Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 17

“Ana M Akpọ Unu Ndị Enyi M”

“Ana M Akpọ Unu Ndị Enyi M”

“Ana m akpọ unu ndị enyi m, n’ihi na ihe niile m nụrụ n’ọnụ Nna m ka m mere ka unu mara.”​—JỌN 15:15.

ABỤ NKE 13 Ọ Bụ Kraịst Ka Anyị Na-eso

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Gịnị ka ị ga-eme ma ị chọọ ka gị na mmadụ bụrụ ezigbo enyi?

Ọ BỤRỤ na ị chọrọ ka gị na mmadụ bụrụ enyi, ihe mbụ i kwesịrị ime bụ iwepụta oge ka gị na ya na-akparịta. Ka unu na-akparịta gbasara otú obi dị unu na ihe ndị unu na-eche, unu ga-abụ enyi. Mgbe ụfọdụ, ọ naghị adịrị anyị mfe ịbụ ezigbo ndị enyi Jizọs. Olee ụfọdụ ihe kpatara ya?

2. Olee ihe mbụ mere o ji esiri anyị ike ịbụ ezigbo ndị enyi Jizọs?

2 Ihe mbụ na-eme ka o siere anyị ike bụ na anyị ahụtụbeghị Jizọs. Ọ bụkwa otú ọ dị ọtụtụ n’ime Ndị Kraịst n’oge ndịozi. N’agbanyeghị ya, Pita onyeozi kwuru, sị: “Ọ bụ ezie na unu ahụghị ya, unu hụrụ ya n’anya. Ọ bụ ezie na unu adịghị ele ya anya ugbu a, ma unu nwere okwukwe n’ebe ọ nọ.” (1 Pita 1:8) N’ihi ya, anyị na Jizọs ga-abụli ezigbo enyi n’agbanyeghị na anyị ahụtụbeghị ya.

3. Olee ihe nke abụọ mere o ji esiri anyị ike ịbụ ezigbo ndị enyi Jizọs?

3 Ihe nke abụọ mere o ji esiri anyị ike bụ na anyị agaghị agwali Jizọs okwu. Anyị kpewe ekpere, ọ bụ Jehova ka anyị na-agwa okwu. Ọ bụ eziokwu na anyị na-ekpe ekpere n’aha Jizọs, ọ bụghị ya ka anyị na-agwa okwu. Nke bụ́ eziokwu bụ na Jizọs achọghị ka anyị na-agwa ya okwu n’ekpere. N’ihi gịnị? N’ihi na ekpere bụ otu ụzọ anyị si efe ofufe. Ọ bụkwa naanị Jehova ka anyị kwesịrị ife. (Mat. 4:10) N’agbanyeghị nke ahụ, anyị ka nwekwara ike igosi na anyị hụrụ Jizọs n’anya.

4. Gịnị bụ ihe nke atọ mere o ji esiri anyị ike ịbụ ezigbo ndị enyi Jizọs? Oleekwa ihe ndị anyị ga-eleba anya na ha n’isiokwu a?

4 Ihe nke atọ mere o ji esiri anyị ike bụ na Jizọs bi n’eluigwe. N’ihi ya, anyị na ya enweghị ike ịnọrị. Ma, anyị ka nwere ike ịmụta ọtụtụ ihe gbasara Jizọs n’agbanyeghị na anyị na ya anọghị. Anyị ga-eleba anya n’ihe anọ anyị nwere ike ime ka anyị na ya bụrụ ezigbo enyi. Ma, ka anyị buru ụzọ leba anya n’ihe mere o ji dị ezigbo mkpa ka anyị na Jizọs dịrị n’ezigbo mma.

GỊNỊ MERE ANYỊ KWESỊRỊ IJI BỤRỤ NDỊ ENYI JIZỌS?

