Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 18

“Gbaruo ‘Ọsọ Ahụ n’Isi’

“Gbaruo ‘Ọsọ Ahụ n’Isi’

“Agbawo m ọsọ ahụ ruo n’isi.”​—2 TIM. 4:7.

ABỤ NKE 129 Anyị Ga Na-atachi Obi

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Gịnị ka anyị niile kwesịrị ime?

Ị̀ GA-ACHỌ iso gbaa ọsọ ị ma ga-esiri gị ike, karịchaa, ma ọ bụrụ na ahụ́ adịghị gị ma ọ bụ na ike adịghị gị? O nwere ike ị gaghị achọ. Ma, Pọl onyeozi kwuru na Ndị Kraịst niile na-agba ọsọ. (Hib. 12:1) Anyị niile, ma okenye ma nwata, ma ànyị ka gbasiri ike ma ọ bụ na anyị agbasighị, anyị kwesịrị ịtachi obi ruo n’isi ma ọ bụrụ na anyị chọrọ inweta ihe a na-agbata n’ọsọ Jehova chọrọ inye anyị.​—Mat. 24:13.

2. Gịnị mere Pọl ji nwee ike ikwu ihe dị na 2 Timoti 4:​7, 8?

2 Ihe mere Pọl ji nwee ike ikwu ihe a bụ na yanwa agbaala “ọsọ ahụ ruo n’isi.” (Gụọ 2 Timoti 4:​7, 8.) Ma, olee ụdị ọsọ Pọl kwuru okwu ya?

OLEE ỤDỊ ỌSỌ ANYỊ NA-AGBA?

3. Olee ụdị ọsọ Pọl kwuru gbasara ya?

3 Mgbe ụfọdụ, Pọl na-eji ihe a na-eme n’egwuregwu ndị Gris oge ochie akụzi ihe ndị dị ezigbo mkpa. (1 Kọr. 9:​25-27; 2 Tim. 2:5) Mgbe ụfọdụ, ọ na-eji ịgba ọsọ atụnyere ndụ Ndị Kraịst. (1 Kọr. 9:24; Gal. 2:2; Fil. 2:16) Mgbe mmadụ na-amalite ịgba ọsọ ahụ bụ mgbe o nyefere Jehova onwe ya ma mee baptizim. (1 Pita 3:21) Ọ ga-agbacha ọsọ ahụ mgbe Jehova nyere ya ndụ ebighị ebi.​—Mat. 25:​31-34, 46; 2 Tim. 4:8.

4. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?

4 Olee otú ịgba ọsọ nkịtị si yie otú Ndị Kraịst si ebi ndụ? E nwere ụzọ ụfọdụ ha si yie. Ka anyị kwuo gbasara atọ n’ime ha. Nke mbụ, anyị kwesịrị ịgba ọsọ ahụ ebe e kwesịrị ịgba ya. Nke abụọ, anyị kwesịrị ilekwasị anya n’ebe anyị chọrọ ịgbaru. Nke atọ, anyị kwesịrị ịgbaru ya n’isi ọ bụrụgodị na anyị enwee nsogbu n’ụzọ.

GBAA ỌSỌ AHỤ EBE E KWESỊRỊ ỊGBA YA

Anyị niile kwesịrị ịna-ebi ndụ ka Ndị Kraịst (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5 ruo na nke 7) *

5. Olee ụdị ndụ anyị kwesịrị ịna-ebi, n’ihi gịnịkwa?

5 Ọ bụrụ na mmadụ chọrọ inweta ihe a na-agbata n’ọsọ, ọ ga-agba ọsọ ahụ ebe ndị haziri ya sị ka a gbaa ya. Ọ bụrụkwa na anyị chọrọ inweta ndụ ebighị ebi, anyị kwesịrị ibi ndụ otú Ndị Kraịst kwesịrị isi ebi ndụ. (Ọrụ 20:24; 1 Pita 2:21) Ma, Ekwensu na ndị òtù ya achọghị ka anyị na-ebi ndụ ka Ndị Kraịst. Ha chọrọ ka anyị soro ha “na-ebi ndụ ịla n’iyi.” (1 Pita 4:4) Ha na-akwa anyị emo, na-ekwukwa na ndụ ha na-ebi ka nke anyị mma, nakwa na ọ na-eme ka mmadụ nwere onwe ya. Ma, ihe a ha na-ekwu abụghị eziokwu.​—2 Pita 2:19.

