Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 35

Na-akwanyere Ndị Ọzọ n’Ọgbakọ Jehova Ùgwù

Na-akwanyere Ndị Ọzọ n’Ọgbakọ Jehova Ùgwù

“Anya apụghị ịgwa aka, sị: ‘Ị dịghị m mkpa’; ma ọ bụ, isi apụghịkwa ịgwa ụkwụ, sị: ‘Ị dịghị m mkpa.’”​—1 KỌR. 12:21.

ABỤ NKE 124 Hụ Jehova na Ụmụnna Anyị n’Anya

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Gịnị ka Jehova nyere onye ọ bụla ji obi ya niile na-efe ya?

JEHOVA nyere onye ọ bụla ji obi ya niile na-efe ya ọrụ dị mkpa n’ọgbakọ ya n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya. N’agbanyeghị na ọrụ anyị dị iche iche, anyị niile bara uru n’ọgbakọ, dịkwa ibe anyị mkpa. Pọl onyeozi kwuru ihe gosiri na nke a bụ eziokwu. Olee otú o si mee ya?

2. Dị ka e kwuru ná Ndị Efesọs 4:​16, gịnị mere anyị ji kwesị iji ibe anyị kpọrọ ihe ma na-arụkọ ọrụ ọnụ?

2 Dị ka e kwuru n’amaokwu Akwụkwọ Nsọ e si nweta isiokwu a, Pọl mere ka o doo anya na o nweghị onye ọ bụla n’ime anyị ga-asị ibe ya, “Ị̀ dịghị m mkpa.” (1 Kọr. 12:21) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka udo dịrị n’ọgbakọ, anyị kwesịrị iji ibe anyị kpọrọ ihe, na-arụkọkwa ọrụ ọnụ. (Gụọ Ndị Efesọs 4:16.) Ọ bụrụ na anyị ana-arụkọ ọrụ ọnụ, onye ọ bụla ga-ahụ ibe ya n’anya, ihe ana-agakwa aga n’ọgbakọ.

3. Olee ihe ndị anyị ga-eleba anya na ha n’isiokwu a?

3 Olee ụzọ ụfọdụ anyị nwere ike isi na-akwanyere Ndị Kraịst ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ùgwù? N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’otú ndị okenye nwere ike isi na-akwanyere ibe ha ùgwù. Ihe ọzọ anyị ga-eleba anya na ya bụ otú anyị niile nwere ike isi gosi na anyị ji ụmụnna anyị ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye kpọrọ ihe. N’ikpeazụ, anyị ga-amụta otú anyị nwere ike isi na-akwanyere ndị na-anaghị asụ asụsụ anyị nke ọma ùgwù.

NA-AKWANYERE NDỊ OKENYE IBE GỊ ÙGWÙ

4. Olee ndụmọdụ Pọl nyere dị ná Ndị Rom 12:10 ndị okenye kwesịrị ige ntị?

4 Ọ bụ mmụọ nsọ Jehova ka e ji họpụta ndị okenye niile nọ n’ọgbakọ. Ma, onye nke ọ bụla n’ime ha nwere onyinye dị iche iche. (1 Kọr. 12:​17, 18) Ụfọdụ n’ime ha nwere ike ịbụ ndị a ka họpụtara ọhụrụ amamihe ha na-eruchaghị nke ndị ọzọ. Ndị ọzọ enweghị ọtụtụ ihe ha na-arụ n’ihi nká na ọrịa. N’agbanyeghị ya, e nweghị okenye ọ bụla kwesịrị iche na okenye nke ọzọ abaghị uru. Kama, okenye ọ bụla kwesịrị ige ntị na ndụmọdụ Pọl nyere ná Ndị Rom 12:10.​—Gụọ ya.

