Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 23

“Ka E Doo Aha Gị Nsọ”

“Ka E Doo Aha Gị Nsọ”

“Jehova, aha gị na-adịru mgbe ebighị ebi.”​—ỌMA 135:13.

ABỤ NKE 10 Toonụ Jehova Chineke Anyị

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1-2. Olee isiokwu ndị na-amasị Ndịàmà Jehova?

E NWERE ihe dị mkpa gbasara anyị taa. Ọ bụ ido aha Jehova nsọ na igosi na ọ bụ ya kwesịrị ịchị. Ebe anyị bụ Ndịàmà Jehova, ọ na-amasị anyị ikwu gbasara isiokwu ndị a. Ma, ọ pụtaghị na e nwere ihe dị iche n’ido aha Jehova nsọ na igosi na ọ bụ ya kwesịrị ịchị.

2 Anyị niile amụtala na e kwesịrị ido aha Jehova nsọ. Anyị amụtakwala na ọ bụ Jehova kwesịrị ịchị, nakwa na ọchịchị ya kacha mma. Ihe abụọ a dị anyị ezigbo mkpa.

3. Olee ihe ndị aha Chineke nọchiri anya ha?

3 Nke bụ́ eziokwu bụ na aha Jehova nọchiri anya ihe niile gbasara Chineke anyị, ma otú o si achị. N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị asị na ido aha Chineke nsọ bụ ihe kacha mkpa, ihe anyị na-ekwu bụ na e kwesịrị igosi na ọ bụ ọchịchị Jehova kacha mma. E nwere ezigbo ihe jikọrọ Aha Jehova na otú o si achị.​—Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Ihe Ndị So n’Ihe Ahụ Dị Mkpa.”

4. Olee otú Abụ Ọma 135:13 si kọwaa aha Chineke, oleekwa ajụjụ ndị anyị ga-aza n’isiokwu a?

4 Aha Jehova pụrụ iche. (Gụọ Abụ Ọma 135:13.) Gịnị mere aha Chineke ji dị ezigbo mkpa? Olee otú e si kwutọọ ya na nke mbụ ya? Olee otú Chineke si edo aha ya nsọ? Oleekwa otú anyị nwere ike isi nye aka doo aha ya nsọ? Ka anyị zaa ajụjụ ndị a.

IHE MERE AHA JI DỊ MKPA

5. Olee ajụjụ ụfọdụ ndị nwere ike ịjụ ma ha nụ na e kwesịrị ido aha Chineke nsọ?

5 “Ka e doo aha gị nsọ.” (Mat. 6:9) Jizọs kwuru na ihe a kwesịrị iso n’ihe ndị kacha mkpa anyị ga-ekpe ekpere maka ha. Ma, gịnị ka ihe a Jizọs kwuru pụtara? Ido ihe nsọ pụtara ime ka ọ dị ọcha. Ụfọdụ nwere ike ịna-eche, sị, ‘Ọ̀ bụ na aha Jehova adịghị nsọ?’ Iji zaa ajụjụ a, anyị kwesịrị iche gbasara ihe aha na-anọchi anya ya.

6. Gịnị mere aha ji dị mkpa?

6 Aha abụghị naanị ihe e dere ede ma ọ bụ kwuo ekwuo. Baịbụl kwuru, sị: “Ọ dị mma ịhọrọ ezi aha karịa ịhọrọ akụ̀ dị ukwuu.” (Ilu 22:1; Ekli. 7:1) Gịnị mere aha ji dị mkpa otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na ọ na-anọchi anya ihe e ji mara mmadụ na ihe ndị mmadụ na-eche gbasara onye na-aza aha ahụ. N’ihi ya, ihe kacha mkpa abụghị otú e si ede aha mmadụ ma ọ bụ otú e si akpọ ya. Ihe kacha mkpa bụ onye nwe aha ahụ na ihe ndị mmadụ na-eche gbasara ya.

