Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 25

“Mụ Onwe M Ga-achọta Atụrụ M”

“Mụ Onwe M Ga-achọta Atụrụ M”

“Mụ onwe m ga-achọta atụrụ m wee lekọta ha.”​—EZIK. 34:11.

ABỤ NKE 105 “Chineke Bụ Ịhụnanya”

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Olee otú Jehova si yie nne na-enye nwa ara?

N’OGE Aịzaya onye amụma, Jehova jụrụ, sị: “Nwaanyị ọ̀ pụrụ ichefu nwa ya ka na-aṅụ ara?” Jehova kwuziri, sị: “Ọbụna ndị inyom a nwere ike ichefu, ma mụ onwe m agaghị echefu gị.” (Aịza. 49:15) Jehova anaghị ejikarị onwe ya atụnyere nne. Ma, o ji onwe ya tụnyere nne na nke ugbu a. Jehova ji otú nne na nwa ya si adị ná mma tụnyere otú o si hụ ndị ya n’anya. Ọtụtụ ndị nne ga-ekweta ihe a otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Jasmin kwuru. Ọ sịrị: “Inye nwa ara na-eme ka gị na ya dịrị ná mma ná ndụ unu niile.”

2. Olee otú obi na-adị Jehova ma otu nwa ya kwụsị ijere ya ozi?

2 Jehova ma mgbe nwa ya nke ọ bụla kwụsịrị ikwusa ozi ọma na ịga ọmụmụ ihe. Chegodịnụ ụdị mwute Jehova na-enwe ịhụ ka ọtụtụ puku ndị ohu ya na-akwụsị ijere ya ozi * kwa afọ.

3. Gịnị ka Jehova chọrọ?

3 Ọtụtụ ụmụnna anyị ndị a anyị hụrụ n’anya kwụsịrị ije ozi na-emecha lọghachi n’ọgbakọ. Obi na-adịkwa anyị ụtọ ma ha lọghachi. Jehova chọrọ ka ha lọghachi, anyịnwa chọkwara. (1 Pita 2:25) Olee otú anyị nwere ike isi nyere ha aka ịlọghachi? Tupu anyị azaa ajụjụ a, ọ ga-adị mma ka anyị mata ihe mere ụfọdụ n’ime ha ji akwụsị ịga ọmụmụ ihe na ozi ọma.

GỊNỊ MERE ỤFỌDỤ JI AKWỤSỊ IFE JEHOVA?

4. Olee otú ọrụ ụfọdụ ndị nwere ike isi akpa ha aka ọjọọ?

4 Ụfọdụ ndị kwere ka ọrụ ha bụrụ ihe kacha ha mkpa ná ndụ. Otu nwanna bi n’ebe Ndịda Ọwụwa Anyanwụ Eshia aha ya bụ Hung * kwuru, sị: “M kwere ka ọrụ m na-ewekọrọ oge m. Iberiibe m mere bụ na m nọ na-eche na ọ bụrụ na mụ enwee ezigbo ego, m ga-enwe ike ijekwuru Jehova ozi. N’ihi ya, m malitere ijikwu ọtụtụ awa na-arụ ọrụ, ya emee ka m na-ahapụkwu ọmụmụ ihe ruo mgbe m kwụsịchara. O yiri ka Setan ò ji ụwa a na-eme ka ndị mmadụ jiri nwayọọ nwayọọ kwụsị ife Jehova.”

5. Olee otú nsogbu si zuo otu nwanna nwaanyị ahụ́?

5 Nsogbu emeela ka ụfọdụ ụmụnna anyị kwụsị ijere Jehova ozi. E nwere otu nwanna nwaanyị bi na Briten aha ya bụ Anne. Ọ mụrụ ụmụ ise. Ọ sịrị: “Otu nwa m nwere nkwarụ kemgbe a mụrụ ya. Ka oge na-aga, a chụrụ otu nwa m nwaanyị n’ọgbakọ, ihe emechaakwa metụwa otu nwa m nwoke n’isi. Ihe a mere ka obi daa m mbà, mụ akwụsị ịga ọmụmụ ihe na ozi ọma. Emechakwara m ghọọ onye nkwusa na-adịghị ejekwa ozi.” Anyị na-emetere Nwanna Nwaanyị Anne na ezinụlọ ya nakwa ụmụnna anyị ndị ọzọ nwere ụdị nsogbu a ebere.