Otú ndị okenye si egosi na ha na-akwanyere ndị okenye ibe ha ùgwù bụ ịna-ege ha ntị nke ọma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5 na nke 6)

5. Olee otú ndị okenye si egosi na ha na-akwanyere ibe ha ùgwù? Gịnị mere o ji dị ezigbo mkpa?

Ndị okenye na-egosi na ha na-akwanyere ibe ha ùgwù ma ọ bụrụ na ha ana-ege ibe ha ntị nke ọma. Ha ga-eme nke a karịchaa mgbe ha nọ ná nnọkọ ndị okenye na-akparịta ihe dị mkpa n’ọgbakọ ha. N’ihi gịnị? Ụlọ Nche Bekee nke Ọktoba 1, 1988 kwuru, sị: “Ndị okenye kwesịrị ịmata na Kraịst nwere ike iji mmụọ nsọ mee ka okenye ọ bụla n’ọgbakọ kwuo ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru ga-enyere ndị okenye ibe ya aka ịmara ihe ha ga-eme ma ọ bụ ihe ha ga-ekpebi. (Ọrụ 15:​6-15) Mmụọ nsọ na-enyere ndị okenye niile aka, ọ bụghị naanị otu onye n’ime ha.”

6. Gịnị ga-enyere ndị okenye aka ịna-arụkọ ọrụ ọnụ? Oleekwa otú o si abara ọgbakọ uru?

6 Okenye na-akwanyere ndị okenye ibe ya ùgwù anaghị achọkarị ibu ụzọ kwuo okwu ná nnọkọ ndị okenye. Ọ naghị achọ ka o kwuo okwu karịa ndị ọzọ, ọ naghịkwa eche na ọ bụ ihe o kwuru ka mma mgbe niile. Kama nke ahụ, ọ na-eji obi umeala kwuo ihe o chere. Ọ na-egekwa ntị n’ihe ndị ọzọ na-ekwu. Nke kacha nke, ọ na-adị njikere ịgwa ndị ọzọ ihe Baịbụl kwuru na ige ntị ná ntụziaka “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” nyere. (Mat. 24:​45-47) Ọ bụrụ na ndị okenye ahụ ibe ha n’anya ma na-akwanyere ha ùgwù mgbe ha na-enwe nnọkọ, mmụọ nsọ Chineke ga-anọ n’etiti ha ma nyere ha aka ikpebi ihe ga-abara ọgbakọ uru.​—Jems 3:​17, 18.

NA-AKWANYERE ỤMỤNNA NA-ALỤBEGHỊ DI MA Ọ BỤ NWUNYE ÙGWÙ

7. Olee otú Jizọs si were ndị na-alụghị di ma ọ bụ nwunye?

7 Taa, e nwere ọtụtụ ndị di na nwunye na ọtụtụ ezinụlọ n’ọgbakọ, nweekwa ọtụtụ ụmụnna na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye. Olee otú anyị kwesịrị isi na-emeso ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye? Ka anyị legodị otú Jizọs si lee ndị na-alụghị di ma ọ bụ nwunye anya. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ lụghị nwaanyị. Ọ nọ naanị ya ma jiri oge ya niile lekwasị anya n’ihe ọ bịara ime n’ụwa. Jizọs ekwughị na Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị ịlụ di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ na o kwesịghị ịlụ. Ma, o kwuru na ụfọdụ Ndị Kraịst ga-ekpebi ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye. (Mat. 19:​11, 12) Jizọs kwanyeere ndị na-alụghị di ma ọ bụ nwunye ùgwù. O ledaghị ha anya ma ọ bụ were ha ka ndị ihe kọrọ n’ihi na ha alụghị di ma ọ bụ nwunye.