6. Gịnị ka ị mụtara n’ihe mere Brian?

6 Onye ọ bụla na-ebi ndụ otú Setan na ụwa ya chọrọ ga-emecha chọpụta na ụdị ndụ ahụ anaghị eme ka mmadụ nwere onwe ya, kama ọ na-eme ka mmadụ bụrụ ohu. (Rom 6:16) Legodị ihe mere otu nwanna aha ya bụ Brian. Nne na nna ya gwara ya ka ọ na-ebi ndụ ka Onye Kraịst. Ma, mgbe ọ nọ afọ iri na ụma, o chewere na ibi ndụ ka Onye Kraịst agaghị eme ka ọ na-enwe obi ụtọ. O kpebiziri ịgbakwuru ndị na-ebi ndụ otú Setan si chọọ. Ọ sịrị: “Amaghị m na ịchọ inwere onwe m ga-eme ka ọtụtụ àgwà ọjọọ rie m ahụ́. M malitere ịṅụ ọgwụ ọjọọ, ịṅụ oké mmanya na ime omume rụrụ arụ. Ka oge na-aga, m ṅụwara ọgwụ ọjọọ ndị ka njọ. Ha rikwara m ahụ́. . . . M malitere ire ọgwụ ọjọọ ka m nweta ego m ga-eji na-ebi ndụ ọjọọ m.” Brian mechara kpebie ibiwe ndụ otú Jehova chọrọ. Ọ gbanwere àgwà ya ma mee baptizim n’afọ 2001. Obi dị ya ezigbo ụtọ ugbu a n’ihi na ọ na-ebi ndụ ka Onye Kraịst. *

7. Dị ka e kwuru na Matiu 7:​13, 14, olee ụzọ abụọ nọ anyị n’ihu?

7 Ọ dị ezigbo mkpa ka anyị soro ụzọ anyị kwesịrị iso. Setan chọrọ ka anyị niile kwụsị ịgba ọsọ n’ụzọ ahụ dị mkpagide “nke na-eduba ná ndụ” ma gafeta n’ụzọ ahụ sara mbara nke ọtụtụ ndị nọ n’ụwa a nọ na ya. Ụzọ ahụ na-ewu ewu, ọ dịkwa mfe ịgba ọsọ na ya. Ma, ọ “na-eduba ná mbibi.” (Gụọ Matiu 7:​13, 14.) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịnọrọ n’ụzọ ahụ ma ghara ikwe ka ihe ọ bụla mee ka anyị nupụrụ Jehova isi, anyị kwesịrị ịtụkwasị Jehova obi ma na-ege ya ntị.

LEKWASỊ ANYA N’ỌSỌ AHỤ, EMEKWALA KA GỊ MA Ọ BỤ NDỊ ỌZỌ DAA

Anyị kwesịrị ilekwasị anya n’ọsọ anyị na-agba ma ghara ime ka ndị ọzọ daa (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8 ruo na nke 12) *

8. Ọ bụrụ na onye na-agba ọsọ adaa, gịnị ka ọ na-eme?

Ndị na-agba ọsọ na-ele anya n’ebe ha ga-azọnye ụkwụ ka ha ghara ịda. Ma, onye ha na ya na-agba ọsọ nwere ike ime ka ha daa ma ọ bụkwanụ ha azọnye ụkwụ n’òkòkòrò. Ọ bụrụgodị na ha adaa, ha na-ebilikwa gbara ọsọ na-aga. Ihe na-abụ mkpa ha abụghị ihe kwadara ha, kama, ọ bụ ịgbaru ọsọ ahụ n’isi ma merie.

9. Ọ bụrụ na anyị adaa, gịnị ka anyị kwesịrị ime?

