Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 21

Obi Ọ̀ Dị Gị Ụtọ Maka Onyinye Ndị Chineke Nyere Gị?

Obi Ọ̀ Dị Gị Ụtọ Maka Onyinye Ndị Chineke Nyere Gị?

“I mewo ọtụtụ ihe, Jehova bụ́ Chineke m, bụ́ ọrụ gị ndị dị ebube nakwa ihe ndị ị na-eche banyere anyị.”—ỌMA 40:5.

ABỤ NKE 5 Ọrụ Chineke Dị Ebube

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1-2. Dị ka e kwuru n’Abụ Ọma 40:5, olee onyinye ndị Jehova nyere anyị, gịnịkwa mere anyị ga-eji kwuo gbasara ha?

JEHOVA bụ Chineke na-emesapụ aka. Chegodị gbasara onyinye ụfọdụ o nyere anyị: ụwa a mara ezigbo mma, ụbụrụ anyị dị ịtụnanya, nakwa Okwu ya bụ́ Baịbụl. Ihe atọ a Jehova nyere anyị mere ka anyị nwee ebe anyị bi, mee ka anyị nwee ike ịna-eche echiche ma na-agwa ndị ọzọ okwu, meekwa ka anyị mata azịza ajụjụ ndị kacha mkpa anyị nwere ike ịjụ.—Gụọ Abụ Ọma 40:5.

2 N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’onyinye atọ ndị ahụ Jehova nyere anyị. Ọ bụrụ na anyị ana-echebara ha echiche, ọ ga-eme ka anyị na-ekele Chineke, meekwa ka anyị kpebisikwuo ike ịna-eme ihe dị Onye kere anyị hụrụ anyị n’anya bụ́ Jehova mma. (Mkpu. 4:11) Ọ ga-emekwa ka anyị dịkwuo njikere inyere ndị e ji ozizi evolushọn duhie aka.

ỤWA ANYỊ A PỤRỤ ICHE

3. Gịnị mere ụwa ji pụọ iche?

3 Otú Chineke si kee ụwa anyị a gosiri na o nwere amamihe. (Rom 1:20; Hib. 3:4) Ọ bụghị naanị ụwa bụ planet na-agba anyanwụ gburugburu. Ma, ụwa pụrụ iche n’ihi na ọ bụ naanị ya ka e kere ka mmadụ nwee ike ibi na ya.

4. Gịnị mere anyị nwere ike iji kwuo na ụwa ka ụgbọ mmiri mmadụ rụrụ mma?

4 E nwere ike iji ụwa anyị a tụnyere ụgbọ mmiri nọ n’oké osimiri. Ma, o nwere ihe dị iche n’ụgbọ mmiri mmadụ juru na ụwa anyị a. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ọ bụ ndị nọ n’ụgbọ mmiri ga-eji aka ha emepụta ikuku ha ga-ekuru, nri ha ga-eri na mmiri ha ga-aṅụ, ya abụrụkwa na e nweghị ebe ha ga-ekpofu ihe ndị ha na-achọghị, olee mgbe ha ga-anọru ndụ? Ọ gaghị ete aka ha anwụọ. Ma ụwa dị iche. E nwere ọtụtụ ijeri ụmụ mmadụ na anụmanụ bi na ya. Ọ bụ ụwa na-emepụta ikuku niile ha na-ekuru, nri ha na-eri na mmiri ha na-aṅụ. Ihe ndị a anaghịkwa akọ anyị. N’agbanyeghị na e nweghị ebe ọzọ ihe ndị anyị na-achọghị na-aga, ụwa anyị a ka mara mma, dịkwa mma obibi. Gịnị mere o ji dị otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na Jehova kere ụwa a otú ọ ga na-agbanwe ihe ndị anyị na-achọghị, mee ka ha baara anyị uru. Ka anyị leba anya n’abụọ n’ime ha na-egosi na Jehova nwere amamihe, ya bụ, otú anyị si enweta ikuku na mmiri.

5. Gịnị mere ikuku oxygen anaghị agwụnahụ anyị? Oleekwa ihe nke ahụ na-egosi?

5 Oxygen bụ ikuku ụmụ mmadụ na anụmanụ na-ekuru iji dị ndụ. Nchọpụta e mere gosiri na ihe ndị dị ndụ na-ekuru oxygen buru ezigbo ibu kwa afọ. Ikuku ihe ndị a dị ndụ na-ekupụta bụ carbon dioxide. N’agbanyeghị nke ahụ, ha anaghị ekurucha oxygen niile, carbon dioxide emebeghịkwa ka ikuku anyị na-ekuru ghara ịdị mma. N’ihi gịnị? N’ihi na Jehova kere ụdị osisi dị iche iche na-ekuru carbon dioxide, na-ekupụta oxygen. Ihe a gosiri na ihe e kwuru n’Ọrụ Ndịozi 17:24, 25 bụ eziokwu. Ebe ahụ sịrị: “Chineke . . . na-enye mmadụ niile ndụ na ume.”