8. Dị ka e kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 7:​7-9, gịnị ka Pọl gbara Ndị Kraịst ume ka ha mee?

8 Pọl onyeozi alụghịkwa nwaanyị mgbe ọ na-eje ozi ya otú ahụ Jizọs na-alụghị. O nweghị mgbe Pọl kụziri na ọ dịghị mma Onye Kraịst ịlụ di ma ọ bụ nwunye. Ọ ma na ọ bụ ihe mmadụ ga-ekpebiri onwe ya. Ma, Pọl gbara Ndị Kraịst ume ka ha lee ma hà ga-ahapụ ịlụ di ma ọ bụ nwunye ka ha nwee ike ijere Jehova ozi. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 7:​7-9.) O doro anya na Pọl eledaghị ndị na-alụghị di ma ọ bụ nwunye anya. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ họọrọ Timoti, bụ́ onye na-alụbeghị nwaanyị n’oge ahụ, ka ọ rụọ ọrụ ndị dị mkpa. * (Fil. 2:​19-22) N’ihi ya, anyị ekwesịghị iche na otu nwanna ruru eru karịa ibe ya naanị n’ihi na ọ lụọla nwaanyị ma ọ bụ n’ihi na ọ lụbeghị.​—1 Kọr. 7:​32-35, 38.

9. Olee ihe anyị nwere ike ikwu gbasara ịlụ di ma ọ bụ nwunye na alụghị di ma ọ bụ nwunye?

9 Ma Jizọs ma Pọl akụzighị na Ndị Kraịst ga-alụrịrị di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ na ha agaghị alụ. Olee ihe anyị nwere ike ikwu gbasara ịlụ di ma ọ bụ nwunye na alụghị di ma ọ bụ nwunye? Ụlọ Nche Ọktoba 1, 2012, kwuru, sị: “N’eziokwu, mmadụ ịlụ di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụkwanụ mmadụ ịhapụ ịlụ alụ bụcha onyinye si n’aka Chineke. . . . Jehova ewereghịkwanụ mmadụ ịhapụ ịlụ di ma ọ bụ nwunye ka ihe ihere ma ọ bụ ihe ga-eme ka mmadụ nwewe mwute.” N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-akwanyere ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye ùgwù n’ọgbakọ.

Gịnị ka anyị na-ekwesịghị ime n’ihi na anyị na-akwanyere ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye ùgwù? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10)

10. Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị na-akwanyere ụmụnna anyị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye ùgwù?

10 Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị na-akwanyere ụmụnna anyị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye ùgwù ma na-echebara ha echiche? Anyị kwesịrị ịna-echeta na ụfọdụ ụmụnna na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye ji aka ha kpebie na ha agaghị alụ. Ụfọdụ n’ime ha ga-achọ ịlụ ma ha ahụbeghị onye dị ha mma. E nwekwara ndị nke di ha ma ọ bụ nwunye ha nwụnahụrụ. Nke ọ bụla ọ bụ, ọ̀ ga-adị mma ka ndị nọ n’ọgbakọ na-ajụ nwanna na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye ihe mere na ọ lụbeghị ma ọ bụ gwa ya ka a chọtara ya onye ọ ga-alụ? N’eziokwu, ụfọdụ n’ime ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye nwere ike ikwu ka a chọtara ha. Ma ọ bụrụ na ha ekwubeghị ka a chọtara ha, olee otú obi ga-adị nwanna na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụrụ na mmadụ agwa ya ka a chọtara ya? (1 Tesa. 4:11; 1 Tim. 5:13) Ka anyị lee ihe ụfọdụ ụmụnna anyị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye kwuru.

11-12. Olee otú anyị nwere ike isi mee ihe ga-ewute ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye?

11 Otu onye nlekọta sekit na-alụbeghị nwaanyị na-arụ ọrụ ya nke ọma kwuru na e nwere ọtụtụ uru dị n’alụghị di ma ọ bụ nwunye. Ma, o kwukwara na ọ na-ewute ya ma ụmụnna bu ọdịmma ya n’obi na-ajụ ya ihe mere na ọ lụbeghị nwaanyị. Otu nwanna na-alụbeghị nwaanyị na-eje ozi na Betel kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ, ụmụnna na-eme ka m chewe na e kwesịrị imetere ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye ebere. O nwere ike ime ka alụghị di ma ọ bụ nwunye yie nsogbu kama ịbụ ihe ọma.”

