, ọ bụrụ na anyị emeda obi leba anya n’ihe niile gbasara amụma ahụ, anyị ga-achọpụta na anyị kwesịrị ịgbanwe ihe anyị ghọtara. Ka anyị kwuzie gbasara ihe anọ mere anyị kwesịrị iji gbanwee ihe anyị ghọtaburu.

IHE ANỌ MERE ANYỊ JI KWESỊ ỊGBANWE IHE ANYỊ GHỌTABURU

5-6. Olee ajụjụ anyị ga-ajụ ma anyị gụchaa (a) Joel 2:20? (b) Joel 2:25?

5 Nke mbụ, legodị ihe Jehova kwuru gbasara igurube ahụ. Ọ sịrị: “M ga-emekwa ka ndị si n’ebe ugwu [ya bụ, igurube] si n’ebe unu nọ pụọ gaa n’ebe dị anya.” (Joel 2:20) Ọ bụrụ na igurube ahụ nọchiri anya Ndịàmà Jehova na-ekwusa ozi ọma ma na-eme ndị na-eso ụzọ otú ahụ Jizọs gwara ha na-eme, olee ihe mere Jehova ji sị na ọ ga-achụpụ ha? (Ezik. 33:​7-9; Mat. 28:​19, 20) O doro anya na Jehova anaghị achụpụ ndị ji obi ha na-efe ya, kama, ọ na-achụpụ ihe ma ọ bụ onye na-emegide ndị ya.

6 Nke abụọ, chee gbasara ihe e dere na Joel 2:25. Jehova kwuru n’ebe ahụ, sị: “M ga-etikwa unu aka n’obi maka afọ ndị ahụ igurube, bụ́ igurube na-arị arị, ndị na-enweghị nku, nakwa ọchịcha na egú ripịara ihe, bụ́ ụsụụ ndị agha m dị ike, ndị m zitere n’etiti unu.” Ị̀ chọpụtara na Jehova kwuru na ọ ‘ga-eti’ ndị mmadụ aka n’obi maka ihe ndị igurube ahụ mebiri? Ọ bụrụ na igurube ahụ nọchiri anya ndị na-ekwusa ozi ọma Alaeze, ọ pụtara na ozi ọma ha na-emebi ihe. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ozi ọma ahụ na-azọ ndị mmadụ ndụ, na-emekwa ka ndị ọjọọ chegharịa. (Ezik. 33:​8, 19) Ọ bụụrụ ha ihe ọma.

7. Olee ihe “mgbe e mesịrị” ahụ e kwuru na Joel 2:​28, 29 nyeere anyị aka ịghọta?

7 Gụọ Joel 2:​28, 29. Ihe nke atọ bụ usoro ihe ndị e kwuru n’amụma ahụ ga-esi eme. Ị̀ hụrụ ihe Jehova kwuru? Ọ sịrị: “Mgbe e mesịrị, m ga-awụkwasị mmụọ m n’ahụ́ ụdị anụ ahụ́ ọ bụla.” Mgbe ọ ga-eme ya bụ mgbe igurube ndị ahụ rụchara ọrụ ha. Ọ bụrụ na igurube ndị ahụ bụ ndị na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke, olee ihe mere Jehova ga-eji wụkwasị ha mmụọ ya mgbe ha kwusachara ozi ọma? Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụrụ na mmụọ nsọ Chineke anaghị enyere ha aka, ha agaghị na-ekwusa ozi ọma ruo ọtụtụ afọ n’agbanyeghị mmegide na mmachi.

Ihe a bụ Nwanna J. F. Rutherford na ndị ọzọ e tere mmanụ duziri nzukọ Jehova n’oge gara aga. Ha kwusara ikpe Chineke mara ụwa ọjọọ a (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8)

8. Olee ndị igurube e kwuru okwu ya ná Mkpughe 9:​1-11 nọchiri anya ha? (Kọwaa ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)

8 Gụọ Mkpughe 9:​1-11. Ka anyị lebazie anya n’ihe nke anọ. Ihe mere anyị jibu kwuo na igurube ahụ Joel buru amụma ya bụ ozi ọma anyị na-ekwusa bụ n’ihi amụma yiri ya dị n’akwụkwọ Mkpughe. Amụma ahụ kwuru na igurube ndị ahụ nwere ihu mmadụ, kpurukwa “ihe yiri okpueze ndị dị ka ọlaedo n’isi ha.” (Mkpu. 9:7) Ha mekpara “ndị mmadụ [ya bụ, ndị iro Chineke] na-enweghị akara nke Chineke n’egedege ihu ha ahụ́,” ruo ọnwa ise, ya bụ, ihe dị ka ọnwa ole igurube na-adịru ndụ. (Mkpu. 9:​4, 5) O yiri ka è ji ihe a akọwa ndị Jehova e tere mmanụ. Ha katara obi na-ekwusa ikpe Chineke mara ụwa ọjọọ a, nke mere ka ahụ́ ghara iru ndị na-akwado ụwa a ala.