7. Olee otú ndị mmadụ si eme ka a na-ele Chineke anya ọjọọ?

7 Ọ bụrụ na ndị mmadụ ana-ekwu ihe na-abụghị eziokwu gbasara Jehova, ihe ha na-eme bụ ime ka ndị mmadụ lewe ya anya ọjọọ. Ọ bụrụ na ndị mmadụ elewe Chineke anya ọjọọ, ha na-ata ya ụta ma na-ekwutọ aha ya. Oge mbụ e kwutọrọ aha Chineke bụ n’ogige Iden. Ka anyị tụlee ihe anyị ga-amụta na ya.

OTÚ E SI KWUTỌỌ AHA CHINEKE NA NKE MBỤ YA

8. Gịnị ka Adam na Iv ma, oleekwa ajụjụ ndị anyị nwere ike ịjụ?

8 Adam na Iv ma na aha Chineke bụ Jehova. Ha makwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ dị ezigbo mkpa banyere ya. Ha ma na ọ bụ ya kere ha, nye ha ndụ, nye ha ebe mara mma ha bi, nyekwa ha onye ha lụrụ. (Jen. 1:​26-28; 2:18) Ma, hà nọgidere na-eche gbasara ihe ọma niile Jehova meere ha? Hà nọgidere na-ahụ Jehova n’anya ma na-egosi na obi dị ha ụtọ maka ihe ndị ọ na-emere ha? A matara azịza ajụjụ ndị a mgbe onye iro Chineke nwara ha.

9. Dị ka e kwuru na Jenesis 2:​16, 17; na 3:​1-5, gịnị ka Chineke gwara Adam na Iv, oleekwa otú Setan si mee ka ha chewe ihe na-ezighị ezi banyere Chineke?

9 Gụọ Jenesis 2:​16, 17; na 3:​1-5. Setan ji agwọ jụọ Iv, sị: “Ọ̀ bụ eziokwu na Chineke sịrị unu erila mkpụrụ si n’osisi ọ bụla dị n’ubi a?” Setan si otu a ghagide Chineke ụgha, ya emee ka Iv chewe ihe na-ezighị ezi banyere Chineke. Ihe Chineke gwara ha bụ na ha nwere ike iri mkpụrụ osisi niile, e wezụga otu. E nwere ụdị mkpụrụ osisi dị iche iche ha nwere ike iri. (Jen. 2:9) N’eziokwu, Jehova na-emesapụ aka. Ma, e nwere otu osisi Chineke gwara ha erila mkpụrụ si na ya. N’ihi ya, ajụjụ a Ekwensu jụrụ mere ka o yie ka ọ̀ bụ na Chineke anaghị emesapụ aka. Iv nwere ike ịna-eche, sị: ‘È nwere ihe ọma Chineke na-achọghị ka m nweta?’

10. Olee otú Setan si kwutọọ aha Chineke? Gịnịkwa ka ọ kpatara?

10 N’oge ahụ, Iv ka na-erubere Chineke isi. Ọ gwara Setan ihe Chineke gwara ha. Ọ gwadịrị ya na ha ekwesịghị imetụ osisi ahụ aka. Ọ ma na Chineke gwara ha na ha ga-anwụ ma ha nupụrụ ya isi. Ma Setan sịrị ya: “Unu agaghị anwụ ma ọlị.” (Jen. 3:​2-4) Setan ejighịzi ụzọ aghụghọ na-agwa Iv na Jehova ghaara ha ụgha. Ọ gwara Iv na Jehova na-aghara ha ụgha, si otú ahụ kwutọọ aha Jehova. O sizi otú ahụ ghọọ Ekwensu ma ọ bụ onye nkwutọ. A ghọgburu Iv kpamkpam, ya ekweta ihe Setan kwuru. (1 Tim. 2:14) Ọ tụkwasịrị Ekwensu obi karịa Jehova. Ọ bụ ya mere o ji mee mkpebi kacha njọ mmadụ nwere ike ime. O kpebiri inupụrụ Jehova isi. O riri mkpụrụ osisi ahụ Jehova sị ha erila. Mgbe e mechara, o nyere Adam ụfọdụ mkpụrụ osisi ahụ.​—Jen. 3:6.