12 Otu nwanna nwaanyị na-alụbeghị di na-eje ozi na Betel kwuru, sị: “Ụfọdụ ndị nkwusa na-eche na ndị niile na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye na-achọ onye ha ga-alụ ma ọ bụ na-ewere ya na ha nwere ike inweta onye ha ga-alụ ma ha gaa n’ebe ọ bụla ọtụtụ ndị gbakọtara. E nwere ihe mere otu mgbe m gara ọrụ Betel n’obodo ọzọ, garuo n’ụbọchị ọmụmụ ihe nwanna nwaanyị m nọrọ n’ụlọ ya. Nwanna nwaanyị ahụ gwara m na e nwere ụmụnna nwoke abụọ nọ n’ọgbakọ ha mụ na ha bụ ọgbọ. Ọ gwara m na ọ bụghị na ọ na-achọtara m onye ga-alụ m. Ma, ozugbo anyị banyere n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ọ kpọọrọ m gaa n’ebe ụmụnna abụọ ahụ nọ. Ihe ahụ o mere menyere mụ na ụmụnna abụọ ahụ ihere.”

13. Olee ihe ndị nyeere otu nwanna nwaanyị na-alụbeghị di aka?

13 Nwanna nwaanyị ọzọ na-alụbeghị di na-ejekwa ozi na Betel kwuru, sị: “Ama m ọtụtụ ndị sụrụla ụzọ ọtụtụ afọ ma nke a na-akọ n’ọgbakọ, ji ozi ha kpọrọ ihe, dịkwa njikere inyere ndị ọzọ aka. Ha na-enwe obi ụtọ, na-abakwara ọgbakọ ezigbo uru. Ha ma ihe alụghị di ma ọ bụ nwunye pụtara. Ha anaghị eche na ha ka ndị ọzọ mma ma ọ bụ na o nwere ihe na-efunahụ ha n’ihi na ha alụbeghị ma ọ bụ na ha amụtabeghị ụmụ.” Ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ọgbakọ ana-akwanyere ndị ọzọ ùgwù ma jiri ha kpọrọ ihe, ahụ́ na-eru onye ọ bụla ala. O nweghị onye ga na-emetere gị ebere ma ọ bụ na-emere gị anyaụfụ, e nweghịkwa onye ga na-eleda gị anya ma ọ bụ na-eche na ị ka ya mma. Ị ma na ndị gị na ha nọ n’ọgbakọ hụrụ gị n’anya.

14. Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị na-akwanyere ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye ùgwù?

14 Obi ga-adị ụmụnna anyị ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye ụtọ ma ọ bụrụ na anyị ejiri ha kpọrọ ihe n’ihi àgwà ọma ha ọ bụghị n’ihi na ha alụghị di ma ọ bụ nwunye. Kama ịna-emetere ha ebere, anyị kwesịrị iji ha kpọrọ ihe maka na ha ji obi ha niile na-efe Jehova. Anyị na-eme otú ahụ, ụmụnna anyị ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye agaghị na-eche na anyị na-asị ha: “Ị dịghị m mkpa.” (1 Kọr. 12:21) Kama nke ahụ, ha ga-amata na anyị na-akwanyere ha ùgwù, jirikwa ha kpọrọ ihe n’ọgbakọ.

