Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 29

“Mgbe M Na-adịghị Ike, Mgbe Ahụ Ka M Na-adị Ike”

“Mgbe M Na-adịghị Ike, Mgbe Ahụ Ka M Na-adị Ike”

“Ana m enweta obi ụtọ n’adịghị ike, ná mkparị, n’ịnọ ná mkpa, ná mkpagbu na ihe isi ike, n’ihi Kraịst.”—2 KỌR. 12:10.

ABỤ NKE 38 Ọ Ga-eme Ka I Sie Ike

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Gịnị ka Pọl onyeozi kwuru hoo haa gbasara onwe ya?

PỌL onyeozi kwuru hoo haa na e nwere mgbe ọ na-anaghị adị ike. O kwuru na ahụ́ ya “na-ala n’iyi,” na ọ na-esiri ya ike ime ihe dị mma, nakwa na ọ bụghị mgbe niile ka Jehova zara ekpere ya otú ọ tụrụ anya ya. (2 Kọr. 4:16; 12:7-9; Rom 7:21-23) Pọl kwukwara na ndị na-emegide ya weere ya ka onye na-adịghị ike. * Ma, o kweghị ka ihe ọjọọ ndị mmadụ na-ekwu banyere ya ma ọ bụ adịghị ike ya mee ka o chee na ọ baghị uru.—2 Kọr. 10:10-12, 17, 18.

2. Dị ka e kwuru ná 2 Ndị Kọrịnt 12:9, 10, olee ihe dị ezigbo mkpa Pọl mụtara?

2 Pọl mụtara ihe dị mkpa. Ọ mụtara na mmadụ nwere ike ịdị ike mgbe o chere na ọ dịghị ike. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 12:9, 10.) Jehova gwara Pọl na a na-eme ka ike ya “zuo okè n’adịghị ike.” Ihe ọ pụtara bụ na Jehova ga-enye ya ike ọ na-enweghị. Ka anyị buru ụzọ tụlee ihe mere na anyị ekwesịghị iwe iwe ma ndị iro anyị kparịa anyị.

NA-ENWETA “OBI ỤTỌ . . . NÁ MKPARỊ”

3. Gịnị mere anyị ji kwesị inwe obi ụtọ ma a kparịa anyị?

3 E nweghị onye n’ime anyị na-achọ ka a kparịa ya. Ma, ọ bụrụ na ndị iro anyị akparịa anyị, ya ewee anyị ezigbo iwe, o nwere ike ime ka anyị daa mbà. (Ilu 24:10) Oleezi otú anyị kwesịrị isi na-ele mkparị ndị na-emegide anyị na-akparị anyị anya? Dị ka Pọl, anyị nwekwara ike inwe “obi ụtọ . . . ná mkparị.” (2 Kọr. 12:10) N’ihi gịnị? N’ihi na mkparị a na-akparị anyị na mkpagbu a na-akpagbu anyị na-egosi na anyị bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. (1 Pita 4:14) Jizọs kwuru na a ga-akpagbu ndị na-eso ụzọ ya. (Jọn 15:18-20) Ihe mere n’oge ndịozi gosiri na ihe a bụ eziokwu. N’oge ahụ, ndị omenala ndị Gris riri isi na-ewere Ndị Kraịst ka ndị na-amaghị nke a na-akọ na ndị na-adịghị ike. Ndị Juu na-ewerekwa Ndị Kraịst ka “ndị na-agụghị oké akwụkwọ na ndị nkịtị.” (Ọrụ 4:13) Ndị Kraịst yiri ndị na-adịghị ike n’ihi na ha anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ga-eme ka ha na-agwa ndị ọchịchị ihe ha ga-eme. Ha esoghịkwa ná ndị agha. N’ihi ya, ha enweghị ike ịlụ agha ma ọ bụ chebe onwe ha.