9 N’ọsọ anyị na-agba, anyị nwere ike ịda ọtụtụ ugboro, mejọọ ihe n’okwu ọnụ ma ọ bụ n’omume. Ndị anyị na ha so na-agba ọsọ nwekwara ike ime ihe ndị nwere ike iwute anyị. O kwesịghị iju anyị anya ma ụdị ihe a mee. Anyị niile ezughị okè. Anyị na-agbakwa ọsọ n’otu ụzọ ahụ dị mkpagide nke na-eduba ná ndụ. N’ihi ya, mgbe ụfọdụ, anyị na ndị ọzọ nwere ike ịkụkọta. Pọl kwuru na mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike ime ihe ibe anyị “ga-eji mee mkpesa.” (Kọl. 3:13) Ma, kama ilekwasị anya n’ihe mere anyị ji daa, anyị kwesịrị ilekwasị anya n’ihe a na-agbata n’ọsọ. Ọ bụrụ na anyị adaa, ka anyị bilie ma gbara gawa. Ọ bụrụ na anyị ewewe iwe ma ghara ibili gbara gawa, anyị agaghị agbaru ọsọ ahụ n’isi, anyị agaghịkwa enweta ihe a na-agbata n’ọsọ. Anyị nwekwara ike ịnọchiri ndị ọzọ na-agbalị ịgba ọsọ n’ụzọ ahụ dị mkpagide nke na-eduba ná ndụ ụzọ.

10. Olee otú anyị ga-esi zere ịghọrọ ndị ọzọ “ihe mkpọbi ụkwụ”?

10 Ihe ọzọ anyị ga-eme ka anyị ghara ịghọrọ ndị anyị na ha na-agba ọsọ “ihe mkpọbi ụkwụ” bụ ịhapụ ka e mee ihe otú ndị ọzọ chọrọ mgbe ụfọdụ kama isiwe ọnwụ ka e mee nke anyị. (Rom 14:​13, 19-21; 1 Kọr. 8:​9, 13) Anyị mee otú a, anyị agaghị eme ka ndị na-agba ọsọ nkịtị. Ha na ibe ha na-ama aka. Onye nke ọ bụla na-achọ ka ọ bụrụ ya ga-emeri. Ha na-echekarị gbasara onwe ha. N’ihi ya, ha nwere ike ịkwapụ onye ha na ya na-agba ọsọ n’ụzọ ka ha nọrọ n’ihu. Ma anyị dị iche, anyị na ibe anyị anaghị ama aka. (Gal. 5:26; 6:4) Ihe anyị chọrọ bụ inyere ọtụtụ ndị aka ka ha soro anyị gbachaa ọsọ ahụ ma nweta ndụ. N’ihi ya, anyị na-agbalị ime ihe Pọl si n’ike mmụọ nsọ kwuo. Ọ sịrị: “Na-elekwasị anya, ọ bụghị naanị n’ọdịmma onwe unu, kamakwa n’ọdịmma nke ndị ọzọ.”​—Fil. 2:4.

11. Olee ihe onye na-agba ọsọ na-elekwasị anya na ya, n’ihi gịnịkwa?

11 E wezụga ile anya n’ebe ha ga-azọnye ụkwụ, ihe ọzọ ndị na-agba ọsọ nkịtị na-eme bụ ilekwasị anya n’ebe ha chọrọ ịgbaru. N’agbanyeghị na ha anaghị ahụ ebe ahụ ha chọrọ ịgbaru, ha nwere ike iji uche ha na-ahụ ebe ha gbaruru ya n’isi, e nyekwa ha ihe nrite. Iburu ihe ha ga-erite n’uche na-enyere ha aka ijisi ike na-agba ọsọ ahụ.

12. Olee ihe Jehova gwara anyị?

12 N’ọsọ anyị na-agba, Jehova agwala anyị ihe ọ ga-emere anyị ma anyị gbaruo ọsọ ahụ n’isi, ya bụ, inye anyị ndụ ebighị ebi n’eluigwe ma ọ bụ na paradaịs n’ụwa. Baịbụl kọwara otú ndụ ga-adị mgbe ahụ, ka anyị nwee ike iche otú ndụ ga-esi tọọ anyị ụtọ. Ọ bụrụ na anyị ana-eche gbasara ihe ndị Jehova kwere anyị ná nkwa, anyị ga-ekpebisi ike ịna-atachi obi.