NA-AKWANYERE NDỊ NA-ANAGHỊ ASỤ ASỤSỤ GỊ NKE ỌMA ÙGWÙ

15. Olee ihe ụmụnna ụfọdụ gbanwere ná ndụ ha iji nwee ike jekwuoro Jehova ozi?

15 N’oge ndị na-adịbeghị anya, ọtụtụ ndị nkwusa kpebiri ịmụta asụsụ ọzọ ka ha nwee ike ịna-ekwusakwu ozi ọma. Iji nwee ike ime ya, ha gbanwere ọtụtụ ihe ná ndụ ha. Ha hapụrụ ọgbakọ ji asụsụ ha amụ ihe gaa n’ọgbakọ na-eji asụsụ ọzọ amụ ihe n’ihi na a chọkwuru ndị nkwusa n’ọgbakọ ahụ. (Ọrụ 16:9) Ọ bụ hanwa ji aka ha kpebie ime ya ka ha nwee ike ijekwuru Jehova ozi. N’agbanyeghị na o nwere ike iwe ha ọtụtụ afọ tupu ha amụta asụsụ ahụ nke ọma, ha na-abara ọgbakọ ezigbo uru. Àgwà ọma ha na ihe ndị ha mụtara na-enyere ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ ahụ aka. Obi dị anyị ụtọ n’ebe ụmụnna ndị a nọ.

16. Gịnị ka ndị okenye ga-eji kpebie ma nwanna ò ruru eru ịbụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi?

16 Ndị okenye ekwesịghị ịsị na nwanna erughị eru ịbụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi naanị n’ihi na ọ naghị asụ asụsụ ọgbakọ ha ji amụ ihe nke ọma. Ndị okenye ga-eji ihe Baịbụl kwuru chọpụta ma nwanna ò ruru eru ịbụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi, ọ bụghị ma ọ̀ na-asụ asụsụ ọgbakọ ji amụ ihe nke ọma.​—1 Tim. 3:​1-10, 12, 13; Taị. 1:​5-9.

17. Olee ihe nne na nna kwesịrị ikpebi ma ha kwaga mba ọzọ?

17 Ụfọdụ ezinụlọ bụ́ Ndị Kraịst esila ná mba ha kwaga mba ọzọ n’ihi ihe isi ike. Ọ ga-emezi ka ọ bụrụ asụsụ a kacha asụ ná mba ahụ ha kwagara ka a ga-eji na-akụziri ụmụ ha ihe n’ụlọ akwụkwọ. O nwekwara ike ịdị mkpa ka nne na nna ha mụọ asụsụ ọhụrụ ahụ iji nwee ike nweta ọrụ. Ọ bụrụkwanụ na e nwere ọgbakọ ma ọ bụ ìgwè na-eji asụsụ ha amụ ihe? Olee ọgbakọ nke ezinụlọ ahụ kwesịrị iso na-amụ ihe? Ọ̀ bụ ọgbakọ na-eji asụsụ a kacha asụ ná mba ahụ ha kwagara amụ ihe, ka ọ̀ bụ nke na-eji asụsụ ha amụ ihe?

18. Dị ka e kwuru ná Ndị Galeshia 6:​5, olee otú anyị nwere ike isi nabata ihe onyeisi ezinụlọ kpebiri gbasara ọgbakọ ha ga-eso na-amụ ihe?

18 Onyeisi ezinụlọ kwesịrị ikpebi ọgbakọ nke ezinụlọ ya ga-eso na-amụ ihe. Ebe ihe a bụ ihe mmadụ ga-ekpebiri onwe ya, onyeisi ezinụlọ ahụ ga-echebara ihe ga-akacha baara ezinụlọ ya uru echiche. (Gụọ Ndị Galeshia 6:5.) Anyị ekwesịghị ịkatọ ihe ọ bụla onyeisi ezinụlọ kpebiri gbasara ihe a. Ihe ọ bụla o kpebiri, ka anyị nabata ha n’ọgbakọ anyị ma jiri ha kpọrọ ihe.​—Rom 15:7.