4. Olee ihe Ndị Kraịst oge mbụ mere mgbe ndị na-emegide ha lere ha anya ka ndị na-amaghị nke a na-akọ?

Ndị Kraịst ndị ahụ hà kwere ka otú ahụ ndị na-emegide ha si ele ha anya mee ka ha kwụsị ịbụ ndị na-eso ụzọ Kraịst? Mba. Dị ka ihe atụ, Pita onyeozi na Jọn onyeozi nwere obi ụtọ na a kpagburu ha n’ihi na ha bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs ma na-akụziri ndị mmadụ gbasara ya. (Ọrụ 4:18-21; 5:27-29, 40-42) E nweghị ihe mere ndịozi ahụ kwesịrị iji mewe ihere. N’agbanyeghị na ndị obodo ejighị Ndị Kraịst kpọrọ ihe n’oge ndịozi, Ndị Kraịst nyeere ndị mmadụ ezigbo aka karịa ndị ahụ na-akpagbu ha. Dị ka ihe atụ, akwụkwọ Baịbụl ụfọdụ n’ime Ndị Kraịst ndị ahụ dere nyeere ọtụtụ nde mmadụ aka ma mee ka ha nwee olileanya. Alaeze ahụ ha kwusara banyere ya na-achị n’eluigwe ugbu a, ọ ga-achịkwa ụwa niile n’oge na-adịghị anya. (Mat. 24:14) Ma, ọchịchị ndị Rom oge ochie ahụ kpagburu Ndị Kraịst adaala kemgbe ọtụtụ afọ gara aga, ebe ndị na-eso ụzọ Jizọs ndị ahụ bụzi ndị eze n’eluigwe ugbu a. Ma ndị ahụ kpagburu ha anwụọla. Ọ bụrụ na ha emechaa soro ná ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ, ha ga-eso ná ndị Alaeze ahụ Ndị Kraịst ahụ ha kpọrọ asị kwusara ga-achị.—Mkpu. 5:10.

5. Dị ka e kwuru na Jọn 15:19, gịnị mere ndị mmadụ ji eleda ndị Jehova anya?

5 Taa, ndị mmadụ na-eleda anyị anya mgbe ụfọdụ n’ihi na anyị bụ ndị Jehova. Ha na-akwa anyị emo n’ihi na ha chere na anyị bụ ndị na-amaghị nke a na-akọ na ndị na-adịghị ike. N’ihi gịnị? N’ihi na anyị anaghị eme ka ndị gbara anyị gburugburu. Anyị na-agba mbọ ịdị umeala n’obi ma na-erube isi. Ma ndị mmadụ na-eto ndị dị mpako na ndị na-enupụ isi. Ihe ọzọkwa bụ na anyị anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, anyị anaghịkwa eso ná ndị agha obodo ọ bụla. Anyị dị iche ná ndị ụwa. N’ihi ya, ha na-ele anyị anya ka ndị na-enweghị ebe ha ruru ndị ọzọ.—Gụọ Jọn 15:19; Rom 12:2.

6. Gịnị ka Jehova ji ndị ya na-arụzu?

6 N’agbanyeghị otú ụwa si were anyị, Jehova ji anyị na-arụzu ihe ndị dị ịtụnanya. O ji anyị ekwusa ozi ọma taa karịa otú e kwusatụrụla ya n’ụwa. Ọ bụ ndị ohu ya na-ebipụta akwụkwọ ndị a kacha asụgharị ma na-ekesa n’ụwa taa. Ha na-ejikwa Baịbụl na-enyere ọtụtụ nde mmadụ aka ime ka ndụ ha ka mma. Ọ bụ Jehova ka anyị ga-ekele maka ihe ndị a anyị na-arụzu. O ji ndị e chere na ha adịghị ike na-arụ ihe ndị a dị ịtụnanya. Gịnịkwanụ banyere anyịnwa n’otu n’otu? Jehova ò nwere ike inyere anyị aka ka anyị dịrị ike? Ọ bụrụ na o nwere ike ime ya, gịnị ka anyị kwesịrị ime ka o nyere anyị aka? Ka anyị tụlee ihe atọ anyị nwere ike ịmụta n’aka Pọl onyeozi.

