Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 20

Ònye Bụ “Eze Ugwu” Taa?

Ònye Bụ “Eze Ugwu” Taa?

“Ọ ga-abịarukwa ọgwụgwụ ya, ọ dịghịkwa onye ga-enyere ya aka.”—DAN. 11:45.

ABỤ NKE 95 Ìhè Na-enwusikwu Ike

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1-2. Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu a?

E NWERE ọtụtụ ihe mere obi ji sie anyị ike ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ na anyị bi ná ngwụcha nke oge ikpeazụ. N’oge na-adịghị anya, Jehova na Jizọs Kraịst ga-ebibi ọchịchị niile na-emegide Alaeze Chineke. Ma tupu nke ahụ emee, eze ugwu na eze ndịda ga na-amarịta aka, ha ga na-emegidekwa ndị Chineke.

2 N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’amụma dị na Daniel 11:40–12:1. Anyị ga-amata onye bụ́ eze ugwu ugbu a, kwuokwa ihe mere ụjọ ekwesịghị ịtụ anyị maka nsogbu ndị ga-abịara anyị n’ọdịnihu.

E NWEELA EZE UGWU ỌHỤRỤ

3-4. Ònye bụ eze ugwu taa? Kọwaa.

3 Mgbe Sọviet Yuniọn dachara n’afọ 1991, ‘e nyetụụrụ’ ndị Chineke nọ n’ebe ahụ aka, ya bụ, ha nweretụụrụ onwe ha. (Dan. 11:34) N’ihi ya, ha nweere onwe ha ikwusa ozi ọma. Ọ dịghị anya, ndị nkwusa e nwere ná mba ọchịchị Kọmunist na-achị eruo ọtụtụ narị puku. Ka oge na-aga, Rọshịa na mba ndị na-akwado ya ghọrọ eze ugwu. Dị ka anyị kwuru n’isiokwu bu nke a ụzọ, e nwere ihe atọ e ji amata ọchịchị bụ́ eze ugwu ma ọ bụ eze ndịda. Ha bụ: (1) ọ ga-emegide ndị na-efe Chineke, (2) otú o si emeso ndị na-efe Chineke ga-egosi na ọ kpọrọ Jehova na ndị ya asị, nakwa (3) ya na eze nke ọzọ ga na-amarịta aka.

4 Lee ihe atọ mere anyị ji kwuo na ọ bụ Rọshịa na mba ndị na-akwado ya bụ eze ugwu taa. (1) Ha na-emegide ndị Chineke. Ha machiri ọtụtụ puku ụmụnna anyị bi n’ebe ha na-achị ikwusa ozi ọma, na-akpagbukwa ha. (2) Ihe ndị a ha na-eme gosiri na ha kpọrọ Chineke na ndị ya asị. (3) Ha na eze ndịda, bụ́ Briten na Amerịka, na-amarịtakwa aka. Ka anyị lee otú Rọshịa na mba ndị na-akwado ya si bụrụ eze ugwu.

EZE UGWU NA EZE NDỊDA GA NA-ASỌRỊTA MPI

5. Olee oge e kwuru okwu ya na Daniel 11:40-43, gịnịkwa ga-eme n’oge ahụ?

5 Gụọ Daniel 11:40-43. Ihe e kwuru n’amụma a na-eme ka anyị mata ihe ga-eme n’oge ikpeazụ. Ọ kọwara otú eze ugwu na eze ndịda ga-esi na-asọrịta mpi. Dị ka Daniel buru n’amụma, n’oge ikpeazụ, eze ndịda na eze ugwu “ga-asọrịta mpi.”—Dan. 11:40.

6. Olee ihe ndị gosiri na eze abụọ ahụ na-asọrịta mpi?

6 Eze ugwu na eze ndịda ga na-amarịta aka n’ihi na nke ọ bụla n’ime ha chọrọ ịbụ ọchịchị kacha ike n’ụwa. Dị ka ihe atụ, chegodị ihe mere mgbe a lụchara Agha Ụwa nke Abụọ, mgbe Sọviet Yuniọn na mba ndị na-akwado ya chịwara ọtụtụ mba na Yurop. Ihe a mere ka eze ndịda na mba ndị ọzọ kwekọrịta ijikọ ndị agha ha iji megide eze ugwu. A kpọrọ ha NATO. Eze ugwu na eze ndịda na-emefu nnukwu ego iji mee ka ndị agha ha ka nke ibe ha. Eze ugwu lụsoro eze ndịda agha. Otú o si mee ya bụ na ọ kwadoro ndị iro eze ndịda n’Afrịka, Eshia, nakwa na Latịn Amerịka n’agha ha lụrụ. N’afọ ndị na-adịbeghị anya, Rọshịa na mba ndị na-akwado ya esiela ezigbo ike n’ụwa. Ha na-ejikwa kọmputa alụso eze ndịda ọgụ. Ndị eze abụọ ahụ na-ebo ibe ha ebubo na ha na-eji kọmputa eme ka ibe ha na-emefu ego, na-ejikwa ya etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ha. Eze ugwu na-alụsokwa ndị Chineke ọgụ otú ahụ Daniel buru n’amụma.—Dan. 11:41.