NA-AGBA ỌSỌ N’AGBANYEGHỊ NSOGBU

Anyị kwesịrị ịna-agba ọsọ nke ndụ ahụ n’agbanyeghị nsogbu ndị anyị nwere (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13 ruo na nke 20) *

13. Olee otú anyị si ka ndị na-agba ọsọ nkịtị mma?

13 E nwere ọtụtụ nsogbu ndị na-agba ọsọ na Gris oge ochie na-enwe, dị ka, ike ọgwụgwụ na ahụ́ mgbu. Ihe na-enyere ha aka bụ naanị ọzụzụ e nyere ha na ike ha. A na-azụkwa anyị otú ahụ a zụrụ ha ka anyị nwee ike ịgba ọsọ nke anyị nke ọma. Ma, e nwere ihe anyị ji ka ha mma. Ike anyị ji na-agba ọsọ si n’aka Jehova. Ike ya anaghịkwa agwụ agwụ. Jehova kwere anyị nkwa na ọ bụrụ na anyị atụkwasị ya obi, ọ ga na-azụ anyị, na-enyekwa anyị ike.​—1 Pita 5:10.

14. Olee otú 2 Ndị Kọrịnt 12:​9, 10 si enyere anyị aka ma anyị nwee nsogbu?

14 E nwere ọtụtụ nsogbu ndị bịaara Pọl. E wezụga na ndị mmadụ kparịrị ya ma kpagbuo ya, e nwere mgbe ike gwụrụ ya, nweekwa otu nsogbu ọ kpọrọ “ogwu n’anụ ahụ́” kpara ya aka ọjọọ. (2 Kọr. 12:7) Ma, kama ikwe ka nsogbu ndị ahụ mee ka ọ kwụsị ife Jehova, ha mere ka ọ tụkwasịkwuo Jehova obi. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 12:​9, 10.) Ihe a o mere mere ka Jehova nyere ya aka ná nsogbu ya niile.

15. Ọ bụrụ na anyị ana-eme ka Pọl, gịnị ka anyị ga-achọpụta?

15 E nwekwara ike ịkparị anyị ma ọ bụ kpagbuo anyị n’ihi ihe anyị kweere. Ike nwekwara ike na-agwụ anyị ma ọ bụkwanụ ọrịa ana-enye anyị nsogbu. Ma, ọ bụrụ na anyị ana-eme ka Pọl, ihe ndị ahụ niile nwere ike ime ka anyị chọpụta na Jehova dị njikere inyere anyị aka.

16. Ọ bụrụgodị na ahụ́ agbasichaghị gị ike, gịnị ka i nwere ike ime?

16 Ị̀ nọ n’ute ọrịa, ka ị̀ nọ n’ígwè ndị ngwọrọ? Ikpere ọ̀ na-enye gị nsogbu, ka ọ̀ bụ na ị naghị ahụcha ụzọ nke ọma? Ọ bụrụ otú ahụ, ì nwere ike iso ndị ka na-eto eto na ndị ahụ́ gbasiri ike na-agba ọsọ? Ee, i nwere ike. E nwere ọtụtụ ndị agadi na ndị ahụ́ na-agbasichaghị ike na-agba ọsọ nke ndụ ahụ. Ha agaghị emeli ya n’ike nke aka ha. Kama, Jehova na-enye ha ike. Ha na-enweta ya ma ha jiri telefon na-ege ihe a na-eme n’ọmụmụ ihe ma ọ bụkwanụ na-ele ndị nke e tinyere na vidio. Ha sokwa na-eme ndị na-eso ụzọ. Otú ha si eme ya bụ izi ndị dọkịta, ndị nọọsụ, na ndị ikwu na ibe ha ozi ọma.