ATỤKWASỊKWALA ONWE GỊ OBI

7. Olee otu ihe anyị na-amụta n’aka Pọl?

7 Otu ihe anyị na-amụta n’aka Pọl bụ na anyị ekwesịghị ịtụkwasị onwe anyị obi n’ofufe anyị na-efe Jehova. N’anya mmadụ, e nwere ọtụtụ ihe mere Pọl gaara eji maka ya dịwa mpako ma ọ bụ tụkwasịwa onwe ya obi. O toro na Tasọs, bụ́ isi obodo Rom. Ndị bi na Tasọs bara ezigbo ọgaranya, e nwekwara mahadum na-ewu ewu n’ebe ahụ. Pọl gụrụ ezigbo akwụkwọ. Onye kụziiri ya ihe bụ onye ndú ndị Juu kacha akwanyere ùgwù n’oge ahụ. Aha ya bụ Gameliel. (Ọrụ 5:34; 22:3) E nwekwara mgbe Pọl so ná ndị ọnụ na-eru n’okwu n’obodo ha. Ọ sịrị: “M nọkwa na-enwe ọganihu dị ukwuu n’okpukpe ndị Juu karịa ọtụtụ n’ime ndị ọgbọ m, bụ́ ndị agbụrụ m.” (Gal. 1:13, 14; Ọrụ 26:4) Ma, Pọl atụkwasịghị onwe ya obi.

Pọl weere ihe ndị yiri ka hà bụ ihe ndị bara uru n’ụwa ka “nnukwu ihe e kpofuru ekpofu” ma e jiri ha tụnyere uru ndị o ritere n’iso Kraịst (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8) *

8. Dị ka e kwuru ná Ndị Filipaị 3:8, olee otú Pọl si were ihe ndị ọ hapụrụ? Gịnịkwa mere o ji nwee “obi ụtọ n’adịghị ike” ya?

8 Pọl ji obi ụtọ hapụ ihe ndị ahụ mere ka ọ bụrụ nnukwu mmadụ n’otú ụwa si ele ihe anya. O mechadịrị were ihe ndị ahụ yiri uru ọ na-eritebu ka “nnukwu ihe e kpofuru ekpofu.” (Gụọ Ndị Filipaị 3:8.) Pọl tara nnukwu ahụhụ n’ihi ịbụ onye na-eso ụzọ Kraịst. Ndị obodo ya kpọrọ ya asị. (Ọrụ 23:12-14) Ụmụ amaala Rom ibe ya tiri ya ihe, tụọkwa ya mkpọrọ. (Ọrụ 16:19-24, 37) Ọ makwa na ya ezughị okè nakwa na ọ na-esiri ya ike ime ihe dị mma. (Rom 7:21-25) Ma, kama ikwe ka ndị iro ya ma ọ bụ ihe ndị o mejọrọ mee ka ọ kwụsị ịbụ onye na-eso ụzọ Kraịst, o nwere “obi ụtọ n’adịghị ike” ya. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ bụ mgbe ọ na-adịghị ike ka ọ hụrụ na Chineke ji ike ya na-enyere ya aka.—2 Kọr. 4:7; 12:10.