EZE UGWU BANYERE “N’ALA NKE IHE ỊCHỌ MMA”

7. Gịnị bụ “ala nke Ihe Ịchọ Mma” ahụ?

7 Daniel 11:41 kwuru na eze ugwu ga-abanye “n’ala nke Ihe Ịchọ Mma.” Gịnị bụ ala ahụ? N’oge ochie, ọ bụ ala Izrel. E weere ya ka ala kacha ala niile mma. (Ezik. 20:6) Ma, ihe mere o ji bụrụ ala kacha mma bụ na ọ bụ ebe a na-anọ efe Jehova. Kemgbe Pentikọst afọ 33, “ala” ahụ abụghịzi otu mba n’ihi na ndị na-efe Jehova nọzi n’ebe niile n’ụwa. Taa, “ala nke Ihe Ịchọ Mma” ahụ bụ ihe niile ndị Jehova na-eme n’ofufe ya, dị ka ịga ọmụmụ ihe na ikwusa ozi ọma.

8. Olee otú eze ugwu si banye “n’ala nke Ihe Ịchọ Mma”?

8 N’oge ikpeazụ, eze ugwu abanyela “n’ala nke Ihe Ịchọ Mma” ahụ ọtụtụ ugboro. Dị ka ihe atụ, mgbe ọchịchị ndị Nazi nke Jamani bụ eze ugwu, karịchaa, mgbe a na-alụ Agha Ụwa nke Abụọ, ọ banyere “n’ala nke Ihe Ịchọ Mma.” Otú o si mee ya bụ na ọ kpagburu ndị Chineke ma gbuo ha. Mgbe a lụchara Agha Ụwa nke Abụọ, Sọviet Yuniọn ghọrọ eze ugwu. Ọ banyere “n’ala nke Ihe Ịchọ Mma.” Otú o si mee ya bụ na ọ kpagburu ndị Chineke ma chụpụ ha n’ebe ha bi.

9. N’afọ ndị na-adịbeghị anya, olee otú Rọshịa na mba ndị na-akwado ya si banye “n’ala nke Ihe Ịchọ Mma”?

9 N’afọ ndị na-adịbeghị anya, Rọshịa na mba ndị na-akwado ya banyere “n’ala nke Ihe Ịchọ Mma.” Olee otú ha si mee ya? N’afọ 2017, Rọshịa machiri ọrụ ndị Jehova, tụọkwa ụfọdụ ụmụnna anyị mkpọrọ. Ọ machiri akwụkwọ anyị, ma Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ, jichiekwa alaka ụlọ ọrụ, Ụlọ Nzukọ Alaeze na Ụlọ Mgbakọ anyị niile dị na Rọshịa. Mgbe o mechara ihe a niile, Òtù Na-achị Isi kwuru n’afọ 2018 na ọ bụ Rọshịa na mba ndị na-akwado ya bụ eze ugwu. Ndị Jehova anaghị agba ọchịchị mgba okpuru ma ọ bụkwanụ na-achọ ka a gbanwee ya, ma mgbe ọ na-akpagbu ha. Kama nke ahụ, ha na-eme ihe Baịbụl kwuru, nke bụ́ ka ha na-ekpe ekpere maka “ndị niile nọ n’ọkwá dị elu,” karịchaa, mgbe ha na-ekpebi ihe ndị nwere ike ịgbasa ofufe anyị na-efe Chineke.—1 Tim. 2:1, 2.

EZE UGWU Ọ̀ GA-EMERI EZE NDỊDA?

10. Eze ugwu ọ̀ ga-emeri eze ndịda? Kọwaa.

10 Amụma e buru na Daniel 11:40-45 kacha kwuo gbasara eze ugwu. Ọ̀ pụtara na eze ugwu ga-emeri eze ndịda? Mba. Eze ndịda ka ga-adị ruo mgbe Jehova na Jizọs ga-ebibi ọchịchị ụmụ mmadụ n’Amagedọn. (Mkpu. 19:20) Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Ka anyị lee ihe amụma dị na Daniel na nke dị ná Mkpughe gosiri.