11. Gịnị ka Adam na Iv kwesịrị ime ha na-emeghị?

11 Chegodị ihe Iv gaara agwa Setan. Weregodị ya na ọ gwara ya ihe dị ka: “Amaghị m onye ị bụ. Ma ama m Nna m bụ́ Jehova. M hụrụ ya n’anya, tụkwasịkwa ya obi. O nyere mụ na di m ihe niile anyị nwere. Gịnị mere ị ga-eji kwuo ụdị ihe ọjọọ a gbasara ya? Si ebe a pụọ.” Obi gaara adị Jehova ezigbo ụtọ ma a sị na Iv gwara Setan ụdị ihe a. (Ilu 27:11) Ma, Iv ahụghị Jehova n’anya. Otú ahụ ka ọ dịkwa Adam. Ọ bụ ya mere na ha agbachitereghị ya mgbe a na-ekwutọ ya.

12. Olee otú Setan si mee ka Iv nwewe obi abụọ? Gịnịkwa ka Adam na Iv na-emeghị?

12 Dị ka anyị hụrụ, ihe mbụ Setan mere bụ ime ka Iv nwewe obi abụọ. O mere ka o chewe ma Jehova ọ̀ bụ ezigbo Nna. Adam na Iv agbachitereghị Jehova mgbe Ekwensu na-aghagide ya ụgha. O mere ka ọ dịrị ha mfe ige Ekwensu ntị ma nupụrụ Nna ha isi. Setan na-emekwa ụdị ihe ahụ taa. Ọ na-ekwutọ aha Jehova si otú ahụ mee ka ndị mmadụ na-ele ya anya ọjọọ. Ọ na-adịrị ndị kweere n’ụgha Setan mfe inupụrụ Jehova isi.

JEHOVA NA-EDO AHA YA NSỌ

13. Olee otú Ezikiel 36:23 si gosi isi ihe Baịbụl na-ekwu?

13 Jehova ọ̀ gbachiri nkịtị ná nkwụtọ ahụ e kwutọrọ aha ya? Mba, ọ gbachighị nkịtị. Ihe niile e kwuru na Baịbụl bụ ihe Jehova mere iji gosi na ihe ndị ahụ e kwuru gbasara ya n’ogige Iden abụghị eziokwu. (Jen. 3:15) Anyị nwedịrị ike ikwu na ihe niile e kwuru na Baịbụl bụ: Jehova ji Alaeze ya nke Ọkpara ya na-achị na-eme ka aha ya dịrị nsọ, jirikwa ya na-eme ka ezi omume na udo dịrịghachi n’ụwa. Baịbụl kwuru ihe ga-enyere anyị aka ịghọta otú Jehova si edo aha ya nsọ.​—Gụọ Ezikiel 36:23.

14. Olee otú ihe Jehova mere gbasara isi e nupụụrụ ya n’Iden si mee ka e doo aha ya nsọ?

14 Setan emeela ike ya niile ka Jehova ghara ido aha ya nsọ. Ma, mbọ ya niile akụọla afọ n’ala ọtụtụ ugboro. Baịbụl agwala anyị ihe Jehova mere. O gosiri na e nweghị onye dị ka Jehova Chineke. N’eziokwu, isi Setan na ndị òtù ya nupụụrụ ya gbawara ya obi. (Ọma 78:40) N’agbanyeghị nke ahụ, ihe o mere maka ya gosiri na ọ ma ihe, na-enwe ndidi, na-ekpekwa ikpe ziri ezi. O gosikwala na ọ bụ ya kacha ike n’ọtụtụ ụzọ. Nke kachanụ bụ na ihe niile ọ na-eme na-egosi na ọ hụrụ anyị n’anya. (1 Jọn 4:8) Jehova akwụsịbeghị ịrụ ọrụ iji mee ka e doo aha ya nsọ.