17. Olee otú Jehova si ewere ndị ahụ́ na-agbasichaghị ike?

17 Ọ bụrụ na i nweghị ike ime ihe niile ị chọrọ ime n’ozi Jehova, adala mbà n’obi ma chee na ị gaghị agbali ọsọ ndụ ahụ. Jehova hụrụ gị n’anya n’ihi okwukwe gị na ihe ndị i meerela ya kemgbe ọtụtụ afọ. Ị chọsiri enyemaka ya ike ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Ọ gakwanụghị agbahapụ gị. (Ọma 9:10) Kama, ọ ga na-anọkwu gị nso. Lee ihe otu nwanna nwaanyị ọrịa na-enye nsogbu kwuru. Ọ sịrị: “Ka ọrịa m na-akakwu njọ, ka ọ na-esikwuru m ike ịna-ezi ndị mmadụ ozi ọma otú m na-emebu. Ma, ama m na ntakịrị ihe ọ bụla m nwere ike ime na-atọ Jehova ụtọ. Nke ahụ na-emekwa m obi ụtọ.” Mgbe ọ bụla ị dara mbà, cheta na Jehova nọnyeere gị. Cheta ihe Pọl mere, chetakwa okwu na-agba ume o kwuru. Ọ sịrị: “Ana m enweta obi ụtọ n’adịghị ike, . . . n’ihi na mgbe m na-adịghị ike, mgbe ahụ ka m na-adị ike.”​—2 Kọr. 12:10.

18. Olee nsogbu pụrụ iche ụfọdụ na-enwe?

18 E nwekwara nsogbu ọzọ na-abịara ndị na-agba ọsọ nke ndụ ahụ. Ha na nsogbu ndị anyị na-enweghị ike ịhụ na ndị nke anyị na-enweghị ike ịghọta nwere ike na-alụ. Dị ka ihe atụ, ha na ịda mbà n’obi ma ọ bụ oké nchegbu nwere ike na-alụ. Gịnị mere nsogbu ndị ohu Jehova ndị a ji pụọ iche? Ọ bụ n’ihi na mmadụ gbajie aka ma ọ bụkwanụ daa ngwọrọ, ndị mmadụ na-ahụ ihe na-eme ya. Ha nwekwara ike chọọ inyere ya aka. Ma, o nwere ike e nweghị ihe ọ bụla a na-ahụ anya ga-egosi na isi akpakọchaghị mmadụ ọnụ. Nsogbu ya na ha na-alụ yikwara nke ndị gbajiri ụkwụ ma ọ bụ aka. Ma, ebe ọ bụ na ndị ọzọ anaghị ahụ nsogbu ha ahụ anya, o nwere ike ime ka ha ghara inyere ha aka e kwesịrị inyere ha.

19. Gịnị ka anyị na-amụta n’ihe mere Mefiboshet?

19 Ọ bụrụ na e nwere nsogbu i nwere i chere na ndị mmadụ anaghị aghọta, ihe mere Mefiboshet nwere ike inyere gị aka. (2 Sam. 4:4) Ọ dara ngwọrọ, Eze Devid chere ihe na-adịghị mma gbasara ya, mejọọkwa ya. Ọ bụghị Mefiboshet kpataara onwe ya nsogbu ndị ahụ. Ma, o kweghị ka ihe ahụ wewe ya iwe. Kama, obi dị ya ụtọ maka ihe ọma ndị meere ya. Obi dịkwa ya ụtọ maka ihe ọma ndị Devid meere ya n’oge gara aga. (2 Sam. 9:​6-10) N’ihi ya, mgbe Devid mejọrọ ya, o chebaara ihe niile merenụ echiche. O kweghị ka ihe Devid mejọrọ mee ka obi na-ajọ ya njọ. Ọ takwanụghị Jehova ụta maka ihe Devid mere ya. Mefiboshet mere ihe o nwere ike ime iji kwadoo eze Jehova họpụtara. (2 Sam. 16:​1-4; 19:​24-30) Jehova mere ka e dee ihe Mefiboshet mere n’Okwu ya ka anyị mụta ihe na ya.​—Rom 15:4.