6. Olee otú emeghị ihe e kwuru ná Ndị Kọlọsi 3:13 nwere ike isi mee ka mmadụ kwụsị ịga ọmụmụ ihe na ozi ọma?

6 Gụọ Ndị Kọlọsi 3:13. E nwere ụfọdụ ndị iwe na-ewe n’ihi ihe ụmụnna ha mere ha. Pọl onyeozi kwuru na o nwere mgbe ụfọdụ anyị nwere ike inwe ezigbo ihe mere anyị “ga-eji mee mkpesa megide” nwanna anyị. O nwedịrị ike ịbụ na e mere anyị ihe na-adịghị mma. Ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya, anyị nwere ike ibuwe iwe n’obi. Iwe nwere ike ime ka mmadụ hapụ Jehova na ndị ya. Chegodị banyere otu nwanna bi n’Ebe Ndịda Amerịka aha ya bụ Pablo. Mmadụ ghagidere ya ụgha, ndị okenye ekweta ihe onye ahụ kwuru ma napụ ya ọrụ ọ na-arụ n’ọgbakọ. Gịnị ka Pablo mere? Ọ sịrị: “Iwe were m, mụ ejiri nwayọọ nwayọọ kwụsị ịga ọmụmụ ihe na ozi ọma.”

7. Olee ihe obi amamikpe nwere ike ime mmadụ?

7 Obi mmadụ nwere ike ịna-ama ya ikpe n’ihi ihe ọjọọ o mere n’oge gara aga, ya emee ka o chee na Jehova agaghị ahụli ya n’anya. Ọ bụrụgodị na o chegharịala, a gbaghara ya, o nwere ike ịna-eche na ya erughịzi eru ịnọ n’ọgbakọ. Ọ bụ otú a ka ọ dị otu nwanna aha ya bụ Francisco. Ọ sịrị: “A dọrọ m aka ná ntị n’ihi na m kwara iko. N’agbanyeghị na m nọ na-aga ọmụmụ ihe ná mmalite, ọ na-adị m ka mụ erughị eru ịnọ n’ọgbakọ. Obi m ka nọ na-ama m ikpe, mụ echee na Jehova agbagharabeghị m. Ka oge na-aga, m kwụsịrị ịga ọmụmụ ihe na ozi ọma.” Olee otú obi na-adị gị gbasara ụmụnna ndị ụdị ihe ndị a anyị kwuru okwu ha mere? Ị̀ na-emetere ha ebere? Nke kacha nke, olee otú obi na-adị Jehova gbasara ha?

JEHOVA HỤRỤ ATỤRỤ YA N’ANYA

Onye ọzụzụ atụrụ bụ́ onye Izrel hụrụ atụrụ ya kpafuru akpafu n’anya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8 na nke 9) *

8. Jehova ọ̀ na-echefu ndị nwere mgbe ha fere ya? Kọwaa.

8 Jehova anaghị echefu onye ọ bụla fere ya ma mechaa kwụsịtụ ịga ọmụmụ ihe na ozi ọma. Ọ naghịkwa echefu ozi ha jeere ya. (Hib. 6:10) Aịzaya onye amụma mere ihe atụ mara ezigbo mma iji gosi otú Jehova si elekọta ndị ya. Ọ sịrị: “Ọ ga-azụ ìgwè atụrụ ya dị ka onye ọzụzụ atụrụ. Ọ ga-eji ogwe aka ya chịkọta ụmụ atụrụ ya; ọ ga-ekuru ha n’obi ya.” (Aịza. 40:11) Olee otú obi na-adị Jehova, bụ́ Onye Ọzụzụ Atụrụ Ukwu ahụ, ma otu atụrụ ya kpafuo? Ihe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya mere ka anyị ghọta otú obi na-adị Jehova. Ọ sịrị ha: “Gịnị ka unu chere? Ọ bụrụ na otu nwoke nwere otu narị atụrụ ma otu n’ime ha akpafuo, ọ́ gaghị ahapụ iri itoolu na itoolu ahụ n’elu ugwu wee gaa chọwa nke ahụ kpafuru akpafu? Ọ bụrụ na ọ chọta ya, n’ezie, ana m asị unu, ọ ga-aṅụrị ọṅụ n’ihi ya karịa otú ọ na-aṅụrị n’ihi iri itoolu na itoolu ahụ na-akpafughị akpafu.”​—Mat. 18:​12, 13.