9. Olee otú i kwesịrị isi na-ele ihe ọ bụla yiri ihe nwere ike ime ka ị ghara ịdị ike anya?

9 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Jehova nye anyị ike, anyị ekwesịghị ịna-eche na ọ bụ ike ọkpụkpụ aka anyị, otú anyị gụruru n’akwụkwọ, omenala anyị, ma ọ bụ ihe ndị anyị nwere ga-ekpebi ma ànyị bara uru. Ọ bụghị ihe ndị a na-eme ka anyị baa uru n’anya Jehova. N’eziokwu, ọ bụghị ọtụtụ ndị ohu Chineke ‘maara ihe n’ụzọ anụ ahụ́, dịrị ike, ma ọ bụ si n’ezinụlọ eze.’ Ma, Jehova họọrọ iji “ihe ndị na-adịghị ike nke ụwa” mezuo uche ya. (1 Kọr. 1:26, 27) N’ihi ya, anyị ekwesịghị iwere ihe ndị anyị na-enweghị ka ihe ndị nwere ike igbochi anyị ife Jehova. Kama, were ya ka ohere i nwere iji hụ na Jehova na-enye gị ike ya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na e nwere ndị na-eme ka obi ghara isi gị ike n’ihe ndị i kweere, rịọ Jehova ka o nye gị obi ike ị ga-eji kọwaara ha ihe i kweere. (Efe. 6:19, 20) Ọ bụrụ na ezigbo ọrịa ji gị, rịọ Jehova ka o nye gị ike ị ga-eji na-ejere ya ozi otú i nwere ike. Mgbe ọ bụla ị hụrụ na Jehova nyeere gị aka, okwukwe gị ga-esikwu ike.

MỤTA IHE N’AKA NDỊ A KỌRỌ AKỤKỌ HA NA BAỊBỤL

10. Gịnị mere anyị kwesịrị iji mụọ banyere ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl, dị ka ná Ndị Hibru 11:32-34?

10 Pọl mụsiri Akwụkwọ Nsọ ike. Ọ mụtara ihe n’aka ndị fere Jehova ọ gụrụ banyere ha n’Akwụkwọ Nsọ. Mgbe ọ na-edegara Ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru akwụkwọ ozi, ọ gwara ha ka ha chee banyere ndị fere Jehova a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl. (Gụọ Ndị Hibru 11:32-34.) Ka anyị tụlee otu n’ime ha. Aha ya bụ Devid. Ma ndị iro ya ma ndị bụbu ndị enyi ya megidere ya. Ka anyị na-atụle banyere Devid, anyị ga-ahụ otú o nwere ike isi bụrụ na ịtụgharị uche n’akụkọ Devid nyeere Pọl aka nakwa otú anyị nwere ike isi mee ka Pọl.

Devid atụghị ụjọ ịlụso Golayat ọgụ n’agbanyeghị na ọ bụ nwatakịrị, yiekwa onye na-adịghị ike. Ọ tụkwasịrị Jehova obi n’ihi na ọ ma na Jehova ga-enye ya ike imeri Golayat. Jehova nyekwaara ya aka (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11)

11. Gịnị mere o ji yie ka Devid adịghị ike? (Kọwaa ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)

11 Golayat bụ́ dike lere Devid anya ka onye na-adịghị ike. Mgbe Golayat hụrụ Devid, “ọ malitere ileda ya anya.” A sị ka e kwuwe, Golayat gbara dimkpa, nwee ngwá agha, a zụọkwa ya nke ọma maka agha karịa Devid. Ma, Devid bụ nwata na-enweghị ihe ọ ma. O yikwara onye na-ejikereghị maka agha. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na Devid dị ike. Ọ tụkwasịrị Jehova obi. Jehova nyekwara ya ike o ji merie Golayat.—1 Sam. 17:41-45, 50.

12. Olee nsogbu ndị ọzọ Devid diri?

12 E nwekwara nsogbu ọzọ nwere ike ime ka ike gwụ Devid. Devid ji obi ya niile jeere Sọl bụ́ onye Jehova họpụtara ịbụ eze Izrel ozi. Eze Sọl kwanyeere Devid ùgwù ná mmalite. Ma ka oge na-aga, Sọl dịwara mpako, ya emee ka o nwewere Devid anyaụfụ. Sọl mere Devid ihe ọjọọ, chọọdị igbu ya.—1 Sam. 18:6-9, 29; 19:9-11.

13. Gịnị ka Devid mere mgbe Sọl mere ya ihe ọjọọ?

13 N’agbanyeghị ihe ọjọọ Eze Sọl mere Devid, Devid nọgidere na-akwanyere eze Jehova họpụtara ùgwù. (1 Sam. 24:6) Ọ taghị Jehova ụta maka ihe ọjọọ Sọl mere ya. Kama, ọ tụkwasịrị Jehova obi na ọ ga-enye ya ike ọ ga-eji die nsogbu ahụ bịaara ya.—Ọma 18:1, okwu mmeghe.