9. Olee ihe ndị dị iche n’igurube Joel hụrụ na nke Jọn hụrụ?

9 Ọ bụ eziokwu na e nwere otú amụma ahụ dị ná Mkpughe na nke dị na Joel si yie, ma, e nwere ezigbo ihe dị iche na ha. Chegodị ihe a: N’amụma Joel, igurube ndị ahụ lara ahịhịa ndụ niile n’iyi. (Joel 1:​4, 6, 7) N’amụma Jọn, a gwara igurube ndị ahụ “ka ha ghara ibibi ahịhịa ndụ ndị dị n’ụwa.” (Mkpu. 9:4) Igurube ndị Joel hụrụ si n’ebe ugwu. (Joel 2:20) Ndị nke Jọn hụrụ si n’abis. (Mkpu. 9:​2, 3) E kwuru na a chụpụrụ igurube ndị Joel hụrụ. N’akwụkwọ Mkpughe, a chụpụghị igurube ahụ. Kama, a hapụrụ ha ka ha rụchaa ọrụ ha. O nweghị ihe Baịbụl kwuru gosiri na obi adịghị Jehova mma n’ebe ha nọ.​—Gụọ igbe bụ́ “ Amụma Ndị E Buru Gbasara Igurube Yiri, Ma Ha Dị Iche.”

10. Si na Baịbụl mee ihe atụ gosiri na igurube ahụ Joel kwuru okwu ya nwere ike ịpụta ihe dị iche na nke Jọn kwuru okwu ya.

10 Ihe ndị ahụ dị iche n’amụma abụọ a mere ka anyị mata na ọ bụghị otu ihe ka ha abụọ na-ekwu maka ya. Ihe anyị na-ekwu ọ̀ bụ na igurube ndị ahụ Joel kwuru okwu ha na igurube ndị ahụ akwụkwọ Mkpughe kwuru okwu ha abụghị otu? Ee. Na Baịbụl, otu ihe e ji mee ihe atụ nwere ike ịpụta otu ihe n’otu ebe ma pụta ihe ọzọ n’ebe ọzọ. Dị ka ihe atụ, ná Mkpughe 5:​5, a kpọrọ Jizọs “Ọdụm nke si n’ebo Juda,” ma na 1 Pita 5:​8, a kpọrọ Ekwensu “ọdụm na-ebigbọ ebigbọ.” Ihe anọ ndị ahụ anyị kwuru gbasara ha na nsogbu ndị a chọpụtara na ha mere ka anyị mata na anyị kwesịrị ịgbanwe otú anyị si na-akọwa amụma Joel ahụ. Olee otú ọzọ anyị ga-esi kọwaa ya?

GỊNỊ KA Ọ PỤTARA?

11. Olee otú Joel 1:6 na 2:​1, 8, 11 si nyere anyị aka ịghọta ndị bụ igurube ahụ?

11 Anyị leruo amaokwu ndị gbara amụma Joel ahụ gburugburu anya, anyị ga-achọpụta na ọ na-ekwu gbasara agha a ga-alụ. (Joel 1:6; 2:​1, 8, 11) Jehova kwuru na ya ga-eji “ụsụụ ndị agha” (ya bụ, ndị agha Babịlọn) taa ndị Izrel nupụụrụ ya isi ahụhụ. (Joel 2:25) Ọ dabara adaba na a kpọrọ ndị agha Babịlọn ahụ “ndị si n’ebe ugwu” n’ihi na ọ bụ n’ebe ugwu Izrel ka ha ga-esi bịa lụso ha ọgụ. (Joel 2:20) E ji ndị agha ahụ tụnyere ìgwè igurube haziri onwe ha nke ọma. Joel kwuru banyere ha, sị: “[Onye agha nke ọ bụla] na-aga ebe ọ na-aga n’eleghị anya n’azụ. . . . Ha ji ọsọ na-abanye n’ime obodo. Ha na-agba ọsọ n’elu mgbidi. Ha na-arịgo n’elu ụlọ. Ha si na windo abanye dị ka ndị ohi.” (Joel 2:​8, 9) Weregodị ya na ị na-ahụ ka ihe a na-eme. Ndị agha juru ebe niile. E nweghị ebe mmadụ ga-ezoli. E nweghị onye ga-agbanahụli mma agha ndị Babịlọn.

12. Olee otú amụma Joel buru gbasara igurube si mezuo?

12 Dị ka igurube, ndị Babịlọn (ma ọ bụ ndị Kaldia) busoro Jeruselem agha n’afọ 607 Tupu Oge Ndị Kraịst. Baịbụl kwuru, sị: “Eze ndị Kaldia . . . wee jiri mma agha gbuo ụmụ okorobịa ha . . . , o nweghịkwara nwa okorobịa ma ọ bụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke, okenye ma ọ bụ agadi ume na-adịkwaghị ọmịiko. [Chineke] nyefere ihe niile n’aka ya. O wee gbaa ụlọ ezi Chineke ọkụ ma kwatuo mgbidi Jeruselem; ha gbakwara ụlọ elu ya niile ọkụ, gbaakwa arịa ya niile dị oké ọnụ ahịa ọkụ, iji bibie ihe niile.” (2 Ihe 36:​17, 19) Mgbe ndị Babịlọn bibichara ala ahụ, ndị mmadụ sịrị: “Ọ bụ ebe tọgbọrọ n’efu, nke mmadụ na anụ ụlọ na-anọghị. E nyefewo ya n’aka ndị Kaldia.”​—Jere. 32:43.

13. Kọwaa ihe ihe e kwuru na Jeremaya 16:​16, 18 pụtara.

13 Mgbe ihe dị ka narị afọ abụọ gara Joel buchara amụma ahụ, Jehova si n’ọnụ Jeremaya kwuo ihe ọzọ gbasara agha ahụ. O kwuru na ndị agha ahụ ga-achọ ndị Izrel ahụ na-eme omume ọjọọ ma jide ha. Jeremaya buru amụma, sị: “‘Lee, m na-ezi ozi ka ọtụtụ ndị na-akụ azụ̀ bịa,’ ka Jehova kwuru, ‘ha ga-akụta ha dị ka azụ̀; e mesịakwa, m ga-ezi ozi ka ọtụtụ ndị dinta bịa, ha ga-achụ nta ha n’ugwu ukwu ọ bụla nakwa n’ugwu nta ọ bụla nakwa n’ebe ndị gbawara agbawa na nkume dị elu. [M ga-akwụzu] ha ụgwọ njehie ha na ụgwọ mmehie ha.’” Oké osimiri ma ọ bụ ọhịa agaghị ezoli ndị Izrel ahụ na-ekweghị echegharị ka aka ndị Babịlọn ghara ịkpara ha.​—Jere. 16:​16, 18.

IHE GA-ADỊGHACHI MMA

14. Olee mgbe amụma e buru na Joel 2:​28, 29 mezuru?

14 Joel nwere ozi dị mma o ziri ha. Ala ahụ ga-emewekwa nri. (Joel 2:​23-26) O nwekwara mgbe ọ ga-eru, ihe ndị ga-enyere ha aka ife Chineke abaa ụba. Jehova sịrị: “M ga-awụkwasị mmụọ m n’ahụ́ ụdị anụ ahụ́ ọ bụla, ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom ga-ebukwa amụma. . . . M ga-awụkwasịkwa mmụọ m ọbụna n’ahụ́ ndị ikom na-eje ozi nakwa n’ahụ́ ndị inyom na-eje ozi.” (Joel 2:​28, 29) Jehova awụkwasịghị ha mmụọ nsọ ya ozugbo ha si Babịlọn lọta n’ala ha. Kama, o mere ya mgbe ọtụtụ narị afọ gachara, na Pentikọst afọ 33. Olee otú anyị si mara?

15. Dị ka e kwuru n’Ọrụ Ndịozi 2:​16, 17, olee ihe Pita gbanwere n’ihe e kwuru na Joel 2:28? Gịnịkwa ka ọ pụtara?

15 Pita onyeozi si n’ike mmụọ nsọ kwuo na ihe ndị dị ịtụnanya mere n’ụbọchị Pentikọst mezuru amụma ahụ e buru na Joel 2:​28, 29. N’ihe dị ka elekere itoolu nke ụtụtụ, Chineke wụkwasịrị ndị mmadụ mmụọ nsọ ya, ha amalite ikwu “banyere ihe ndị dị ebube nke Chineke.” (Ọrụ 2:11) Mgbe Pita si n’ike mmụọ nsọ na-ekwughachi ihe Joel buru n’amụma, o ji okwu dịtụ iche kwuo ya. Ị̀ chọpụtara ihe ọ gbanwere? (Gụọ Ọrụ Ndịozi 2:​16, 17.) Kama Pita ịsị “mgbe e mesịrị,” ọ sịrị: “N’oge ikpeazụ.” N’amaokwu a, oge ikpeazụ ọ na-ekwu gbasara ya bụ tupu e bibie Jeruselem na ụlọ nsọ ya. Chineke ga-awụkwasị “ụdị anụ ahụ́ ọ bụla” mmụọ nsọ ya. Ihe a gosiri na ogologo oge gafere tupu amụma Joel ahụ emezuo.

16. Olee otú mmụọ nsọ Chineke si nye aka n’ozi ọma n’oge ndịozi Jizọs? Oleekwa otú o si enyere anyị aka taa?

16 Ọ bụ mgbe Chineke wụkwasịchara ndị ya mmụọ nsọ n’oge ndịozi ka ha bidoro ikwusa ozi ọma ga-emecha ruo ebe niile n’ụwa. N’ihe dị ka afọ 61, mgbe Pọl degaara Ndị Kọlọsi akwụkwọ ozi, o kwuru na e kwusaala ozi ọma ahụ “n’etiti ihe niile e kere eke dị n’okpuru eluigwe.” (Kọl. 1:23) “Ihe niile e kere eke” Pọl na-ekwu okwu ya pụtara ebe ya na ndị ọzọ garuru. Jehova ejirila mmụọ nsọ ya mee ka ozi ọma ahụ gazuo ọtụtụ ebe n’ụwa taa. E nwere ike ikwu na o ruola ná “nsọtụ ụwa.”​—Ọrụ 13:47; gụọ igbe bụ́ “ M Ga-awụkwasị Mmụọ M n’Ahụ́” Ndị Ohu M.

GỊNỊ GBANWERE?

17. Gịnị gbanwere n’otú anyị si ghọta amụma Joel buru banyere igurube?

17 Gịnị gbanwere? Anyị aghọtala amụma ahụ e buru na Joel 2:​7-9 nke ọma. Ikwu ya ná nkenke, amụma e buru n’amaokwu ndị a anaghị ekwu gbasara ozi ọma anyị ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa. Kama, ọ na-ekwu banyere agha ndị Babịlọn busoro Jeruselem n’afọ 607 Tupu Oge Ndị Kraịst.

18. Olee ihe na-agbanweghị gbasara ndị Jehova?

18 Olee ihe na-agbanweghị? Ndị Jehova ka na-ekwusa ozi ọma n’ebe niile. Ha na-esikwa n’ụzọ dị iche iche ekwusa ya. (Mat. 24:14) E nweghị iwu ndị ọchịchị nwere ike igbochi anyị ikwusa ozi ọma. Jehova na-enyekwara anyị aka iji ịnụ ọkụ n’obi na obi ike na-ekwusa ozi ọma Alaeze karịa otú e kwusatụrụla ya. Anyị ga na-atụkwasị Jehova obi na ọ ga na-enyere anyị aka ịna-aghọta amụma ndị dị na Baịbụl nke ọma. Obi siri anyị ike na ọ ga-enyere anyị aka “ịghọta eziokwu niile” mgbe oge ya ruru.​—Jọn 16:13.

ABỤ NKE 97 Okwu Chineke Na-enye Ndụ

^ par. 5 Kemgbe ọtụtụ afọ, anyị kweere na amụma e buru na Joel isi nke mbụ na nke abụọ gbasara ozi ọma anyị na-ekwusa n’oge a. Ma, e nwere ihe anọ mere o ji dị mkpa ka anyị gbanwee otú anyị si ghọta amụma dị na Joel isi nke mbụ na nke abụọ. Gịnị ka ha bụ?

^ par. 3 Dị ka ihe atụ, gụọ isiokwu bụ́ “A Na-ahụ Amamihe Jehova n’Ihe Ndị O Kere.” Ọ gbara n’Ụlọ Nche Eprel 15, 2009, paragraf nke 14-16.