5. Olee ihe mere anyị ji kwesị ịbụ enyi Jizọs? (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Ịbụ Enyi Jizọs Ga-eme Ka Anyị Bụrụ Enyi Jehova” na “ Otú Anyị Kwesịrị Isi Were Jizọs.”)

5 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka anyị na Jehova dịrị n’ezigbo mma, anyị na Jizọs ga-abụrịrị enyi. N’ihi gịnị? Ka anyị hụ ihe abụọ mere o ji dị mkpa. Nke mbụ, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Nna m n’onwe ya hụrụ unu n’anya nke ukwuu, n’ihi na unu hụrụ m n’anya nke ukwuu.” (Jọn 16:27) Ọ sịkwara: “Ọ dịghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ́ bụghị site na mụ.” (Jọn 14:6) Mmadụ ịchọ ka ya na Jehova bụrụ enyi n’ebughị ụzọ mee ka ya na Jizọs bụrụ enyi dị ka mmadụ ịchọ ịbanye n’ụlọ n’esighị n’ọnụ ụzọ. Jizọs mere ihe atụ yiri nke a mgbe o kwuru na ya bụ “ọnụ ụzọ nke atụrụ ahụ.” (Jọn 10:7) Ihe nke abụọ mere o ji dị mkpa bụ na Jizọs kpara nnọọ àgwà ka Nna ya. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Onye hụrụ m ahụwokwa Nna m.” (Jọn 14:9) N’ihi ya, otu ụzọ dị mkpa anyị ga-esi amata Jehova bụ ịmụ banyere ndụ Jizọs. Ọ bụrụ na anyị ana-amụ gbasara Jizọs, anyị ga na-ahụkwu ya n’anya. Ọ bụrụkwa na anyị na Jizọs ana-adịkwu ná mma, anyị ga na-ahụkwu Nna ya n’anya.

6. Olee ihe ọzọ mere anyị ji kwesị ịbụ ndị enyi Jizọs? Kọwaa.

6 Anyị na Jizọs ga-adịrịrị ná mma ma anyị chọọ ka a na-aza ekpere anyị. Ihe ọ pụtara bụ na ihe anyị ga-eme abụghị naanị ịsị “n’aha Jizọs” ma anyị kpechaa ekpere. Anyị ga-aghọta otú Jehova si eji Jizọs aza ekpere anyị. Jizọs sịrị ndịozi ya: “Ihe ọ bụla unu rịọkwara n’aha m, m ga-eme ya.” (Jọn 14:13) N’agbanyeghị na ọ bụ Jehova na-anụ ekpere anyị ma na-aza ya, ọ bụ Jizọs ka o nyere ikike ime ihe ọ bụla yanwa bụ́ Jehova kpebiri. (Mat. 28:18) N’ihi ya, tupu Chineke aza ekpere anyị, ọ na-ebu ụzọ achọpụta ma ànyị na-eme ihe Jizọs kwuru. Dị ka ihe atụ, Jizọs sịrị: “Ọ bụrụ na unu na-agbaghara ndị mmadụ njehie ha, Nna unu nke eluigwe ga na-agbagharakwa unu; ma ọ bụrụ na unu adịghị agbaghara ndị mmadụ njehie ha, Nna unu agaghịkwa na-agbaghara unu njehie unu.” (Mat. 6:​14, 15) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-emeso ndị ọzọ otú Jehova na Jizọs si emeso anyị.

7. Ole ndị ka àjà Jizọs chụrụ ga-abara uru?

7 Ọ bụ naanị ndị ha na Jizọs bụ ezigbo enyi ka àjà ọ chụrụ ga-abara uru. Olee otú anyị si mara? Jizọs kwuru na ọ “ga-atọgbọ mkpụrụ obi ya n’ihi ndị enyi ya.” (Jọn 15:13) Ndị fere Jehova tupu Jizọs abịa n’ụwa ga-amụkwa gbasara Jizọs ma hụ ya n’anya. Dị ka ihe atụ, a ga-akpọlite Ebreham, Sera, Mozis, na Rehab n’ọnwụ. Ma, ndị a fere Chineke ka kwesịkwara ịbụ ndị enyi Jizọs ka ha nwee ike inweta ndụ ebighị ebi.​—Jọn 17:3; Ọrụ 24:15; Hib. 11:​8-12, 24-26, 31.