N’Amagedọn, Alaeze Chineke nke e ji tụnyere nkume ga-ebibi ọchịchị ụmụ mmadụ nke e ji tụnyere nnukwu ihe oyiyi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11)

11. Gịnị ka amụma e buru na Daniel 2:43-45 na-egosi? (Kọwaa ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)

11 Gụọ Daniel 2:43-45. Daniel onye amụma kọwara otu nnukwu ihe oyiyi e ji ihe dị iche iche kpụọ. Akụkụ dị iche iche nke ihe oyiyi ahụ nọchiri anya ọchịchị chịrị mba e nwere ọtụtụ ndị na-efe Chineke. Ha chịrị n’oge dị iche iche. E ji ígwè na ụrọ kpụọ ụkwụ ya. Ụkwụ ya ahụ nọchiri anya ọchịchị nke ikpeazụ bụ́ Briten na Amerịka. Amụma a na-egosi na Briten na Amerịka ga na-achị ruo mgbe Alaeze Chineke ga-abịa bibie ọchịchị ụmụ mmadụ niile.

12. Gịnị ka isi nke asaa nke anụ ọhịa ahụ nọchiri anya ya, gịnịkwa mere ịmata ya ji dị mkpa?

12 Jọn onyeozi kwukwara gbasara ọchịchị ndị chịrị mba e nwere ọtụtụ ndị na-efe Jehova. Jọn kọwara ọchịchị ndị a ka anụ ọhịa nwere isi asaa. Isi ya nke asaa nọchiri anya Briten na Amerịka Bụ́ Mba Abụọ Jikọrọ Aka Na-achị Ụwa. Ịmata isi nke asaa ahụ dị mkpa n’ihi na anụ ọhịa ahụ agaghị enwe isi ọzọ. Isi nke asaa nke anụ ọhịa ahụ ka ga na-achị mgbe Kraịst na ndị mmụọ ozi ya ga-abịa bibie ya na anụ ọhịa ahụ niile. *Mkpu. 13:1, 2; 17:13, 14.

GỊNỊ KA EZE UGWU GA-EME N’ỌDỊNIHU?

13-14. Ònye bụ “Gọg nke ala Megọg,” gịnịkwa nwere ike ime ka ọ lụsowe ndị Chineke ọgụ?

13 Amụma e dere n’Ezikiel mere ka anyị mata ihe ụfọdụ nwere ike ime tupu e bibie eze ugwu na eze ndịda. O yiri ka amụma e buru n’Ezikiel 38:10-23; Daniel 2:43-45; 11:44–12:1; na Mkpughe 16:13-16, 21 ọ̀ na-ekwu banyere ihe ga-eme n’otu oge. Ọ bụrụ otú ahụ, anyị ga-atụ anya na ihe ndị na-esonụ ga-eme.

14 Oké mkpagbu malitechaa, “ndị eze nke elu ụwa dum mmadụ bi” ga-ejikọ aka. (Mkpu. 16:13, 14; 19:19) Mba ndị ahụ jikọrọ aka ka Baịbụl kpọrọ “Gọg nke ala Megọg.” (Ezik. 38:2) Ha ga-alụso ndị Chineke niile ọgụ ma chọọ igbuchapụ ha. Gịnị mere ha ga-eji chọọ ilụso ndị Chineke ọgụ? N’amụma Jọn buru banyere oge a, o kwuru na nnukwu akụ́ mmiri ígwé ga-ada ndị iro Chineke. Akụ́ mmiri ígwé ahụ nwere ike ịnọchi anya ozi amamikpe ndị Jehova ga-ezi. O nwere ike ịbụ ozi ahụ ga-eme ka Gọg nke ala Megọg chọọ ikpochapụ ndị Chineke n’ụwa.—Mkpu. 16:21.

15-16. (a) Olee ihe o nwere ike ịbụ ya ka Daniel 11:44, 45 na-ekwu okwu ya? (b) Gịnị ga-eme eze ugwu na mba ndị ọzọ so na Gọg nke ala Megọg?