14. Olee nsogbu ndị bịaara Pọl yiri ndị nke ahụ bịaara Devid?

14 Pọl onyeozi nwekwara ụdị nsogbu ahụ Devid nwere. Ndị iro Pọl siri ezigbo ike karịa ya. Ọtụtụ ndị ndú a ma ama n’oge ya kpọrọ ya asị. Ha tiri ya ihe ma tụọ ya mkpọrọ ọtụtụ ugboro. Ndị kwesịrị ịbụ ndị enyi ya mere ya ihe ọjọọ otú ahụ e mekwara Devid. E nwedịrị ndị nọ n’ọgbakọ megidere ya. (2 Kọr. 12:11; Fil. 3:18) Ma Pọl meriri ndị niile megidere ya. Olee otú o si merie ha? N’agbanyeghị na ha na-emegide ya, ọ kwụsịghị ikwusa ozi ọma. Ọ hapụghị ụmụnna ya ma mgbe ha mere ihe wutere ya. Nke kacha mkpa bụ na o fegidere Chineke ruo ọnwụ ya. (2 Tim. 4:8) Ihe mere o ji mee ihe a niile abụghị n’ihi na o siri ike, kama n’ihi na ọ tụkwasịrị Jehova obi.

Na-akwanyere ndị na-agba ihe i kweere ụkwụ ùgwù mgbe ị na-achọ ime ka ha chebara ihe mere i ji kwere n’ihe i kweere echiche (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15) *

15. Olee ihe bụ́ mkpa anyị, oleekwa otú anyị nwere ike isi mee ya?

15 Ụmụ akwụkwọ ibe gị, ndị ọrụ ibe gị ma ọ bụ ndị ezinụlọ gị na-abụghị Ndịàmà Jehova, hà na-akparị gị ma ọ bụ na-emegide gị? Ò nwere onye nọ n’ọgbakọ mere gị ihe ọjọọ? Ọ bụrụ otú ahụ, cheta akụkọ Devid na Pọl. I nwere ike ịna-eji “ihe ọma na-emeri ihe ọjọọ.” (Rom 12:21) Ihe bụ́ mkpa gị abụghị ịlụso ndị na-emegide gị ọgụ otú ahụ Devid lụsoro Golayat. Ihe bụ́ mkpa gị bụ inyere ndị mmadụ aka ịmụta gbasara Jehova na Okwu ya, si otú ahụ merie ihe ọjọọ. I nwere ike ime ya ma i jiri Baịbụl na-aza ndị mmadụ ajụjụ ndị ha jụrụ, na-akwanyere ndị na-emegide gị ùgwù ma na-emere mmadụ niile ihe ọma, ma ndị na-emegide gị.—Mat. 5:44; 1 Pita 3:15-17.

KWE KA NDỊ ỌZỌ NYERE GỊ AKA

16-17. Gịnị ka Pọl na-echefughị?

16 Tupu Pọl onyeozi aghọọ onye na-eso ụzọ Kraịst, ọ bụ nwa okorobịa na-akparị mmadụ, nakwa onye na-emegide ndị na-eso ụzọ Jizọs. (Ọrụ 7:58; 1 Tim. 1:13) Jizọs kwụsịrị Pọl, bụ́ onye a ma dị ka Sọl mgbe ahụ, ịkpagbu ọgbakọ Ndị Kraịst. Jizọs si n’eluigwe gwa Pọl okwu ma mee ka o kpuo ìsì. Pọl gakwuuru ndị ahụ ọ na-akpagbubu ka ha nyere ya aka ka ọ hụwa ụzọ. O medakwara obi nabata aka onye na-eso ụzọ Jizọs aha ya bụ Ananayas nyeere ya bụ́ onye mere ka ọ hụwa ụzọ.—Ọrụ 9:3-9, 17, 18.