9. Olee otú ezigbo onye ọzụzụ atụrụ si elekọta atụrụ ya? (Kọwaa ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)

9 Gịnị mere anyị nwere ike iji jiri Jehova tụnyere onye ọzụzụ atụrụ? Ọ bụ n’ihi na ezigbo onye ọzụzụ atụrụ na-elekọta atụrụ ya nke ọma. Dị ka ihe atụ, Devid lụsoro ọdụm na anụ ọhịa bea ọgụ iji chebe ụmụ atụrụ ya. (1 Sam. 17:​34, 35) Ezigbo onye ọzụzụ atụrụ na-achọpụta mgbe otu atụrụ ya furu. (Jọn 10:​3, 14) Onye ọzụzụ atụrụ ahụ ga-ahapụ atụrụ ya dị iri itoolu na itoolu n’ogige atụrụ ma ọ bụ hapụrụ ya ndị ọzụzụ atụrụ ibe ya gaa chọwa otu ahụ furu efu. Jizọs ji ihe atụ ahụ kụzie otu eziokwu dị mkpa nke bụ́: “Ọ dịghị Nna m nke bi n’eluigwe mma ka otu n’ime ndị a dị nta laa n’iyi.”​—Mat. 18:14.

Ebe onye ọzụzụ atụrụ bụ́ onye Izrel na-elekọta atụrụ ya furu efu (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9)

JEHOVA NA-ACHỌ ATỤRỤ YA

10. Dị ka e kwuru n’Ezikiel 34:​11-16, gịnị ka Jehova kwuru na ya ga-emere atụrụ ya kpafuru akpafu?

10 Jehova hụrụ onye ọ bụla n’ime anyị n’anya, ma ‘ndị dị nta’ kpafuru akpafu. Chineke si n’ọnụ Ezikiel onye amụma kwe nkwa na ya ga-achọ atụrụ ya, nyekwara ha aka ka ya na ha dịghachi ná mma. O kwukwara ihe ndị ọ ga-eme iji napụta ha. Ihe ndị ahụ yiri ihe onye ọzụzụ atụrụ bụ́ onye Izrel na-eme ma atụrụ ya kpafuo. (Gụọ Ezikiel 34:​11-16.) Nke mbụ, onye ọzụzụ atụrụ ahụ ga-achọ atụrụ ahụ. O nwere ike ịgba ezigbo mbọ ka o nwee ike ịchọta ya, ya eweekwa ya oge. Ọ hụzie atụrụ ahụ, ya akpọlata ya. Ihe ọzọkwa bụ na ọ bụrụ na atụrụ ahụ merụrụ ahụ́ ma ọ bụ na agụụ na-agụ ya, onye ọzụzụ atụrụ ahụ ga-eji nwayọọ nyere ya aka, kechie ọnyá ya, kuru ya ma nye ya nri. Ndị okenye, bụ́ ndị na-azụ “ìgwè atụrụ Chineke,” kwesịrị ịna-eme ihe ndị a ma ha chọọ inyere onye ọ bụla hapụrụ ọgbakọ aka. (1 Pita 5:​2, 3) Ndị okenye na-achọ ha, nyere ha aka ịlọghachi n’ọgbakọ, nyekwara ha aka ka ha na Jehova dịghachi ná mma iji gosi ha na ha hụrụ ha n’anya. *

11. Gịnị ka ezigbo onye ọzụzụ atụrụ ma?

11 Ezigbo onye ọzụzụ atụrụ ma na atụrụ ya nwere ike ịkpafu. Ọ bụrụ na e nwee atụrụ kpafurunụ, onye ọzụzụ atụrụ anaghị ata ya ahụhụ. Ka anyị tụlee otú Jehova si nyere ụfọdụ ndị kwụsịtụrụ ife ya n’oge ochie aka na ihe anyị ga-amụta na ya.

