Njide Onwe Onye Dị Anyị Mkpa Ka Ihe Anyị Na-amasị Jehova
Otu nwoke aha ya bụ Paul kwuru, sị: “Mgbe nwa nwanne mama m lụsoro m ọgụ, m tọgidere ya n’akpịrị, chọọ ịtọgbu ya.”
Otu nwoke aha ya bụ Marco kwuru, sị: “N’ụlọ, obere ihe na-ewe m iwe, mụ akụwasịwa ihe ọ bụla ruru m aka, ma oche ma ihe ndị e ji egwu egwu.”
O nwere ike anyị agaghị emerucha ka ndị a e kwuru okwu ha. Ma, o nwere mgbe ọ na-esiri onye ọ bụla n’ime anyị ike ijide onwe ya. Ihe kpatara ya bụ ezughị okè anyị ketara n’aka nwoke mbụ bụ́ Adam. (Rom 5:12) E nwere ndị ọ na-esiri ike ijide onwe ha ma iwe bịa ha dị ka Paul na Marco, nweekwa ndị ọ na-esiri ike iwepụ echiche na-adịghị mma batara ha n’obi. Ha na-echegbu onwe ha gbasara ihe ndị na-emenye ha egwu na ihe ndị na-akụda ha obi. E nwekwara ndị ọ na-esiri ike ijide onwe ha n’ihe gbasara ịkwa iko, ịṅụbiga mmanya okè, na ịṅụ ọgwụ ọjọọ.
Ndị ọ na-esiri ike ijide onwe ha n’ihe ha na-eche, n’ihe na-agụ ha agụụ na ihe ha na-eme nwere ike ịkpatara onwe ha ezigbo nsogbu. Ma, anyị nwere ike izere ya. Olee otú anyị nwere ike isi zere ya? Ọ bụ ịmụta ijide onwe anyị. Ka anyị tụlee ajụjụ atọ ga-enyere anyị aka ijide onwe anyị: (1) Gịnị bụ njide onwe onye? (2) Gịnị mere o ji dị mkpa? (3) Olee otú anyị nwere ike isi mụta àgwà a so ná “mkpụrụ nke mmụọ nsọ”? (Gal. 5:22, 23) Anyị ga-atụlekwa ihe anyị nwere ike ime ma e nwee mgbe ụfọdụ anyị na-ejidelighị onwe anyị.
GỊNỊ BỤ NJIDE ONWE ONYE?
Onye na-ejide onwe ya anaghị eme ihe ọ bụla obi ya gwara ya mee. Kama, ọ na-ejide onwe ya ka ọ ghara ikwu ma ọ bụ mee ihe na-adịghị Jehova mma.
Jizọs kụziiri anyị ihe mmadụ ijide onwe ya bụ. Baịbụl sịrị: “Mgbe a na-ekwujọ ya, ọ dịghị ekwujọgwara. Mgbe ọ na-ata ahụhụ, o yighị onye ọ bụla egwu, kama ọ nọ na-enyefe onwe ya n’aka onye ahụ nke na-ekpe ikpe ziri ezi.” (1 Pita 2:23) Jizọs mere ihe a mgbe ndị na-emegide ya kparịrị ya mgbe ọ nọ n’osisi ịta ahụhụ. (Mat. 27:39-44) Tupu mgbe ahụ, o gosiri na ya na-ejide onwe ya mgbe ndị ndú okpukpe chọrọ ijide ya n’okwu ọnụ ya. (Mat. 22:15-22) Ihe o mere mgbe ndị Juu iwe ji chọrọ ịtụ ya okwute bụ ihe anyị kwesịrị ịna-eme. Kama iweso ha iwe, o “zoro wee pụọ n’ụlọ nsọ ahụ.”—Jọn 8:57-59.
Ànyị nwere ike ime ka Jizọs? Ee, otú anyị nwere ike. Pita onyeozi kwuru, sị: “Kraịst 1 Pita 2:21) Ọ bụ eziokwu na anyị ezughị okè, ma anyị nwere ike isochi nzọụkwụ Jizọs anya. Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị mee otú ahụ?
tara ahụhụ n’ihi unu, wee hapụrụ unu ihe nlereanya ka unu wee sochie nzọụkwụ ya anya.” (GỊNỊ MERE NJIDE ONWE ONYE JI DỊ MKPA?
Anyị kwesịrị ịna-ejide onwe anyị ka ihe anyị nwee ike ịdị Jehova mma. Ọ bụrụgodị na anyị efeela Jehova ruo ọtụtụ afọ, anyị na ya nwere ike gharazie ịdị ná mma ma ọ bụrụ na anyị anaghị ejide onwe anyị ma n’okwu ọnụ ma n’omume.
Chegodị gbasara Mozis, onye dị “umeala n’obi karịa mmadụ niile nọ n’elu ala” n’oge ya. (Ọnụ Ọgụ. 12:3) Mozis nọgidere na-edi ntamu ụmụ Izrel na-atamu ruo ọtụtụ afọ. Ma, otu ụbọchị, o jidelighị onwe ya. Iwe were ya mgbe ụmụ Izrel kwuru ọzọ na ha enweghị mmiri ga-ezuru ha. O ji olu ike gwa ha, sị: “Nụrụnụ, unu ndị nnupụisi! Ọ̀ bụ na nkume a dị elu ka anyị ga-esi mee ka mmiri gbapụtara unu?”—Ọnụ Ọgụ. 20:2-11.
Mozis ejidelighị onwe ya. O kwughị na ọ bụ Jehova ji ọrụ ebube nye ha mmiri. (Ọma 106:32, 33) Ihe a o mere mere ka Jehova ghara ikwe ka ọ banye n’Ala Nkwa ahụ. (Ọnụ Ọgụ. 20:12) Ọ ga-abụ na ihe ahụ o mere wutegidere ya ruo mgbe ọ nwụrụ.—Diut. 3:23-27.
Gịnị ka anyị na-amụta na ya? Ọ bụrụgodị na anyị efeela Jehova ruo ọtụtụ afọ, anyị ekwesịghị ịkparị ndị kpasuru anyị iwe ma ọ bụ ndị anyị chọrọ ịgbazi. (Efe. 4:32; Kọl. 3:12) Nke bụ́ eziokwu bụ na ka anyị na-eme okenye ka o nwere ike ịna-esikwuru anyị ike inwe ndidi. Ma, cheta Mozis. Anyị agaghị achọ ka ejideghị onwe anyị mee ka ozi anyị jeere Jehova ọtụtụ afọ laa n’iyi. Gịnị ka anyị ga-eme iji mụta àgwà a dị ezigbo mkpa?
OTÚ ANYỊ GA-ESI MỤTA IJIDE ONWE ANYỊ
Rịọ Jehova ka o nye gị mmụọ nsọ. N’ihi gịnị? N’ihi na njide onwe onye so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ. Jehova na-enyekwa ndị ọ bụla rịọrọ ya mmụọ nsọ ya. (Luk 11:13) Jehova na-eji mmụọ nsọ ya enye anyị ike anyị ga-eji na-ejide onwe anyị. (Fil. 4:13) Ọ ga-enyekwara anyị aka ịmụta àgwà ndị ọzọ so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ, dị ka, ịhụnanya, bụ́kwanụ ihe ga-enyere anyị aka ịna-ejide onwe anyị.—1 Kọr. 13:5.
Efe. 5:3, 4) Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị kwesịrị izere ihe ọ bụla nwere ike ime ka anyị mee ihe na-adịghị mma. (Ilu 22:3; 1 Kọr. 6:12) Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịdị mkpa ka onye ọ na-esiri ike ịgbara omume rụrụ arụ ọsọ zere akwụkwọ ma ọ bụ fim na-ekwu gbasara ịhụnanya nwoke na nwaanyị.
Zere ihe ọ bụla nwere ike ime ka o siere gị ike ijide onwe gị. Dị ka ihe atụ, zere ebe ndị a na-eme omume ndị na-adịghị mma n’Ịntanet na ntụrụndụ ndị ọzọ na-adịghị mma. (O nwere ike isiri anyị ike ime ihe a. Ma, ọ bụrụ na anyị agbaa mbọ, Jehova ga-enyere anyị aka ịna-ejide onwe anyị. (2 Pita 1:5-8) Ọ ga-enyere anyị aka ịna-ejide onwe anyị ka anyị ghara ịna-eche, na-ekwu ma ọ bụ na-eme ihe na-adịghị mma. Ihe mere Paul na Marco anyị kwuburu okwu ha gosiri na nke a bụ eziokwu. Ha kwụsịrị iwe iwe ọkụ. Cheekwa gbasara otu nwanna na-anya ụgbọala. Ọ na-ewesokarị ndị ọzọ na-anya ụgbọala iwe, na-esesakwa ha okwu. Gịnị ka o mere gbasara ya? Ọ sịrị: “M na-ekpesi ekpere ike maka ya kwa ụbọchị. M mụrụ isiokwu ndị na-ekwu gbasara njide onwe onye, butekwa amaokwu Baịbụl ndị ga-enyere m aka n’isi. Ọ bụ eziokwu na m na-agbalị ijide onwe m kemgbe ọtụtụ afọ, ihe na-enyere m aka bụ ichetara onwe m kwa ụtụtụ na m kwesịrị ịgbalị na-ejide onwe m. M na-apụkwa n’oge gawa ebe m chọrọ ịga ka ọ ghara ịna-adị m ngwa ngwa.”
E NWEE MGBE ANYỊ NA-EJIDELIGHỊ ONWE ANYỊ
E nwere mgbe ụfọdụ anyị na-agaghị ejideli onwe anyị. Ya dị otú ahụ, ihere nwere ike imewe anyị ikpe ekpere. Ma, ọ bụ mgbe ahụ ka ekpere kacha dịrị anyị mkpa. N’ihi ya, kpee ekpere ozugbo. Rịọ Jehova ka ọ gbaghara gị ma nyere gị aka. Kpebiekwa na ị gaghị eme ya ọzọ. (Ọma 51:9-11) Echela na Jehova agaghị anụ arịrịọ ị na-arịọ ka o meere gị ebere. (Ọma 102:17) Jọn onyeozi chetaara anyị na ọbara Ọkpara Chineke “na-asachapụ anyị mmehie niile.” (1 Jọn 1:7; 2:1; Ọma 86:5) Cheta na Jehova na-agwa ndị na-efe ya ka ha na-agbaghara ugboro ugboro. Obi kwesịrị isi anyị ike na ọ ga-emekwara anyị otú ahụ.—Mat. 18:21, 22; Kọl. 3:13.
O wutere Jehova mgbe Mozis na-ejideghị onwe ya n’ala ịkpa. Ma, Jehova gbaghaara ya. Okwu Chineke kwuru na Mozis nwere ezigbo okwukwe. Anyị kwesịrị ịna-eme ka ya. (Diut. 34:10; Hib. 11:24-28) Jehova ekweghị ka ọ banye n’Ala Nkwa ahụ, ma ọ ga-ekwe ka o biri na Paradaịs ma nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. Anyị nwekwara ike inwe olileanya ịdị ndụ ebighị ebi ma ọ bụrụ na anyị amụta ịna-ejide onwe anyị.—1 Kọr. 9:25.