17 Pọl mechara ghọọ onye a ma ama n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Ma, o chefughị ihe Jizọs kụziiri ya n’ụzọ Damaskọs. Pọl nọgidere na-adị umeala n’obi. O jikwa obi ya niile nabata aka ụmụnna ya nyeere ya. O kwuru na ha bụ ndị ‘na-eme ka ya dị ike.’—Kọl. 4:10, 11.

18. Gịnị mere o nwere ike iji siere anyị ike ịnabata aka ndị ọzọ na-enyere anyị?

18 Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’aka Pọl? Mgbe anyị malitere iso ndị Jehova ọhụrụ, o nwere ike ịbụ na anyị dị njikere ịnabata aka ụmụnna ndị ọzọ na-enyere anyị n’ihi na anyị ma na e nwere ọtụtụ ihe anyị na-amaghị. (1 Kọr. 3:1, 2) Ma, ugbu a kwanụ? Ọ bụrụ na anyị efeela Jehova ọtụtụ afọ, mụtakwa ọtụtụ ihe, o nwere ike anyị agaghị anabata aka ụmụnna ndị ọzọ na-enyere anyị, karịchaa ma ọ bụrụ na onye chọrọ inyere anyị aka bụ onye anyị bu ụzọ bata n’ọgbakọ. Ma ọtụtụ mgbe, Jehova na-eji ụmụnna anyị na-eme ka anyị dị ike. (Rom 1:11, 12) Anyị kwesịrị iburu nke a n’obi ma anyị chọọ inweta ike Jehova na-enye.

19. Gịnị mere ihe ji gaziere Pọl?

19 Pọl mere ụfọdụ ihe dị ịtụnanya mgbe ọ ghọrọ Onye Kraịst. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ mụtara na ihe ga-eme ka ihe gaziere mmadụ abụghị ike ọkpụkpụ aka ya, ebe ọ gụruru akwụkwọ, otú ọ baruru n’ọgaranya ma ọ bụ ebe o si, kama, ọ bụ mmadụ ịdị umeala n’obi na ịtụkwasị Jehova obi. Ka anyị niile na-eme ka Pọl (1) n’ịtụkwasị Jehova obi, (2) n’ịmụta ihe n’aka ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl, nakwa (3) n’ikwe ka ndị Kraịst ibe anyị nyere anyị aka. Anyị mee otú ahụ, Jehova ga-eme ka anyị dị ike n’agbanyeghị na o nwere ike ịdị anyị ka anyị adịghị ike.

ABỤ NKE 71 Anyị Bụ Ndị Agha Jehova

^ par. 5 N’isiokwu a, anyị ga-atụle ihe anyị ga-amụta n’aka Pọl onyeozi. Anyị ga-achọpụta na ọ bụrụ na anyị adị umeala n’obi, Jehova ga-enye anyị ike anyị ga-eji die emo a na-akwa anyị, meekwa ka anyị dị ike mgbe anyị na-adịghị ike.

^ par. 1 NKỌWAKWU: E nwere ọtụtụ ihe nwere ike ime ka mmadụ ghara ịdị ike. Ha bụ ezughị okè, ịda ogbenye, ọrịa, ma ọ bụ agụghị akwụkwọ. Ihe ọzọkwa bụ na ndị iro anyị nwere ike ịna-agwa anyị okwu ọjọọ ma ọ bụ na-emegide anyị iji mee ka anyị chee na anyị abaghị uru.

^ par. 57 NKỌWA FOTO: Mgbe Pọl malitere ikwusa ozi ọma banyere Kraịst, ọ hapụrụ ihe ndị mere o ji bụrụ onye Farisii. Ihe ndị ahụ nwere ike ịbụ akwụkwọ mpịakọta dị iche iche na ihe e ji etinye Akwụkwọ Nsọ.

^ par. 61 NKỌWA FOTO: Ebe ndị ha na otu nwanna nwoke na-arụkọ ọrụ na-amanye ya ka o soro ha mee ememme ncheta ụbọchị ọmụmụ onye ọrụ ha.