8-9. Dị ka e kwuru na Jọn 15:​4, 5, gịnị ka anyị ga-enwe ike ime ma anyị bụrụ ndị enyi Jizọs? Gịnịkwa mere o ji dị mkpa ka anyị na Jizọs dịrị ná mma?

8 Obi na-atọ anyị ụtọ na anyị na Jizọs na-arụkọ ọrụ n’ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ bụ onye nkụzi. Kemgbe ọ laghachiri eluigwe, ọ ka na-eduzi ọrụ ikwusa ozi ọma na ịkụziri ndị mmadụ Baịbụl n’ihi na ọ bụ ya bụ onyeisi ọgbakọ. Ọ na-ahụ mbọ niile ị na-agba inyere ndị mmadụ aka ịmata Nna ya. O jikwa ya kpọrọ ihe. Nke bụ́ eziokwu bụ na naanị ihe ga-eme ka anyị rụọ ọrụ a nke ọma bụ ma Jehova na Jizọs nyere anyị aka.​—Gụọ Jọn 15:​4, 5.

9 Okwu Chineke mere ka o doo anya na anyị ga-ahụ Jizọs n’anya ma anyị chọọ ime ihe dị Jehova mma. N’ihi ya, ka anyị kwuo ihe anọ anyị nwere ike ime iji bụrụ ndị enyi Jizọs.

IHE ANYỊ GA-EME KA ANYỊ NA JIZỌS BỤRỤ ENYI

I nwere ike ịbụ enyi Jizọs ma ọ bụrụ na (1) ị mata ya nke ọma, (2) ị na-eche echiche otú o si eche ma na-eme ka ya, (3) ị na-akwado ụmụnna Kraịst, nakwa ma (4) ị na-akwado ihe ndị nzukọ Jehova haziri (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10 ruo na nke 14) *

10. Olee ihe mbụ anyị ga-eme ka anyị na Jizọs bụrụ enyi?

10 (1Mata Jizọs nke ọma. Ihe ga-enyere anyị aka ịmata Jizọs bụ ịgụ akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn. Anyị na-echebara ihe a kọrọ gbasara ndụ Jizọs na Baịbụl echiche, ọ ga-eme ka anyị hụ Jizọs n’anya ma na-akwanyere ya ùgwù n’ihi otú o si meso ndị mmadụ. Dị ka ihe atụ, n’agbanyeghị na ọ bụ Nna Ukwu ndị na-eso ụzọ ya, o mesoghị ha ihe ka ohu. Kama nke ahụ, ọ gwara ha otú obi dị ya na ihe ndị ọ na-eche. (Jọn 15:15) Ihe na-ewute ha wutere Jizọs. O sokwa ha bee ákwá. (Jọn 11:​32-36) Ndị na-emegide ya chọpụtadịrị na ya na ndị nabatara ozi ya bụ enyi. (Mat. 11:19) Ọ bụrụ na anyị ana-emeso ndị ọzọ otú Jizọs si meso ndị na-eso ụzọ ya, anyị na ha ga na-adịkwu ná mma, obi ga na-adịkwu anyị ụtọ, anyị ga-ahụkwukwa Jizọs n’anya ma na-akwanyekwuru ya ùgwù.