12. Olee otú Jehova si meso Jona?

12 Jona onye amụma gbaara ọrụ Jehova nyere ya ọsọ. N’agbanyeghị nke ahụ, Jehova ajụghị ya. Dị ka ezigbo onye ọzụzụ atụrụ, Jehova zọpụtara ya ma nyere ya aka inweta ume ọ ga-eji rụọ ọrụ ahụ o nyere ya. (Jona 2:7; 3:​1, 2) Ka oge na-aga, Chineke ji osisi ogiri ụgba nyere Jona aka ịghọta otú o si were ndụ mmadụ. (Jona 4:​10, 11) Gịnị ka anyị na-amụta na ya? Ndị okenye ekwesịghị ikpebi ozugbo na ndị na-anaghị ejekwa ozi agaghị agbanweli. Kama, ha na-agbalị ịghọta ihe mere ha ji kpafuo. Ọ bụrụkwa na ha alọghachi n’ọgbakọ, ndị okenye kwesịrị ịna-egosi ha na ha hụrụ ha n’anya.

13. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’otú Jehova si meso onye dere Abụ Ọma nke iri asaa na atọ?

13 Obi dara onye dere Abụ Ọma nke iri asaa na atọ mbà mgbe ọ hụrụ ihe ndị mere ka o yie ka ihe ọ̀ na-agaziri ndị ajọ omume. Ọ bịara na-eche ma è nwere uru irubere Chineke isi bara. (Ọma 73:​12, 13, 16) Gịnị ka Jehova mere? Jehova abaraghị ya mba. Kama nke ahụ, Jehova medịrị ka e dee ihe ndị o kwuru na Baịbụl. Ka oge na-aga, ọbụ abụ ahụ mechara ghọta na e nweghị ihe a ga-eji tụnyere mmadụ na Chineke ịdị ná mma. (Ọma 73:​23, 24, 26, 28) Gịnị ka anyị na-amụta na ya? Ndị okenye ekwesịghị ịna-akatọ ndị ọ na-eme obi abụọ ma ife Chineke ọ̀ bara uru. Kama ịkatọwa ha, ha kwesịrị ịgbalị ghọta ihe mere ha ji na-ekwu ma na-eme ihe ndị ha na-eme. Ọ bụ naanị mgbe ahụ ka ha nwere ike iji Baịbụl nyere ha aka.

14. Gịnị mere e kwesịrị iji nyere Ịlaịja aka? Oleekwa otú Jehova si nyere ya aka?

14 Ịlaịja onye amụma gbara ọsọ n’ihi Eze Nwaanyị Jezibel. (1 Eze 19:​1-3) O chere na ọ bụ naanị ya bụ onye amụma Jehova fọrọnụ, nakwa na ozi niile o jeere Jehova bụ ịkwọ aka tiere ọkụkọ akị. Ịlaịja dara mbà n’obi nke na ọ chọrọ ka ọnwụ bịa gburu ya. (1 Eze 19:​4, 10) Kama Jehova ịkatọ Ịlaịja, o mere ka obi sie ya ike na ọ bụghị naanị ya bụ onye amụma fọrọnụ, na o nwere ike ịtụkwasị Chineke obi, nakwa na e nwere ọtụtụ ọrụ ọ ka ga-arụ. Jehova medara obi gee ntị n’ihe Ịlaịja kwuru ma nye ya ọrụ ọhụrụ. (1 Eze 19:​11-16, 18) Gịnị ka anyị na-amụta na ya? Anyị niile, karịchaa ndị okenye, kwesịrị iji obiọma na-emeso atụrụ Chineke ihe. Ma okwu mmadụ na-ekwu ọ̀ na-egosi na iwe ji ya ma ọ bụkwanụ na ya erughị eru ka Jehova meere ya ebere, ndị okenye ga-ege ya ntị mgbe ọ na-ekwu otú ọ dị ya n’obi. Ha ga-emezi ka obi sie ya ike na Jehova ji ya kpọrọ ihe.