20. Olee ihe oké nchegbu nwere ike ime ụfọdụ ndị, gịnịkwa ka obi kwesịrị isi ha ike na ya?

20 Ahụ́ anaghị eru ụfọdụ ụmụnna ala ma ha na ndị ọzọ nọrọ n’ihi na ha na oké nchegbu na-alụ. O nwere ike isiri ha ike ịnọ n’ebe ìgwè mmadụ nọ, ma ha ka na-agbalị abịa ọmụmụ ihe na mgbakọ. Ọ na-esiri ha ike ịgwa onye ha na-amaghị okwu, ma ha na-ezi ndị mmadụ ozi ọma. Ọ bụrụ na ọ dị gị otú ahụ, obi sie gị ike na ọ bụghị naanị gị ka ọ dị otú ahụ. E nwekwara ọtụtụ ndị ọ dị otú ọ dị gị. Cheta na obi dị Jehova ụtọ maka ozi i ji obi gị niile na-ejere ya. Ebe ọ bụ na ị kwụsịbeghị ife Jehova, o gosiri na Jehova na-agọzi gị, na-enyekwa gị ike. * (Fil. 4:​6, 7; 1 Pita 5:7) Ọ bụrụ na ị na-efe Jehova n’agbanyeghị ọrịa ma ọ bụ nsogbu ndị ọzọ, ka obi sie gị ike na ihe ị na-eme dị Jehova mma.

21. Olee ihe Jehova ga-enyere anyị aka ime?

21 Obi dị anyị ụtọ na e nwere ihe ndị dị iche n’ọsọ nkịtị na nke ahụ Pọl kwuru okwu ya. N’ọsọ nkịtị a na-agba n’oge ochie, naanị otu onye na-enweta ihe nrite. Ma, onye ọ bụla tachiri obi gbaruo ọsọ ndụ Ndị Kraịst na-agba n’isi ga-enweta ndụ ebighị ebi. (Jọn 3:16) N’ọsọ nkịtịkwa, ahụ́ ga-agbasi ndị niile so na-agba ya ike, ma ọ́ bụghị ya, ha agaghị emerili. Ma, n’agbanyeghị na ahụ́ esighị ọtụtụ n’ime anyị ike, anyị na-atachi obi n’ọsọ nke ndụ ahụ. (2 Kọr. 4:16) Jehova ga-enyere anyị niile aka ịgbaru ọsọ ahụ n’isi.

ABỤ NKE 144 Lekwasị Anya n’Ụgwọ Ọrụ

^ par. 5 Ọtụtụ ndị ohu Jehova taa na nká na-alụ. E nwere ndị nke ọrịa na-ekweghị zuru ike. E nwekwara mgbe ike na-agwụ onye ọ bụla n’ime anyị. N’ihi ya, o nwere ike ịdị anyị ka anyị agaghị esoli gbaa ọsọ. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’otú anyị niile nwere ike isi jiri ntachi obi gbaa ọsọ ndụ ahụ Pọl onyeozi kwuru okwu ya ma merie.

^ par. 6 Gụọ isiokwu bụ́ “Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ.” Ọ gbara n’Ụlọ Nche Jenụwarị 1, 2013.

^ par. 20 Ị chọọ ịmatakwu ihe ndị nwere ike inyere gị aka ma i chegbuwe onwe gị nakwa ihe nyeere ndị ọzọ aka, lee ihe omume tiivi anyị nke ọnwa Mee afọ 2019. Gaa na jw.org®, pịa IHE NDỊ ANYỊ NWERE, pịzie Ihe Omume Tiivi Ndịàmà Jehova.

^ par. 63 NKỌWA FOTO: Ịnọ n’ozi ọma mgbe niile na-enyere nwanna a katarala ahụ́ aka ịna-agba ọsọ nke ndụ.

^ par. 65 NKỌWA FOTO: Anyị nwere ike ime ka ndị ọzọ daa ma ọ bụrụ na anyị ana-agwa ha ka ha ṅụkwuo mmanya na-aba n’anya ma ọ bụkwanụ ma anyịnwa na-aṅụ ya nnukwu.

^ par. 67 NKỌWA FOTO: N’agbanyeghị na otu nwanna nọ n’ụlọ ọgwụ, ọ ka nọkwa na-agba ọsọ nke ndụ ahụ. Otú o si na-eme ya bụ izi ndị na-elekọta ya ozi ọma.