Setan ghaara Iv ụgha gbasara Jehova. Kemgbe ọtụtụ afọ, ọ ka na-ekwutọ aha Chineke (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9, nke 10 na nke 15) *

15. Olee otú Setan si ekwutọ aha Chineke taa, gịnịkwa ka ọ na-akpata?

15 Setan ka na-ekwutọ aha Chineke taa. Ọ na-eme ka obi ghara isi ndị mmadụ ike na Chineke dị ike, na-ekpe ikpe ziri ezi, mara ihe ma hụ anyị n’anya. Dị ka ihe atụ, Setan na-agbalị ime ka ndị mmadụ kweta na e nweghị Onye Okike. Ọ bụrụkwanụ na ụfọdụ ekweta na Chineke dị, ọ na-agbalị ime ka ha chee na iwu ya ezighị ezi nakwa na o siri ike ndebe. Ọ na-akụzikwara ndị mmadụ na Jehova bụ Chineke obi tara mmiri nke na-akpọ ndị mmadụ ọkụ n’ọkụ ala mmụọ. Ọ bụrụ na ndị mmadụ ekweta ihe ndị a, ọ na-emezi ka ha nupụwere Jehova isi. Setan agaghị akwụsị ikwutọ aha Jehova ruo mgbe Jehova ga-ebibi ya. Ọ ga-achọkwa ime ka gịnwa nupụrụ Jehova isi. Ọ̀ ga-emeli ya?

IHE I NWERE IKE IME GBASARA OKWU A

16. Gịnị ka i nwere ike ime Adam na Iv na-emeghị?

16 Jehova kwere ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè soro mee ka e doo aha ya nsọ. Ihe ọ pụtara bụ na i nwere ike ime ihe Adam na Iv na-emeghị. N’agbanyeghị na i bi n’ụwa ọtụtụ ndị na-ekwutọ aha Chineke, i nwere ike ịgbachitere Jehova ma gwa ndị mmadụ na ọ dị nsọ, bụrụ onye ezi omume, dịrị mma, hụkwa anyị n’anya. (Aịza. 29:23) I nwere ike ịkwado ọchịchị ya. I nwere ike ime ka ndị mmadụ ghọta na ọ bụ naanị ọchịchị Jehova ziri ezi, nakwa na ọ bụ naanị ya ga-emeli ka ihe niile e kere eke dịrị n’udo ma na-enwe obi ụtọ.​—Ọma 37:​9, 37; 146:​5, 6, 10.

17. Olee otú Jizọs si mee ka a mara aha Nna ya?

17 Anyị na-eme ka Jizọs ma anyị na-agbachitere aha Jehova. (Jọn 17:26) Jizọs mere ka a mara aha Nna ya. Otú o si mee ya bụ na ọ na-akpọ Nna ya aha ya, na-akụzikwara ndị mmadụ ụdị onye Nna ya bụ. Dị ka ihe atụ, àgwà ya dị iche na nke ndị Farisii. Ndị Farisii na-eme ka o yie ka Jehova ọ̀ dị obi ọjọọ, na-achọ ka ụmụ mmadụ mee ihe ha na-agaghị emeli, nọrọ ha n’ebe dị anya, bụrụkwa onye obi kpọrọ nkụ. Ma Jizọs mere ka ndị mmadụ mara na Nna ya na-echebara ha echiche, na-enwere ha ndidi, hụ ha n’anya, na-agbagharakwa ha. Ihe ọzọkwa bụ na ọ na-akpa àgwà ka Nna ya n’ihe niile ọ na-eme n’ụbọchị. O si otú ahụ nyere ndị mmadụ aka ịmata Jehova.​—Jọn 14:9.

18. Olee otú anyị nwere ike isi gosi na ihe Setan na-ekwu gbasara Jehova abụghị eziokwu?

18 Dị ka Jizọs, anyị nwere ike ịna-agwa ndị mmadụ ihe anyị ma gbasara Jehova, na-akụziri ha na Chineke hụrụ ha n’anya, dịrịkwa obiọma. Anyị na-eme otú ahụ, anyị na-egosi na ihe ahụ Ekwensu na-ekwu gbasara Chineke abụghị eziokwu. Anyị na-eme ka aha Jehova dịrị nsọ, ma n’obi ndị mmadụ. Anyị nwekwara ike ime ka Jehova. Anyị ga-emeli ya n’agbanyeghị na anyị ezughị okè. (Efe. 5:​1, 2) Ọ bụrụ na okwu ọnụ anyị na omume anyị ana-egosi ndị mmadụ ụdị onye Jehova bụ, anyị so na-eme ka e doo aha ya nsọ. Anyị na-eme ka e wepụ aha Jehova n’ụta ma anyị na-enyere ndị mmadụ aka ịmata ihe bụ́ eziokwu gbasara Chineke. * Anyị na-egosikwa na mmadụ na-ezughị okè ga-erubereli Chineke isi.​—Job 27:5.