15 O nwere ike ịbụ ozi amamikpe a na ọgụ ikpeazụ a ga-alụso ndị Chineke ka e kwuru okwu ha na Daniel 11:44, 45. (Gụọ ya.) N’ebe ahụ, Daniel kwuru na ‘akụkọ ga-esi n’ebe ọwụwa anyanwụ na ebe ugwu’ ga-enye eze ugwu nsogbu, ya ejiri “ọnụma” pụọ. Ihe ọ ga-ebu n’obi bụ ịga “kpochapụ ọtụtụ ndị ma laa ha n’iyi.” “Ọtụtụ ndị” ahụ nwere ike ịbụ ndị Jehova. * O nwere ike ịbụ na ihe Daniel na-ekwu okwu ya bụ ọgụ ikpeazụ ahụ a ga-alụso ndị Chineke.

16 Ọgụ a eze ugwu na mba ndị ọzọ ga-alụso ndị Chineke ga-akpasu Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ezigbo iwe, meekwa ka agha Amagedọn malite. (Mkpu. 16:14, 16) N’oge ahụ ka a ga-ebibi eze ugwu na mba ndị ọzọ so na Gọg nke ala Megọg. O nweghịkwa onye “ga-enyere ya aka.”—Dan. 11:45.

N’agha Amagedọn, Jizọs na ndị agha ya nke eluigwe ga-ebibi ụwa Ekwensu ma chebe ndị Chineke (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17)

17. Ònye bụ Maịkel “nnukwu onyeisi ahụ” e kwuru okwu ya na Daniel 12:1, gịnịkwa ka ọ na-eme?

17 Daniel 12:1 kwuru otú a ga-esi bibie eze ugwu na mba ndị na-akwado ya nakwa otú a ga-esi zọpụta anyị. (Gụọ ya.) Gịnị ka ihe e kwuru n’amaokwu a pụtara? Maịkel bụ aha ọzọ nke Eze anyị na-achị ugbu a bụ́ Jizọs Kraịst. Jizọs “guzo ọtọ n’ihi” ndị Chineke kemgbe afọ 1914 e hiwere Alaeze Chineke n’eluigwe. N’oge na-adịghị anya, ọ “ga-ebili” ma laa ndị iro Chineke n’iyi n’agha Amagedọn. Agha ahụ ga-abụ ihe ikpeazụ ga-eme n’ihe ndị Daniel kpọrọ “oge ahụhụ” kachanụ e nwetụrụla. Amụma Jọn dị ná Mkpughe kpọrọ ihe ga-eme obere oge tupu Amagedọn “oké mkpagbu.”—Mkpu. 6:2; 7:14.

À ‘GA-EDE AHA GỊ N’AKWỤKWỌ’ AHỤ?

18. Gịnị mere ụjọ ihe ga-eme n’ọdịnihu ekwesịghị ịtụ anyị?

18 Daniel na Jọn kwuru na Jehova na Jizọs ga-azọpụta ndị na-ejere ha ozi n’oge oké mkpagbu. N’ihi ya, ụjọ agaghị atụ anyị n’agbanyeghị ihe nwere ike ime mgbe ahụ. Daniel kwuru na ndị a ga-azọpụta bụ ndị ‘e dere aha ha n’akwụkwọ.’ (Dan. 12:1) Gịnị ka anyị ga-eme ka e dee aha anyị n’akwụkwọ ahụ? Anyị ga-eme ihe gosiri na anyị nwere okwukwe na Jizọs bụ́ Nwa Atụrụ Chineke. (Jọn 1:29) Anyị ga-eme baptizim iji gosi na anyị enyefeela Chineke onwe anyị. (1 Pita 3:21) Ihe ọzọ bụ na anyị ga-enyere ndị ọzọ aka ịmara Jehova iji gosi na anyị na-akwado Alaeze Chineke.

19. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ugbu a? N’ihi gịnịkwa?

19 Anyị kwesịrị ịtụkwasị Jehova na nzukọ nke ndị ya obi ugbu a. Ihe a bụ oge anyị kwesịrị ikwado Alaeze Chineke. Anyị mee otú ahụ, a ga-azọpụta anyị mgbe Alaeze Chineke ga-ebibi eze ugwu na eze ndịda.

ABỤ NKE 149 Abụ Mmeri

^ par. 5 Ònye bụ “eze ugwu” taa, oleekwa otú a ga-esi bibie ya? Ịmata azịza ajụjụ ndị a ga-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike, nyekwara anyị aka ijikere maka nsogbu ndị ga-abịara anyị n’ọdịnihu.

^ par. 15 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu gbasara ya, gụọ Ụlọ Nche Mee 15, 2015, peeji nke 29-30.