11. Olee ihe nke abụọ anyị ga-eme ka anyị na Jizọs bụrụ enyi? Gịnịkwa mere o ji dị mkpa?

11 (2Na-eche echiche ka Jizọs ma na-eme ka ya. Ọ bụrụ na anyị amatakwuo otú Jizọs si eche echiche ma na-eme ka ya, anyị na ya ga-adịkwu ná mma. (1 Kọr. 2:16) Olee otú anyị nwere ike isi na-eche echiche ka Jizọs? Chegodị gbasara ihe atụ a. Jizọs na-eche gbasara inyere ndị ọzọ aka karịa iche gbasara ihe ga-adị ya mma. (Mat. 20:28; Rom 15:​1-3) Ọ bụ otú a o si eche echiche mere ka o jiri obi ya hụ ndị mmadụ n’anya ma na-agbaghara ha. Ihe ndị mmadụ kwuru gbasara ya anaghị ewe ya iwe ngwa ngwa. (Jọn 1:​46, 47) Ọ naghị emeso ndị mmadụ ihe n’ihi ihe ndị ha mejọrọ n’oge gara aga. (1 Tim. 1:​12-14) Jizọs sịrị: “Mmadụ niile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.” (Jọn 13:35) Jụọ onwe gị, sị, “M̀ na-eme ike m niile ịhụ na mụ na ụmụnna m dị n’udo otú Jizọs mere?”

12. Olee ihe nke atọ anyị ga-eme ka anyị na Jizọs bụrụ enyi? Oleekwa otú anyị ga-esi mee ya?

12 (3Na-akwado ụmụnna Jizọs. Jizọs na-ewere ya na ọ bụ ya ka anyị meere ihe ọ bụla anyị meere ụmụnna ya e tere mmanụ. (Mat. 25:​34-40) Ihe kacha mkpa anyị ga-eme iji kwado ha bụ ịna-eme ike anyị niile n’ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke na ime ndị na-eso ụzọ Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-eme. (Mat. 28:​19, 20; Ọrụ 10:42) Naanị ihe ga-eme ka ụmụnna Kraịst kwusachaa ozi ọma a ha na-ekwusa n’ụwa niile ugbu a bụ ma “atụrụ ọzọ” ahụ nyere ha aka. (Jọn 10:16) Ọ bụrụ na i so n’atụrụ ọzọ ahụ, mgbe ọ bụla ị na-ekwusa ozi ọma, ị na-egosi na ị hụrụ ndị e tere mmanụ n’anya, hụkwa Jizọs n’anya.

13. Olee otú anyị nwere ike isi mee ihe e kwuru na Luk 16:9?

13 Anyị na Jehova na Jizọs ga-abụkwa enyi ma ọ bụrụ na anyị ejiri ego anyị na-enye onyinye maka ọrụ ha na-ahazi. (Gụọ Luk 16:9.) Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike inye onyinye maka ọrụ zuru ụwa ọnụ. E ji onyinye ndị ahụ akwado ozi ọma Alaeze n’ebe ndị dịpụrụ adịpụ, na-arụ ma na-elekọta ụlọ ndị a na-anọ efe Jehova, na-agbatakwara ndị ọdachi dakwasịrị ọsọ enyemaka. Anyị nwekwara ike inye onyinye iji kwụọ ụgwọ ihe a na-emefu n’ọgbakọ anyị, nyekwara ndị anyị ma ihe na-esiri ike aka. (Ilu 19:17) Ihe ndị a bụ ụzọ anyị nwere ike isi na-enyere ụmụnna Kraịst aka.