6. Gịnị mere mmiri anaghị agwụnahụ anyị? Oleekwa ihe nke ahụ na-egosi? (Gụọkwa igbe isiokwu ya bụ “ Otú Jehova Si Mee Ka Mmiri Ghara Ịkọ n’Ụwa.”)

6 Ihe mere mmiri dị n’ụwa akpụkọghị akpụkọ bụ na ụwa adịghị oké anya n’ebe anyanwụ dị. A sị na ụwa nọ anyanwụ nso karịa otú ọ dị ugbu a, mmiri niile dị na ya ga-ata, ụwa adị ọkụ, kpọọ nkụ, o nweghịkwa ihe ọ bụla ga-adịli ndụ na ya. Ọ bụrụkwanụ na ụwa nọtụ anyanwụ n’ebe dị anya, ihe niile dị n’ụwa ga-ajụ oyi ma kpụkọọ. Ma, ebe ọ bụ na Jehova dowere ụwa ebe o kwesịrị ịnọ, otú ụwa si emepụta mmiri mere ka e nwee ihe ndị dị ndụ. Anyanwụ na-amịkọrọ mmiri dị ma n’osimiri ma n’elu ala laa n’elu, ya aghọọ urukpuru. Kwa afọ, mmiri anyanwụ na-amịkọrọ karịrị mmiri niile dị n’ọdọ mmiri niile dị n’ụwa. Mmiri ahụ na-anọ ihe dị ka abalị iri na mbara ígwé tupu ya ezoo ka mmiri ma ọ bụkwanụ daa ka snoo. Mmiri ahụ na-emecha sọba n’osimiri ma ọ bụkwanụ n’iyi, anyanwụ amịkọrọkwa ya ọzọ. Jehova mere ya ka ọ dịrị otú a ka mmiri ghara ịkọ n’ụwa. Ihe a gosiri na Jehova nwere amamihe, dịrịkwa ike.—Job 36:27, 28; Ekli. 1:7.

7. Olee ụzọ ụfọdụ anyị nwere ike isi gosi na obi dị anyị ụtọ maka onyinye Jehova nyere anyị e kwuru okwu ya n’Abụ Ọma 115:16?

7 Olee otú anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ maka ụwa anyị a na ihe ọma ndị dị na ya? (Gụọ Abụ Ọma 115:16.) Otu ụzọ anyị ga-esi eme ya bụ ịna-atụgharị uche n’ihe ndị Jehova kere. Ọ ga-eme ka anyị na-ekele ya kwa ụbọchị maka ihe ọma ndị ọ na-emere anyị. Ụzọ ọzọ anyị ga-esi eme ya bụ ịna-eme ike anyị niile iji na-edebe ebe anyị bi ọcha.

ỤBỤRỤ ANYỊ DỊ ỊTỤNANYA

8. Gịnị mere anyị nwere ike iji kwuo na e kere ụbụrụ anyị n’ụzọ dị ịtụnanya?

8 E kere ụbụrụ anyị n’ụzọ dị ịtụnanya. Mgbe ị nọ n’afọ nne gị, ụbụrụ gị toro otú e si hazie ya. Ọ na-emepụtakwa ọtụtụ puku mkpụrụ ndụ ná nkeji ọ bụla. Ndị na-eme nchọnchọ kwuru na ụbụrụ onye toro eto nwere ihe dị ka otu narị ijeri mkpụrụ ndụ a na-akpọ neurons. Ha dị ka ngwugwu e kere nke ọma dị ihe dị ka otu kilogram na ọkara n’arọ. Ka anyị tụlegodị ihe ụfọdụ dị ịtụnanya ụbụrụ anyị na-emeli.

9. Gịnị mere i ji kwere na ikwu okwu bụ onyinye si n’aka Chineke?

9 Ikwu okwu bụ ọrụ ebube. Chegodị banyere ihe na-eme ma anyị kwuwe okwu. Anyị kpọpụtawa okwu ọ bụla, ụbụrụ anyị na-achịkwa ihe dị ka otu narị ihe dị iche iche dị anyị n’ire, n’akpịrị, n’egbugbere ọnụ, n’agba, nakwa n’obi. Ihe ndị ahụ na-emegharị n’usoro ka anyị nwee ike ikwu ihe a ga-aghọta. Otu nchọpụta e mere n’afọ 2019 gbasara ikwu okwu gosiri na ụmụaka a mụrụ ọhụrụ na-anụ ma na-aghọta okwu dị iche iche. Nchọpụta a kwadoro ihe ọtụtụ ndị ọzọ na-eme nchọnchọ kwuru, ya bụ, na mgbe a mụrụ anyị, anyị nwere ike ịhụwa asụsụ ama, nweekwa ike ịmụta asụsụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na ikwu okwu bụ onyinye si n’aka Chineke.—Ọpụ. 4:11.

10. Olee otú anyị nwere ike isi gosi na obi dị anyị ụtọ maka onyinye ikwu okwu Chineke nyere anyị?

10 Otu ụzọ anyị ga-esi egosi na obi dị anyị ụtọ maka onyinye ikwu okwu Chineke nyere anyị bụ ịgwa ndị kweere n’evolushọn ihe mere anyị ji kwere na ọ bụ Chineke kere ihe niile. (Ọma 9:1; 1 Pita 3:15) Ndị na-akwado ozizi a na-ekwu na ụwa na ihe ndị dị ndụ dị na ya nọkatara dịrị. Anyị nwere ike iji Baịbụl na ihe ụfọdụ anyị tụlere n’isiokwu a gbachitere Nna anyị nke eluigwe, jirikwa ya gosi ndị chọrọ ige anyị ntị ihe mere anyị ji kwetasie ike na ọ bụ Jehova kere eluigwe na ụwa.—Ọma 102:25; Aịza. 40:25, 26.

11. Olee otu ihe mere ụbụrụ anyị ji dị ịtụnanya?

11 Otú anyị si echeta ihe dị ịtụnanya. N’oge gara aga, otu onye na-ede akwụkwọ kwuru na ụbụrụ mmadụ nwere ike icheta ihe ga-eju akwụkwọ nde iri abụọ. Ma ugbu a, e kwuru na ụbụrụ anyị nwere ike icheta ihe karịrị otú ahụ. Olee ihe pụrụ iche anyị nwere ike ime n’ihi na anyị nwere ike icheta ihe?

12. Olee otú anyị si dịrị iche n’ụmụ anụmanụ n’ihe gbasara ịmụta ihe n’ihe mere anyị?

12 N’ime ihe niile e kere eke dị n’ụwa, ọ bụ naanị ụmụ mmadụ nwere ike icheta ihe na ichebara ihe ahụ echiche ma si na ya mụta ihe. Ọ bụ ihe a mere anyị ji enwe ike ịmụta ịkpa àgwà ọma na ịgbanwe otú anyị si eche echiche na otú anyị si ebi ndụ. (1 Kọr. 6:9-11; Kọl. 3:9, 10) N’eziokwu, anyị nwere ike ịzụ akọnuche anyị ka ọ na-amata ihe dị iche n’ihe ọma na ihe ọjọọ. (Hib. 5:14) Anyị nwere ike ịmụta ịhụ ndị mmadụ n’anya, inwere ha ọmịiko, na imere ha ebere. Anyị nwekwara ike ịmụta ikpe ikpe ziri ezi ka Jehova.

13. Dị ka e kwuru n’Abụ Ọma 77:11, 12, gịnị ka anyị kwesịrị iji onyinye icheta ihe Chineke nyere anyị na-eme?

13 Otu ụzọ anyị nwere ike isi gosi na obi dị anyị ụtọ maka onyinye ịna-echeta ihe bụ anyị ịna-echeta oge niile Jehova nyeere anyị aka ma kasie anyị obi. Ọ ga-eme ka obi sie anyị ike na ọ ga-enyere anyị aka n’ọdịnihu. (Gụọ Abụ Ọma 77:11, 12; 78:4, 7) Otú ọzọ anyị nwere ike isi mee ya bụ ịna-echeta ihe ọma ndị ọzọ meere anyị na igosi ha na obi dị anyị ụtọ maka ya. Ndị na-eme nchọnchọ kwuru na ndị obi na-atọ ụtọ maka ihe ọma e meere ha na-enwekarị obi ụtọ. Anyị kwesịkwara ịna-echefu ihe ụfọdụ otú ahụ Jehova na-eme. Dị ka ihe atụ, o nweghị onye na-echeta ihe karịa Jehova. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụrụ na anyị emejọọ ya ma chegharịa, ọ na-agbaghara anyị ma chefuo ihe ahụ anyị mejọrọ. (Ọma 25:7; 130:3, 4) Ọ chọkwara ka anyị na-emekwa otú ahụ ma ndị ọzọ mejọọ anyị ma gosi na ihe ha mere wutere ha.—Mat. 6:14; Luk 17:3, 4.