19. Olee ihe onyeisi ezinụlọ ga-echebara echiche ma kpee ekpere gbasara ya?

19 Ụfọdụ ezinụlọ nwere ike ịnọ n’ọgbakọ ji asụsụ ha amụ ihe ma e nwere ike ụmụ ha amachaghị asụsụ ahụ. Ọ bụrụ na ọgbakọ ahụ nọ n’ebe a na-asụ asụsụ ọzọ, o nwere ike isiri ụmụ ha ike ịna-aghọta ihe a na-amụ n’ọmụmụ ihe nke nwere ike ime ka ha na Jehova ghara ịdị ná mma. N’ihi gịnị? N’ihi na ụmụaka ahụ nwere ike ịna-aga ụlọ akwụkwọ e ji asụsụ ọzọ na-abụghị asụsụ ha na-akụziri ha ihe. Ụdị ihe a mee, onyeisi ezinụlọ ga-ekpe ekpere maka amamihe iji kpebie ihe ga-enyere ụmụ ha aka ịbịarukwu Jehova na ndị ya nso. Ha nwere ike nyere ụmụ ha aka ịmụta asụsụ ha nke ọma ma ọ bụkwanụ ha elee ma hà ga-agafe n’ọgbakọ ahụ na-eji asụsụ ụmụ ha na-aghọta nke ọma amụ ihe. Ihe ọ bụla onyeisi ezinụlọ ahụ kpebiri, ọgbakọ ahụ ọ họọrọ ịga kwesịrị ime ka ahụ́ ruo ya na ezinụlọ ya ala, jirikwa ha kpọrọ ihe.

Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị ji ndị na-amachaghị otú e si asụ asụsụ anyị kpọrọ ihe? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 20)

20. Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị na-akwanyere ụmụnna anyị ndị na-amụ asụsụ ọzọ ùgwù?

20 N’ihi ihe niile a anyị kwuru gbasara ha, a ga na-enwe ụmụnna ndị na-agbalị ịmụta asụsụ ọzọ n’ọtụtụ ọgbakọ. O nwere ike ime ka o siere ha ike ikwu obi ha. Ma, ọ bụrụ na anyị ahapụ ile otú ha si asụ asụsụ ahụ, anyị ga-ahụ na ha hụrụ Jehova n’anya, chọọkwa ife ya. Ọ bụrụ na anyị elekwasị anya n’àgwà ọma ha, anyị ga-eji ha kpọrọ ihe, na-akwanyekwara ha ùgwù. Anyị agaghị eji maka na ha amachaghị asụsụ anyị na-asị ha: “Ị dịghị m mkpa.”

JEHOVA JI ANYỊ KPỌRỌ IHE

21-22. Olee ihe ọma Jehova meere anyị niile?

21 Obi dị anyị niile ụtọ na Jehova nyere onye nke ọ bụla n’ime anyị ọrụ ọ ga na-arụrụ ya n’ọgbakọ. Ma ànyị bụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị, ma ànyị alụọla di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ na anyị alụbeghị, ma ànyị ka na-eto eto ma ànyị emeela agadi, ma ànyị na-asụ otu asụsụ nke ọma ma ànyị ka na-amụ ya amụ, anyị niile dị Jehova mkpa, dịrịkwa ibe anyị mkpa.​—Rom 12:​4, 5; Kọl. 3:​10, 11.

22 Ka anyị gbalịsie ike na-eme ihe anyị mụtara n’ihe atụ ahụ Pọl ji ahụ́ mmadụ mee. Ime otú ahụ ga-enyere anyị aka ịmata ihe anyị ga-eme iji nyekwuoro ụmụnna anyị aka. Ọ ga-enyekwara anyị aka ịhụ ha n’anya ma na-akwanyere ha ùgwù.

ABỤ NKE 90 Ka Anyị Na-agbarịta Ibe Anyị Ume

^ par. 5 Ndị Jehova si n’ebe dị iche iche, na-arụkwa ọrụ dị iche iche n’ọgbakọ. Isiokwu a ga-enyere anyị aka ịmata ihe mere o ji dị mkpa ka anyị na-akwanyere onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ Jehova ùgwù.

^ par. 8 Anyị agaghị ekwuli hoo haa na Timoti alụghị nwaanyị.