Anyị kwesịrị inyere ndị anyị na-amụrụ ihe aka ịghọta na Jehova dị obiọma, hụkwa anyị n’anya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 18 na nke 19) *

19. Olee otú Aịzaya 63:7 si enyere anyị aka ịmata ihe kwesịrị ịbụ isi ihe mere anyị ji na-akụziri ndị mmadụ ihe?

19 E nwekwara ihe ọzọ anyị nwere ike ime iji mee ka e doo aha Jehova nsọ. Anyị na-akụziri ndị mmadụ Baịbụl, anyị na-ekwukarị na ọ bụ Chineke kwesịrị ịchị. Nke ahụ bụkwa eziokwu. N’agbanyeghị na anyị kwesịrị ịkụziri ndị mmadụ iwu Chineke, ihe kacha anyị mkpa bụ inyere ndị mmadụ aka ịhụ Nna anyị bụ́ Jehova n’anya na irubere ya isi. Anyị kwesịkwara ime ka ha mata àgwà ọma ndị Jehova nwere, meekwa ka ha ghọta ụdị Onye ọ bụ. (Gụọ Aịzaya 63:7.) Anyị si otú a na-akụziri ndị mmadụ ihe, anyị ga-enyere ha aka isi n’obi ha hụ Jehova n’anya ma na-erubere ya isi.

20. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

20 Ma, olee otú anyị ga-esi jide n’aka na otú anyị si akpa àgwà na otú anyị si akụziri ndị mmadụ ihe ga-eme ka ha na-eche ihe ọma ma ha nụ aha Jehova, meekwa ka ha chọọ ịbụ enyi ya? A ga-aza ajụjụ a n’isiokwu na-esonụ.

ABỤ NKE 2 Jehova Bụ Aha Gị

^ par. 5 Olee ihe dị ndị mmadụ na ndị mmụọ ozi ezigbo mkpa? Olee ihe mere o ji dị ezigbo mkpa, oleekwa otú o si gbasa anyị? Ịghọta azịza ajụjụ ndị a na ajụjụ ndị yiri ya ga-eme ka anyị na Jehova dịrịkwuo ná mma.

^ par. 18 E nweela mgbe akwụkwọ anyị kwuru na anyị ekwesịghị ikwu na e kwesịrị iwepụ aha Jehova n’ụta. N’ihi gịnị? N’ihi na e nwebeghị onye kwuru na Chineke ekwesịghị ịna-aza aha ahụ bụ́ Jehova. Ma, ná nnọkọ a na-enwe kwa afọ nke afọ 2017, anyị ghọtakwuru isiokwu a. Onyeisi oche nnọkọ ahụ kwuru, sị: “N’ikwu ya n’otú ọ ga-adị mfe nghọta, o nweghị ihe o mere ma anyị kpee ekpere ka e wepụ aha Jehova n’ụta n’ihi na n’eziokwu, e kwesịrị iwepụ aha ya n’ụta.”​—Lee ihe omume tiivi anyị nke ọnwa Jenụwarị afọ 2018 na jw.org/ig. Gaa n’ebe e dere IHE NDỊ ANYỊ NWERE pịa IHE OMUME TIIVI NDỊÀMÀ JEHOVA.

^ par. 62 NKỌWA FOTO: Setan kwutọrọ aha Chineke, gwa Iv na Chineke bụ onye ụgha. Kemgbe ọtụtụ afọ, Ekwensu na-akụzi ụgha dị iche iche, dị ka na obi kpọrọ Chineke nkụ, nakwa na ọ bụghị ya kere ụmụ mmadụ.

^ par. 64 NKỌWA FOTO: Mgbe otu nwanna na-akụziri mmadụ Baịbụl, ọ na-akọwara ya ụdị onye Chineke bụ.