Anyị na-egosi na obi dị anyị ụtọ maka ụbụrụ Chineke nyere anyị ma anyị jiri ya na-eme ihe ga-eme ka e too ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14) *

14. Olee otú anyị nwere ike isi gosi na obi dị anyị ụtọ maka ụbụrụ Chineke nyere anyị?

14 Anyị nwere ike iji ụbụrụ anyị bụ́ onyinye magburu onwe ya Jehova nyere anyị mee ka e too ya, si otú ahụ gosi na obi dị anyị ụtọ. Ụfọdụ ndị na-eji ụbụrụ ha eme ihe ga-abara naanị onwe ha uru. Ha na-eji ya ekpebiri onwe ha ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. Ma, ebe ọ bụ Jehova kere anyị, o doro anya na ihe ọ bụla o kpebiri ga-aka mma karịa ihe anyị ga-ekpebiri onwe anyị. (Ndị Rom 12:1, 2) Ọ bụrụ na anyị erubere ya isi, anyị ga-enwe udo. (Aịzaya 48:17, 18) Ọ ga-emekwa ka anyị mata ihe Jehova chọrọ ka anyị na-eme ná ndụ anyị, ya bụ, ime ka e too ya ma mee ya obi ụtọ.—Ilu 27:11.

BAỊBỤL BỤ ONYINYE PỤRỤ ICHE

15. Olee otú Baịbụl Chineke nyere anyị si egosi na ọ hụrụ anyị n’anya?

15 Baịbụl bụ onyinye magburu onwe ya Chineke nyere anyị. Nna anyị nke eluigwe nyere ndị dere ya mmụọ nsọ ka ha dee ya n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya nke ukwuu. Jehova ji Baịbụl zaa anyị ajụjụ ndị kacha mkpa anyị nwere ike ịjụ, dị ka: Olee ebe anyị si bịa n’ụwa? Gịnị mere anyị ji dịrị ndụ? nakwa Gịnị ka ọdịnihu anyị ga-abụ? Jehova chọrọ ka anyị niile mata azịza ajụjụ ndị a. Ọ bụ ya mere o ji mee ka a sụgharịa Baịbụl n’ọtụtụ asụsụ. Taa, a sụgharịala akwụkwọ niile dị na ya ma ọ bụ akwụkwọ ụfọdụ dị na ya n’ihe karịrị puku asụsụ atọ. Baịbụl bụ akwụkwọ a kacha sụgharịa ma kesaa n’ụwa. N’agbanyeghị ebe ndị mmadụ bi ma ọ bụ asụsụ ha na-asụ, ọtụtụ n’ime ha nwere ike ịgụ Baịbụl n’asụsụ ha.—Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Ime Ka Ndị Mmadụ Nweta Baịbụl n’Asụsụ Ndị A Na-asụ n’Afrịka.”

16. Dị ka Matiu 28:19, 20 kwuru, olee otú anyị nwere ike isi gosi na obi dị anyị ụtọ maka Baịbụl Chineke nyere anyị?

16 Anyị nwere ike igosi na obi dị anyị ụtọ maka Baịbụl Chineke nyere anyị ma anyị na-agụ ya kwa ụbọchị, na-atụgharị uche n’ihe ọ na-akụzi ma na-eme ike anyị ime ihe anyị mụtara. Anyị na-egosikwa na obi dị anyị ụtọ ma anyị gbalịa zie ọtụtụ ndị ozi ọma gbasara Alaeze Chineke.—Ọma 1:1-3; Mat. 24:14; gụọ Matiu 28:19, 20.

17. Olee onyinye ndị Chineke nyere anyị anyị tụlere n’isiokwu a? Olee ihe anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

17 N’isiokwu a, anyị atụleela gbasara onyinye ndị Chineke nyere anyị, dị ka, ụwa anyị a, ụbụrụ anyị dị ịtụnanya, na Okwu Chineke e ji mmụọ nsọ dee bụ́ Baịbụl. Ma, e nwekwara onyinye ndị ọzọ Jehova nyere anyị anya anyị na-enweghị ike ịhụ. Anyị ga-atụle ha n’isiokwu na-esonụ.

ABỤ NKE 12 Jehova Chineke Dị Ukwuu

^ par. 5 Isiokwu a ga-eme ka anyị hụkwuo Jehova n’anya, meekwa ka anyị na-ekele ya maka onyinye atọ o nyere anyị. Ọ ga-emekwa ka anyị mara otú anyị ga-esi enyere ndị na-ekweghị na Chineke dị aka.

^ par. 64 NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna nwaanyị na-amụ asụsụ ọzọ ka o nwee ike ịkụziri ndị bịara n’obodo ha Okwu Chineke.