14. Dị ka e kwuru ná Ndị Efesọs 4:​15, 16, olee ihe nke anọ anyị ga-eme ka anyị bụrụ ndị enyi Jizọs?

14 (4Na-akwado ihe ndị nzukọ Jehova haziri. Anyị na-eme ka anyị na Jizọs, bụ́ onyeisi ọgbakọ, dịkwuo ná mma ma ọ bụrụ na anyị ana-erubere ndị a họpụtara ịna-elekọta anyị isi. (Gụọ Ndị Efesọs 4:​15, 16.) Dị ka ihe atụ, anyị na-agba mbọ ịhụ na mmadụ ole na-anọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ọ bụla amụ ihe na-eru ole e bu n’obi rụọ ya. N’ihi ya, e kpokọtala ụfọdụ ọgbakọ na ibe ha, hazigharịakwa ebe e kenyere ha ikwusa ozi ọma. Ihe a emeela ka nzukọ Jehova gharazie ịna-emefu ego buru ibu. O meekwala ka ụfọdụ ụmụnna gbanwee ihe ụfọdụ. O nwere ike ịbụ na ụmụnna ndị a anọọla n’ọgbakọ ha ọtụtụ afọ, ha na ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ ahụ abụrụkwa nnu na mmanụ. Ma ugbu a, a gwala ha ka ha gaa ọgbakọ ọzọ. Obi na-atọ Jizọs ụtọ ma ọ hụ ka ndị a na-eso ụzọ ya na-akwado nhazi ndị a.

HA GA-ABỤ NDỊ ENYI JIZỌS RUO MGBE EBIGHỊ EBI

15. Olee otú anyị na Jizọs ga-esi adịkwu ná mma n’ọdịnihu?

15 Ndị e ji mmụọ nsọ tee mmanụ nwere olileanya na ha ga-eso Jizọs chịa n’Alaeze Chineke. Ha ga na-ahụ Jizọs, na-agwa ya okwu, ha na ya anọrọkwa ruo mgbe ebighị ebi. (Jọn 14:​2, 3) Jizọs ga-anọnyekwara ndị nwere olileanya ibi n’ụwa, ọ ga-ahụkwa ha n’anya. Ọ bụ eziokwu na ha agaghị na-ahụ Jizọs, ha na ya ga-adịkwu ná mma ka ha na-adị ndụ Jehova na Jizọs mere ka ha nweta.​—Aịza. 9:​6, 7.

16. Olee ihe ọma ndị na-emere anyị n’ihi na anyị bụ ndị enyi Jizọs?

16 Ọ bụrụ na anyị aza òkù Jizọs kpọrọ anyị ka anyị bịa bụrụ enyi ya, anyị ga-erite ọtụtụ uru. Dị ka ihe atụ, ọ hụrụ anyị n’anya, na-enyekwara anyị aka ugbu a. Anyị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. Nke kachanụ bụ na anyị na Jizọs bụrụ enyi, ọ ga-eme ka anyị na Nna ya bụ́ Jehova dịrị n’ezigbo mma, bụkwanụ uru kachanụ. N’eziokwu, o nweghị ihe a ga-eji tụnyere mmadụ ịbụ enyi Jizọs.

ABỤ NKE 17 “Achọrọ M”

^ par. 5 Jizọs na ndịozi ya rụkọrọ ọrụ, kwurịtakwa okwu ruo afọ ole na ole. O mere ka ha na ya bụrụ enyi. Jizọs chọkwara ka anyịnwa bụrụ ndị enyi ya. Ma, ọ gaghị adịrị anyị mfe ịbụ ndị enyi Jizọs otú ahụ ọ dịịrị ndịozi ya mfe. N’isiokwu a, anyị ga-atụle ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ nwere ike ime ka o siere anyị ike ịbụ ndị na-eso ụzọ Jizọs nakwa ihe ndị anyị nwere ike ime iji bụrụ ezigbo ndị enyi Jizọs.

^ par. 55 NKỌWA FOTO: (1) Anyị nwere ike ịmụ gbasara ndụ na ozi Jizọs n’oge anyị na-enwe ofufe ezinụlọ. (2) N’ọgbakọ, anyị nwere ike ịgbalị ka anyị na ụmụnna anyị dịrị n’udo. (3) Anyị na-akwado ụmụnna Kraịst ma anyị na-eme ike anyị niile n’ozi ọma. (4) Ọ bụrụ na e kpokọta ọgbakọ anyị na ọgbakọ ọzọ, anyị ga-akwado nhazi ndị okenye mere.