OLEE OTÚ OBI KWESỊRỊ ỊDỊ ANYỊ MAKA ATỤRỤ CHINEKE FURU EFU?

15. Dị ka e kwuru na Jọn 6:​39, olee otú Jizọs si were atụrụ Nna ya?

15 Olee otú Jehova chọrọ ka obi dịrị anyị maka atụrụ ya furu efu? Jizọs gosiri anyị ihe anyị kwesịrị ime. Ọ ma na Jehova ji atụrụ ya niile kpọrọ ihe. N’ihi ya, Jizọs mere ihe niile o nwere ike ime iji nyere “atụrụ furu efu nke ụlọ Izrel” aka ịlọghachikwute Jehova. (Mat. 15:24; Luk 19:​9, 10) Jizọs bụ ezigbo onye ọzụzụ atụrụ. N’ihi ya, o mere ike ya niile ka atụrụ Jehova ọ bụla ghara ịkpafu.​—Gụọ Jọn 6:39.

16-17. Olee otú obi kwesịrị ịdị ndị okenye gbasara inyere ndị kpafuru akpafu aka? (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Otú Obi Nwere Ike Ịdị Atụrụ Kpafuru Akpafu.”)

16 Pọl onyeozi gwara ndị okenye nọ n’ọgbakọ Efesọs ka ha na-eme ka Jizọs. Ọ gwara ha, sị: “Unu aghaghị inyere ndị na-adịghị ike aka, unu aghaghịkwa iburu okwu Onyenwe anyị Jizọs n’uche, mgbe ya onwe ya sịrị, ‘A na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.’” (Ọrụ 20:​17, 35) Amaokwu a gosiri na ndị okenye nwere ọrụ dị mkpa n’ilekọta ndị Jehova. Otu okenye bi na Spen aha ya bụ Salvador kwuru, sị: “M chewe otú Jehova si were atụrụ ya kpafuru akpafu, ọ na-eme ka m chọkwuo inyere ha aka. Ebe m bụ okenye, ama m na Jehova chọrọ ka m na-enyere ha aka.”

17 E nyeere ndị niile kpafuru akpafu anyị kwuru banyere ha n’isiokwu a aka ha alọghachikwute Jehova. Taa, e nwere ọtụtụ ndị kpafuru akpafu chọkwara ịlọghachi. N’isiokwu na-eso nke a, anyị ga-atụle otú anyị ga-esi nyere ha aka ịlọghachikwute Jehova.

ABỤ NKE 139 Hụ Onwe Gị n’Ụwa Ọhụrụ

^ par. 5 Gịnị mere ụfọdụ ndị ferela Jehova ọtụtụ afọ ji akwụsị ịga ọmụmụ ihe na ozi ọma? Olee otú obi na-adị Chineke maka ha? A ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu a. Isiokwu a lebakwara anya n’ihe anyị nwere ike ịmụta n’otú Jehova si nyere ndị kwụsịtụrụ ife ya aka n’oge ochie.

^ par. 2 NKỌWAKWU: Onye nkwusa na-adịghị ejekwa ozi bụ onye na-enyebeghị akụkọ ozi ya kemgbe ọnwa isii ma ọ bụ karịa iji gosi na o kwusara ozi ọma. N’agbanyeghị nke ahụ, ụdị ndị a ka bụkwa ụmụnna anyị. Anyị hụkwara ha n’anya.

^ par. 4 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

^ par. 10 Isiokwu na-esonụ ga-ekwu otú ndị okenye ga-esi eme ihe ndị a.

^ par. 60 NKỌWA FOTO: N’oge ụmụ Izrel, onye ọzụzụ atụrụ otu atụrụ ya kpafuru na-aga chọọ ya ma nyere ya aka ịlọghachi n’ìgwè atụrụ ya n’ihi na ọ hụrụ ya n’anya. Otú ahụ ka ndị okenye na-emekwa taa.

^ par. 64 NKỌWA FOTO: Ka otu nwanna nwaanyị na-adịghị ejekwa ozi nọ na bọs, ọ hụrụ Ndịàmà Jehova abụọ ji obi ụtọ na-ezi ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị.