Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ọ̀ bụ naanị àgwà ndị ahụ dị ná Ndị Galeshia 5:​22, 23 so ná “mkpụrụ nke mmụọ nsọ”?

Ndị Galeshia 5:​22, 23 kwuru àgwà itoolu Ndị Kraịst kwesịrị ịna-akpa. Ọ sịrị: “Mkpụrụ nke mmụọ nsọ bụ ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị mma, okwukwe, ịdị nwayọọ, njide onwe onye.” Ma, ọ bụghị naanị àgwà ndị a ka mmụọ nsọ Chineke nwere ike inyere anyị aka ịna-akpa.

Lee ihe Pọl kwuru n’amaokwu ndị bu ụzọ: “Ọrụ nke anụ ahụ́ pụtara ìhè, ha bụ ịkwa iko, adịghị ọcha, omume rụrụ arụ, ikpere arụsị, ime mgbaasị, ibu iro, esemokwu, ekworo, iwe ọkụ, ndọrọ ndọrọ, nkewa, inwe òtù, anyaụfụ, ịṅụ oké mmanya, oriri oké mkpọtụ, na ihe ndị dị otú a.” (Gal. 5:​19-21) E nwere àgwà ndị ọzọ Pọl gaara akpọ aha so ‘n’ọrụ nke anụ ahụ́,’ dị ka ndị ahụ dị ná Ndị Kọlọsi 3:5. Mgbe Pọl kpọchara àgwà ọma itoolu ndị ahụ, o kwuru, sị: “Ọ dịghị iwu na-emegide ihe ndị dị otú a.N’ihi ya, ihe Pọl mere abụghị idepụtacha àgwà ọma niile mmụọ nsọ nwere ike ime ka anyị na-akpa.

Anyị ga-aghọtakwu ihe a ma anyị jiri àgwà ndị a Pọl kpọrọ aha tụnyere ndị nke ọ kpọrọ aha n’akwụkwọ ozi o degaara ọgbakọ nọ n’Efesọs. Ọ sịrị: “Mkpụrụ nke ìhè ahụ bụ ụdị ịdị mma ọ bụla na ụdị ezi omume ọ bụla na ụdị eziokwu ọ bụla.” (Efe. 5:​8, 9) “Ịdị mma,” ezi omume na eziokwu so ná “mkpụrụ nke ìhè ahụ.” Ma, ịdị mma sokwa ná “mkpụrụ nke mmụọ nsọ.”

Ihe ọzọkwa bụ na e nwere àgwà isii Pọl gwara Timoti ka o nwee. Ha bụ: “Ezi omume, nsọpụrụ Chineke, okwukwe, ịhụnanya, ntachi obi, ịdị nwayọọ n’obi.” (1 Tim. 6:11) Naanị atọ n’ime ha (ya bụ, okwukwe, ịhụnanya na ịdị nwayọọ n’obi) ka e denyere n’àgwà ndị so ná “mkpụrụ nke mmụọ nsọ.” Ma, ọ bụkwa mmụọ nsọ ga-enyere Timoti aka ịmụta àgwà ndị ọzọ a kpọrọ aha, ya bụ, ezi omume, nsọpụrụ Chineke, na ntachi obi.​—Tụlee Ndị Kọlọsi 3:12; 2 Pita 1:​5-7.

N’ihi ya, ọ bụghị àgwà niile Ndị Kraịst kwesịrị ịna-akpa ka e dere ná Ndị Galeshia 5:​22, 23. Mmụọ nsọ nwere ike inyere anyị aka ịmụta àgwà itoolu ndị ahụ so ná “mkpụrụ nke mmụọ nsọ.” Ma, e nwere àgwà ndị ọzọ anyị kwesịrị ịmụta ka anyị na-aghọ Ndị Kraịst tozuru okè nakwa ka anyị na-eyiri “mmadụ ọhụrụ ahụ nke e kere dị ka uche Chineke si dị, n’ezi omume na iguzosi ike n’ihe.”​—Efe. 4:24.